Otú A Ga-esizi Na-enwe Ọmụmụ Ihe Ọgbakọ
1, 2. Olee ihe ndị a ga-agbanwe n’ọmụmụ ihe anyị malite na January 2009?
1 N’izu nke April 21-27, 2008, a maara ụmụnna anyị n’ụwa niile otu ọkwa na-eme obi ụtọ. “Malite na January 1, 2009, a ga na-enwezi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ n’otu oge ahụ a na-enwe Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na Nzukọ Ije Ozi. Ihe a ga na-akpọzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ bụ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ.”
2 Otú A Ga-esi Na-enwe Ọmụmụ Ihe A Kwa Izu: Oge ọmụmụ ihe a ga-ewe, ma oge a ga-eji bụọ abụ ma oge a ga-eji kpee ekpere, ga-abụ 1 awa na nkeji 45. A ga-eji abụ na ekpere malite ọmụmụ ihe ahụ (nkeji 5), nke ahụ gachaa, a malitezie Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ (nkeji 25). Ihe ga-esochi ozugbo bụ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke (nkeji 30). E mechaa ya, a bụọ abụ (nkeji 5) iji malite Nzukọ Ije Ozi (nkeji 35). A ga-eji abụ na ekpere (nkeji 5) mechie ọmụmụ ihe ahụ. Iji nyere gị aka ịkwadebe maka ọmụmụ ihe ndị a, a ga na-ebipụta usoro ihe omume maka Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ, Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, na Nzukọ Ije Ozi n’Ozi Alaeze Anyị kwa ọnwa.
3. Olee otú a ga na-esi eduzi Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ?
3 Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ: A ga na-eduzi ọmụmụ ihe a otú e si eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Ọ gaghị adị mkpa ibu ụzọ tụleghachi ihe a mụrụ n’izu gara aga tupu a malite nke izu ahụ. Kama nke ahụ, e kwesịrị ikwu naanị ihe ole na ole iji malite ya. Nke a ga-eme ka mmadụ niile bịaranụ nwee ohere zuru ezu ịza ajụjụ. Onyeisi oche ndị nlekọta ga na-ahụ maka ikenye ndị okenye iduzi ọmụmụ ihe a, okenye nke a duzie n’izu a, okenye ọzọ eduzie n’izu ọzọ.
4. Olee ihe ga-agbanwe ná Nzukọ Ije Ozi?
4 Nzukọ Ije Ozi: Nzukọ Ije Ozi ga-adịgide otú ọ dị ugbu a, ọ bụ naanị na a ga-egbubilata oge e ji eme ihe omume dị iche iche. Ịma ọkwa ga na-ewekarị nkeji ise. Nke a kwesịrị izu iji maa ọkwa ndị dị mkpa ma gụọ akwụkwọ ozi ndị sitere n’aka alaka ụlọ ọrụ. Ọ gaghị adị mkpa ịdị na-agụpụta ọkwa banyere ihe ndị dị ka ndokwa ozi ubi, ndokwa ịzacha Ụlọ Nzukọ Alaeze, akụkọ ndekọ ego, na akwụkwọ ozi ndị alaka ụlọ ọrụ na-ezitere ọgbakọ kwa mgbe site n’elu ebe ikpo okwu, kama nke ahụ, a ga na-amapawa ha na bọọdụ ịma ọkwa ka ụmụnna gaa gụọ ha ebe ahụ. Ndị e kenyere ihe omume kwesịrị ịkwado nke ọma ma ghara iri oge, gbasookwa ntụziaka ndị e nyere maka ihe omume ha.
5. N’izu onye nlekọta sekit ga-eleta ọgbakọ, olee otú a ga-esi hazie ọmụmụ ihe ọgbakọ?
5 Nleta Onye Nlekọta Sekit: A gaghị agbanwe otú e si eme ihe omume n’izu nleta nke onye nlekọta sekit. Na Tuesday, a ga-abụ abụ mgbe e duzisịrị Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke na Nzukọ Ije Ozi. Onye nlekọta sekit ga-ekwuzi okwu ga-ewe nkeji 30. Dị ka a na-eme ugbu a n’izu ahụ, a ga-ewepụta mgbede ọzọ n’izu ahụ maka Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ, e duzichaakwa ya, a bụọ abụ a ga-eji malite okwu onye nlekọta sekit. A ga-eji abụ na ekpere mechie ọmụmụ ihe ahụ.
6. Gịnị bụ ọrụ onye nlekọta ìgwè?
6 Nzukọ Maka Ozi Ubi: Òtù ndị okenye ga-enye ndị nlekọta ìgwè ọrụ ilekọta ìgwè ozi ubi dị iche iche na ịzụ ndị nọ n’ìgwè ndị ahụ. Mgbe ọ dị mkpa ka ohu na-eje ozi rụọ ọrụ ahụ, e kwesịrị ịdị na-akpọ ya “ohu na-ahụ maka ìgwè.”
7. Olee ihe anyị kwesịrị ịtụ anya ya n’otú a a ga-esizi na-eduzi ọmụmụ ihe ọgbakọ anyị?
7 Dị ka e kwuru n’ebe a, anyị ga-enwe ohere ịnụrụ okwu ndị na-ewuli elu sitere na Baịbụl ná mgbede ahụ anyị ga na-enwe ọmụmụ ihe a. Nke a ga-enyere anyị aka ịbụ ezi ndị nkwusa na ndị nkụzi, ndị a zụrụ ịrụpụtakwu ihe n’ozi ha.—Efe. 4:13, 14; 2 Tim. 3:17.
8. Olee otú onye nke ọ bụla n’ime anyị ịkwadebe akwadebe tupu ya ana-aga ọmụmụ ihe nwere ike isi baara ma anyị ma ndị ọzọ uru?
8 Ịkwadebe akwadebe tupu anyị ana-aga ọmụmụ ihe ndị a ga-enyere anyị aka ilekwasị anya n’isi ihe ndị e kwuru n’ọmụmụ ihe nke ọ bụla. Anyị ga-enwe ohere ịza ajụjụ, si otú ahụ na-agbarịta nnọọ ibe anyị ume. (Rom 1:11, 12; Hib. 10:24) Ihe mgbaru ọsọ anyị kwesịrị ịbụ ‘ime ka ọganihu anyị pụta ìhè’ site n’ịdị “na-ejizi okwu nke eziokwu ahụ ejizi.”—1 Tim. 4:15; 2 Tim. 2:15.
9. Olee ihe anyị kpebisiri ike ime, n’ihi gịnịkwa?
9 Obi dị anyị ụtọ maka nnukwu mgbanwe a e mere n’ọmụmụ ihe ọgbakọ anyị. Ka anyị niile nọgide na-anabata nduzi sitere n’aka “ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche” ma nọrọ Nnukwu Onye Ọzụzụ Atụrụ anyị nso ka ọ na-akwadebe anyị maka oké “mkpagbu” ahụ dị nso ugbu a.—Mat. 24:21, 45; Hib. 13:20, 21; Mkpu. 7:14.