Usoro Ihe Omume Maka Izu Na-amalite na Jenụwarị 28
IZU NA-AMALITE NA JENỤWARỊ 28
Abụ nke 29 na Ekpere
□ Ọmụmụ Baịbụl Ọgbakọ:
jr isi nke 4 ¶15-20 (Nkeji 30)
□ Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke:
Ọgụgụ Baịbụl: Matiu 16-21 (Nkeji 10)
Nke 1: Matiu 17:22–18:10 (Nkeji 4 ma ọ bụ ihe na-erughị ya)
Nke 2: Olee Ihe Ọma Jehova Gwara Ụmụ Izrel Ndị Jọshụa Hụrụ Mgbe Ha Mezuru?—Jọsh. 23:14 (Nkeji 5)
Nke 3: “Onye A Zọpụtara, A Zọpụtachaala Ya” Esighị n’Akwụkwọ Nsọ—td 33B (Nkeji 5)
□ Nzukọ Ije Ozi:
Nkeji 5: Ịmalite Ọmụmụ Baịbụl na Satọdee Mbụ n’Ọnwa. Jiri ihe dị n’ebe ahụ e dere “Ihe I Nwere Ike Ikwu” mee ihe ngosi otú e nwere ike isi malitere mmadụ ọmụmụ Baịbụl na Satọdee mbụ n’ọnwa Febụwarị. Gbaa mmadụ niile ume ka ha bịa ozi ọma n’ụbọchị ahụ.
Nkeji 25: “Karịsịa Ihe Niile, Nweenụ Ịhụnanya Siri Ike n’Ebe Ibe Unu Nọ.” Ajụjụ na azịza. Ọ ga-esi na broshọ bụ́ Nọrọ na Nche! peeji nke 28, paragraf nke 1-20. Jiri ihe e kwuru na paragraf nke mbụ n’Ozi Alaeze a mere okwu mmeghe na-agaghị egbu oge. I kwuchaa, gị ajụwazie ndị na-ege ntị ajụjụ ndị ahụ dị na peeji nke 31. Unu tụlechaa, jiri ihe e kwuru na paragraf nke abụọ n’Ozi Alaeze a mere okwu mmechi. Gbaa mmadụ niile ume ka ha lee vidio bụ́ Ụmụnna Anyị Nọ n’Ụwa Dum.
Abụ nke 53 na Ekpere