IHE ỌMỤMỤ NKE 37
E Mere Ka Ihe Ndị Bụ́ Isi Ihe Pụta Ìhè
OLEE ihe ndị na-abụ isi ihe n’okwu? Ọ bụghị nanị akụkụ ndị dị ụtọ, ndị e hotara ná mkpirikpi mgbe a na-ekwu okwu. Ha bụ echiche ndị dị mkpa ndị a kọwapụtara n’ụzọ sara mbara. Ha bụ echiche ndị dị oké mkpa iji mezuo ebumnobi gị.
Otu ihe dị mkpa iji mee ka ihe ndị bụ́ isi ihe pụta ìhè bụ gị iji amamihe họrọ ma hazie ihe ndị ị ga-ekwu. Ime nnyocha mgbe a na-akwadebe okwu na-emekarị ka e nweta ihe ọmụma karịa otú a pụrụ iji mee ihe. Olee otú ị pụrụ isi kpebie ndị ị ga-eji mee ihe?
Nke mbụ, chebara ndị ga-ege gị ntị echiche. Hà maara nnọọ ihe banyere isiokwu gị nke ọma ka ọ̀ bụ na ha amakebeghị ihe banyere ya? Ihe ka ukwuu n’ime ha hà kwenyere n’ihe Bible na-ekwu banyere ya, ka ụfọdụ hà na-enwetụ obi abụọ? Ụdị ihe ịma aka dịgasị aṅaa ka ha na-eche ihu kwa ụbọchị mgbe ha na-agbalị itinye ihe Bible na-ekwu n’isiokwu ahụ n’ọrụ? Nke abụọ, jide n’aka na ebumnobi i ji na-agwa ndị ahụ na-ege ntị okwu n’isiokwu ị na-eme atụmatụ ikwu okwu na ya doro gị anya nke ọma. N’iji ụkpụrụ nduzi abụọ a eme ihe, nyochaa ihe ọmụma ahụ ma were nanị ihe ndị dabara adaba n’ezie.
Ọ bụrụ na e nyere gị ihe ndepụta nke nwere nanị isiokwu na ihe ndị bụ́ isi ihe, i kwesịrị ịrapara na ya. Otú ọ dị, a ga-eme ka ihe ị na-ekwu bakwuo nnọọ uru ma ọ bụrụ na i buru ihe ndị ahụ e kwuru n’elu n’uche mgbe ị na-akọwapụta isi ihe nke ọ bụla. Mgbe a na-enyeghị gị ihe ndepụta, ọ dịịrị gị ịhọrọ isi ihe ndị ị ga-eji mee ihe.
Mgbe ihe ndị i ji mere isi ihe doro gị anya nke ọma, mgbe ị haziwokwara nkọwa ha n’okpuru ha, ikwu okwu ahụ ga-adịrị gị mfe karị. Ma eleghị anya, ndị ga-ege gị ntị ga-eritekwa uru na ya karị.
Ụzọ Dị Iche Iche nke Isi Hazie Ihe Ọmụma Gị. E nwere ọtụtụ ụzọ ị pụrụ isi hazie ụmị okwu gị. Ka ị na-amatakwu ha, ị ga-ahụ na ọtụtụ n’ime ha pụrụ ịdị irè, na-adabere n’ebumnobi gị.
Otu ụzọ nke a pụrụ iji mee ihe n’ụdị okwu dịgasị iche iche bụ ikerisịkwu ya n’isiokwu n’isiokwu. (Isi ihe nke ọ bụla dị mkpa n’ihi na ọ na-eme ka ndị na-ege gị ntị ghọtakwuo isiokwu ahụ ma ọ bụ na-enye aka n’imezu ebumnobi nke okwu gị.) Ụzọ ọzọ bụ ịhazi ya n’usoro oge ihe ji mee. (Dị ka ihe atụ, ihe ndị mere tupu Iju Mmiri ahụ pụrụ ibute ụzọ, ihe ndị mere tupu e bibie Jeruselem na 70 O.A. esochie ya, ihe ndị mere n’oge anyị pụkwara isotezi ya.) Ụzọ nke atọ bụ ikwu ihe kpatara ihe na ihe ọ kpatara. (A pụrụ ibu ụzọ kwuo nke ọ bụla n’ime ha. Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ibu ụzọ kwuo ọnọdụ dị mgbe ahụ, nke bụ́ ihe ọ kpatara, ma kwuzie ihe kpatara ya.) Ụzọ nke anọ na-agụnye ihe ndị megidere ibe ha. (Ị pụrụ iji ihe ọma tụnyere ihe ọjọọ.) Mgbe ụfọdụ a pụrụ iji ihe karịrị otu ụzọ hazie okwu.
na-emetụ n’ahụ́, bụ́ nke e kwuru n’usoro oge ihe ji mee. Ka ị na-agụ ya n’Ọrụ 7:2-53, rịba ama na o leziri anya họrọ isi ihe ndị o ji mee ihe. Stivin bu ụzọ mee ka o doo anya na ya na-akọ akụkọ ndị na-ege ya ntị na-apụghị ịgọ na ha amaghị. Ọ kọwapụtaziri na ọ bụ ezie na ụmụnne Josef jụrụ ya, Chineke ji ya napụta ha. O gosiziri na ndị Juu nupụụrụ Mozis isi, bụ́ onye Chineke ji na-eme ihe. O mechiri site n’imesi ya ike na ndị mere ka e gbuo Jizọs Kraịst gosiri otu mmụọ ahụ ndị Juu dịrị ndụ n’ọgbọ ndị bu ụzọ gosiri.
Ejila Ọtụtụ Isi Ihe Gabigara Ókè Eme Ihe. E nwere nanị ihe ole na ole dị mkpa n’ịkọwapụta isiokwu ọ bụla. N’ihe ka n’ọtụtụ ọnọdụ, ha anaghị agafe isi ihe ise. Nke a bụ eziokwu ma ị̀ ga-ekwu okwu ruo minit 5, minit 10, minit 30, ma ọ bụ karịa. Anwala ime ka ọtụtụ isi ihe gabigara ókè pụta ìhè. Ndị na-ege gị ntị pụrụ ịghọta nanị isi ihe ole na ole dịgasị iche iche n’otu okwu n’ụzọ ezi uche dị na ya. Ọ bụrụkwa na okwu ahụ etoo ogologo karị, a ghaghịkwa imesikwu ihe ndị bụ́ isi ihe dị na ya ike karị ma mee ka ha doo nnọọ anya karị.
N’agbanyeghị isi ihe ole i ji na-eme ihe, jide n’aka na ị kọwapụtara nke ọ bụla otú zuru ezu. Nye ndị na-ege ntị ohere zuru ezu iji nyochaa isi ihe nke ọ bụla ka o wee bamie abamie n’uche ha.
Okwu gị kwesịrị ịdị mfe. Nke a adịghị adabere mgbe nile n’otú ihe ị ga-ekwu hà. Ọ bụrụ na ị hazie echiche ndị dị n’okwu gị n’ìgwè n’ìgwè n’ụzọ doro anya n’okpuru isiokwu ole na ole ma kọwaa ha otu otu, ige ntị n’okwu ahụ ga-adị mfe, ọ ga-esikwa ike ichefu ya.
Mee Ka Ihe Ndị Bụ́ Isi Ihe n’Okwu Gị Pụta Ìhè. Ọ bụrụ na ị haziri ihe ọmụma gị otú kwesịrị ekwesị, ọ gaghị esiri gị ike imesi mkpa ihe ndị bụ́ isi ihe dị ike site n’otú i si ekwu okwu.
Ụzọ bụ́ isi nke isi mee ka isi ihe pụta ìhè bụ iwepụta ihe ndị na-anwapụta ihe, akụkụ Akwụkwọ Nsọ, na ihe ndị ọzọ n’ụzọ ga-eme ka ha dọrọ uche gaa n’echiche ahụ bụ́ isi ma mesikwuo ya ike. Isi ihe nile ndị ka nta kwesịrị ime ka ihe bụ́ isi ihe dokwuo anya, nwapụta ya ma ọ bụ mesikwuo ya ike. Agbakwụnyela ihe ndị na-adịghị mkpa nanị n’ihi na ha dị ụtọ. Ka ị na-akọwapụta isi ihe ndị ka nta, gosi n’ụzọ doro anya ihe jikọrọ ha na isi ihe ahụ ha na-akwado. Ahapụla ya ka ndị na-ege ntị chọpụta ya n’onwe ha. A pụrụ igosi njikọ ahụ site n’ikwughachi okwu ndị gbara ọkpụrụkpụ bụ́ ndị na-ewepụta echiche ahụ bụ́ isi ma ọ bụ site n’ịdị na-ekwughachi echiche bụ́ isi dị n’isi ihe ahụ n’onwe ya site n’oge ruo n’oge.
Ndị ọkà okwu ụfọdụ na-eme ka ihe ndị bụ́ isi ihe pụta ìhè site n’inye ha nọmba. Ọ bụ ezie na nke ahụ bụ otu ụzọ isi mee ka ihe ndị bụ́ isi ihe pụta ìhè, e kwesịghị iji ya dochie iji nlezianya họrọ ihe ọmụma gị nakwa ịkọwapụta ya n’ụzọ ezi uche dị na ya.
I nwere ike ikpebi nanị ibu ụzọ kwuo ihe bụ́ isi ihe dị n’okwu gị tupu i kwuwe ihe ndị na-akwado ya. Nke a ga-enyere ndị na-ege ntị aka ịghọta uru ihe ndị ga-esochi ya bara, ọ ga-emesikwa isi ihe ahụ ike. Ị pụrụ imesi ihe ahụ ike site n’ịchịkọta ya ọnụ mgbe ị kọwapụtasịworo ya n’ụzọ zuru ezu.
N’ozi Ubi. Ụkpụrụ ndị a tụlere n’elu na-emetụta ọ bụghị nanị okwu ndị a na-ekwu n’ihu ọha kamakwa mkparịta ụka ndị ị na-enwe n’ozi ubi. Mgbe ị na-eme nkwadebe, buru n’uche ọnọdụ ọ bụla gbara ọkpụrụkpụ nke dị ndị nọ n’ógbè ahụ n’uche. Họrọ isiokwu nke ga-enye gị ohere igosi otú olileanya Bible na-enye ga-esi dozie ọnọdụ ahụ. Họrọ isi ihe abụọ ma eleghị anya iji kọwapụta isiokwu ahụ. Kpebie akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị ị ga-eji kwadoo isi ihe ndị ahụ. Mgbe ahụ mee ndokwa otú ị ga-esi malite nkwurịta okwu gị. Ụdị nkwadebe dị otú ahụ na-eme ka i nwee ike ime ụdị mgbanwe na-adị mkpa ná mkparịta ụka. Ọ na-enyekwara gị aka ikwu ihe ndị nwe ụlọ ga-echeta.