Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Izi Ozi Ọma n’Ebe Ndị Mmadụ Na-akpa Afọ Ha
Ihe Mere O Ji Dị Mkpa: Anyị gaa ozi ọma, anyị anaghị enwetakarị ọtụtụ ndị n’ụlọ n’ihi na ha na-anọ n’ebe ndị ha na-akpa afọ ha. Ka anyị nwee ike izi ha ozi ọma, ọ ga-akacha mma ka anyị gakwuru ha n’ebe ndị ahụ. Ịga ozi ọma n’ụdị ebe ahụ na-atọ ụtọ n’ihi na anyị na-enweta ndị mmadụ. Ha na-anabatakwa anyị n’ihi na ha na-ewere onye ọ bụla bịara na nke ha ka onye wetaara ha ọrụ ma ọ bụkwanụ onye bịara ịgba ha aka ahịa. Ka anyị nwee ike izi ozi ọma n’ebe ndị ahụ, anyị kwesịrị ileru anya mara mgbe ọ ga-adaba ịgwa mmadụ okwu na mgbe ọ na-agaghị adabacha. Anyị kwesịkwara ịna-eji ejiji dị mma. (2 Kọr. 6:3) Anya onye nlekọta ije ozi kwesịrị ịna-eru n’ugboro ole a na-arụ ebe ndị ahụ nakwa ndị na-arụ ha.
Mee Ihe A n’Ọnwa A:
Unu nwewe ofufe ezinụlọ, mụọnụ otú unu nwere ike isi zie ndị mmadụ ozi ọma n’ebe ha na-akpa afọ ha.