Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/04 p. 4
  • Otú E Si Eme Nkwusa n’Ógbè Azụmahịa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú E Si Eme Nkwusa n’Ógbè Azụmahịa
  • Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Izi Ozi Ọma n’Ebe Ndị Mmadụ Na-akpa Afọ Ha
    Ozi Alaeze Anyi—2015
  • Kwusaa Ozi Ọma ahụ Ebe Nile
    Ozi Alaeze Anyi—1997
  • Jiri Obi Ike Na-agbara Ndị Mmadụ Àmà n’Ebe Ha Na-anọ Akpa Afọ Ha
    Ozi Alaeze Anyi—2012
  • Ì Nwere Ókèala nke Aka Gị?
    Ozi Alaeze Anyi—2007
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2004
km 7/04 p. 4

Otú E Si Eme Nkwusa n’Ógbè Azụmahịa

1. Olee ụfọdụ uru ndị a na-erite n’ịgba àmà n’ógbè azụmahịa?

1 Ọ̀ ga-amasị gị ime nkwusa n’ókèala ebe ndị mmadụ na-anabatakarị ndị ọbịa na ebe a na-enwetakarị ndị mmadụ n’ụlọ? Ị pụrụ ime nke ahụ kpọmkwem n’ókèala ọgbakọ gị. N’ụzọ dị aṅaa? Ọ bụ site n’ịga n’ógbè azụmahịa ndị dị na ya. Ndị nkwusa bụ́ ndị na-agba àmà site n’ụlọ ahịa ruo n’ụlọ ahịa na-arụpụta ihe ndị dị mma.

2. Olee otú a pụrụ isi hazie maka ịgba àmà n’ógbè azụmahịa?

2 Ụfọdụ ọgbakọ nwere ógbè azụmahịa (gụnyere ọma ahịa) dị ka akụkụ nke ókèala e kenyere ha. Nwanna na-elekọta ókèala pụrụ imepụta kaadị ókèala pụrụ iche nke ógbè ndị a e nwere ọtụtụ ụlọ ahịa na ha. Ọ bụrụ na e nwere kaadị ókèala nke ebe obibi ndị mmadụ na ógbè azụmahịa dịkọtara ọnụ na ya, e kwesịrị igosi n’ụzọ doro anya na a gaghị arụ ógbè azụmahịa ndị ahụ mgbe a na-arụ ókèala ndị mmadụ bi na ha. N’ókèala ndị ọzọ, a pụrụ ịrụkọta ógbè azụmahịa na ebe ndị mmadụ bi. Ọ bụrụ na ị gbatụbeghị àmà n’ógbè azụmahịa, malite ya site n’ime nkwusa n’obere ụlọ ahịa ole na ole.

3. Gịnị ga-enyere anyị aka ịrụpụta ihe mgbe anyị na-agba àmà site n’ụlọ ahịa ruo n’ụlọ ahịa?

3 Jiri Ụzọ Nkwurịta Okwu Dị Mfe Na-eme Ihe: Mgbe ị na-agba àmà site n’ụlọ ahịa ruo n’ụlọ ahịa, ọ dị mkpa ka i jie ejiji otú ị ga-esi eji ma ị gawa nzukọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ọ dịkwa mma ịga mgbe ndị ahịa na-ejughị n’ụlọ ahịa ahụ. Ọ bụrụ na o kwere omume, banye ebe ahụ mgbe ọ na-adịghị onye bịara ịzụ ahịa. Gwa onye nọ na ya na ị chọrọ ịhụ manịja ma ọ bụ onye nwe ụlọ ahịa ahụ. Gbuo okwu gị nkenke ma kapịa okwu ọnụ. Gịnị ka ị pụrụ ikwu?

4-6. Gịnị ka anyị pụrụ ikwu mgbe anyị na-agbara onye na-ere ahịa ma ọ bụ manịja àmà?

4 Mgbe ị na-agwa onye na-ere ahịa ma ọ bụ manịja okwu, ị pụrụ ikwu ihe dị ka nke a: “Ndị ahịa na-eji nnọọ ọrụ n’aka nke na anyị adịghị ahụkebe ha n’ụlọ, n’ihi ya, anyị bịara ka anyị hụ gị n’ụlọ ahịa gị. Magazin anyị na-akọ banyere okwu ndị a kpụ n’ọnụ n’ụwa nile.” Mgbe ahụ, kwuo otu isi ihe dị mkpirikpi sitere n’otu magazin.

5 Ma ọ bụ, ị pụrụ ịnwale ụzọ iche ihe n’ihu a dị mfe: “Ọtụtụ mmadụ ga-enwe mmasị ịmatakwu banyere Bible ma ihe merenụ bụ na ha adịchaghị enwe oge. Traktị a na-akọ banyere usoro ọmụmụ ihe a na-enwe n’efu iji nyere gị aka ịchọta azịza nye ajụjụ gị ndị dabeere na Bible.” Mgbe ahụ, kwuo ihe dị na peeji nke 4-5 nke traktị bụ́ Ị̀ Ga-achọ Ịmatakwu Banyere Bible?

6 Ọ bụrụ na o yiri ka onye ụlọ ahịa ahụ dị n’aka ya ò ji ọrụ n’aka, ị pụrụ nanị inyefe ya traktị ma kwuo, sị: “Aga m abịaghachi mgbe ị na-ejighị nnọọ ọrụ n’aka. Aga m achọ ịma ihe i chere banyere traktị a.”

7. Olee otú anyị pụrụ isi wulite mmasị anyị chọtara n’ógbè azụmahịa?

7 Iwulite Mmasị E Gosipụtara: I nwedịrị ike iduzi ọmụmụ Bible n’ógbè azụmahịa. Otu ọsụ ụzọ pụrụ iche nọ na-ewegara otu onye ọchụnta ego magazin n’esepụghị aka. Mgbe nwoke ahụ kwupụtara ekele o nwere maka ihe ọ na-agụ, onye ọsụ ụzọ ahụ jiiri broshuọ Na-achọ gosi ya otú e si enwe ọmụmụ Bible. A malitere iduziri nwoke ahụ ọmụmụ Bible kpọmkwem n’ụlọ ọrụ ya. N’iburu ọnọdụ ya n’uche, onye ọsụ ụzọ ahụ mere ka ọmụmụ ihe ahụ ghara ịdị na-akarị minit 10 ma ọ bụ 15 n’oge nke ọ bụla. N’otu aka ahụ, ka anyị nọgide na-achọ ndị kwesịrị ekwesị site n’ịdị na-agba àmà n’ógbè azụmahịa.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya