Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jr isi 4 p. 43-53
  • Kpachara Anya Ka Obi Dị Aghụghọ Ghara Ịrafu Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kpachara Anya Ka Obi Dị Aghụghọ Ghara Ịrafu Gị
  • Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • OBI DỊ AGHỤGHỌ NWERE IKE IDUHIE ANYỊ
  • OTÚ JEHOVA SI AKPỤZI ANYỊ
  • KWE KA JEHOVA KPỤZIE GỊ
  • Ị̀ Na-ajụ Kwa Ụbọchị, “Olee Ebe Jehova Nọ?”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • “Apụghị M Ịgbachi Nkịtị”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • “Gwa Ha Okwu A”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Olee Ụdị Ndị Ị Ga-emeta Enyi?
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
jr isi 4 p. 43-53

ISI NKE ANỌ

Kpachara Anya Ka Obi Dị Aghụghọ Ghara Ịrafu Gị

1, 2. Gịnị mere o ji sie ike ịma otú obi ihe atụ anyị dị n’ezie?

KA E were ya na i tetara n’ụra n’isi ụtụtụ ma chọpụta na obi na-egbusi gị mgbu ike nakwa na ọ na-esiri gị ike iku ume. I nwere ike iche, sị: ‘Ọ̀ ga-abụ na obi achọwala ịkụchi m?’ Naanị iche na o nweghị ihe na-eme gị agaghị enyere gị aka. I kwesịrị ime ihe ozugbo. N’ihi ya, i nwere ike ikwu ka e buga gị ụlọ ọgwụ. Dọkịta nwere ike iji ihe e ji ele obi lee gị ahụ́ nke ọma. Ịchọpụta ihe na-arịa gị ngwa ngwa na ịgwọ ya ozugbo nwere ike ime ka ị ghara ịnwụ.

2 Oleekwanụ banyere obi ihe atụ anyị? O nwere ike isiri anyị ike ịma otú ọ dị n’ezie. N’ihi gịnị? Baịbụl gwara anyị, sị: “Obi dị aghụghọ karịa ihe ọ bụla ọzọ, o sikwara ike njite. Ònye pụrụ ịmara ya?” (Jere. 17:9) N’ihi ya, obi anyị nwere ike ịghọgbu anyị, mee ka anyị chee na anyị enweghị nsogbu ọ bụla n’ihe banyere mmekọrịta anyị na Chineke n’agbanyeghị na ndị ọzọ nwere ike ịhụ ihe na-egosi na anyị nwere nsogbu, ya ana-echu ha ụra. Olee ihe mere obi anyị nwere ike iji ghọgbuo anyị? Ọchịchọ ime mmehie nke anyị bu pụta ụwa nwere ike ịghọgbu anyị. Setan na ụwa ya nwekwara ike ime ka anyị ghara ịma otú obi anyị dị n’ezie. Anyị nwere ike isi n’aka Jeremaya na ndị bi na Juda n’oge ya mụta otú anyị ga-esi na-enyocha obi anyị.

3. Olee ihe ọtụtụ ndị ji mere chi?

3 Ọtụtụ ndị bi na Juda gosiri na obi ihe atụ ha nwere nsogbu. Ha hapụrụ onye naanị ya bụ ezi Chineke, gaa fewe chi ndị Kenan, ma obi ha amaghị ha ikpe. Jehova gwara ha, sị: “Olee ebe chi ndị unu meere onwe unu nọ? Ka ha bilie ma ọ bụrụ na ha nwere ike ịzọpụta unu n’oge ọdachi unu. N’ihi na dị ka obodo unu dị ọtụtụ, otú ahụ ka chi unu dị ọtụtụ.” (Jere. 2:28) N’ezie, anyị maara na anyị anaghị efe chi ụgha. Ma otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru na okwu ahụ bụ́ “chi” nwere ike ịpụta “onye ma ọ bụ ihe mmadụ ji kpọrọ ihe nke ukwuu.” Ọtụtụ ndị n’ụwa na-ewere ọrụ ha, ahụ́ ike ha, ezinụlọ ha, na anụ ụlọ ha dị ka ihe mbụ. Ndị ọzọ na-ewere egwuregwu, ndị a ma ama, nkà na ụzụ, ime njem, ma ọ bụ omenala dị ka ihe kacha mkpa ná ndụ ha. Ọtụtụ ndị na-eleghara mmekọrịta ha na Onye kere ha anya n’ihi ịchụ ihe ndị a. Ụdị ihe ahụ ò nwere ike ime ezi Ndị Kraịst dị ka o mere ndị bi na Juda n’oge Jeremaya?

OBI DỊ AGHỤGHỌ NWERE IKE IDUHIE ANYỊ

4. Ndị ahụ sịrị “Olee ebe okwu Jehova dị? Biko, ya mezuo,” hà ji obi ha dum na-achọ okwu Jehova?

4 Ma eleghị anya, ịtụle ihe ndị ọzọ Jeremaya kwuru mgbe o dere na obi dị aghụghọ ga-amasị gị. Ọ ghọtara na ndị mmadụ nọ na-ekwu, sị: “Olee ebe okwu Jehova dị? Biko, ya mezuo.” (Jere. 17:15) Ma hà ji obi ha dum na-achọ okwu Jehova? Amaokwu ndị bu ụzọ na Jeremaya isi iri na asaa kwuru, sị: “E ji mkpịsị ígwè dee mmehie Juda. E ji mkpịsị dayamọnd kanye ya ná mbadamba nkume nke bụ́ obi ha.” Nsogbu ndị ahụ bi na Juda nwere bụ na ha ‘tụkwasịrị mmadụ obi, dabere n’ogwe aka bụ́ anụ ahụ́ ma wepụ obi ha n’ebe Jehova nọ.’ Ma e nwere mmadụ ole na ole na-emeghị otú ahụ. Ha tụkwasịrị Chineke obi, na-achọ nduzi ya na ngọzi ya.—Jere. 17:1, 5, 7.

5. Olee ihe ndị obodo Jeremaya mere mgbe ha nụrụ ihe Jehova chọrọ ka ha mee?

5 Ihe ọtụtụ n’ime ha mere mgbe ha nụrụ okwu Chineke gosiri otú obi ha dị n’ezie. (Gụọ Jeremaya 17:21, 22.) Dị ka ihe atụ, ha ekwesịghị ịrụ ọrụ ọ bụla n’Ụbọchị Izu Ike. Ha kwesịrị iji ya fee Chineke. Ndị obodo Jeremaya ekwesịghị iji ụbọchị ahụ na-achụ ego ma ọ bụ na-arụ ọrụ ha. Ma ihe ha mere gosiri otú obi ha dị n’ezie. “Ha egeghị ntị, ha atọghịkwa ntị n’ala, ha wee kwesie olu ike ka ha ghara ige ntị, gharakwa ịnara ịdọ aka ná ntị.” N’agbanyeghị na ha ma iwu Chineke, otú ha si ele ihe anya dị iche. Ha na-eme ihe masịrị ha n’Ụbọchị Izu Ike.—Jere. 17:23; Aịza. 58:13.

6, 7. (a) Olee ihe na-ezighị ezi Onye Kraịst nwere ike iche n’agbanyeghị ndụmọdụ ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-enye anyị taa? (b) Gịnị nwere ike ime ka anyị ghara ịgachi ọmụmụ ihe anya?

6 Taa, e nyeghị anyị iwu idebe Ụbọchị Izu Ike. Ma e nwere ihe anyị kwesịrị ịmụta n’ihe ndị obodo Jeremaya mere, nke gosiri otú obi ha dị n’ezie. (Kọl. 2:16) Anyị ahapụla ịchụ ihe ndị na-amasị anyị ma ọ bụ ihe nke ụwa iji na-eme uche Chineke. Anyị ma na ọ ga-abụ nzuzu ma anyị jiri aka anyị kpebie otú ga-akara anyị mfe isi na-efe Chineke. Ma eleghị anya, anyị ma ọtụtụ ndị ji ndụ ha dum na-eme uche Chineke, nke mere ka ha nwee obi ụtọ, obi eruokwa ha ala. Ma, olee otú e nwere ike isi duhie anyị?

7 Onye Kraịst nwere ike iche na obi ya enweghị ike iduhie ya otú ahụ obi ọtụtụ ndị n’oge Jeremaya duhiere ha. Dị ka ihe atụ, nwoke nwere ike iche, sị, ‘M kwesịrị ịna-arụ ọrụ ka m nwee ike ịna-elekọta ezinụlọ m.’ Echiche dị otú ahụ adịghị njọ. Ọ́ bụrụkwanụ na nke ahụ emee ka onye ahụ chewe, sị, ‘M kwesịrị ịgụkwu akwụkwọ ka m nwee ike inweta ezigbo ọrụ ma ọ bụ ka a ghara ịchụ m n’ọrụ’? Echiche dị otú ahụ nwere ike iyi ihe kwesịrị ekwesị, mezie ka onye ahụ kwuo, sị, ‘Ihe agbanweela, onye chọkwara ka agụụ ghara igbu ya kwesịrị ịga mahadum ka o nweta ezigbo ọrụ nakwa ka a ghara ịchụ ya n’ọrụ.’ Onye ahụ nwere ike iji nwayọọ nwayọọ na-ajụ ndụmọdụ bara uru ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche na-enye n’ihe banyere ịga mahadum ma malite ịhapụ ịga ọmụmụ ihe! Ụfọdụ ejirila nwayọọ nwayọọ malite iche echiche ka ndị ụwa n’ihe banyere ịga mahadum. (Efe. 2:2, 3) Baịbụl dọrọ anyị aka ná ntị kwesịrị ekwesị, sị: “Ekwela ka ụwa nke gbara gị gburugburu kpụọ gị ka i yie ya.”—Rom 12:2, Phillips.a

Foto ndị dị na peeji nke 46

Ò nweela mgbe obi gị ghọgburu gị, mee ka ị hapụ ịga ọmụmụ ihe?

8. (a) Olee ihe nwere ike ime ka Onye Kraịst na-anya isi? (b) Gịnị mere ịmara ihe ụfọdụ banyere Chineke na ihe ndị o mere abụghị ebe okwu biri?

8 N’ezie, ụfọdụ Ndị Kraịst na narị afọ mbụ bara ọgaranya. Ikekwe, a matụ ụfọdụ n’ime ha ama n’ụwa. Otú ahụ ka ọ dịkwa ụfọdụ Ndị Kraịst n’oge anyị a. Olee otú ha kwesịrị isi na-ele akụnụba ha anya? Oleekwa otú anyị kwesịrị isi na-ele ụdị ndị ahụ anya? Jehova si n’ọnụ Jeremaya zaa ajụjụ ndị a. (Gụọ Jeremaya 9:23, 24.) Onye bara ọgaranya ekwesịghị iji akụnụba ya na-anya isi, kama o kwesịrị ịghọta na ihe kacha mkpa bụ ịmara Ọkaakaa Eluigwe na Ala. (1 Kọr. 1:31) Ma olee ihe inwe nghọta banyere Jehova na ịmara ya pụtara? Ndị biri ndụ n’oge Jeremaya maara aha Chineke. Ha makwa otú o si chebe ndị nna nna ha n’Oké Osimiri Uhie, napụta ha mgbe ha na-abanye n’Ala Nkwa ahụ, zọpụta ha n’oge Ndị Ikpe nakwa n’oge ndị eze kwesịrị ntụkwasị obi chịrị ha. Ma, ha amaghị Jehova n’ezie, ha enweghịkwa ezigbo okwukwe n’ebe ọ nọ. N’agbanyeghị nke ahụ, onye ọ bụla n’ime ha kwuru, sị: “Aka m dị ọcha. N’ezie, iwe [Chineke] na-eweso m adajụwo.”—Jere. 2:35.

Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị mata na obi anyị dị aghụghọ? Olee otú anyị nwere ike isi nyochaa obi anyị ma chọpụta otú Jehova bụ́ Onye na-enyocha obi nwere ike isi lee anyị anya?

OTÚ JEHOVA SI AKPỤZI ANYỊ

Foto ndị dị na peeji nke 48

Ị̀ na-ekwe ka Jehova kpụzie gị?

9. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na anyị nwere ike ịgbanwe obi anyị, oleekwa otú anyị nwere ike isi mee ya?

9 Ndị Juu Jeremaya ziri ozi Chineke kwesịrị ịgbanwe obi ha. Ha nwere ike ime ya n’ihi na Chineke kwuru banyere ndị ahụ a ga-esi n’ala ọzọ kpọlata, sị: ‘M ga-enye ha obi ha ga-eji mara m, na mụ onwe m bụ Jehova; ha ga-abụ ndị m, mụ onwe m ga-abụkwa Chineke ha, n’ihi na ha ga-alọghachikwute m.’ (Jere. 24:7) Mmadụ nwekwara ike ịgbanwe obi ya taa. Ihe ọzọ bụ na ọtụtụ n’ime anyị nwere ike imezikwu otú obi ihe atụ ha dị. Ụzọ ihe atọ anyị kwesịrị ime bụ: ịmụchi Okwu Chineke anya, ịghọta otú Chineke si arụ ọrụ ná ndụ anyị, nakwa ime ihe ndị anyị mụtara banyere Chineke. Anyị ekwesịghị ịdị ka ndị obodo Jeremaya, kama anyị kwesịrị ịchọ ka Jehova bụ́ Onye na-enyocha obi nyochaa obi anyị. Anyị nwekwara ike iji Baịbụl nyochaa obi anyị, tụleekwa ihe ọma ndị Jehova meere anyị. (Ọma 17:3) Anyị kwesịrị ime otú ahụ!

10, 11. (a) Gịnị mere Jeremaya ji gaa ịhụ ọkpụite? (b) Gịnị na-ekpebi otú Jehova si akpụzi ndị mmadụ?

10 Setan chọrọ ịkpụgharị ndị mmadụ ka ha niile yie. Ma, Chineke na-ebu ọnọdụ mmadụ n’obi mgbe ọ na-akpụzi ya. Anyị ga-ahụ otú Chineke si akpụzi anyị n’ihe Jeremaya hụrụ. Otu ụbọchị, Chineke gwara ya ka ọ gaa n’ụlọ ọkpụite nke ji wiil e ji akpụ ite na-akpụ ite. Ma, mgbe arịa ahụ ọ na-akpụ mebiri, naanị ihe o mere bụ iji ụrọ ahụ na-akpọbeghị nkụ kpụọ ụdị arịa ọzọ. (Gụọ Jeremaya 18:1-4.) Gịnị mere Jehova ji gwa Jeremaya ka ọ gaa hụ ihe ọkpụite na-eme, gịnịkwa ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe ahụ ọ hụrụ?

11 Jehova chọrọ igosi ma Jeremaya ma ndị Izrel na ya nwere ikike ịkpụzi ndị mmadụ nakwa mba dị iche iche otú ọ bụla o si chọọ. Olee otú Chineke si akpụzi ndị mmadụ dị ka ụrọ? Jehova adịghị ka ụmụ mmadụ na-akpụ ite bụ́ ndị na-emehie ihe; ọ naghịkwa eme, ọ tatụ ya n’isi, ya emebie ihe ọ kpụrụ. Àgwà ndị mmadụ na-akpa mgbe Jehova na-akpụzi ha ga-ekpebi ihe ọ ga-eji ha eme.—Gụọ Jeremaya 18:6-10.

12. (a) Olee ihe Jehoyakim mere mgbe Jehova chọrọ ịkpụzi ya? (b) Gịnị ka ị mụtara n’ihe a kọrọ banyere Jehoyakim?

12 Oleezi otú Jehova si akpụzi ndị mmadụ n’otu n’otu? Ihe bụ́ isi o ji akpụzi ha taa bụ Baịbụl. Ihe mmadụ mere mgbe ọ gụchara Okwu Chineke na-egosi ụdị mmadụ ọ bụ. Chineke nweziri ike ịkpụ ya. Ugbu a, ka anyị tụlee ihe Eze Jehoyakim mere iji hụ otú o si mee ka ndị mmadụ mụta ịkpa àgwà ọjọọ n’ihe ndị ha na-eme kwa ụbọchị n’oge Jeremaya. Iwu Mozis kwuru na mmadụ ekwesịghị ‘irigbu onye ọrụ e goro ego.’ Ma, ọ bụ ihe ahụ ka eze mere. Ọ na-erigbu ndị Izrel ibe ya, mee ka ha na-ewuru ya “ụlọ sara mbara.” Ma, ọ naghị akwụ ha ihe o kwesịrị ịkwụ ha. (Diut. 24:14; Jere. 22:13, 14, 17) Chineke si n’ọnụ ndị amụma ya gbalịa iji okwu ya kpụzie Jehoyakim. Ma eze ahụ mere ihe obi ya dị aghụghọ gwara ya. Ọ sịrị, “Agaghị m erube isi,” ma na-akpa àgwà ọ na-akpa kemgbe ụwa. N’ihi ya, Chineke kwuru, sị: “A ga-eli [Jehoyakim] dị ka oké ịnyịnya ibu, kpụrụ ya n’ala gaa tụfuo.” (Jere. 22:19, 21) Ọ ga-abụrụ anyị nzuzu ikwu, sị: ‘Ọ bụ otú m dị. Agaghị m agbanwe’! Taa, Chineke anaghị ezitere anyị ndị amụma dị ka Jeremaya, ma ọ na-eduzi anyị. Ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, onye nwekwara uche na-enyere anyị aka ịghọta ihe Baịbụl kwuru na ime ya eme. O nwere ike imetụta ihe anyị na-eme kwa ụbọchị, dị ka uwe anyị na ejiji anyị ma ọ bụ egwú ndị anyị ga-akpọ n’agbamakwụkwọ ma ọ bụ n’ebe ọzọ nakwa ụdị egwú anyị ga-agba. Ànyị ga-ekwe ka Okwu Chineke kpụzie anyị?

13, 14. (a) Gịnị mere ndị nwere ndị ohu na Jeruselem ji kweta ime ka ndị ohu ha bụ́ ndị Hibru nwere onwe ha? (b) Olee ihe mere ka a mata otú obi ndị nwe ndị ohu ahụ dị n’ezie?

13 Ka anyị tụlee ihe atụ ọzọ. Ndị Babịlọn mere Zedekaya eze Juda nke ga-anọ n’okpuru ha. Zedekaya aṅaghị ntị na ndụmọdụ Chineke si n’ọnụ Jeremaya nye ya. O nupụụrụ eze Babịlọn isi. (Jere. 27:8, 12) N’ihi ya, ndị Babịlọn nọchibidoro Jeruselem. Eze na ndị o mere ndị isi kpebiri irube isi n’Iwu Mozis ka ha nwee ike inweta ihu ọma Chineke. Zedekaya ma na ọ bụrụ na mmadụ nwere ohu bụ́ onye Hibru, na o kwesịrị ime ka o nwere onwe ya n’afọ nke asaa. N’ihi ya, Zedekaya na ndị obodo ya gbara ndụ ịhapụ ndị ohu ha bụ́ ndị Hibru. (Ọpụ. 21:2; Jere. 34:14) N’ezie, mgbe ndị iro gbara Jeruselem gburugburu, ndị bi na ya kpebiri na mberede ime ka ndị ohu ha nwere onwe ha!—Gụọ Jeremaya 34:8-10.

14 Mgbe e mechara, ndị agha ndị Ijipt bịara nyere Jeruselem aka, mee ka ndị Babịlọn hapụ Jeruselem. (Jere. 37:5) Olee ihe ndị ahụ mere ka ndị ohu ha nwere onwe ha ga-eme? Ha malitere ịkpọrọghachi ndị ohu ha hapụburu. (Jere. 34:11) Ihe ọ pụtara bụ na mgbe ndị Juu nọ ná nsogbu, ha mere ka hà na-edebe iwu Chineke, dị ka à ga-asị na ọ ga-eme ka Chineke leghara omume ọjọọ ha anya. Ma mgbe nsogbu ahụ belatara, ha laghachiri n’ihe ọjọọ ha na-emebu. N’agbanyeghị na ha mere ka hà na-edebe Iwu Mozis, ihe ndị ha mechara mee gosiri na n’obi ha, ha achọghị ime ihe Chineke kwuru n’Okwu ya, ha achọghịkwa ka ọ kpụzie ha.

Olee ihe bara uru i nwere ike ịmụta n’ihe Jeremaya dere banyere ọkpụite? Olee otú Jehova si akpụzi anyị taa?

KWE KA JEHOVA KPỤZIE GỊ

15. Olee otú ị chọrọ ka Jehova kpụziruo gị? Nye ihe atụ.

15 Ọgbakọ Jehova nke zuru ụwa ọnụ na-eme ka anyị mata ihe Baịbụl kwuru anyị kwesịrị ime mgbe e nwere nsogbu. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịma ihe anyị kwesịrị ime ma nwanna kpasuo anyị iwe. (Efe. 4:32) Anyị nwere ike ikweta na ndụmọdụ Baịbụl ziri ezi, baakwa uru. Ma, olee ụdị ụrọ anyị ga-abụ? Ànyị ga-ekwe n’ezie ka Jehova kpụzie anyị? Ọ bụrụ na obi anyị akpọghị nkụ, anyị ga-agbanwe; Jehova bụ́ Ọkpụite Ukwu ga-akpụzi anyị ka anyị bụrụ arịa ga-abara ya uru. (Gụọ Ndị Rom 9:20, 21; 2 Timoti 2:20, 21.) Kama inwe ụdị obi ahụ Jehoyakim na ndị ahụ nwere ndị ohu n’oge Zedekaya nwere, anyị kwesịrị ikwe ka Jehova kpụzie anyị maka nzube kwesịrị nsọpụrụ.

16. Olee eziokwu dị mkpa Jeremaya ghọtara?

16 Chineke kpụzikwara Jeremaya. Gịnị ka onye amụma ahụ mere? Ihe o kwuru ga-enyere gị aka ịchọpụta. Ọ sịrị: “Ọ dịrịghị mmadụ nke na-eje ije ọbụna iduzi nzọụkwụ ya.” Ọ rịọziri, sị: “Jehova, . . . gbazie m.” (Jere. 10:23, 24) Ndị na-eto eto, ùnu ga-eṅomi Jeremaya? Ma eleghị anya, unu nwere ọtụtụ mkpebi unu ga-eme. Ụfọdụ ndị na-eto eto chọrọ iji aka ha ‘na-eduzi nzọụkwụ ha.’ Mgbe ị na-eme mkpebi, ị̀ ga-achọ ka Chineke duzie gị? Dị ka Jeremaya, ị̀ ga-eji obi umeala kweta na ụmụ mmadụ enweghị ike iduzi nzọụkwụ ha? Cheta na ị chọọ nduzi Chineke, ọ ga-akpụzi gị.

17-19. (a) Gịnị mere Jeremaya ji mee ogologo njem gaa Yufretis? (b) Olee ihe nwere ike ime ka o siere Jeremaya ike irubere Chineke isi? (ch) Gịnị ka Chineke ji ihe Jeremaya mere banyere ájị̀ ahụ kụzie?

17 Ihe ga-eme ka Jeremaya rụọ ọrụ ya bụ irube isi ná ntụziaka Chineke. A sị na ị bụ Jeremaya, ị̀ gaara eso ntụziaka ndị e nyere ya? E nwere mgbe Jehova gwara Jeremaya ka ọ gaa nweta ájị̀ ákwà linin, keekwa ya n’úkwù. Ihe ọzọ Chineke gwara ya bụ ka ọ gaa n’akụkụ Osimiri Yufretis. I lee anya na map, ị ga-achọpụta na njem ahụ dị ihe dị ka narị kilomita ise. Mgbe Jeremaya ruru ebe ahụ, ọ ga-ezo ájị̀ ahụ n’ebe gbawara agbawa na nkume dị elu, ma jiri ụkwụ laghachi Jeruselem. Chineke mechara gwa ya ka ọ gaghachi weta ájị̀ ahụ. (Gụọ Jeremaya 13:1-9.) Njem niile ahụ Jeremaya mere dị ihe dị ka otu puku kilomita na narị itoolu. O siiri ndị na-akatọ Baịbụl ike ikweta na Jeremaya ji ụkwụ mee ogologo njem ahụ were ya ọtụtụ ọnwa.b (Ezra 7:9) Ma ọ bụ ihe Chineke gwara Jeremaya ka o mee, ya emee ya.

18 Jiri anya nke uche gị hụ ebe onye amụma ahụ ji ụkwụ na-agafe ugwu ndị dị na Juda, ma eleghị anya si n’ọzara gawa Yufretis, naanị ka ọ gaa zoo ájị̀ linin. Ọ ga-abụ na ogologo oge ahụ ọ na-anọghị ya mere ka ndị agbata obi ya chọọ ịma ihe ọ gara ime. O jighị ájị̀ linin ahụ lọta. Chineke gwara ya ka o mee ogologo njem ahụ ọzọ gaa weta ájị̀ ahụ. “Ọ dịghị ihe ọ bụla a ga-eji ya eme” n’ihi na o mebiela. Chegodị echiche otú o si dị mfe ikwu, sị: ‘Ihe a akarịala. Olee uru ọ bara?’ Ma Jeremaya ekwughị otú ahụ n’ihi na Chineke akpụziela ya. Kama imewe mkpesa, o mere ihe a gwara ya!

Foto  dị na peeji nke 53

Gịnị mere anyị ji kwesị irube isi ná ntụziaka Jehova nyere anyị a sịgodị na anyị aghọtachaghị ihe mere o ji nye anyị ya?

19 Ọ bụ mgbe o mechara njem nke ugboro abụọ ka Chineke kọwaara ya ihe mere o ji gwa ya mee ihe ahụ. Ihe ahụ Jeremaya mere bụ ihe atụ ọ ga-eji buo amụma dị oké mkpa. Chineke gwara ya, sị: “Ndị ọjọọ a, ndị na-ajụ irube isi n’okwu m, ndị na-eje ije dị ka isi ike nke dị n’obi ha si dị, na-esokwa chi ọzọ dị iche iche iji na-efe ha ofufe ma na-akpọrọ ha isiala, ga-adị nnọọ ka ájị̀ ahụ ọ na-adịghị ihe a ga-eji ya eme.” (Jere. 13:10) Jehova si ụzọ ahụ magburu onwe ya kụziere ndị ya ihe! Otú ahụ Jeremaya si jiri obi ya dum rubere Jehova isi n’ihe yiri ka o nweghị ihe ọ bụ nyere aka mee ka okwu Jehova ruo ndị ya n’obi.—Jere. 13:11.

20. Gịnị mere isi ị na-erubere Chineke nwere ike iji ju ụfọdụ ndị anya, ma olee ihe i kwesịrị iburu n’obi?

20 Chineke anaghị agwa Ndị Kraịst taa ka ha jiri ụkwụ gaa ọtụtụ narị kilomita iji kụziere ndị mmadụ ihe. Ma ò nwere ike ịbụ na àgwà Ndị Kraịst ị na-akpa ga-eju ndị agbata obi gị ma ọ bụ ndị gị na ha na-emekọ ihe anya ma ọ bụ mee ka ha na-akatọ gị? O nwere ike ịbụ uwe gị na ejiji gị, ebe i kpebiri ịgụru akwụkwọ, ọrụ i kpebiri ịrụ ma ọ bụkwanụ otú i si ele mmanya na-egbu egbu anya. Dị ka Jeremaya, ị̀ ga-ekpebisi ike ime ihe Chineke kwuru? Ọ bụrụ na i kwe ka Chineke na-akpụzi obi gị, ihe ndị i kpebiri ime nwere ike ime ka ị gbaara ndị ọzọ ezigbo àmà. Otú ọ bụla o si dị, irube isi n’ihe Jehova kwuru n’Okwu ya na ime ihe o si n’aka ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na-agwa anyị ga-abara gị ezigbo uru. Kama ime ihe obi gị dị aghụghọ gwara gị, i kwesịrị ime ka Jeremaya. N’ihi ya, kpebisie ike ikwe ka Chineke na-akpụzi gị; kwe ka ọ na-akpụzi gị ka ị bụrụ arịa kwesịrị nsọpụrụ ọ ga-eji na-arụ ọrụ ruo mgbe ebighị ebi.

Gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị lụso ọnwụnwa si n’aka Setan na ụwa ya na obi anyị na-ezughị okè ọgụ?

a Otú e si sụgharịa ya na Baịbụl ọzọ [a kpọrọ NET Bible (2005)] bụ: “Ekwela ka e mee ka i yie ụwa dị ugbu a.” Ihe e dere n’ala ala peeji ya bụ: “Amaokwu a na-akụziri anyị na a na-eji nwayọọ nwayọọ eme ka mmadụ ‘yie’ ụwa dị ugbu a, n’ihi na o gosiri na ọ bụ ihe nwere ike ime mmadụ, onye ahụ aghara ịma. Ma, . . . mmadụ nwere ike ịma na e meela ka ọ malite iyi ụwa. Ọtụtụ mgbe, ihe abụọ ahụ nwere ike ime mmadụ.”

b Ụfọdụ kwuru na ọ bụghị Yufretis ka Jeremaya gara, kama na ọ bụ ebe ọzọ dị nso. N’ihi gịnị? Otu ọkà mmụta kwuru, sị: “Ihe bụ́ isi mere ha ji na-ekwu ihe ahụ megidere Baịbụl bụ ka a ghara ikwu na Jeremaya si na Jeruselem gaa Yufretis ugboro abụọ.”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya