Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 1/13 p. 2
  • Ì Nwere Ike Inwe Ókèala nke Gị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ì Nwere Ike Inwe Ókèala nke Gị?
  • Ozi Alaeze Anyi—2013
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ì Nwere Ókèala nke Aka Gị?
    Ozi Alaeze Anyi—2007
  • Ụzọ Dị Iche Iche Anyị Si Ekwusa Ozi Ọma
    Ndị A Haziri Ime Uche Jehova
  • Nzukọ Ozi Ubi
    Ozi Alaeze Anyi—2009
  • Otú E Si Eme Nkwusa n’Ógbè Azụmahịa
    Ozi Alaeze Anyi—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2013
km 1/13 p. 2

Ì Nwere Ike Inwe Ókèala nke Gị?

1. Gịnị ka onye nkwusa nwere ike ime ma ọ bụrụ na ọgbakọ ha nwere ókèala hiri nne?

1 N’ọgbakọ e nwere ọtụtụ ókèala, onye nkwusa nwere ike ikwu ka e nye ya ókèala dị nso n’ụlọ ya ka ọ na-aga ezi ozi ọma. Ọ bụrụ na e nye ya ókèala ahụ, ọ ghọọla nke ya. Akwụkwọ bụ́ Ndị A Haziri kwuru na peeji nke 103, sị: “Inwe ókèala nke aka gị nke dị gị nso ga-eme ka o kwe gị mee iji oge nke ị pụrụ itinye n’ozi ubi mee ihe n’ụzọ kasị baa uru. Ị pụkwara ịchọ ịkpọ onye nkwusa ọzọ isoro gị rụọ ọrụ n’ókèala nke aka gị.”

2. E nye mmadụ ókèala ọ ga na-aga ozi ọma, olee mgbe o kwesịrị ịna-aga ozi ọma na ya? Oleekwa mgbe ọ ga-akacha mma ka o soro ndị nọ n’ìgwè ozi ubi ha gaa ozi ọma?

2 Ị Ka Ga Na-eso Ọgbakọ Na-aga Ozi Ọma: Ọ bụrụ na e nye gị ókèala dị nso n’ebe ị na-arụ ọrụ, gị na onye nkwusa ọzọ nwere ike na-aga ezi ndị mmadụ ozi ọma ma unu gbasaa ọrụ ụtụtụ ma ọ bụ nke ehihie, ma ọ bụrụ na ebe ọ na-arụ ọrụ dị nso n’ebe ị na-arụ. Ọ bụrụ na e nye gị ókèala nke dị nso n’ụlọ gị, gị na ndị ezinụlọ gị nwere ike ịna-aga ezi ozi ọma ebe ahụ ná mgbede ọ bụla unu chọrọ. Ị manụ na ọ bụrụ na ị gaghị nzukọ ozi ubi, i kwesịrị ikpe ekpere tupu gị amalite ozi ọma. (Fil. 4:6) Ihe ọzọ bụ na i kwesịghị ikwo na i nwere ókèala nke gị gharazie iso ndị nọ n’ìgwè ozi ubi unu na-aga ozi ọma. Ọ ga-adị mma ma i soro ndị nọ n’ìgwè ozi ubi unu na-aga ozi ọma ná ngwụcha izu n’ihi na ọtụtụ mmadụ ga-apụta ozi ọma.

3. Olee uru mmadụ inwe ókèala nke ya bara?

3 Uru Ọ Ga-abara Gị: I nwee ókèala nke gị, i nweela ebe ị ga na-aga ozi ọma mgbe ọ bụla ị chọrọ. Ị ga-ejikwu oge hiri nne na-ezi ozi ọma n’ihi na ebe ị ga-aga ozi ọma dị gị nso. Nke a ga-eme ka ụfọdụ ndị nkwusa nwee ike ịbụ ndị ọsụ ụzọ inyeaka ma ọ bụ ndị ọsụ ụzọ oge niile. Ọ bụrụ na onye ị gara ozi ọma na nke ya enwee mmasị n’ozi anyị, ọ ga-adịrị gị mfe ịga nletaghachi na nke ya ma ọ bụdị mụọrọ ya Baịbụl n’ihi na na o bi gị nso. Ọ bụrụ na mmadụ enwee ókèala nke ya, ọ ga-enyere ya aka ịmatakwu ndị bi n’ókèala ahụ. Ahụ́ ga-erukwa ha ala ma ọ bịa na nke ha n’ihi na ha ma ya nke ọma. Ọ na-adịkwa mma ma ọ rụọ ókèala ahụ ihe karịrị otu ugboro tupu ya enyeghachi ya nwanna na-ahụ maka ókèala. Í cheghị na inwe ókèala ị ga na-aga ezi ozi ọma ga-eme ka gị na ndị ezinụlọ gị jezuo ozi unu?—2 Tim. 4:5.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya