Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 5/07 p. 6
  • Ì Nwere Ókèala nke Aka Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ì Nwere Ókèala nke Aka Gị?
  • Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ì Nwere Ike Inwe Ókèala nke Gị?
    Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Ụzọ Dị Iche Iche Anyị Si Ekwusa Ozi Ọma
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Igbe Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Mgbe Ndị Mmadụ Na-anọghị n’Ụlọ
    Ozi Alaeze Anyi—2007
Ozi Alaeze Anyi—2007
km 5/07 p. 6

Ì Nwere Ókèala nke Aka Gị?

1. Gịnị bụ ókèala nke aka gị?

1 Ókèala nke aka gị bụ ókèala e kenyere nanị gị ịrụ ọrụ na ya. O nwere ike ịbụ ókèala dị gị nso, nke nanị gị ma ọ bụ gị na onye nkwusa ọzọ pụrụ ịdị na-ezi ozi ọma na ya. Ọ bụ ezie na ọ bara uru iso ọgbakọ aga ozi ìgwè mgbe ọ bụla o kwere mee, ọ bụrụ na ndị nkwusa enwee ókèala nke aka ha, bụ́ nke ha ga na-arụ ọrụ na ya n’oge ndị ọzọ, nke ahụ ga-enye aka mee ka e zie ndị mmadụ ozi ọma n’ụzọ zuru ezu, karịsịa n’ọgbakọ e nwere ókèala buru ibu.—Ọrụ 10:42.

2. Olee ụfọdụ uru inwe ókèala nke aka anyị bara?

2 Uru Ndị Dị na Ya: Ụfọdụ achọpụtala na ọ bakwuuru ha uru inweta ókèala nke aka ha n’ebe dị nso n’ụlọ ọrụ ha n’ihi na ha na-aga na ya ekwusa ozi ọma n’oge ha kwụsịtụrụ ọrụ maka nri ehihie ma ọ bụ ozugbo ha gbasara ọrụ. Ezinụlọ ụfọdụ na-enwe mmasị ijekọ ozi ọma ọnụ gburugburu ebe ha bi ruo ihe dị ka otu awa tupu oge Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ ha eruo. N’ihi ya, ebe ndị ha na-aga nletaghachi ma na-eduzi ọmụmụ Bible anaghị adị anya, nke a na-emekwa ka oge, ike, na ego ha na-emefu ghara ịharu ka nke ha gaara emefu ma a sị na ọ bụ ókèala dị anya. Ebe ọ bụ na a pụrụ iji oge dị nta rụzuo nnọọ ihe bara uru, ọ ga-adịrị ndị nwere ókèala nke aka ha mfe inwe ike ịrụ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka site n’oge ruo n’oge ma ọ bụdị malite ọrụ ọsụ ụzọ oge nile. Tụkwasị na nke ahụ, anyị inwe ókèala nke aka anyị na ịma ndị bi na ha nke ọma pụrụ inye aka mee ka ha tụkwasị anyị obi, nyekwa aka mee ka okwu anyị na-ekwekọ ná mkpa ha. Nke a ga-eme ka ozi ọma anyị na-arụpụtakwu ihe bara uru.

3. Kọọ ahụmahụ nke otu onye ọsụ ụzọ nwetara ókèala nke aka ya.

3 Otu onye ọsụ ụzọ nke onye nlekọta sekit gbara ume ka o nweta ókèala nke aka ya, kwuru, sị: “N’ihi agbamume a, enwetara m ókèala nke aka m, n’oge na-adịghịkwa anya abịara m matakwuo ndị nọ n’ókèala m nke ọma, mụ na ha bịakwara bụrụ enyi. Ana m aga eleta ha mgbe ọ bụla ha chọrọ ka m bịa. Nke a mere ka nletaghachi m na-enweta n’ọnwa si na 35 gbagoo ruo ihe karịrị 80, m na-eduzikwara mmadụ asaa ọmụmụ Bible n’ebe obibi ha.”

4. Olee otú ị pụrụ isi nweta ma na-arụ ọrụ n’ókèala nke aka gị?

4 Otú Ị Ga-esi Nweta Ya: Ọ bụrụ na ị chọrọ inweta ókèala nke aka gị, gwa nwanna na-ahụ maka ókèala n’ọgbakọ unu. I nweere onwe gị ịkpọrọ otu onye nkwusa gị na ya ga-arụ, ma, hụkwa na i nwere akwụkwọ ị na-eji edetu banyere ndị ị na-enwetaghị n’ụlọ ha. I kwesịrị ịgba mbọ rụchaa ókèala ahụ n’ọnwa anọ e kenyere gị ya. Ọ bụrụ na ị rụchalighị ya n’ọnwa anọ, ị pụrụ ịgwa onye nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ gị ma ọ bụ ndị ọzọ ka ha nyere gị aka. Mgbe ọnwa anọ ahụ gwụrụ, ị pụrụ inyefeghachi ókèala ahụ n’aka nwanna ahụ na-ahụ maka ókèala ma ọ bụkwanụ gị agwa ya na ị ga-achọ ịrụghachi ya. Otú ọ dị, otu ókèala ahụ ị rụrụ ọrụ na ya ekwesịghị ịnọgide na-abụ nke aka gị, kama nke ahụ, nyeghachi ya nwanna ahụ na-ahụ banyere ókèala maka ndị ọzọ ga-achọ ịrụ ya. Ọ bụrụ na ọgbakọ unu enweghị ókèala buru ibu, ya abụrụkwa na ọ gaghị ekwe omume na ị ga-enweta ókèala nke aka gị, ikekwe ị pụrụ ịgwa onye nlekọta Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ unu ka o nye gị otu akụkụ nke ókèala unu.

5. Olee ihe a chọrọ anyị n’aka iji rụzuo ọrụ nkwusa e nyere anyị ịrụ?

5 Ọrụ nkwusa a e nyere anyị ịrụ “n’elu ụwa dum mmadụ bi,” adịghị mfe. (Mat. 24:14) Ihe ọ chọrọ anyị n’aka bụ ịhụ na anyị haziri ya ahazi. Ịga ozi ìgwè ma na-agakwa ozi ọma n’ókèala nke aka anyị, pụrụ inyere anyị aka izi ọtụtụ mmadụ ozi ọma ruo ókè ike kwere anyị.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya