Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 7/04 p. 3
  • Igbe Ajụjụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Igbe Ajụjụ
  • Ozi Alaeze Anyi—2004
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nọgide Na-erite Uru Site n’Ụlọ Nche na Teta!
    Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Jiri Magazin Anyị Mee Ihe n’Ụzọ Kasị Mma
    Ozi Alaeze Anyi—1996
Ozi Alaeze Anyi—2004
km 7/04 p. 3

Igbe Ajụjụ

◼ Olee otú mmadụ kwesịrị isi na-enweta Ụlọ Nche na Teta! nke aka ya?

Ebe ọ bụ na, n’oge na-adịbeghị anya, a kwụsịrị ndokwa maka ụtụ Ụlọ Nche na Teta!, ma ndị e dere ede ma ndị dị na kaseti a na-egere egere n’asụsụ nile, ndị nkwusa nile kwesịrị inweta magazin nke aka ha site n’ọgbakọ ha. Ihe ndị a gụpụrụ bụ ihe ndị a na-ezitere ndị ruru eru, dị ka magazin ndị e dere ná mkpụrụ akwụkwọ ndị ìsì nakwa ndị dị na kaseti a na-egere egere maka ndị ìsì, bụ́ ndị post ọfịs na-adịghị ana ego iji zite ha. Biko rịba ama na ọgbakọ pụrụ iji fọm Congregation Requests (M-202) tụọ ọda magazin. A pụkwara iji fọm a tụọ ọda magazin ndị e dere n’asụsụ ala ọzọ nakwa ndị e dere ná mkpụrụ akwụkwọ gbara okpotokpo.

Ọ bụrụ na ọ dị onye nọ n’ókèala unu na-achọ ka ị na-ewegara ya magazin mgbe nile, biko jide n’aka na i na-ewegara ya magazin n’oge, ka e wee ghara inwe ọbụna mbipụta nke ọ na-enwetaghị. Ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ pụrụ inweta magazin ma ọ bụ akwụkwọ nke aka ha site n’ebe a na-enweta magazin nakwa akwụkwọ ndị ọzọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. E kwesịghị ịgụnye ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ ná ndị a na-ewegara magazin.

Nanị ụtụ magazin ndị alaka ụlọ ọrụ ga-enwe na faịlụ bụ maka ndị ahụ onye nkwusa ọgbakọ na-apụghị iwejere magazin. Ọ bụrụ na Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ ezitewe ụtụ magazin maka onye a na-apụghị iwejere magazin, odeakwụkwọ ọgbakọ kwesịrị izitekọta ya na ihe odide dị mkpirikpi nke na-akọwa na Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ atụlewo ụtụ a nke ọma ma kwadoo ka e zite ya.

Nke a pụtara na ndị nkwusa ekwesịghị idetara alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ ka a na-ezitere ha magazin nke aka ha. A ga-ezighachiri ọgbakọ akwụkwọ ndị dị otú ahụ ndị nkwusa na ndị nwere mmasị dere ka a na-ezitere ha magazin nke aka ha.

◼ Olee otú onye mkpọrọ pụrụ isi nweta magazin nke aka ya?

Ọ bụrụ na ọgbakọ nke na-ekwusa ozi ọma n’ụlọ mkpọrọ pụrụ iwegara ndị mkpọrọ nọ na ya magazin, onye mkpọrọ kwesịrị isi n’aka ndị nkwusa na-eleta ụlọ mkpọrọ ahụ nweta Ụlọ Nche na Teta! nke aka ya. Mgbe nke a na-agaghị ekwe omume, onye mkpọrọ ahụ pụrụ idetara alaka ụlọ ọrụ akwụkwọ ozi n’onwe ya, ma kwuo ka a na-ezitere ya magazin. Biko, rịba ama na ndị mkpọrọ a chụpụrụ n’ọgbakọ pụkwara inweta magazin nke aka ha dị ka a kọwara na paragraf a.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya