Nọgide Na-erite Uru Site n’Ụlọ Nche na Teta!
Ebe ọ bụ na a kwụsịwala ụtụ Ụlọ Nche na Teta! ndị a na-enweta site na post ọfịs, ọ ga-achọ itinye mgbalị iji hụ na ọbụna otu mbipụta akwaghị anyị na ndị anyị na-ekwusara ozi ọma.
Magazin Onwe Onye: Mgbe ụtụ magazin nke gị gwụsịrị, mụbaa ọnụ ọgụgụ magazin ị tụrụ ọda ya n’ebe a na-enweta magazin. Ndị mụrụ ụmụ kwesịrị ịtụ ọda ọnụ ọgụgụ magazin zuru ezu ka onye òtù ezinụlọ nke ọ bụla wee nwee magazin nke ya. Ide aha gị na magazin nke gị ga-eme ka ị ghara inyefe ya n’ubi n’amaghị ụma. Mgbe e butere magazin, ụmụnna na-elekọta ha ga-ewepụta mbipụta nke ọ bụla ozugbo n’ụlọ Nzukọ Alaeze.
Ụzọ Magazin: Ndị nkwusa kwesịrị ịgbalịsi ike ime ka ndị nile nwere mmasị bụ́ ndị chọrọ ịdị na-enweta mbipụta nke ọ bụla nọrọ n’ụzọ magazin ha. Ịdị na-ewegara ndị dị otú ahụ magazin n’onwe anyị ga-emeghe ohere iji wulite mmasị e gosiri nakwa iji malite ọmụmụ Bible.—Lee Ozi Alaeze Anyị, nke October 1998, peeji nke 8.
Ndị Nwere Mkpa Pụrụ Iche: Ọ bụrụ na mmadụ egosipụta ezi mmasị ma biri n’ókèala a na-eketaghị ọrụ, a pụrụ ilebara ọnọdụ ya anya iji mee ka ọ na-enweta magazin site na post ọfịs. Ọ bụrụ na a pụghị ime ka onye bi n’ókèala ọgbakọ nọrọ n’ụzọ magazin ma ya abụrụ na o nwere ezi mmasị n’ịdị na-enweta magazin, soro Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ kwurịta ọnọdụ ahụ. Ọ bụrụ na ha akwadoo ya, a pụrụ ịtụrụ onye ahụ nwere mmasị ụtụ magazin. A pụrụ iji fọm e ji atụ ụtụ magazin bụ́ (M-1 na M-101) mee ihe maka nzube a.
Anyị pụrụ inwe obi ike na Jehova ga-anọgide na-agọzi mgbalị nile anyị na-eme iji Ụlọ Nche na Teta! na-akpọsa Alaeze ahụ.