Ì Nwere Ike Inwe Ókèala nke Gị?
1. Gịnị ka onye nkwusa nwere ike ime ma ọ bụrụ na ọgbakọ ha nwere ókèala hiri nne?
1 N’ọgbakọ e nwere ọtụtụ ókèala, onye nkwusa nwere ike ikwu ka e nye ya ókèala dị nso n’ụlọ ya ka ọ na-aga ezi ozi ọma. Ọ bụrụ na e nye ya ókèala ahụ, ọ ghọọla nke ya. Akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri kwuru na peeji nke 103, sị: “Inwe ókèala nke aka gị nke dị gị nso ga-eme ka o kwe gị mee iji oge nke ị pụrụ itinye n’ozi ubi mee ihe n’ụzọ kasị baa uru. Ị pụkwara ịchọ ịkpọ onye nkwusa ọzọ isoro gị rụọ ọrụ n’ókèala nke aka gị.”
2. E nye mmadụ ókèala ọ ga na-aga ozi ọma, olee mgbe o kwesịrị ịna-aga ozi ọma na ya? Oleekwa mgbe ọ ga-akacha mma ka o soro ndị nọ n’ìgwè ozi ubi ha gaa ozi ọma?
2 Ị Ka Ga Na-eso Ọgbakọ Na-aga Ozi Ọma: Ọ bụrụ na e nye gị ókèala dị nso n’ebe ị na-arụ ọrụ, gị na onye nkwusa ọzọ nwere ike na-aga ezi ndị mmadụ ozi ọma ma unu gbasaa ọrụ ụtụtụ ma ọ bụ nke ehihie, ma ọ bụrụ na ebe ọ na-arụ ọrụ dị nso n’ebe ị na-arụ. Ọ bụrụ na e nye gị ókèala nke dị nso n’ụlọ gị, gị na ndị ezinụlọ gị nwere ike ịna-aga ezi ozi ọma ebe ahụ ná mgbede ọ bụla unu chọrọ. Ị manụ na ọ bụrụ na ị gaghị nzukọ ozi ubi, i kwesịrị ikpe ekpere tupu gị amalite ozi ọma. (Fil. 4:6) Ihe ọzọ bụ na i kwesịghị ikwo na i nwere ókèala nke gị gharazie iso ndị nọ n’ìgwè ozi ubi unu na-aga ozi ọma. Ọ ga-adị mma ma i soro ndị nọ n’ìgwè ozi ubi unu na-aga ozi ọma ná ngwụcha izu n’ihi na ọtụtụ mmadụ ga-apụta ozi ọma.
3. Olee uru mmadụ inwe ókèala nke ya bara?
3 Uru Ọ Ga-abara Gị: I nwee ókèala nke gị, i nweela ebe ị ga na-aga ozi ọma mgbe ọ bụla ị chọrọ. Ị ga-ejikwu oge hiri nne na-ezi ozi ọma n’ihi na ebe ị ga-aga ozi ọma dị gị nso. Nke a ga-eme ka ụfọdụ ndị nkwusa nwee ike ịbụ ndị ọsụ ụzọ inyeaka ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ oge niile. Ọ bụrụ na onye ị gara ozi ọma na nke ya enwee mmasị n’ozi anyị, ọ ga-adịrị gị mfe ịga nletaghachi na nke ya ma ọ bụdị mụọrọ ya Baịbụl n’ihi na na o bi gị nso. Ọ bụrụ na mmadụ enwee ókèala nke ya, ọ ga-enyere ya aka ịmatakwu ndị bi n’ókèala ahụ. Ahụ́ ga-erukwa ha ala ma ọ bịa na nke ha n’ihi na ha ma ya nke ọma. Ọ na-adịkwa mma ma ọ rụọ ókèala ahụ ihe karịrị otu ugboro tupu ya enyeghachi ya nwanna na-ahụ maka ókèala. Í cheghị na inwe ókèala ị ga na-aga ezi ozi ọma ga-eme ka gị na ndị ezinụlọ gị jezuo ozi unu?—2 Tim. 4:5.