Ụzọ Ọhụrụ E Si Ekwusa Ozi Ọma
1. Olee ihe ndị ozi Jizọs mere n’oge ochie nke anyị nwere ike ịmụta ihe na ya?
1 Ọ bụghị naanị n’ụlọ n’ụlọ ka ndị ozi Jizọs n’oge ochie kwusara ozi ọma. Ha kwusakwara ozi ọma n’ebe ndị ọzọ. (Ọrụ 20:20) Dị ka ihe atụ, ha gara kwusaa ozi ọma n’ụlọ nsọ n’ihi na ha ma na ha ga-ahụ ọtụtụ ndị n’ebe ahụ. (Ọrụ 5:42) Mgbe Pọl onyeozi nọ n’Atens, ọ na-aga ezi ndị nọ n’ọma ahịa ozi ọma kwa ụbọchị. (Ọrụ 17:17) Anyị na-ekwusa ozi ọma n’ebe a na-aba ụgbọala, n’ọma ahịa, n’ebe na-ekwo ekwo nakwa n’ebe ọ bụla ndị mmadụ na-anọkarị. Ma, ozi ọma ụlọ n’ụlọ ka bụ ụzọ bụ́ isi anyị si ekwusa ozi ọma. A na-agba ndị nkwusa niile ume ka ha na-ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ebe ọ bụla ha hụrụ ha. Ma, e nwere ụzọ ọhụrụ abụọ ọtụtụ ndị nkwusa ga-esikwa na-ekwusa ozi ọma.
2. Gịnị ka e mere n’ọnwa Nọvemba afọ 2011 na Niu Yọk Siti?
2 Ụzọ Pụrụ Iche E Si Ezi Ozi Ọma n’Ebe Na-ekwo Ekwo ná Nnukwu Obodo: Na peeji nke 16 na nke 17 n’Akwụkwọ Mgbaafọ nke 2013, a kọrọ na e nwere ụzọ ọhụrụ e si kwusaa ozi ọma na Niu Yọk Siti n’ọnwa Nọvemba 2011, ka a mara otú ọ ga-adị. Ụfọdụ ụmụnna n’obodo ahụ na-edosacha akwụkwọ anyị na tebụl na n’ihe ndị a na-akwagharị akwagharị. Ha na-edosa akwụkwọ ndị e dere n’asụsụ dị iche iche. Ebe ha na-edosa akwụkwọ ndị ahụ bụ n’ebe na-ekwo ekwo. Ọtụtụ ndị na-agafe ebe ahụ kwa ụbọchị, ma ndị bi n’ebe a na-anaghị ekwe ka ụmụnna anyị banye ma ndị na-anaghị anọkarị n’ụlọ. Ọtụtụ ndị na-akwụsị na-ewere akwụkwọ anyị. Dị ka ihe atụ, n’otu ọnwa, ndị mmadụ weere puku magazin atọ na narị asaa na iri itoolu na asaa nakwa puku akwụkwọ asaa na narị itoolu na iri asatọ na isii. Ọtụtụ ndị kwukwara na ha chọrọ ka a bịa mụwara ha Baịbụl. Ihe e kwo malite ihe a bụ iji mụwara ọtụtụ ndị Baịbụl. N’ihi ya, mgbe ọ bụla mmadụ nyere ha adres ya, ha na-eziga ya n’ọgbakọ na-eje ozi n’ebe onye ahụ bi ka e nwee ike mụwara ya Baịbụl.
3. Olee ebe ndị a chọrọ ka ụmụnna na-edosa akwụkwọ anyị ma ọ bụ na-akwagharị ha ka ndị na-agafe nwee ike inweta ha?
3 Otú a e si malite ikwusa ozi ọma mere ka a mụwara ọtụtụ ndị Baịbụl, n’ihi ya, a chọziri ka ụmụnna ndị bi ná nnukwu obodo si otú a na-ekwusa ozi ọma n’ụwa niile. Ọ bụ alaka ụlọ ọrụ ga na-ekpebi obodo ndị a ga-esi otú a na-ekwusa ozi ọma na ha. Ebe a ga na-aga ụdị ozi a bụ ebe na-ekwo ekwo n’ihi na ọtụtụ ndị na-aba ụgbọala n’ebe ahụ ma ọ bụ na e nwere ọtụtụ ụlọ ọrụ ma ọ bụkwanụ na a rụrụ ọtụtụ ụlọ n’ebe ahụ. Ka oge na-aga, alaka ụlọ ọrụ ga-ahọpụta ọgbakọ ndị ga-esi otú a na-ekwusa ozi ọma, ha ga-agwakwa ha otú ha ga-esi na-eme ya. Ọ bụ ndị ọsụ ụzọ oge niile na ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ka a ga na-ahọpụta ka ha si otú a na-ekwusa ozi ọma. N’ebe ụfọdụ, e nwekwara ike ịgwa ndị ọsụ ụzọ inyeaka ka ha si otú a na-ekwusa ozi ọma.
4. Olee otú e si ekwusa ozi ọma n’ebe na-ekwo ekwo?
4 Otú E Si Eme Ya: Ndị na-ekwusa ozi ọma n’ebe na-ekwo ekwo na-echere ka ndị na-agafe bịa were akwụkwọ ha dosara na tebụl ma ọ bụ n’ihe ha ji akwagharị ha. Ọ bụrụ na mmadụ abịa iwere akwụkwọ, a na-agwa ya ka o were nke ọ bụla masịrị ya. Ndị ọsụ ụzọ ahụ ga-eji Baịbụl zaa ajụjụ ọ bụla onye ahụ jụrụ. Ọ bụrụ na onye ahụ ewere akwụkwọ, a gaghị agwa ya ihe ọ bụla gbasara onyinye. Ma, ọ bụrụ na onye ahụ ajụọ otú anyị si enweta ego anyị ji arụ ọrụ, a ga-akọwara ya na ọ bụ onyinye ndị mmadụ nyere ka e ji akwado ya. E nwekwara ike ịgwa ya na ọ bụrụ na ọ chọrọ inye onyinye, o nwere ike iziga ya n’otu n’ime adres ndị e dere n’akwụkwọ ahụ o weere. Ọ bụrụ na ohere dị, ha ga-ajụ onye weere akwụkwọ anyị ma ọ̀ ga-achọ ka Onyeàmà Jehova bịa na nke ya ma ọ bụ ha ajụọ ya ma ọ̀ ma na anyị na-amụrụ ndị weere akwụkwọ anyị Baịbụl na-anaghị ha ego.
5. Olee otú obi dị otu nwanna na nwunye ya maka ozi ọma ha na-ekwusa n’ebe na-ekwo ekwo?
5 Ụmụnna ndị sirila otú a kwusaa ozi ọma kwuru na ọtụtụ ndị na-ewere akwụkwọ anyị. Otu nwanna nwoke na nwunye ya dere, sị: “Otú ọtụtụ ndị si agafeta ewere akwụkwọ anyị kwa ụbọchị mere ka anyị ghọtakwuo na ọrụ ụmụnna anyị na-arụ n’ụwa niile iji hụ na ndị mmadụ nụrụ ozi ọma abụghị obere ọrụ. Ka ndị a niile na-agafe, anyị na-echeta na Jehova hụrụ ha n’anya n’otu n’otu. O meekwala ka anyị kpebie na anyị agaghị akwụsị ịna-ekwusa ozi ọma, n’ihi na Jehova na-enyocha obi ha ịmara ndị nke ọ ga-adọta ka ha bịa fewe ya. Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị na ndị mmụọ ozi na-arụkọ ọrụ.”
6. (a) Olee ụzọ ọhụrụ a na-ahazi ka ọtụtụ ọgbakọ si na-ekwusa ozi ọma? Olee otú o si dị iche na nke a na-ahazi ná nnukwu obodo? (b) Olee otú ndị nọ n’ọgbakọ dị iche iche nwere ike isi na-emekọ ihe ọnụ?
6 Otú Ọzọ E Si Ahazi Ụdị Ozi Ọma A: E wezụga ná nnukwu obodo, ọtụtụ ndị okenye na-eme ndokwa maka ụzọ ọhụrụ e nwere ike isi na-ekwusa ozi ọma n’ókèala ha. Ndị nkwusa na-edosa akwụkwọ anyị na tebụl ma ọ bụ n’ihe a na-akwagharị akwagharị n’ebe na-ekwo ekwo n’ókèala ha. Ná nnukwu obodo, ọ bụ alaka ụlọ ọrụ ga-ahọrọ ndị si n’ọgbakọ dị iche iche ka ha si otú a na-ekwusa ozi ọma n’ebe na-ekwo ekwo. Ma, ọ bụ ndị okenye ga-ahazi ụdị ozi ọma a n’obodo na-emepeghị emepe.—Gụọ igbe bụ́ “Na-emekọnụ Ihe Ọnụ.”
7. Ọ bụrụ na e nwere ọgbakọ nwere ike ịna-edosa akwụkwọ anyị na tebụl n’ebe na-ekwo ekwo n’ókèala ha, olee otú ndị okenye nwere ike isi hazie ụdị ozi ọma a?
7 Ndị okenye ga-achọpụta ma è nwere ebe na-ekwo ekwo n’ókèala ha. Ọ bụrụ na e nwere, ha ga-ekpebizi ma ndị ọgbakọ ha hà ga na-aga ebe ahụ. Ebe e nwere ike idosa akwụkwọ anyị na tebụl ma ọ bụ n’ihe a na-akwagharị akwagharị bụ n’ebe a na-aba ụgbọala, ebe ndị mmadụ na-agbakọkarị, n’okporo ámá na-ekwo ekwo, n’ebe e nwere ọtụtụ ụlọ ahịa, n’ụlọ akwụkwọ mahadum, n’ọdụ ụgbọelu, nakwa n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè. Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na a na-edosa tebụl ahụ n’otu ebe, ọ bụghị ha nọ ebe a taa, ha anọ ebe ọzọ echi. Ọ bụrụ na ọ bụ ụbọchị Mọnde ka ha họọrọ ịna-abịa, ha ga na-abịa ya kwa Mọnde, ha ekwesịghịkwa ịna-agbanwe oge ha ji anọ ebe ahụ. A chọpụtala na ọ ka mma idosa tebụl n’ebe e nwere ọtụtụ ụlọ ahịa kama idewe ya n’ihu otu ụlọ ahịa n’ihi na ndị na-aga n’otu ụlọ ahịa na-achọ naanị ihe butere ha ebe ahụ. Ọ ga-adị mma idosa akwụkwọ anyị n’obere ihe a na-akwagharị akwagharị n’akụkụ ụzọ ndị mmadụ na-esikarị agafe. Ndị okenye nwere ike ịga n’adres anyị n’Ịntanet were posta ndị e sere Ụlọ Nche na Teta! na akwụkwọ Bible Na-akụzi ndị ha nwere ike idewe n’elu tebụl ma ọ bụ n’ihe a na-akwagharị akwagharị. Ihe mere e ji mee posta ndị ahụ bụ naanị maka ụdị ozi ọma a. Ndị ga-esi otú a na-ekwusa ozi ọma ga na-eme ya otú ụmụnna ndị nọ ná nnukwu obodo si eme ya. Ntụziaka ọ bụla onye nlekọta ije ozi nyere ha ka ha ga na-eso. Ọ bụrụ na onye chọrọ ka a mụwara ya Baịbụl ebighị n’ókèala ha, ha ga-edejupụta fọm Please Follow Up (S-43), nye ya odeakwụkwọ ọgbakọ ha.
8. Ọ bụrụ na e nweghị ebe a haziri ka ndị ọgbakọ unu na-aga edosa akwụkwọ anyị na tebụl, olee otú ị ka nwere ike isi na-ezi ndị mmadụ ozi ọma?
8 Na-ekwusa Ozi Ọma n’Ebe Ndị Mmadụ Na-anọkarị: Ụfọdụ enweghị ebe na-ekwo ekwo ha nwere ike idosa akwụkwọ anyị na tebụl n’ókèala ha. Ọ bụrụgodị na ọgbakọ enweghị ebe na-ekwo ekwo, anyị niile kwesịrị ịna-ezi ndị mmadụ ozi ọma n’ebe ọ bụla ha nọ. È nwere ahịa ma ọ bụ ebe a na-ere ahịa n’akụkụ ụzọ, ma ọ bụkwanụ ụlọ ahịa na-ekwo ekwo n’ókèala unu? È nwere ebe a na-aba ụgbọala ma ọ bu ebe ndị mmadụ na-agbakọ n’ókèala unu? È nwere ebe ndị mmadụ na-agakarị ma e mewe ihe n’ókèala unu? Ọ bụrụ na e nwere ebe ndị dị otú ahụ, i nwere ike ịna-aga ebe ndị ahụ na-ezi ndị mmadụ ozi ọma.
9. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ezi ndị mmadụ ozi ọma ebe ọ bụla ha nọ?
9 Uche Jehova bụ ka “a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Tim. 2:4) N’ihi ya, anyị na-agba mbọ ka ọtụtụ ndị nụ ozi ọma Alaeze Chineke tupu ọgwụgwụ abịa. (Mat. 24:14) N’ọtụtụ ebe, ọ na-esiri ndị nkwusa ike inweta ndị mmadụ n’ụlọ. Ma, ha ka nwere ike ịnụ ozi ọma anyị na-ekwusa ma anyị na-agakwuru ha n’ebe ha na-anọ. E nwere ndị ọ na-abụghị n’ụlọ ha ka ha ga-anọ nụ ozi ọma. N’ihi ya, anyị ga-ejezu ozi anyị ma ọ bụrụ na anyị na-ezi ndị mmadụ ozi ọma ebe ọ bụla ha nọ.—2 Tim. 4:5.
[Igbe dị na peeji nke 5]
Na-emekọnụ Ihe Ọnụ
A chọpụtala na ụfọdụ ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ dị ibe ha nso na-aga ekwusa ozi ọma n’otu okporo ámá ma ọ bụ n’otu ebe a na-aba ụgbọala ma ọ bụ n’otu ahịa. Ndị nọkwa n’ọgbakọ dị iche iche na-aga enye ndị mmadụ Ụlọ Nche na Teta! n’otu ebe a na-aba ụgbọala, n’otu ebe ndị mmadụ na-aga atụrụ ndụ ma ọ bụ n’otu ebe ọtụtụ ọfịs dị. Otú a ndị nkwusa si ọgbakọ dị iche iche si aga otu ebe na-ewe ndị ha na-aga ezi ozi ọma iwe, ya sọkwa ya ya bụrụ na ọ bụghị otu ụbọchị ka ha niile gara ebe ahụ. N’ihi ya, ọ ga-aka mma ma ndị ọgbakọ ọ bụla na-aga ozi ọma n’ókèala ha.
Ọ bụrụ na ụfọdụ ụmụnna achọọ ịga kwụsaa ozi ọma n’ókèala ọgbakọ dị ha nso, ha kwesịrị ibu ụzọ gwa onye nlekọta ije ozi ọgbakọ ha. Nwanna ahụ ga-ejizi aka ya gwa onye nlekọta ije ozi ọgbakọ nwe ókèala ahụ tupu ndị nkwusa ahụ agawa. Oge ụfọdụ, ebe ọgbakọ Igbo na-aga ozi ọma nwere ike ịbụ ebe ndị nọ n’ọgbakọ asụsụ ndị ogbi na-agakwa ozi ọma. Ọgbakọ ndị Igbo chọọ ịga ozi ọma n’ụdị ebe ahụ, onye nlekọta ije ozi ha kwesịrị ịgwa onye nlekọta ije ozi ọgbakọ ndị ogbi, ka ọ ghara ịbụ ha gapụ ndị nke ọzọ agachie, ka ha gharakwa ikpasu ndị ha na-ezi ozi ọma iwe. Ọ bụrụ na ha a na-eme ka ibe ha mara ebe ha chọrọ ịga ozi ọma, ihe niile ga na-aga “n’ụzọ kwesịrị ekwesị nakwa n’usoro.”—1 Kọr. 14:40.
[Foto dị na peeji nke 6]
[Foto dị na peeji nke 6]