Jiri Obi Ike Na-agbara Ndị Mmadụ Àmà n’Ebe Ha Na-anọ Akpa Afọ Ha
1. Gịnị mere anyị ekwesịghị ịda mbà ma ọ bụrụ na ịga ebe ndị mmadụ na-anọ akpa afọ ha zie ha ozi ọma na-ara anyị ahụ́?
1 Ọ̀ na-ara gị ahụ́ ịga n’ebe ndị mmadụ na-anọ akpa afọ ha zie ha ozi ọma? Ọ bụrụ na ọ na-ara gị ahụ, adala mbà. Ọ bụghị naanị gị ka ụdị ihe a na-eme. O nwedịrị mgbe Pọl onyeozi ‘gbasiri mgba ike’ izi ndị mmadụ ozi ọma n’agbanyeghị na ọ naghị atụ ndị mmadụ ụjọ. (1 Tesa. 2:2) Ihe ndị anyị ga-ekwu ugbu a bụ ụfọdụ n’ime ihe ndị nwere ike ime ka ọ na-esiri gị ike ịga ozi ọma n’ụdị ebe ahụ. Anyị ga-ekwukwa ihe ndị ị ga-eme ka ọ ghara ịna-ara gị ahụ́.
2. Gịnị mere anyị ekwesịghị iche na ndị anyị gara izi ozi ọma ga-ewere ya na anyị bịara inye ha nsogbu?
2 Hà Ga-ewere Ozi Ọma M Bịara Izi Ha Ka Inye Ha Nsogbu? Ndị na-ere ahịa na ndị na-arụrụ ọhaneze ọrụ ma na ndị mmadụ ga na-abịakwute ha mgbe ọ bụla. Ha na-abụkarị ndị ire ọma n’ihi na ha amaghị onye bụ́ onye. Ọ bụrụ na i jie ejiji dị mma ma gwa ha okwu ọma mgbe ị bịakwutere ha, ha nwere ike ige gị ntị.
3. Gịnị ka anyị ga-eme ka ọbịbịa anyị bịara ghara iwe ndị ahịa ma ọ bụ ndị na-arụ ọrụ iwe?
3 M̀ Kwesịrị Izi Mmadụ Ozi Ọma Mgbe Ya na Ndị Ahịa Ya ma Ọ Bụ Ndị Ọ Na-arụrụ Ọrụ Nọ? O kwe mee, gakwuru ndị mmadụ mgbe ebe ha na-ere ahịa ma ọ bụ ụlọ ọrụ ha na-anaghị ekwo ekwo, o nwere ike bụrụ mgbe ha ka na-emepe emepe. Gakwuru onye na-arụ ebe ahụ mgbe naanị ya nọ. Ekwukwala ogologo okwu.
4. Olee ihe anyị nwere ike ikwu ma anyị gaa izi ndị nọ n’ebe ha na-anọ akpa afọ ha ozi ọma?
4 Gịnị Ka M Kwesịrị Ikwu? Ọ bụrụ na ọtụtụ mmadụ nọ ebe ahụ, gakwuru onye na-elekọta ebe ahụ. I nwere ike sị ya: “Ọ naghị adị mfe inweta unu n’ụlọ, ọ bụ ya mere anyị ji chọrọ unu bịa ebe a. Ebe ọ bụ na i ji ọrụ n’aka, m ga-egbu okwu m nkenke.” Ọ bụrụ na ha ajụghị gị otú e nwere ike isi jiri ego kwado ozi anyị, ọ ga-aka mma ka ị ghara ịgwa ha ka ha nye onyinye, ka ọ ghara ịdị ka ọ̀ bụ ahịa ka ị bịara ire. I zichaa onye na-elekọta ebe ahụ ozi ọma, i nwere ike gwa ya na ị chọrọ iji nkeji ole na ole gwatụ ndị ọzọ nọ ebe ahụ okwu. Gwa ha ihe ahụ ị gwara nna ha ukwu. Ọ bụrụ na onye ị chọrọ izi ozi ọma ji ọrụ n’aka, gbuo okwu gị nkenke ma nye ya traktị. Ọ bụrụ na o nweghị onye n’ime ha nwere efe, i nwere ike hapụrụ ha akwụkwọ anyị n’ebe ha ga-ewere ya ma ha mechaa.
5. Olee ihe ndị mere anyị ji kwesị iji obi ike na-aga ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọ akpa afọ ha?
5 Jizọs na Pọl ji obi ike zie ndị nọ ebe ha na-akpa afọ ha ozi ọma. Gịnwa ga-emelikwa ya. (Mat. 4:18-21; 9:9; Ọrụ 17:17) Rịọ Jehova ka o nyere gị aka ịkata obi. (Ọrụ 4:29) Ị gaa ozi ọma n’ebe ndị mmadụ na-anọ akpa afọ ha, ị ga-enweta ọtụtụ ndị ga-ege gị ntị.