Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Septemba 14
IZU NA-AMALITE NA SEPTEMBA 14
Abụ nke 50 na Ekpere
Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
cl isi nke 30 ¶10-18 (Nkeji 30)
Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: 2 Ndị Eze 16-18 (Nkeji 8)
Nke 1: 2 Ndị Eze 17:12-18 (Nkeji 3 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Olee Otú Ị Ga-esi Na-agụ Baịbụl Ka Ọ Baara Gị Ezigbo Uru?—igw p. 32 (Nkeji 5)
Nke 3: Olee Otú Anyị Ga-esi Mee Ka ‘Anya Anyị Na-ele Otu Ebe’?—Mat. 6:22, 23 (Nkeji 5)
Nzukọ Ije Ozi:
Isiokwu Ọnwa A: ‘Gbasie àmà ike banyere ozi ọma.’—Ọrụ 20:24.
10 min: ‘Gbasie Àmà Ike Banyere Ozi Ọma.’ Okwu dabeere n’isiokwu ọnwa a nakwa n’akwụkwọ Ịgba Àmà nke Ọma Banyere Alaeze Chineke, isi nke 1, paragraf nke 1-11.—Ọrụ 20:24.
20 min: “Otú Anyị Ga-esi Na-emekwu Nke Ọma n’Ozi Ọma—Izi Ozi Ọma n’Ebe Ndị Mmadụ Na-akpa Afọ Ha.” Okwu ndị na-ege ntị ga-etinyetụ ọnụ. A ga-eme ihe ngosi abụọ na-agaghị egbu oge. Nke mbụ ga-abụ ebe mmadụ na-eresị mmadụ ahịa, nwanna gara ozi ọma amalite gwawa ya okwu n’echereghị ka o resịchaa onye ahụ ahịa. N’ihe ngosi nke abụọ, nwanna ahụ ga-emegharị ihe o mere na mbụ. Na nke ugbu a, ọ ga-echere ka onye ahụ resịchaa onye bịara na nke ya ahịa tupu ya eziwe ya ozi ọma. Jụọ ụmụnna ihe mere ha ji chee na ihe ngosi nke abụọ ka nke mbụ mma.
Abụ nke 96 na Ekpere