Ụzọ Ọhụrụ Na-eme Obi Ụtọ E Si Ekwusa Ozi Ọma
1. Olee ihe a gbarala ọgbakọ ndị nwere ebe ndị na-ekwo ekwo n’ókèala ha ume ka na-eme?
1 A gbaala ọgbakọ ndị nwere ebe ndị na-ekwo ekwo n’ókèala ha ume ka ha na-edosa akwụkwọ anyị na tebụl ma ọ bụ n’ihe a na-akwagharị akwagharị n’ebe ndị ahụ. Ọ bụrụ na ọ bụ ihe a na-akwagharị akwagharị ka ha ga-eji na-edosa akwụkwọ anyị, ọ dịkarịa ala otu onye nkwusa ga-anọ n’akụkụ ya ma ọ bụ kwụrụ ebe ahụ. Ma, ọ bụrụ tebụl ka ha ji edosa ha, ọ bụ ndị nkwusa abụọ kwesịrị ịnọ n’akụkụ ya. Ụmụnna ndị a kwesịrị ịna-emesapụrụ ndị mmadụ ihu. Ọ bụrụ na mmadụ akwụsịtụ n’ihu tebụl ahụ, otu nwanna nwere ike malite ịgwa ya okwu. O nwere ike ikwu, sị: “Ì chetụla echiche banyere ihe Baịbụl kwuru banyere isiokwu a?” Otu onye nkwusa ma ọ bụ ndị nkwusa abụọ nwere ike ịnọ n’ebe na-adịghị anya n’ebe tebụl ahụ dị na-ezi ndị na-agafe agafe ozi ọma.
2. Kọọ ahụmahụ na-egosi na idosa akwụkwọ anyị n’ebe ndị na-ekwo ekwo bara uru.
2 A maliterela ọtụtụ ndị e ziri ozi ọma n’ebe ndị na-ekwo ekwo ọmụmụ Baịbụl. E nwere otu nwa akwụkwọ chọrọ ide gbasara Ndịàmà Jehova ma, ọ chọtalighị ebe Ụlọ Nzukọ Alaeze dị. Ka ụbọchị ole na ole gara, ọ hụrụ ebe ụmụnna dosara akwụkwọ anyị na tebụl n’ụlọ akwụkwọ ha. Ka oge na-aga, a malitere mụwara ya Baịbụl, ya aghọkwa Onyeàmà Jehova. O so ekwusa ozi ọma ugbu a n’ebe ndị na-ekwo ekwo.
3. Olee otú obi na-adị ụmụnna banyere ụzọ ọhụrụ a e si ekwusa ozi ọma?
3 Otu nwanna nwaanyị so ekwusa ozi ọma n’ebe ndị na-ekwo ekwo kwuru, sị: “Ụfọdụ ndị na-abịa n’ebe anyị dosara akwụkwọ anyị were magazin ndị ọhụrụ. Ụfọdụ n’ime ha anụtụbeghịkwa gbasara Ndịàmà Jehova. Achọpụtala m na ụzọ a ga-enyere anyị aka izi ọtụtụ ndị ozi ọma.” Nwanna nwaanyị ọzọ kwuru, sị: “Ụzọ ọhụrụ a e si ekwusa ozi ọma na-eme obi ụtọ n’ihi na ndị mmadụ na-abịakwute anyị, ma ndị nwere mmasị ma ndị na-enwechaghị mmasị.”
4. Olee uru ọ bara ịna-edosa akwụkwọ anyị n’otu ebe nakwa n’otu ụbọchị a na-agaghị na-agbanwe agbanwe?
4 Ọ ga-adị mma ka a na-edosa tebụl ahụ n’otu ebe, ọ bụghị ha nọ ebe a taa, ha anọ ebe ọzọ echi. Ọ bụrụ na ọ bụ ụbọchị Mọnde ka ha họọrọ ịna-abịa, ha ga na-abịa ya kwa Mọnde, ha ekwesịghịkwa ịna-agbanwe oge ha ji anọ ebe ahụ. Ime otú a ga-eme ka ndị mmadụ mata na anyị na-edosa akwụkwọ anyị n’ebe ahụ, ahụ́ eruokwa ha ala ịbịa were akwụkwọ ma ọ bụ jụọ ajụjụ. Ndị ọgbakọ unu hà na-edosa akwụkwọ n’ebe ndị na-ekwo ekwo n’ókèala unu? Ọ bụrụ na ha na-edosa, i nwere ike ịgwa ndị okenye ka i soro na-anọ ebe ahụ ka i wee jiri ụzọ a na-enyere ọtụtụ ndị aka ịmata Jehova na-ekwusa banyere “alaeze Chineke n’ebe niile.”—Luk 9:60.