Ịkwadebe Ihe Ndepụta
MGBE e kenyere ha ikwu okwu, ọtụtụ na-adọgbu onwe ha n’ọrụ idepụta ya edepụta, malite n’okwu mmeghe ruo n’okwu mmechi. Tupu e dechaa okwu ahụ, a pụrụ ịkwadebeworị ọtụtụ ihe ndepụta. Ime nke a pụrụ iwe ọtụtụ awa.
Ọ̀ bụ otú ahụ ka i si akwadebe okwu gị? Ị̀ ga-achọ ịmụta ụzọ ka mfe? Ọ bụrụ na ị mụta ụzọ e si akwadebe ihe ndepụta, ọ gakwaghị adị gị mkpa idepụta ihe nile edepụta. Nke a ga-enyekwu gị ohere ịmụgharị otú ị ga-esi kwuo okwu gị. Ọ bụghị nanị na okwu gị ga-adị mfe ikwu karị kama ọ ga-atọkwu ụtọ igere egere, na-akpalikwa ndị na-ege gị ntị karị.
N’ezie, a na-enye ihe ndepụta nke nwere nanị ihe ndị bụ́ isi na ya maka okwu ihu ọha ndị a na-ekwu n’ọgbakọ. Otú ọ dị, ọ dịghị otú ahụ n’ihe ka ọtụtụ n’okwu ndị ọzọ. Ọ pụrụ ịbụ nanị isi ihe ma ọ bụ isiokwu ka a ga-ekenye gị. Ma ọ bụ a pụrụ ịgwa gị ka i kwuo okwu n’otu ihe ọmụma e bipụtara ebipụta. Mgbe ụfọdụ, ọ pụrụ ịbụ nanị ntụziaka ole na ole ka a ga-enye gị. N’ihe omume nile dị otú ahụ, ọ dị mkpa ka ị kwadebe ihe ndepụta nke gị.
Ihe atụ dị na peeji nke 41 ga-eme ka ị ghọta ụzọ a pụrụ isi hazie ihe ndepụta dị mkpirikpi. Rịba ama na nke ọ bụla n’ime okwu ndị bụ́ isi malitere n’ahịrị aka ekpe, e dekwara ha ná mkpụrụ akwụkwọ ukwu. N’okpuru okwu bụ́ isi nke ọ bụla, e depụtara echiche ndị na-akwado ya. E depụtara isi ihe ndị ọzọ a ga-eji kọwapụta echiche ndị ahụ n’okpuru ha, e webatụkwuru ha ime n’aka ekpe. Leruo ihe ndepụta a anya nke ọma. Rịba ama na e nwere njikọ dị kpọmkwem n’agbata ihe abụọ ahụ bụ́ isi ihe na isiokwu ya. Ị ga-achọpụtakwa na okwu ndị na-esote isi ihe ndị ahụ abụghị nanị ihe ndị na-adọrọ mmasị. Kama, nke ọ bụla na-akwado okwu bụ́ isi ọ dị n’okpuru ya.
Mgbe ị na-akwadebe ihe ndepụta, o nwere ike ọ gaghị adị ka nke ahụ kpọmkwem. Ma ọ bụrụ na ị ghọta ụkpụrụ ndị dị na ya, ha ga-enyere gị aka ịhazi ihe ị ga-eji mee ihe omume gị ma kwadebe okwu dị mma n’ime oge kwesịrị ekwesị. Olee otú ị ga-esi malite?
Tụlee, Họrọ, Ma Hazie
I kwesịrị inwe isiokwu. Isiokwu gị agaghị abụ nke a na-akapịghị ọnụ nke ga-abụ nanị otu mkpụrụ okwu. Ọ bụ echiche bụ́ isi ị chọrọ iwepụta, ọ na-egosikwa akụkụ ị na-eme atụmatụ ịtụle n’isiokwu gị. Ọ bụrụ na e kenyere gị isiokwu, tụlee okwu ndị bụ́ isi na ya nke ọma. Ọ bụrụ na ị ga-esi n’ihe e bipụtara ebipụta kwuo okwu n’isiokwu ahụ e kenyere gị, buru isiokwu ahụ n’uche ka ị na-amụ ihe omume ahụ. Ọ bụrụ na ọ bụ nanị isi ihe ị ga-ekwu okwu na ya ka e kenyere gị, ọ bụzi gị ka ọ dị n’aka ịhọrọ isiokwu. Otú ọ dị, tupu i mee nke ahụ, ị pụrụ ịhụ na imetụ nnyocha ga-enyere gị aka. Site n’ịdị njikere ịnabata echiche ọhụrụ, ọtụtụ mgbe ị ga-enweta echiche ọhụrụ.
Ka ị na-agbaso nzọụkwụ ndị a, nọgide na-ajụ onwe gị, sị: ‘Gịnị mere ihe ọmụma a ji dị ndị ga-ege m ntị mkpa? Gịnị bụ ebumnobi m?’ O kwesịghị ịbụ nanị ikwucha ihe nile e dere ede ma ọ bụ ikwu okwu dị oké ụtọ, kama ọ bụ ikwu ihe ga-abara ndị na-ege gị ntị uru. Mgbe ị matara ihe bụ́ nnọọ ebumnobi gị, dee ya ede. Nọgide na-echetara ya onwe gị ka ị na-eme nkwadebe.
Mgbe ị mataworo ihe bụ́ ebumnobi gị ma họrọ isiokwu kwekọrọ na ya (ma ọ bụ tụlee otú isiokwu e kenyere gị si kwekọọ n’ebumnobi gị), ị pụrụ ime nnyocha a kapịrị ọnụ karị. Chọọ ihe ọmụma nwere uru ọ ga-abara ndị na-ege gị ntị. Achọla nanị ihe ndị a na-akapịghị ọnụ, kama chọọ isi ihe ndị a kapịrị ọnụ bụ́ ndị na-ezi ihe ma na-enye aka n’ezie. Jiri ezi uche mara otú nnyocha ị na-eme ga-aha. Dị ka ọ na-adịkarị, n’oge na-adịghị anya ị ga-enweta ihe ọmụma gafere ihe ị pụrụ iji mee ihe, ya mere ọ ga-adị gị mkpa ime nhọrọ.
Mata isi ihe ndị ọ ga-adị mkpa ka ị tụlee iji kọwapụta isiokwu gị ma mezuo ebumnobi gị. Ha ga-aghọrọ gị ihe mgbakwasị ụkwụ, ihe ndepụta gị bụ́ isi. Okwu bụ́ isi ole ka o kwesịrị inwe? Ikekwe abụọ ezuwo maka okwu dị mkpirikpi, ise na-ezukarịkwa maka ọbụna okwu a ga-ekwu otu awa. Ọ bụrụ na isi ihe adịkwuo ole na ole, o yiri ka ndị na-ege gị ntị hà ga-aka cheta ha.
Ozugbo i buuru isiokwu gị na ihe ndị bụ́ isi ihe n’obi, hazie ihe ndị i metara ná nnyocha. Kpebie ihe ndị metụtara kpọmkwem ihe ndị i ji mere isi ihe. Họrọ ụmụ irighiri ihe ndị ga-eme ka ihe omume gị dị ọhụrụ. Mgbe ị na-ahọrọ akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ị ga-eji kwadoo isi ihe ndị ahụ, rịba ama echiche ndị ga-enyere gị aka ikwu okwu n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ahụ n’ụzọ a ga-aghọta ha. Debe ihe nke ọ bụla n’okpuru isi ihe o so na ya. Ọ bụrụ na ụfọdụ n’ime ihe ọmụma ahụ adabaghị na nke ọ bụla n’ime ihe ndị bụ́ isi ihe gị, wepụ ya—ọ bụrụgodị na ọ na-akpali mmasị—ma ọ bụ tinye ya na faịlụ maka iji ya eme ihe mgbe ọzọ. Hapụ nanị ihe ọmụma ndị kasị mma. Ọ bụrụ na ị nwaa ikwu ọtụtụ ihe, ọ ga-eme ka ị gbaa oké ọsọ n’okwu gị, ihe ị ga-ekwu agaghịkwa abami abami. Ọ ka mma ikwu isi ihe ole na ole ga-abara ndị ga-ege gị ntị uru n’ezie ma kwuo ha nke ọma. Erila oge.
Ugbu a, ma ọ bụrụ na i mebeghị ya, hazie ihe omume gị n’usoro n’usoro. Luk onye so dee Oziọma ahụ mere nke a. Ka ọ chikọtasịrị ihe ọmụma bara ụba metụtara isiokwu ya, ọ haziri ha “n’usoro n’usoro.” (Luk 1:3) Ị pụrụ ihazi ihe ọmụma gị n’usoro oge ha ji mee ma ọ bụ n’isiokwu n’isiokwu, o kwe mee n’usoro ihe kpatara ihe na ihe ọ kpatara ma ọ bụ n’usoro nsogbu na ngwọta ya, na-adabere n’ụzọ kasị dị irè nke isi mezuo ebumnobi gị. I kwesịghị isi n’otu echiche maba n’echiche ọzọ. Ndị na-ege gị ntị kwesịrị ịbụ ndị e si n’otu echiche duru gaa n’ọzọ n’ụzọ dị mfe, n’amafereghị ihe ọ bụla nke ga-eme ka o sie ike ijikọta otu echiche na ibe ya. Ihe àmà i nyere kwesịrị iduga ndị na-ege ntị ná nkwubi okwu ezi uche dị na ya. Ka ị na-ahazi isi ihe ndị dị n’okwu gị, chee echiche otú ikwu ha ekwu ga-ada ná ntị ndị ga-ege gị ntị. Ọ̀ ga-adịrị ha mfe ịgbaso ụzọ i si eche echiche? Hà ga-abụ ndị a kpaliri ime ihe ha na-anụ, n’ikwekọ n’ebumnobi gị?
Mgbe nke ahụ gasịrị, kwadebe okwu mmeghe nke na-akpali mmasị n’isiokwu gị, nke na-egosikwa ndị na-ege gị ntị na ihe ị na-aga ikwu ga-abara ha uru n’ezie. Idepụta ahịrịokwu ndị mbụ ị ga-ekwu pụrụ inyere gị aka. N’ikpeazụ, mee atụmatụ maka okwu mmechi na-akpali akpali nke kwekọrọ n’ebumnobi gị.
Ọ bụrụ na ị kwadebe ihe ndepụta gị n’ezi oge, ị ga-enwe oge ime ka ọ ka mma tupu i kwuo okwu ahụ. Ị pụrụ ịhụ mkpa ọ dị iji ndekọ ọnụ ọgụgụ, ihe atụ, ma ọ bụ ahụmahụ kwadoo echiche ụfọdụ. Iji otu okwu a kpụ n’ọnụ ma ọ bụ ihe mere n’ógbè unu mee ihe pụrụ inyere ndị na-ege gị ntị aka ịhụ ngwa ngwa karị uru ihe omume ahụ bara. Ka ị na-atụleghachi okwu gị, ị pụrụ ịhụ ohere ndị ọzọ ị ga-eji mee ka ihe ọmụma ahụ metụta ndị ga-ege gị ntị. Usoro inyocha ihe na ime ka ihe ka mma dị mkpa iji hazie ihe omume dị mma ka ọ bụrụ okwu dị irè.
Ọ pụrụ ịdị ndị ọkà okwu ụfọdụ mkpa idepụta ihe buru ibu karịa ndị ọzọ. Ma ọ bụrụ na ị hazie ihe omume gị n’okpuru isi ihe ole na ole nanị, wepụsịa ihe ndị na-adịghị akwadocha ha, deekwa echiche gị edee n’usoro n’usoro, ị ga-achọpụta na mgbe i nwetakwuru ahụmahụ, ọ gakwaghị adị gị mkpa idepụtacha ihe nile. Lee ihe na-eme ka a ghara igbu oge nke ahụ bụ! Okwu gị ga-aka mma. Ọ ga-apụta ìhè na ị na-erite uru n’ezie site n’ihe ị na-amụta n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.