Igbe Ajụjụ
◼ Ọgbakọ ò kwesịrị ikonye map na-egosi ókèala ha nile n’ebe a ga na-ahụ ya anya n’Ụlọ Nzukọ Alaeze?
Ee, e kwesịrị imere map na-egosi ókèala nile nke ọgbakọ ebe a ga-etinye ya ma konye ya n’ahụ ájá n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. E kwesịghị ịmapanye map ahụ na bọọdụ ịma ọkwa. O kwesịrị igosi ókè nke ókèala nile e kenyere ọgbakọ nakwa ókè nke ókèala nke ọ bụla nakwa nọmba ya. E kwesịrị igosipụta ebe bụ́ ókè maka ókèala nke ọgbakọ nile ji otu Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ eme ihe. Nke a ga-enyere ndị nkwusa nakwa ndị ọhụrụ nwere mmasị aka ịmata ọgbakọ nwe ókèala ha bi na ya. Igosi ebe ndị a na-enwe Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ na map ahụ ga-enyekwara mmadụ nile aka ịchọta ọmụmụ akwụkwọ e kenyere ha na ya. E kwesịrị ịdị na-esegharị map ahụ iji na-egosi mgbanwe ndị kasị ọhụrụ e nwere.
Ikonye map dị otú ahụ ebe a ga na-ahụ ya anya bụ ihe ncheta nye ndị nkwusa nile na, ọ bụrụ na ọ ga-ekwe omume, ọ ga-adị mma ka ha nwee ókèala nke onwe ha. Map ahụ na-enyere ndị chọrọ ịhọrọ ókèala dị ụlọ ha nso aka. Mgbe ụfọdụ ọ pụrụ ime ka a ghara igbu oge ná nzukọ maka ije ozi, na-eme ka onye nduzi nwee ike iduzi ìgwè ndị nkwusa nke ọ bụla ngwa ngwa gaa n’ebe e kenyere ha ịrụ.
Map ahụ na-agbakwa àmà na a haziri ọgbakọ ahụ ikwusa ozi Alaeze ahụ n’ụzọ zuru ezu n’ókèala e kenyere ya.—Luk 9:6.