Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/07 p. 7
  • Igbe Ajụjụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbe Ajụjụ
  • Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Anyị Ji Obi Ụtọ Na-akpọ Gị Òkù
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Ntụziaka Maka Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
    Ntụziaka Maka Ọmụmụ Ihe Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ
  • Otú A Ga-esizi Na-enwe Ọmụmụ Ihe Ọgbakọ
    Ozi Alaeze Anyi—2008
  • Izukọta Ọnụ Na-efe Jehova
    Alaeze Chineke Amalitela Ịchị!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2007
km 5/07 p. 7

Igbe Ajụjụ

◼ Olee otú e kwesịrị isi na-eji abụ amalite Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, Nzukọ Ije Ozi, Okwu Ihu Ọha, na Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche, ònyekwa kwesịrị ịkpọpụta ya?

A na-edepụta abụ a na-eji amalite Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu ọ bụla n’Usoro Ihe Omume Maka Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, bụ́ nke na-adị n’ihe ntinye Ozi Alaeze Anyị nke October. A na-edepụta abụ a na-eji amalite na nke a na-eji emechi Nzukọ Ije Ozi na peeji nke 2 nke Ozi Alaeze Anyị. N’otu aka ahụkwa, a na-edepụta abụ a na-eji amalite na nke a na-eji emechi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche na peeji nke 2 nke Ụlọ Nche ọ bụla. E weere abụ ndị ahụ a na-eji amalite ma na-emechi nzukọ nke ọ bụla dị ka akụkụ nke nzukọ ahụ, n’ihi ya kwa, ọ bụ nwanna ga-eduzi nke ọ bụla n’ime ha kwesịrị ịkpọpụta abụ ndị ahụ, o kwesịghị ịbụ onyeisi oche nke nzukọ bu ụzọ.

Dị ka ihe atụ, onye nlekọta Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ga-anabata ndị nile bịaranụ, kwuo abụ a ga-eji amalite, duzie ụlọ akwụkwọ ahụ, ma kpọpụtazie nwanna ga-ekwu okwu mbụ ná Nzukọ Ije Ozi. Ọ bụ nwanna ahụ ga-ekwu okwu mbụ ná Nzukọ Ije Ozi kwesịrị ịkpọpụta abụ a ga-eji amalite Nzukọ Ije Ozi ahụ.

N’otu aka ahụkwa, onyeisi oche nke Okwu Ihu Ọha ga-amalite nzukọ ahụ. Ọ ga-eji obi ụtọ nabata ndị nile bịaranụ ma gwa ha ka ha sonye n’ịbụ abụ a ga-eji amalite bụ́ nke onye ga-ekwu Okwu Ihu Ọha ahụ họpụtara. Onyeisi oche Okwu Ihu Ọha ahụ (ma ọ bụkwanụ nwanna nwoke ọzọ ruru eru a gwara banyere ya tupu oge eruo) ga-ekpe ekpere mmeghe. Ọ ga-akpọpụta ọkà okwu ma kwuokwa ihe bụ́ isiokwu Okwu Ihu Ọha ahụ. E kwusịa Okwu Ihu Ọha ahụ, onyeisi oche ga-ekwu okwu ekele dị mkpirikpi maka okwu ahụ e ji zie ihe, ma ọ gaghị abịa chịkọtawa okwu ọkà okwu ahụ kwuru. Ọ ga-ama ọkwa isiokwu Okwu Ihu Ọha a ga-ekwu n’izu na-esonụ, mgbe ahụzi, ya agwa ndị na-ege ntị ka ha nọrọkwa maka Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche. Ọ dịghị mkpa ka onyeisi oche ahụ jụwa ndị na-ege ntị ma hà ga-achọ izigara ọgbakọ ọkà okwu ahụ si bịa ozi ekele, ma ọ bụrụ na o si n’ọgbakọ ọzọ bịa. E mesịa, onyeisi oche ahụ ga-akpọpụta nwanna ga-eduzi Ụlọ Nche.

Nwanna ga-eduzi Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ga-akpọpụta abụ a ga-eji amalite ọmụmụ ihe ahụ. Ọ ga-eduzi ọmụmụ ihe ahụ otú nzukọ Jehova nyere ntụziaka ka e siri na-eduzi ya, mgbe o duzichara ya, ya ekwuo abụ a ga-eji mechie nzukọ ahụ. Dị ka a na-emekarị, nwanna duziri Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche ga-akpọ nwanna kwuru Okwu Ihu Ọha ka ọ bịa kpee ekpere mmechi.

Ịgbaso ụkpụrụ a ga-enye aka mee ka e jide n’aka na otú e si eduzi nzukọ ọgbakọ anyị bụ otu n’ebe nile.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya