Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jr isi 15 p. 182-192
  • “Apụghị M Ịgbachi Nkịtị”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Apụghị M Ịgbachi Nkịtị”
  • Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • NA-EKWUSA OZI ỌMA N’AGBANYEGHỊ NA ỌTỤTỤ NDỊ ENWEGHỊ MMASỊ
  • O NWEGHỊ IHE NDỊ MMEGIDE MERE ANYỊ NKE GA-ADỊRU MGBE EBIGHỊ EBI
  • ‘ATỤLA ỤJỌ’
  • IHE E DERE KA Ọ BAARA GỊ URU
  • “Gwa Ha Okwu A”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Olee Ụdị Ndị Ị Ga-emeta Enyi?
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • “M Ga-eme Ka Mkpụrụ Obi Ike Gwụrụ Nwee Ume”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • “Etinyewo M Okwu M n’Ọnụ Gị”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
jr isi 15 p. 182-192

ISI NKE IRI NA ISE

“Apụghị M Ịgbachi Nkịtị”

1. Gịnị mere Jeremaya na ndị amụma ndị ọzọ agbachighị nkịtị?

MALITE n’afọ 647 T.O.A., ihe a na-anụ n’ámá nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem bụ “Nụrụnụ okwu Jehova.” Jeremaya bụ́ onye amụma Chineke adaghị mbà. Ọbụna mgbe e bibiri obodo ahụ ka afọ iri anọ gachara, ọ gwara ha okwu ahụ ọzọ. (Jere. 2:4; 42:15) Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile zigaara ndị Juu ndị amụma ya iji hụ na ha nụrụ ndụmọdụ ya ma chegharịa. Dị ka e bu ụzọ kwuo n’akwụkwọ a, Jeremaya pụrụ iche ná ndị ahụ bụ́ ọnụ na-ekwuru Chineke. Mgbe Chineke na-enye Jeremaya ọrụ, ọ gwara ya, sị: “Bilie gwa ha ihe niile m na-enye gị n’iwu. Atụla ụjọ n’ihi ha.” (Jere. 1:17) Ọrụ ahụ adịghị mfe. A tara Jeremaya ahụhụ. Obi adịghịkwa ya mma mgbe ụfọdụ. Ma n’agbanyeghị ọnwụnwa ahụ niile, ọ rụchara ọrụ ahụ Chineke nyere ya. O kwuru, sị: “Obi m na-agba ghara ghara. Apụghị m ịgbachi nkịtị.”—Jere. 4:19.

2, 3. (a) Olee otú ndị na-eso ụzọ Jizọs si ṅomie Jeremaya? (b) Gịnị mere i ji kwesị iṅomi ihe nlereanya Jeremaya?

2 Otú Jeremaya si rụọ ọrụ ibu amụma ya bụ ihe nlereanya ndị ohu Jehova ga-eṅomi. (Jems 5:10) Obere oge ka Pentikọst nke afọ 33 O.A. gachara, ndị na-achị ndị Juu nwụchiri ndịozi bụ́ Pita na Jọn ma nye ha iwu ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma. Ị manụ na ha zara ha, sị: “Anyị apụghị ịkwụsị ikwu banyere ihe ndị anyị hụrụ na ihe ndị anyị nụrụ.” (Ọrụ 4:19, 20) Mgbe ndị ọchịchị ahụ yichara ha egwu na a ga-eme ha nke ka njọ n’oge ọzọ, ha hapụrụ Pita na Jọn. Ị manụ ihe ndị ikom ahụ kwesịrị ntụkwasị obi mere. Ha enweghị ike ịkwụsị ikwusa ozi ọma, ha akwụsịghịkwa.

3 Ị̀ hụla otú ihe ahụ Pita na Jọn kwuru n’Ọrụ Ndịozi 4:20 si gosi na ha ṅomiri ịnụ ọkụ n’obi Jeremaya? Ebe ị bụ onye ozi Jehova Chineke n’oge ikpeazụ a dị oké egwu, ọ̀ bụ na i kpebisighị ike otú ahụ na o nweghị ihe ga-eme ka ị gbachie nkịtị? Ka anyị hụ otú anyị nwere ike isi nwee obi ike dị ka Jeremaya ma na-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na ọnọdụ ụwa a na-aka njọ.

NA-EKWUSA OZI ỌMA N’AGBANYEGHỊ NA ỌTỤTỤ NDỊ ENWEGHỊ MMASỊ

4. Gịnị ka ọtụtụ ndị kwuru na Jeruselem oge ochie?

4 Ọ̀ bụ na obi esighị gị ike na ozi kacha mma ndị mmadụ nwere ike ịnụ taa bụ nkwa Chineke kwere na ya ga-esi n’ọchịchị Ọkpara ya mee ka e nwee oge magburu onwe ya n’ọdịnihu? N’agbanyeghị nke ahụ, ọtụtụ ndị taa na-ekwu ihe ahụ ụfọdụ ndị Juu gwara Jeremaya, sị: “Anyị agaghị ege ntị n’okwu ị gwara anyị n’aha Jehova.” (Jere. 29:19; 44:16) Jeremaya nụrụ ụdị okwu ahụ ọtụtụ ugboro. Ọtụtụ ndị na-agwakwa Ndịàmà Jehova otú ahụ taa. Ha na-asị, “Achọghị m ịnụ.” Ọ bụrụ na ọtụtụ ndị enweghị mmasị n’ozi ọma, o nwere ike ime ka ndị nkwusa Alaeze daa mbà. Ọ bụrụ na ọ dị otú ahụ n’ókèala unu, nke mere ka ụfọdụ ndị nkwusa n’ọgbakọ unu ma ọ bụkwanụ gị onwe gị na-ada mbà, gịnị ka e nwere ike ime?

5. (a) Olee ihe Jeremaya ghọtara n’agbanyeghị na ndị mmadụ enweghị mmasị n’ozi ya? (b) Gịnị mere ndị na-enweghị mmasị n’ozi ọma ji nọrọ n’ezigbo nsogbu?

5 Chegodị echiche banyere ihe Jeremaya chere mgbe ọtụtụ ndị Juda na-enweghị mmasị n’ozi ọ na-ezi ha. Mgbe Jeremaya ka malitere ọrụ ya amalite, Jehova gwara ya banyere mbibi ọ ga-eme ka ọ bịakwasị ndị na-eme ihe ọjọọ. (Gụọ Jeremaya 4:23-26.) Onye amụma ahụ ghọtara na ihe ga-eme ka ọtụtụ puku mmadụ dị ndụ bụ ige ntị n’ihe ọ ga-agwa ha na ime ya eme. Ndị mmadụ nọ n’ọnọdụ yiri ya taa, tinyere ndị bi n’ókèala unu. Jizọs kwuru banyere “ụbọchị” Chineke ga-ekpe ụwa ọjọọ a ikpe, sị: “Ọ ga-abịakwasị ndị niile bi n’elu ụwa niile. Ya mere, mụrụnụ anya, na-arịọsikwanụ arịrịọ ike mgbe niile ka unu wee nwee ike ịgbanahụ ihe ndị a niile a kara aka na ha ga-eme, nakwa n’iguzo n’ihu Nwa nke mmadụ.” (Luk 21:34-36) Ihe ahụ Jizọs kwuru nwere ike ime ka ị ghọta na ndị jụrụ ozi ọma nọ n’ezigbo nsogbu.

NDỊ NA-ENWEGHỊ MMASỊ NWERE IKE ỊMALITE INWE MMASỊ

Na Niu Ziland, otu nwaanyị Ndịàmà Jehova bịara n’ụlọ ya izi ozi ọma kwuru na ya egetụbeghị ha ntị, ma ọ chọziri ige ntị. N’izu ahụ, ọ gara mgbe a na-eli otu nwanna nwaanyị n’ihi na di ya na di nwanna nwaanyị ahụ nwụrụ anwụ na-arụkọ ọrụ. Nwaanyị ahụ kwuru na ọtụtụ ndị bịara olili ahụ gwara nwanna nwoke ahụ nwunye ya nwụrụ okwu ma kasie ya obi. O kwukwara na otú e si jiri Baịbụl kọwaa olileanya mbilite n’ọnwụ nke ọma dabara adaba.

Nwaanyị ahụ kwuru na ya na-azụ ndị nọọsụ, bụ́ ndị na-elekọta ndị a ma na ọrịa ha ga-egbu ha. N’ihi olili ahụ nwaanyị ahụ gara, ọ gwara ndị nọọsụ ọ na-akụziri ihe ka ha na-aga mgbe ọ bụla Ndịàmà Jehova na-eli ozu. N’ihi gịnị? Ọ gwara Ndịàmà ahụ bịara izi ya ozi ọma na ya gwara ụmụ akwụkwọ ya na Ndịàmà Jehova na-akụzi ihe bụ́ ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ n’ezie, na-emekwa ka a mata olileanya magburu onwe ya nke ga-emezu n’ọdịnihu. O kwuru na ndị nọọsụ ndị ahụ ọ na-akụziri ihe nwere ike iji ihe ndị ahụ na-agba ndị ọrịa ha na-elekọta ume.

Ihe a merenụ gosiri na Jehova nwere ike inye mmadụ ‘obi ọ ga-eji mara ya,’ ọ bụrụgodị na ọ dịla anya onye ahụ gosiwara na ya enweghị mmasị n’ozi ọma anyị na-ekwusa. (Jere. 24:7) Ndị na-enweghị mmasị n’ókèala unu nwere ike ịmalite ige ntị.

Foto dị na peeji nke 184

6. Gịnị mere i ji kwesị ịna-ezi onye ọ bụla ozi ọma, ma ndị na-enwechaghị mmasị?

6 Otú ọ dị, ndị nwere mmasị ma gee ntị n’ozi ọma ga-erite uru na-enweghị atụ ma ọ bụrụ na ha emee ihe Jehova kwuru, bụ́ nke anyị na-agwa ha. Chineke na-ezi anyị ụzọ anyị ga-esi lanahụ mbibi ma banye n’ụwa ọhụrụ ya. E nwere otú o si yie ozi Jeremaya kwusara. Ndị bi na Juda nwere ike ịlanahụ mbibi. (Gụọ Jeremaya 26:2, 3.) Jeremaya ji ọtụtụ afọ nyere ha aka, na-agwa ha ka ha ‘gee ntị ma hapụ ụzọ ọjọọ ha,’ ka ha meekwa ihe ezi Chineke kwuru. Anyị amaghị mmadụ ole chegharịrịnụ ma hapụ ụzọ ọjọọ ha n’ihi ozi onye amụma ahụ ziri ha. Ma ụfọdụ chegharịrị. Ọtụtụ ndị emeekwala otú ahụ n’oge anyị a. Ka anyị na-ekwusa ozi ọma, anyị na-anụkarị otú ndị na-enwebughị mmasị si malite ige ntị n’ozi ọma. (Gụọ igbe dị na peeji nke 184, bụ́ “Ndị Na-enweghị Mmasị Nwere Ike Ịmalite Inwe Mmasị.”) Ọ̀ bụ na nke ahụ ekwesịghị imekwu ka anyị nọsie ike na-ekwusa ozi ọma a na-enye ndụ?

Gịnị mere i ji kpebisie ike ịna-ekwusa ozi ọma n’agbanyeghị na ọtụtụ ndị enweghị mmasị?

O NWEGHỊ IHE NDỊ MMEGIDE MERE ANYỊ NKE GA-ADỊRU MGBE EBIGHỊ EBI

7. Olee otú ndị iro si gbalịa ịkwụsị ọrụ ibu amụma ahụ Jeremaya rụrụ?

7 Otu ihe ị ga-ahụ n’ozi Jeremaya bụ otú ndị mmegide si gbalịa ọtụtụ ugboro igbu ya ma kwụsị ọrụ ya. Ndị amụma ụgha nọ n’ihu ndị mmadụ kwuo ihe megidere ozi ọ na-ekwusa. (Jere. 14:13-16) Ka Jeremaya na-aga n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem, ndị guzocha n’ụzọ nọ na-akparị ya ma na-akwa ya emo. (Jere. 15:10) Ụfọdụ ndị iro ya chepụtara ụzọ ndị ọzọ ha ga-esi mebie aha ya. (Jere. 18:18) Ndị ọzọ gbakwara asịrị iji mee ka ndị nwere ezi obi ghara ige ntị n’eziokwu ahụ Jeremaya na-ekwusa, bụ́ nke Chineke gwara ya. (Ákwá 3:61, 62) Ò mere ka Jeremaya daa mbà? Mbanụ. Kama nke ahụ, ọ nọgidere na-ezisa ozi ahụ. Olee otú o si nọsie ike n’ozi ya?

8. Gịnị ka Jeremaya mere mgbe ndị mmegide nyekwuru ya nsogbu?

8 Ihe bụ́ isi nyeere Jeremaya aka ịlụso ndị niile na-emegide ya ọgụ bụ obi ọ tụkwasịrị Jehova. Mgbe Jeremaya malitere ozi ya, Chineke gwara ya na ya ga-akwado ya ma chebe ya. (Gụọ Jeremaya 1:18, 19.) Jeremaya tụkwasịrị obi ná nkwa ahụ. Jehova kwadokwara ya ma chebe ya. Ka ndị mmegide nyekwuru ya nsogbu ma na-emesikwu ya ike, o nwekwuru obi ike na ntachi obi. Ọ tụghịkwa ha egwu. Ka anyị hụ otú obi ike na ntachi obi si bara ya ezigbo uru.

9, 10. Olee ihe ndị mere ná ndụ Jeremaya, bụ́ ndị kwesịrị ịgba gị ume inwe obi ike?

9 O nwere mgbe ndị nchụàjà na ndị amụma bụ́ ndị nnupụisi kpọgara Jeremaya n’ihu ndị isi Juda ka ha gbuo ya. Egwu ha yiri Jeremaya ò mere ka ọ kwụsị ọrụ ya? Mbanụ. Ihe o kwuru kụghasịrị ebubo ndị ahụ si n’ezi ofufe dapụ boro ya, nke mere ka a ghara igbu ya.—Gụọ Jeremaya 26:11-16; Luk 21:12-15.

10 Cheta na mgbe Pash-họ, bụ́ onye na-eje ozi n’ụlọ nsọ, nụrụ ozi kpụ ọkụ n’ọnụ onye amụma ahụ ziri, ọ kpọchiri ya n’ọtọsị. Ọ ga-abụrịrị na Pash-họ bu n’obi na ịta Jeremaya ahụhụ ga-akụziri ya ihe, mee ka o mechie ọnụ. N’ihi ya, Pash-họ hapụrụ ya n’echi ya. Ma n’agbanyeghị na ahụhụ ahụ a tara Jeremaya ka na-egbu ya mgbu, ọ gwara Pash-họ hoo haa ikpe Jehova mara ya. Ahụhụ a tara Jeremaya emeghị ka o mechie ọnụ! (Jere. 20:1-6) N’ihi gịnị? Jeremaya gwara anyị, sị: “Jehova nọnyeere m dị ka dike dị egwu. Ọ bụ ya mere ndị na-akpagbu m ga-eji sụọ ngọngọ wee ghara imeri.” (Jere. 20:11) Ọbụna mgbe Jeremaya nọ n’ihu ndị mmegide dị obi ọjọọ, ụjọ atụghị ya. Obi ọ tụkwasịrị Jehova kwesịrị ekwesị. I kwesịkwara ime otú ahụ.

11, 12. (a) Olee otú Jeremaya si gosi na ya nwere ezi uche mgbe Hananaya megidere ya? (b) Olee uru o nwere ike ịba ma ọ bụrụ na ị ‘na-ejide onwe gị mgbe ọnọdụ dị njọ’?

11 Anyị kwesịrị icheta na Jeremaya abụghị onye okpukpe ya na-agba ara. O gosiri na o nwere ezi uche mgbe ndị mmadụ na-emegide ya. Ọ ma mgbe o kwesịrị isi n’ebe ha nọ pụọ. Dị ka ihe atụ, chegodị ihe ya na Hananaya jere. Mgbe onye amụma ụgha ahụ nọ n’ihu ndị mmadụ kwuo na amụma ahụ Jehova si n’ọnụ Jeremaya buo abụghị eziokwu, Jeremaya baara ya mba ma kọwaa otú e si amata ezigbo onye amụma. Jeremaya nya osisi yok n’olu iji gosi na ndị Babịlọn ga-achị ndị Juu; Hananaya naara Jeremaya yok ahụ n’ike ma gbajie ya. Ònye ma ihe ọzọ Hananaya ga-eme? Gịnịkwa ka Jeremaya mere? Baịbụl kwuru, sị: “Jeremaya onye amụma wee gawara onwe ya.” N’ezie, Jeremaya si ebe ahụ pụọ. Jehova mechara gwa Jeremaya ka ọ gaghachi gwa Hananaya ihe Chineke ga-eme, ya bụ na eze Babịlọn ga-adọrọ ndị Juu n’agha nakwa na a ga-egbu Hananaya.—Jere. 28:1-17.

12 Akụkọ a e si n’ike mmụọ nsọ dee mere ka o doo anya na mgbe anyị na-ekwusa ozi ọma, anyị kwesịrị inwe ma obi ike ma ezi uche. Ọ bụrụ na onye anyị gara n’ụlọ ya ekwetaghị ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru ma wewe iwe, chọọdị imerụ anyị ahụ́, anyị nwere ike iji akọ si ebe ahụ pụọ ma gaa n’ụlọ ọzọ. Ọ baghị uru ka anyị na onye ọ bụla rụwa ụka na-enweghị isi n’ihi ozi ọma Alaeze Chineke. Ọ bụrụ na anyị ‘na-ejide onwe anyị mgbe ọnọdụ dị njọ,’ anyị agaghị eme ka ụzọ chie, nke ga-eme ka anyị ghara inyere onye ahụ aka n’oge ọzọ obi nwere ike ịdị ya mma.—Gụọ 2 Timoti 2:23-25; Ilu 17:14.

Foto dị na peeji nke 187

Ka anyị na-ekwusa ozi ọma, gịnị mere ịtụkwasị Jehova obi ji dị ezigbo mkpa? Gịnị mere anyị ji kwesị inwe ma obi ike ma ezi uche?

‘ATỤLA ỤJỌ’

13. Gịnị mere Jehova ji gwa Jeremaya: ‘Atụla ụjọ,’ n’ihi gịnịkwa ka anyị ji kwesị ịtụle ihe ahụ ọ gwara ya?

13 Ihe isi ike e nwere na Jeruselem tupu e bibie ya n’afọ 607 T.O.A. metụtara ezi ndị na-efe Chineke. N’ihi ya, i nwere ike ịghọta ihe mere Chineke ji gwa Jeremaya, sị: ‘Atụla ụjọ.’ (Jere. 1:8; Ákwá 3:57) Jehova mere ka ọ gwa ndị ọzọ na-efe ya otu ihe ahụ iji gbaa ha ume. (Gụọ Jeremaya 46:27.) Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? N’oge ọgwụgwụ a dị oké egwu, ụjọ nwere ike ịtụ anyị mgbe ụfọdụ. Mgbe ụdị ihe ahụ mere, ànyị ga-ege Jehova ntị, bụ́ onye na-agwa anyị, sị: ‘Atụla ụjọ’? Anyị ebula ụzọ tụlee n’akwụkwọ a otú Chineke si kwado Jeremaya n’oge ahụ dị oké egwu. Ná nkenke, ka anyị tụleghachi ihe mere mgbe ahụ, iji hụ ihe anyị kwesịrị ịmụta na ya.

14, 15. (a) Olee ihe jọgburu onwe ya e mere Jeremaya? (b) Olee otú Jehova si mezuo nkwa o kwere na ya ga-echebe Jeremaya?

14 Mgbe ndị Babịlọn nọchibidoro Jeruselem, agụụ nyụrụ ndị Juu ịkpakwụ. N’oge na-adịghị anya, ọtụtụ ndị enweghị ihe oriri. (Jere. 37:21) A ka na-ekwu na ụnwụ nri dị, a kpọchie Jeremaya n’ebe o nwere ike ịnọ nwụọ. Ndị isi Juda mere ka Eze Zedekaya ahụ na-anaghị akwụ otu ebe kweta ihe ha kwuru. Ha mere ka a tụba Jeremaya n’olulu miri emi nke mmiri na-adịghị. Ihe juru ya bụ naanị apịtị. Ka Jeremaya na-emikpu n’apịtị ahụ, o nweghị mmadụ ọ bụla ga-anapụta ya. Ọ bụrụ na ọ bụ gị ka e mere otú ahụ, ọ̀ bụ na ụjọ agaghị atụ gị?—Jere. 38:4-6.

15 N’agbanyeghị na Jeremaya bụ mmadụ dị ka anyị, obi siri ya ike na Jehova agaghị ahapụ ya dị ka o kwuru. (Gụọ Jeremaya 15:20, 21.) Jehova ò mezuru ihe ahụ Jeremaya tụrụ anya ya? Anyị ma na o mere otú ahụ n’eziokwu. Chineke mere ka Ibed-melek nupụrụ ndị isi Juda isi ma gaa napụta Jeremaya. Eze nyere Ibed-melek ikike ịga dọpụta onye amụma ahụ n’olulu ahụ apịtị juru, ka ọ ghara ịnwụ n’ebe ahụ.—Jere. 38:7-13.

16. Olee nsogbu ụfọdụ Jehova napụtara ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi na ha?

16 Ọbụna mgbe e si n’olulu ahụ kpọpụta Jeremaya, nsogbu ya agwụbeghị. Ibed-melek rịọrọ eze n’ihi Jeremaya, sị: ‘Ụnwụ ga-egbu ya n’ebe ahụ ọ nọ. N’ihi na nri adịkwaghị n’obodo a.’ (Jere. 38:9) Nri dị ụkọ na Jeruselem, nke mere ka ọtụtụ ndị malite iri anụ mmadụ. Ma, Jehova zọpụtara onye amụma ya ọzọ. Jeremaya gwara Ibed-melek ihe Jehova kwuru banyere ya, nke bụ́ na ọ ga-echeberịrị Ibed-melek. (Jere. 39:16-18) Jeremaya echefughị na Jehova mesiri ya obi ike, sị: “Anọnyeere m gị ịnapụta gị.” (Jere. 1:8) Ebe ọ bụ na Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile na-echebe ndị ikom abụọ ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, o nweghị mgbe ndị iro ha na agụụ ga-egbu ha. Ha anwụghị n’obodo ahụ a ga-ebibi ebibi. Gịnị mere ihe a anyị na-atụle ji dị mkpa? Jehova kwere nkwa na ya ga-echebe ha. O mezukwara nkwa ya.—Jere. 40:1-4.

17. Gịnị mere obi ji kwesị isi gị ike ná nkwa ahụ Jehova kwere na ya ga-echebe ndị ohu ya?

17 Amụma ndị ahụ Jizọs buru banyere ọgwụgwụ nke usoro ihe dị ugbu a fọrọ ntakịrị ka ha mezuchaa. O nweghị ihe ga-eme ka ha ghara imezu. N’oge na-adịghị anya, ‘a ga-enwe ihe ịrịba ama dị iche iche n’anyanwụ na n’ọnwa nakwa na kpakpando, mba dị iche iche ga-anọkwa ná nhụjuanya n’elu ụwa, n’amaghị ihe ha ga-eme, ndị mmadụ ga-atụbọkwa n’ihi egwu nakwa n’ihi ihe ndị ha na-atụ anya ga-abịakwasị elu ụwa mmadụ bi.’ (Luk 21:25, 26) Anyị ga-echere ruo mgbe anyị ga-ahụ ihe ga-abụ ihe ịrịba ama ndị ahụ nakwa otú ha ga-esi mee ka ọtụtụ ndị tụọ egwu. Ihe ọ sọkwara ya mee, i kwesịghị inwe obi abụọ ma Jehova ò nwere ike ichebe ndị ya nakwa ma ọ̀ chọrọ ichebe ha. Ma ihe ọ ga-eme ndị iro ya ga-adị nnọọ iche. (Gụọ Jeremaya 8:20; 14:9.) Ọ bụrụgodị na e nwere ihe mere ndị ohu ya, nke mere ka o yie ka ha enweghị olileanya dị ka ndị nọ n’ala ala olulu nke gbara ọchịchịrị, o nwere ike ịnapụta ha! Chineke ga-emere ndị ya ihe ahụ o kwere Ibed-melek ná nkwa, nke bụ́: “‘M ga-emere gị ụzọ mgbapụ, mma agha agaghị egbu gị; mkpụrụ obi gị ga-abụrụ gị ihe nkwata, n’ihi na ị tụkwasịrị m obi,’ ka Jehova kwuru.”—Jere. 39:18.

Foto dị na peeji nke 190

IHE E DERE KA Ọ BAARA GỊ URU

18. (a) Olee ihe Chineke gwara Jeremaya nke gbanwere ndụ ya? (b) Gịnị ka i kwesịrị ịmụta n’iwu ahụ Chineke nyere na Jeremaya 1:7?

18 Chineke gwara Jeremaya, sị: “Gakwuru ndị niile m ga-eziga gị ka ị gakwuru; kwuokwa ihe niile m ga-enye gị iwu ka i kwuo.” (Jere. 1:7) Mgbe Jeremaya nụrụ iwu ahụ Chineke nyere ya, ndụ ya gbanwere kpamkpam. Malite mgbe ahụ gawa, ihe bụ́zi mkpa ya bụ ikwusa “okwu Jehova.” Okwu ahụ pụtara ọtụtụ ugboro n’akwụkwọ Jeremaya. N’isi nke ikpeazụ nke akwụkwọ Jeremaya, ọ kọrọ otú e si merie Jeruselem nakwa otú e si dọrọ Zedekaya bụ́ eze ikpeazụ ya n’agha. N’ezie, Jeremaya nọgidere na-agba ndị Juda ume ma na-akụziri ha ka ha na-erubere Jehova isi, ruo mgbe ihe ndị merenụ gosiri na ọ rụchaala ọrụ ya.

19, 20. (a) Gịnị mere i ji kwesị iṅomi ozi Jeremaya? (b) Gịnị jikọrọ ikwusa ozi ọma na inweta obi ụtọ na ọṅụ? (ch) Olee otú ịtụle akwụkwọ Jeremaya na Abụ Ákwá si baara gị uru?

19 E nwere ọtụtụ ihe mere ọrụ ahụ Jeremaya rụrụ ji yie ozi ọma Ndịàmà Jehova na-ezi ndị mmadụ taa. Ị na-efe ezi Chineke n’oge ikpe dị ka Jeremaya mere. I nwere ọrụ ndị ọzọ ị na-eji oge gị na ike gị arụ; ma ikwusa ozi ọma bụ ọrụ kacha mkpa i nwere ike ịrụ n’usoro ihe dị ugbu a. I si otú ahụ eto aha ukwu Chineke ma na-erubere ya isi n’ihi na ọ bụ naanị ya bụ Ọkaakaa Eluigwe na Ala. (Gụọ Abụ Ákwá 5:19.) Ọ bụrụ na ị na-enyere ndị ọzọ aka ịmara ezi Chineke na ihe ọ chọrọ ka ndị chọrọ inweta ndụ mee, ị na-egosi na ị hụrụ ndị agbata obi gị n’anya nke ukwuu.—Jere. 25:3-6.

20 Jeremaya kwuru banyere ọrụ ahụ Jehova nyere ya ka ọ rụọ, sị: “Okwu gị ruru m aka, m wee rie ya; okwu gị wee bụrụ ihe na-enye m ọṅụ na ihe na-eme ka obi tọọ m ụtọ; n’ihi na a kpọkwasịwo m aha gị, Jehova Chineke nke ụsụụ ndị agha.” (Jere. 15:16) Ndị niile ọ na-emetụ n’obi taa ikwusara ndị ọzọ banyere ezi Chineke ga-enweta ụdị obi ụtọ na ọṅụ ahụ. N’ihi ya, i kwesịrị ịnọgide na-ekwusa ozi Jehova otú ahụ Jeremaya mere.

Olee otú ihe Jeremaya na Ibed-melek mere nwere ike isi nyere gị aka inwe obi ike? Ka ị na-ekwusa ozi ọma, olee àgwà Jeremaya nke ị chọrọ iṅomi?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya