Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke Maka 2004
1 Jehova na-akwadebe ndị nkịtị ịrụ ọrụ dị mkpa n’ụwa nile. Otu ụzọ ọ na-esi eme nke a bụ site n’ọzụzụ a na-enye kwa izu n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke. Ị̀ na-ekere òkè n’ụzọ zuru ezu ruo n’ókè ọnọdụ gị nyere gị ohere? Na January, a ga-amalite itinye mgbanwe ole na ole e mere n’ọrụ n’olileanya nke inyere ndị mmụta aka irite uru kasị ukwuu ná ndokwa a.
2 Ịgbanwegharị Onye Ndụmọdụ Inyeaka: Ụmụnna ndị na-ekwu okwu izi ihe ma na-eme nchịkọta nke isi ihe ndị sitere na Bible enwewo ekele maka nchọpụta ndị onye ndụmọdụ inyeaka mere n’okwu ha. N’ebe e nwere ndị okenye zuru ezu, bụ́ ndị ruru eru, a pụrụ ịdị na-agbanwegharị onye ndụmọdụ inyeaka kwa afọ. A pụrụ isi otú a kesaa ibu ọrụ ahụ; ma nke ka mkpa bụ na ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ruru eru ga-erite uru n’ahụmahụ nke ndị nkụzi na ndị ọkà okwu ruru eru n’ozuzu ya.
3 Ime Ndokwa Maka Ntụleghachi Ajụjụ na Azịza: Ọ bụrụ na ọgbakọ unu nwere mgbakọ sekit n’izu a ga-eme ntụleghachi ajụjụ na azịza, mgbe ahụ e kwesịrị ibufe ntụleghachi ajụjụ na azịza ahụ (nakwa akụkụ ndị ọzọ nke usoro ihe omume ahụ) n’izu na-abịanụ ma jiri usoro ihe omume nke izu ahụ na-abịanụ mee ihe ná mgbakọ sekit. Otú ọ dị, mgbe ọbịbịa onye nlekọta sekit dabara n’izu a ga-eme ntụleghachi ajụjụ na azịza, ọ gaghị adị mkpa iji akụkụ nile nke usoro ihe omume nke izu ahụ gbanwere nke izu na-abịanụ. Kama nke ahụ, a ga-eji abụ, nkà okwu, na nchịkọta nke isi ihe ndị sitere na Bible, bụ́ ndị e dokwara maka izu ahụ mee ihe. E kwesịrị iweta okwu izi ihe (nke a ga-ekwu mgbe e kwusịrị nkà okwu) site n’usoro ihe omume nke izu na-abịanụ. Nchịkọta nke isi ihe ndị sitere na Bible gasịa, e nwee Nzukọ Ije Ozi nke ga-ewe ọkara awa, bụ́ nke a pụrụ ime ka o nwee akụkụ atọ, ndị ga-ewe minit 10 n’otu n’otu ma ọ bụ akụkụ abụọ, ndị ga-ewe minit 15 n’otu n’otu. (E kwesịrị iwepụ ịma ọkwa.) Mgbe Nzukọ Ije Ozi gasịrị, a bụọ abụ ma nwee ihe omume ga-ewe ọkara awa, nke onye nlekọta sekit ga-eme. Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke maka izu na-abịanụ ga-enwe nkà okwu na nchịkọta nke isi ihe ndị sitere na Bible otú ahụ e si dokwaa ya, ntụleghachi ajụjụ na azịza ga-esochizi ya.
4 Jiri ohere ọ bụla dapụtaranụ na-eto eto n’ụzọ ime mmụọ. Ka ị na-erite uru ná mmụta ị na-enweta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, ị na-agba ọgbakọ gị ume, na-ekere òkè ná mmezu nke amụma Bible, na-ewetakwara Onye Chepụtara ozi ahụ dị ebube, bụ́ nke anyị na-aghaghị ịkpọsa, otuto.—Aịsa. 32:3, 4; Mkpu. 9:19.