Ịkwadebe Okwu A Ga-agwa Ọgbakọ
A NA-AKWADEBE usoro ihe omume nke Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke ka ọ baara ọgbakọ dum uru. A na-enyekwa ihe ọmụma bara uru ná nzukọ ọgbakọ ndị ọzọ nakwa ná mgbakọ dị iche iche. Ọ bụrụ na e kenyere gị ihe omume n’otu n’ime usoro ihe omume ndị a, e nyewo gị nnukwute ibu ọrụ. Pọl onyeozi gbara Timoti, bụ́ Onye Kraịst bụ́ onye nlekọta ume ka ọ na-elezi ozizi ya anya mgbe nile. (1 Tim. 4:16) Ndị bịara nnọkọ dị iche iche nke Ndị Kraịst ewepụtawo oge bara uru—ụfọdụ etinyewokwa mgbalị dị ukwuu—iji bịa maka ntụziaka n’ihe ndị metụtara mmekọrịta ha na Chineke. Inye ntụziaka dị otú ahụ bụ oké ihe ùgwù! Olee otú ị pụrụ isi mezie ya emezi n’ezie?
Isi Ihe Ndị Sitere n’Ọgụgụ Bible
Akụkụ a nke ụlọ akwụkwọ na-adabere n’ọgụgụ Bible e kenyere maka izu ahụ. E kwesịrị imesi otú ihe ọgụgụ ahụ si emetụta anyị taa ike. Dị ka a kọrọ na Nehemaịa 8:8, Ezra na ndị ibe ya gụpụtara Okwu Chineke n’ihu ọha, kọwaa ya, ‘mee ka a mata isi ya,’ meekwa ka a ghọta ya. Gị iwepụta isi ihe ndị sitere n’ọgụgụ Bible na-enye gị ohere imekwa otú ahụ.
Olee otú i kwesịrị isi kwadebe ihe omume dị otú ahụ? Ọ bụrụ na o kwe mee, gụọ ebe ahụ e kenyere gị na Bible otu izu ma ọ bụ karị tupu oge eruo. Mgbe ahụ chee echiche banyere ọgbakọ gị na mkpa ndị o nwere. Kpee ekpere banyere ya. Ndụmọdụ dị aṅaa, ihe nlereanya ndị dị aṅaa, ụkpụrụ ndị dị aṅaa ndị dị n’ebe a n’Okwu Chineke ga-egbo mkpa ndị ahụ?
Ime nnyocha dị oké mkpa. Watchtower Library nke dị na CD-ROM ma ọ bụ Watch Tower Publications Index, ọ̀ dị n’asụsụ gị? Ọ bụrụ otú ahụ, jiri ha mee ihe n’ụzọ bara uru. Site n’ime nnyocha n’ihe e bipụtaworo banyere amaokwu ndị ị họọrọ ilekwasị anya, ị pụrụ inweta ihe ọmụma ndị na-eme ka a ghọtakwuo ọnọdụ ndị gbara ha gburugburu, nkọwa nke mmezu amụma dị iche iche, ntụle nke ihe amaokwu ụfọdụ na-ekpughe banyere Jehova, ma ọ bụ ntụle nke ụkpụrụ dị iche iche. Anwala iwepụta ọtụtụ isi ihe gabiga ókè. Lekwasị anya nanị n’amaokwu ole na ole ị họọrọ. Ọ ka mma ịtụle amaokwu ole na ole ma tụlee ha nke ọma.
Ihe omume gị pụkwara ịchọ ka ị gwa ndị na-ege ntị ka ha kwuo otú ha siworo rite uru n’ọgụgụ Bible dịịrị izu. Gịnị ka ha chọpụtara nke ga-enyere ha aka n’ọmụmụ ihe onwe onye na nke ezinụlọ ha ma ọ bụ n’ozi ha ma ọ bụ n’ụzọ ndụ ha? Olee àgwà Jehova ndị e mere ka ha pụta ìhè n’otú o si mesoo ndị mmadụ na mba dị iche iche? Gịnị ka ndị na-ege ntị mụtara bụ́ nke wusiri okwukwe ha ike ma mee ka ha nwee ekele n’ebe Jehova nọ? Egbula oge n’ịtụchasịwa ihe ndị dị mgbagwoju anya. Mee ka ihe isi ihe ndị ị họọrọ pụtara nakwa abamuru ha pụta ìhè.
Okwu Izi Ihe
Nke a na-adabere n’ihe e bipụtara ebipụta, dị ka isiokwu dị n’Ụlọ Nche ma ọ bụ Teta! ma ọ bụ ikekwe site n’otu ebe n’akwụkwọ. N’ọnọdụ ka ukwuu, a na-enwe ihe ọmụma karịrị oge e kenyere. Olee otú i kwesịrị isi mee ihe omume ahụ? Ọ bụ dị ka onye ozizi, ọ bụghị nanị dị ka onye na-ekwuzu ihe ndị dị n’ihe omume ya. Onye nlekọta aghaghị ịbụ “onye ruru eru izi ihe.”—1 Tim. 3:2.
Malite nkwadebe gị site n’ịmụ ihe omume e kenyere gị. Chọta akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị na ya. Tụgharịa uche. Gbalịa ime nke ahụ n’ezi oge tupu ụbọchị ị ga-ekwu okwu gị. Cheta na a na-agba ụmụnna ume ka ha buru ụzọ gụọ ihe e biri ebi bụ́ ebe okwu ahụ dabeere. Ihe omume gị abụghị nanị ịtụleghachi ya ma ọ bụ ịchịkọta ya kama igosi ụzọ a pụrụ isi tinye ya n’ọrụ. Jiri akụkụ ndị kwesịrị ekwesị n’ihe omume ahụ mee ihe n’ụzọ ga-abara ọgbakọ uru n’ezie.
Dị nnọọ ka nwatakịrị ọ bụla nwere àgwà nke ya, ọgbakọ ọ bụla nwekwara àgwà ndị doro ya iche. Nne ma ọ bụ nna nke na-ezi ihe n’ụzọ dị irè adịghị nanị agụrụ nwa ya ụkpụrụ omume dị ka egwú. Ọ na-eso nwatakịrị ahụ atụgharị uche. Ọ na-eburu n’uche ụdị onye nwatakịrị ahụ bụ nakwa nsogbu ndị nwatakịrị ahụ na-agbaso mgba. N’otu ụzọ ahụ, ndị na-ezi ihe n’ọgbakọ na-anwa ịghọta mkpa nke ìgwè ndị ha na-agwa okwu nwere. Otú ọ dị, onye ozizi nke nwere nghọta ga-ezere ime ihe atụ ndị pụrụ imenye onye so ná ndị na-ege ntị ihere. Ọ ga-egosipụta uru a malitewororị inweta n’ihi ịga ije n’ụzọ Jehova, ọ ga-akọwapụtakwa ndụmọdụ sitere n’Akwụkwọ Nsọ bụ́ nke ga-enyere ọgbakọ ahụ aka imeri nsogbu ndị ha na-eche ihu.
Izi ihe dị mma na-emetụ ndị na-ege ntị n’obi. Nke a na-achọ ọ bụghị nanị ikwu ihe ndị bụ́ eziokwu kamakwa ime ka e nwee mmasị n’ihe ha pụtara. Nke a na-achọ inwe ezi nchegbu maka ndị a na-ezi ihe. Ndị ọzụzụ atụrụ ime mmụọ kwesịrị ịmara ìgwè atụrụ ahụ. Ọ bụrụ na ha ejiri ịhụnanya na-echeta nsogbu mmadụ dị iche iche na-eche ihu, ha ga-enwe ike ikwu okwu n’ụzọ na-agba ume, na-egosi nghọta, ọmịiko, na mmetụta.
Dị ka ndị ozizi dị irè maara, okwu aghaghị inwe ebumnobi doro anya. E kwesịrị ime ihe omume n’ụzọ ga-eme ka ihe ndị bụ́ isi ihe pụta ìhè ma bụrụ ndị a ga-echeta. Ndị na-ege ntị kwesịrị inwe ike icheta ihe bara uru bụ́ ndị ga-emetụta ndụ ha.
Nzukọ Ije Ozi
Mgbe ị na-ekwu okwu nke dabeere n’isiokwu dị n’Ozi Alaeze Anyị, ihe ịma aka ya pụrụ ịdịtụ iche. N’ebe a ị ga-achọpụta na a na-achọkarị ka ị gwa ndị na-ege ntị ihe nile e depụtara, ọ bụghị ịhọrọ ihe kasị kwesị ekwesị. Nyere ndị na-ege ntị aka ịtụgharị uche n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị bụ́ ebe ndabere maka ndụmọdụ ọ bụla a na-enye. (Taị. 1:9) Oge na-adị obere, ọtụtụ mgbekwa, ọ dịghị enye ohere ka e webata ihe ọmụma ndị ọzọ.
N’aka nke ọzọ, a pụrụ ikenye gị ime ihe omume nke na-enweghị isiokwu ọ dabeere na ya n’Ozi Alaeze Anyị. E nwere ike izo aka n’isiokwu dị n’Ụlọ Nche, ma ọ bụ ihe omume ahụ pụrụ ịbụ ihe ole na ole e deturu ná mkpirikpi. Ọ dịịrị gị dị ka onye ozizi ịtụle ihe ndị bụ́ mkpa ọgbakọ dị ka o si metụta ihe omume ahụ e kenyere gị. Ọ pụrụ ịdị gị mkpa iji ihe atụ doro anya ma dị mkpirikpi mee ihe, ma ọ bụ ịkọ ahụmahụ dabara adaba. Cheta na ihe omume gị abụghị nanị ikwu okwu n’isiokwu ahụ kama ikwu ya n’ụzọ ọ ga-enyere ọgbakọ aka ịrụzu ọrụ ahụ Okwu Chineke kwupụtara nakwa inweta ọṅụ n’ime otú ahụ.—Ọrụ 20:20, 21.
Ka ị na-akwadebe ihe omume gị, chee echiche banyere ọnọdụ dị iche iche nke ndị nọ n’ọgbakọ. Jaa ha mma maka ihe ndị ha malitewororị ime. Olee otú ha iji aro ndị a tụrụ n’ebe ihe omume e kenyere sitere mee ihe pụrụ isi mụbaa ịdị irè ha nakwa ọṅụ ha na-enwe n’ozi?
Ihe omume gị ọ̀ chọrọ ihe ngosi ma ọ bụ ajụjụ ọnụ? Ọ bụrụ otú ahụ, e kwesịrị ime atụmatụ ya tupu oge eruo. Ọ pụrụ ịdị gị nnọọ ka ọ bụ gị gwa onye ọzọ ka o mee ndokwa maka ya, ma nke ahụ adịghị arụpụta ihe kasị mma mgbe nile. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwetụ mee, mụgharịa ihe ngosi ma ọ bụ ajụjụ ọnụ ahụ tupu ụbọchị nzukọ eruo. Jide n’aka na e mere akụkụ a nke ihe omume gị n’ụzọ ga-eme n’ezie ka ihe a na-ezi ka mma.
Mgbakọ Dị Iche Iche
Ka oge na-aga, a pụrụ ịgwa ụmụnna nwoke ndị na-azụlite ezi àgwà ime mmụọ na ndị ghọrọ ndị ọkà okwu ihu ọha na ndị ozizi dị irè ka ha kere òkè n’usoro ihe omume ná mgbakọ dị iche iche. Ha bụ n’ezie oge pụrụ iche maka izi ihe n’ụzọ ọchịchị Chineke. Ihe omume dị otú ahụ pụrụ ịbịa n’ụdị okwu a na-agụ agụ, ihe ndepụta, ntụziaka maka ihe nkiri dabeere na Bible nke ihe ndị na-eme n’oge a, ma ọ bụ ntụziaka nke dị n’otu paragraf. Ọ bụrụ na i nwere ihe ùgwù nke iso n’usoro ihe omume dị otú ahụ, jiri nlezianya mụọ ihe omume e nyere gị. Mụọ ya ruo mgbe ị ghọtara abamuru ya.
Ndị e kenyere okwu a na-agụ agụ kwesịrị ịgụpụta ihe omume ahụ dị ka e si dee ya. Ha adịghị agbanwe okwu e dere ma ọ bụ hazigharịa ya. Ha na-amụ ya iji ghọta nke ọma ihe ndị bụ́ isi ihe na otú a ga-esi ewepụta ha. Ha na-amụgharị ịgụpụta ya agụpụta ruo mgbe ha nwere ike iji imesi echiche okwu ike kwesịrị ekwesị, ịnụ ọkụ n’obi, ikpo ọkụ, mmetụta, imesi okwu ike na nkwenye siri ike mee ihe omume ahụ, tinyere ụda olu na ume kwesịrị ekwesị maka ndị na-ege ntị buru ibu.
Ụmụnna ndị e kenyere okwu nwere ihe ndepụta nwere ibu ọrụ nke ịkọwapụta ihe omume ha n’ụzọ kwekọrọ nke ọma n’ihe ndepụta ha. Kama ịgụpụtawa ihe dị n’ihe ndepụta ahụ mgbe ọ na-ekwu okwu ya ma ọ bụ ịkwadebe ya n’ụdị okwu a na-agụ agụ, ọkà okwu kwesịrị ikwu okwu ahụ dị ka ọ bụ okwu nke aka ya, site n’obi ya. Ọ dị mkpa ịgbasochi oge e dere n’ihe ndepụta ahụ anya iji kọwapụta isi ihe nke ọ bụla e wepụtara n’ụzọ doro anya. Ọkà okwu kwesịrị iji echiche na akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị e depụtara n’okpuru ihe ndị bụ́ isi ihe mee ihe nke ọma. O kwesịghị ịhapụ ihe ndị dị n’ihe ndepụta ahụ ma webata isi ihe ndị ọzọ masịrị ya. Otú ọ dị, ihe ahụ a na-ezi kwesịrị ịdabere n’Okwu Chineke. Ibu ọrụ dịịrị Ndị Kraịst bụ́ okenye bụ ‘ikwusa okwu ahụ.’ (2 Tim. 4:1, 2) Ya mere onye ọkà okwu kwesịrị ichemi echiche echemi banyere akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị dị n’ihe ndepụta—na-ekwu okwu na ha ma na-akọwa ha.
Anọla Na-eyigharị Ya
Ị̀ na-eje ozi n’ọgbakọ ebe a na-enwe ọtụtụ ohere ikwu okwu? Olee otú ị pụrụ isi mezie ha nile emezi? Zere ịkwadebe ihe omume gị mgbe oge na-adịkwaghị.
Okwu ọgbakọ na-erite uru na ha n’ezie na-achọ ka e buru ụzọ chebara ha echiche nke ọma. Ya mere, mee ka ọ mara gị ahụ́ ịgụ ebe ihe omume gị sitere ozugbo e nyere gị ihe omume ọ bụla. Nke a ga-enyere gị aka ịtụgharị uche na ya ka ị nọ na-eme ihe ndị ọzọ. N’ime ụbọchị ma ọ bụ izu ụfọdụ tupu i kwuo okwu gị, ị pụrụ ịnụ okwu ndị pụrụ inyere gị aka ịhụ ụzọ kasị mma ị ga-esi jiri ihe ọmụma ahụ mee ihe. A pụrụ inwe ọnọdụ ndị na-egosi na ọ bịara n’ezi oge. Ịgụ na iche echiche banyere ihe omume gị ozugbo ị natara ya na-ewe oge, ma nke a bụ oge e ji mee ihe bara uru. N’ikpeazụ, mgbe ị nọdụrụ ala ịkwadebe ihe ndepụta ahụ, ị ga-erite uru n’ihi na i chebaworo ya echiche tupu oge eruo. Isi otú a na-eme ihe omume ga-ebelata nrụgide n’ụzọ dị ukwuu, ọ ga-enyekwara gị aka ime ihe omume n’ụzọ dị irè, nke na-erukwa n’obi ndị nọ n’ọgbakọ.
Ruo n’ókè i ji onyinye e nyefeworo gị n’aka kpọrọ ihe n’ihe metụtara usoro izi ihe nke Jehova nwere maka ndị ya, ị ga na-enye ya nsọpụrụ ma bụrụ ngọzi nye ndị hụrụ ya n’anya.—Aịsa. 54:13; Rom 12:6-8.