ISI NKE ISE
Olee Ụdị Ndị Ị Ga-emeta Enyi?
1, 2. (a) Olee nsogbu Ndị Kraịst na-enwe mgbe ha na ndị mmadụ na-emekọ ihe? (b) Gịnị mere anyị ji kwesị inwe mmasị n’ụdị ndị Jeremaya metara enyi?
Ọ BỤRỤ na ndị ọrụ ibe gị, ndị agbata obi gị ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe gị agwa gị ka ị bịa soro ha gbaa Krismas, gịnị ka ị ga-eme? Ọ́ bụrụkwanụ na onye ị na-arụrụ ọrụ agwa gị ghaa ụgha ma ọ bụ mee ihe megidere iwu, ma ọ bụkwanụ na ndị ọchịchị sịrị gị mee ihe Onye Kraịst na-ekwesịghị ime? O nwere ike ịbụ na akọnuche gị agaghị ekwe gị mee ụdị ihe ahụ, ọ bụrụgodị na e nwere ike ịchị gị ọchị ma ọ bụ taa gị ahụhụ ma ọ bụrụ na i meghị ya.
2 Anyị ga-achọpụta na e mere Jeremaya ụdị ihe ahụ ọtụtụ mgbe. N’ezie, ọ ga-abara gị uru ma ọ bụrụ na ị tụlee ụfọdụ ndị ha na Jeremaya mekọrọ ihe mgbe o jere ozi. Ụfọdụ n’ime ha gbalịrị ime ka ọ daa mbà n’ọrụ e dunyere ya. Ọrụ ya mere ka ha na ya mekọọ ihe ụfọdụ, ma ha abụghị ndị enyi ya. Ma ọ ga-abara gị uru ma ị tụlee ndị Jeremaya metara enyi, ya bụ, ndị kwadoro ya ma nyere ya aka ikwesị ntụkwasị obi. N’eziokwu, anyị nwere ike ịmụta ihe n’ụdị ndị Jeremaya metara enyi.
OLEE ỤDỊ NDỊ Ị NA-EMETA ENYI?
3. Olee ihe Zedekaya chọrọ ka Jeremaya gwa ya, gịnịkwa ka Jeremaya gwara ya?
3 Tupu e bibie Jeruselem, Eze Zedekaya jụrụ Jeremaya ase ọtụtụ ugboro. N’ihi gịnị? N’ihi na mgbe eze jụrụ ya ihe ga-eme ọchịchị ya n’ọdịnihu, ọ tụrụ anya na ọ ga-agwa ya ihe ga-eme ya obi ụtọ. Ọ chọrọ ka Jeremaya gwa ya na Chineke ga-anapụta Juda n’aka ndị iro ha. Zedekaya dunyere ndị ozi gara rịọ Jeremaya, sị: “Biko, jụọrọ anyị Jehova ase, n’ihi na Nebukadreza bụ́ eze Babịlọn na-ebuso anyị agha. Ikekwe, Jehova ga-arụrụ anyị ọrụ ya dị ebube, nke ga-eme ka [Nebukadreza] hapụ anyị.” (Jere. 21:2) Eze achọghị ime ihe Chineke kwuru, nke bụ́ ịchịliri Babịlọn aka elu. Otu ọkà mmụta ji Zedekaya tụnyere “onye ọrịa nke na-agakwuru dọkịta ugboro ugboro ka ọ gwa ya na ọ ga-agbake, ma o kweghị aṅụ ọgwụ ọ gwara ya ṅụọ.” Oleekwanụ banyere Jeremaya? Zedekaya gaara akpọ ya ezigbo mmadụ ma a sị na ọ gwara ya ihe ọ chọrọ ịnụ. Ma, gịnị mere Jeremaya agbanweghị ihe Chineke gwara ya kwuo, ka ihe katụrụ ya mma? Ọ bụ n’ihi na Jehova gwara ya ka ọ gwa ndị mmadụ na a ga-emeri Jeruselem.—Gụọ Jeremaya 32:1-5.
4. Olee mkpebi ndị anyị ga-eme n’ihe banyere imeta enyi n’ebe anyị na-arụ ọrụ nakwa n’ebe ndị ọzọ?
4 E nwere ike ikwu na ọnọdụ gị yiri nke Jeremaya. O doro anya na gị na ndị mmadụ na-emekọ ihe, ya bụ, ndị agbata obi gị, ndị ọrụ ibe gị ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe gị. Ma ì kwesịrị ikwe ka gị na ha bụrụ enyi ọ bụrụgodị na ha egosila na ha achọghị ịnụ ihe Chineke kwuru ma ọ bụ ime ya? Jeremaya agaghị asị na o nweghị ihe jikọrọ ya na Zedekaya; ọ ka bụ ya bụ eze, ọ bụ ezie na ọ chọghị ime ihe Chineke kwuru. Ma ọ bụghị iwu na Jeremaya ga-eme ihe na-ezighị ezi eze kwuru ma ọ bụ zụrụ ụtọ ya. N’ezie, Zedekaya gaara enye Jeremaya ọtụtụ onyinye, meekwa ka o rite uru ndị ọzọ ma a sị na o mere ihe ọ chọrọ. Ma Jeremaya ekweghị ka e jiri ịbụ enyi Zedekaya rata ya. N’ihi gịnị? N’ihi na Jeremaya achọghị ịgbanwe ihe Jehova gwara ya ka o mee. Ihe a Jeremaya mere kwesịrị ime ka anyị tụlee ma ndị anyị na-emeta enyi hà na-agba ya ume irubere Chineke isi. O nweghị ihe ga-eme ka anyị na ndị na-anaghị efe Chineke ghara imekọ ihe, ma ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ ma ụmụ akwụkwọ ibe anyị ma ndị agbata obi anyị. (1 Kọr. 5:9, 10) Ma, ị manụ na ọ bụrụ na ndị dị otú ahụ abụrụ enyi gị, o nwere ike ime ka ị ghọọ onye iro Chineke.
Ì KWESỊRỊ IMETA NDỊ NA-ATỤKWASỊGHỊ CHINEKE OBI ENYI?
5, 6. Gịnị ka ụfọdụ ndị mere iji mee ka Jeremaya kwụsị ibu amụma?
5 Ọ bụghị naanị Zedekaya gbalịrị ime ka Jeremaya mee ihe na-adịghị mma. Otu n’ime ndị na-ejere Zedekaya ozi ‘tiri’ Jeremaya ihe, ma eleghị anya, pịa ya ọnụ ụtarị iri atọ na itoolu. (Jere. 20:2; Diut. 25:3) Ụfọdụ ndị isi Juda mere Jeremaya ụdị ihe ahụ, ma “tụba ya n’ụlọ mkpọrọ.” A tụbara onye amụma ahụ n’ụlọ mkpọrọ dị n’okpuru ala. Mgbe ọ nọrọ ebe ahụ ọtụtụ ụbọchị, ọ tụrụ ụjọ na ya ga-anwụ n’ihi otú ebe ahụ si jọgbuo onwe ya. (Gụọ Jeremaya 37:3, 15, 16.) Mgbe a kpọpụtara Jeremaya n’ụlọ mkpọrọ ahụ, ndị isi ndị ọzọ gwara Zedekaya ka o gbuo ya. Ha kwuru na ọ na-eme ka ike gwụ ndị agha Juda. Ọ bụ ya mere ha ji tụba onye amụma ahụ n’olulu apịtị juru ka ọ nọrọ ebe ahụ nwụọ. (Jere. 38:1-4) Anyị agụọla na a napụtara Jeremaya n’ebe ahụ jọgburu onwe ya ọ gaara anọ nwụọ. Ma, ihe a niile gosiri otú ndị kwesịrị ịma nke a na-akọ sizi ghara ịtụkwasị okwu onye amụma Chineke obi; ha malitere imegide ya.
6 Ndị iro Jeremaya abụghị naanị ndị ọchịchị. N’oge ọzọ, ụfọdụ ndị si n’obodo Jeremaya bụ́ Anatọt kwuru na ha ga-egbu ya ma ọ bụrụ na ọ kwụsịghị ibu amụma. E nwere ike ikwu na ha bụ ndị agbata obi ya. (Jere. 11:21) Ihe ọ gwara ha were ha iwe. Ọ bụ ya mere ha ji gwa ya na ha ga-egbu ya. Ma Jeremaya metara Jehova enyi kama imeta ndị agbata obi ya enyi. Ndị ọzọ ekwughị nke ha naanị n’ọnụ. Mgbe Jeremaya nyaara yok n’olu iji gosi ndị Juu na ha kwesịrị irubere eze Babịlọn isi ma dị ndụ, Hananaya naara Jeremaya yok ahụ n’ike ma gbajie ya. Onye amụma ụgha ahụ kwuru na Jehova sịrị: ‘M ga-agbaji yok eze Babịlọn.’ Ọ bụ n’afọ ahụ ka Hananaya nwụrụ. Ị manụ onye amụma okwu ya mechara mezuo. (Jere. 28:1-11, 17) Mgbe e bibichara Jeruselem dị ka Jeremaya buru n’amụma, Johenan na ndị ọchịagha ndị ọzọ ekweghị erube isi n’iwu Chineke nyere, nke bụ́ ka ha nọrọ n’ala Juda. Ha gwara Jeremaya, sị: “Ọ bụ ụgha ka ị na-agha. Ọ bụghị Jehova bụ́ Chineke anyị ziri gị ka ị gwa anyị, sị, ‘Unu abanyela Ijipt gaa biri dị ka ndị ọbịa.’” Ha nupụụrụ Jehova isi, kpụrụ Jeremaya na Barọk gaa Ijipt.—Jere. 42:1–43:7.
Olee ụdị ndị ha na Jeremaya mekọrọ ihe? Gịnị ka ị mụtara n’àgwà ọma Jeremaya kpara?
7. Olee mkpebi i kwesịrị ime n’ihe banyere irubere Jehova isi?
7 Ruo ọtụtụ afọ, ndị na-atụkwasịghị Chineke obi na ndị iro gbara Jeremaya gburugburu. Chebara ihe o mere echiche. A sị na ọ chọrọ, ọ dịịrị ya mfe imeta ndị ahụ na-anaghị akwanyere Chineke na Okwu ya ùgwù enyi ebe ọ bụ na ha gbara ya gburugburu. Oleekwanụ banyere gị? E nwere ike gị na ụdị ndị ahụ gbara Jeremaya gburugburu emekọtụla ihe. Ma hà ji iwe na-emegide gị na Chineke gị ma ò yiri ka ha bụ ezigbo mmadụ, ì kwesịrị imeta ha enyi? Ọ̀ dị mma ka gị na ndị na-ejighị amụma Chineke kpọrọ ihe na-akpa? A sị na ọ bụ Jeremaya, ọ̀ gaara emeta ụdị ndị ahụ enyi, ya bụ, ndị omume ha na-emegide eziokwu ndị dị n’Okwu Chineke ma ọ bụ ndị tụkwasịrị mmadụ obi? (2 Ihe 19:2) Chineke gwara Jeremaya hoo haa ihe ga-eme ma ọ bụrụ na mmadụ atụkwasị mmadụ obi kama ịtụkwasị Chineke obi. (Gụọ Jeremaya 17:5, 6.) Gịnị ka i chere banyere ihe ahụ Jehova gwara Jeremaya?
8. Nye ihe atụ ụfọdụ iji gosi ọnwụnwa ndị nwere ike ịbịara Ndị Kraịst bi n’ebe i bi.
8 Ụfọdụ Ndị Kraịst chere na ihe ga-eme ka ọrụ ha ma ọ bụ ahịa ha na-aga aga bụ ịkpọ ndị ụwa bụ́ ndị ahịa ha oriri. Ma, ime otú ahụ ò nwere ike ịbụrụ Ndị Kraịst ahụ mkpakọrịta ọjọọ ma mee ka ha banye ná nsogbu ndị dị ka ikwu okwu rụrụ arụ ma ọ bụ ịṅụ oké mmanya? Ị̀ hụlanụ ihe mere ọtụtụ Ndị Kraịst nọ n’ụdị ọnọdụ ahụ ji kpebie izere mkpakọrịta ọjọọ ọ bụrụgodị na e nwere uru ego ọ ga-eme ka ha ghara irite? Ihe ọzọ yiri ya bụ na onye ị na-arụrụ ọrụ ma ọ bụ ndị ọrụ ibe gị nwere ike ịna-aghọgbu ndị ahịa. Ma ezi Ndị Kraịst anaghị eso ndị ọzọ eme ihe ọjọọ ha na-eme. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike isiri mmadụ ike ikpebi ihe ọ ga-eme n’ụdị ihe ahụ. Obi kwesịrị ịdị anyị ụtọ ma anyị cheta ndị dị ka Jeremaya, bụ́ onye kpara àgwà ọma mgbe niile, nke mere ka o nwee akọnuche dị ọcha. Nke ka nke, o mere ka ya na Chineke dị ná mma.
9. Olee nsogbu dị n’ịchọ ime ihe ndị ọzọ na-eme?
9 N’ihi amụma Jeremaya nọ na-ebu nakwa ihe o kweere, ụfọdụ ndị Juu ibe ya kparịrị ya. (Jere. 18:18) N’agbanyeghị nke ahụ, o kpebiri ịdị iche. O ṅomighị ndị Juu ibe ya, bụ́ ndị soro ‘ụzọ ndị ọzọ na-eso.’ (Jere. 8:5, 6) E nwedịrị mgbe ụfọdụ Jeremaya ‘na-anọ naanị ya.’ Ọ kaara ya mma ịnọ naanị ya, kama ya na ndị ọjọọ ga-anọ, bụ́ ndị nwere ike ime ka ọ mụta àgwà ọjọọ. (Gụọ Jeremaya 9:4, 5; 15:17.) Gịnwa kwanụ? Oge anyị a yiri oge Jeremaya n’ihi na ọtụtụ ndị anaghị asọpụrụ Chineke. Kemgbe ụwa, ndị ohu Jehova na-akpachara anya n’ụdị ndị ha na-emeta enyi. Ọ pụtaghị na Jeremaya enweghị ndị enyi. E nwere ụfọdụ ndị kwuchitere ọnụ ya ma kwado ya. Olee ndị ha bụ? Ịma ndị ha bụ ga-abara gị ezigbo uru.
OLEE ỤDỊ NDỊ JEREMAYA METARA ENYI?
10, 11. (a) Olee ụkpụrụ ndị Jeremaya ji kpebie ndị ọ ga-emeta enyi? (b) Olee ndị bụ́ ndị enyi Jeremaya, oleekwa ajụjụ ndị a jụrụ banyere ha?
10 Olee ụdị ndị Jeremaya kwesịrị imeta enyi? Jeremaya mere ihe Jehova gwara ya, nke bụ́ ịkatọ ndị ọjọọ ugboro ugboro, ya bụ, ndị aghụghọ, ndị na-ekpe ikpe na-ezighị ezi, ndị na-eme ihe ike, ndị obi kpọrọ nkụ, na ndị na-eme omume rụrụ arụ, bụ́ ndị hapụrụ ezi ofufe gaa fewe arụsị, nke mere ka ha yie ndị na-agba akwụna. Ọ gwara ndị Juu ibe ya, sị: “Biko, onye ọ bụla n’ime unu hapụ ụzọ ọjọọ ya, meekwanụ ka ụzọ unu na omume unu dị mma.” (Jere. 18:11) Ọbụna mgbe e bibichara Jeruselem, Jeremaya toro Chineke maka “obiọma” ya, “ebere” ya, na “ikwesị ntụkwasị obi” ya. (Ákwá 3:22-24) Jeremaya chọrọ ka ndị enyi ya bụrụ naanị ndị tụkwasịrị Jehova obi.—Gụọ Jeremaya 17:7.
11 Anyị ma ụfọdụ ndị Jeremaya metara enyi ma ọ bụ ndị ha na ya dị n’ezigbo mma. Ụfọdụ n’ime ndị enyi ya bụ Ibed-melek, Barọk, Seraya, na ụmụ Shefan. Anyị nwere ike ịjụ, sị: ‘Olee ụdị ndị ha bụ? Gịnị ka ha na Jeremaya mekọrọ? Gịnị mere a ga-eji kwuo na ha bụ ezigbo ndị enyi ya? Oleekwa otú ha si nyere Jeremaya aka ịnọsi ike n’ozi Chineke?’ Ka anyị buru ọnọdụ anyị n’obi chọpụta azịza nke ajụjụ ndị a.
12. (a) Gịnị jikọrọ Jeremaya na Barọk, bụ́ ndị e sere na peeji nke 58? (b) Ònye bụ Seraya, oleekwa ihe anyị ma banyere ya?
12 Ọ dị ka onye kacha bụrụ enyi ya bụ Barọk nwa Neraya. Jeremaya tụkwasịrị ya obi ma nye ya ọrụ idekọ ihe niile Jehova kwuru, bụ́ ihe Jeremaya nọ na-agwa ya, ya ana-ede. Ọrụ ọzọ o nyere ya bụ ịga gụpụtara ndị mmadụ akwụkwọ mpịakọta o dere. O bu ụzọ gụpụta ya n’ihu ndị Juda niile ma mechaa gaa gụpụta ya n’ihu ndị isi ha. (Jere. 36:4-8, 14, 15) Dị ka Jeremaya, Barọk nwere okwukwe siri ike na ihe Chineke buru n’amụma ga-emezu. A kpagburu ha abụọ n’ime afọ iri na asatọ e nwere ọgba aghara na Juda tupu e bibie ya. Ọtụtụ mgbe, ha rụkọrọ ọrụ Chineke ọnụ. Ha nwechara ihe isi ike, e zookwa ha ka ndị iro ha ghara inweta ha. Jehova gbakwara ha abụọ ume. Ọ dị ka Barọk ò si n’ezinụlọ ndị odeakwụkwọ a ma ama na Juda. Akwụkwọ Nsọ kpọrọ ya “odeakwụkwọ.” Nwanne ya nwoke bụ́ Seraya nọkwa n’ọkwá dị elu n’ọchịchị obodo Juda. Dịkwa ka Barọk, Seraya na Jeremaya mechara rụkọọ ọrụ, nke bụ́ ịgwa ndị mmadụ amụma Jehova buru. (Jere. 36:32; 51:59-64) Ọ ga-abụrịrị na otú ahụ ndị ikom abụọ ahụ bụ́ ụmụ Neraya si wepụta onwe ha ha na Jeremaya arụkọọ ọrụ n’oge ahụ siri ike mere ka obi sie onye amụma ahụ ike ma gbaa ya ume. Ndị gị na ha ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi taa nwekwara ike ime ka obi sie gị ike ma gbaa gị ume.
Olee ihe i nwere ike ịmụta n’ụdị ndị Jeremaya metara enyi?
13. Dị ka e gosiri na peeji nke 63, olee otú Ibed-melek si gosi na ya bụ ezigbo enyi Jeremaya?
13 Ibed-melek bụ onye ọzọ ya na Jeremaya bụ enyi. Mgbe ndị isi Juda iwe ji tụbara Jeremaya n’olulu mmiri na-adịghị ka ọ nwụọ n’ebe ahụ, onye katara obi nyere ya aka bụ onye mbịarambịa bụ́ Ibed-melek onye Itiopia. Ọ bụ ọnaozi, ya bụ, onye na-eje ozi n’ụlọ eze. Ọ gakwuuru Zedekaya n’ihu ọha, mgbe eze nọ ọdụ n’Ọnụ Ụzọ Ámá Benjamin. Ibed-melek ji obi ike gwa Zedekaya ka o nye ya ikike ịga kpọpụta Jeremaya n’olulu ahụ apịtị juru. Ọ kpọọrọ ndị ikom iri atọ gaa, nke na-egosi na Ibed-melek ma na ndị iro Jeremaya nwere ike ịbịa ka ha gbochie ya. (Jere. 38:7-13) Anyị amaghị otú Ibed-melek na Jeremaya mekọruru ihe. Ma ebe ha abụọ bụ enyi Jehova, o ziri ezi ikwu na ha abụọ bụ ezigbo enyi. Ibed-melek ma na Jeremaya bụ onye amụma Jehova. O kwuru na ihe ahụ ndị isi Juda mere bụ “ihe ọjọọ.” Ọ dịkwa njikere ime ihe ziri ezi, nke nwere ike ime ka ọ baa ná nsogbu. N’eziokwu, Ibed-melek bụ ezigbo mmadụ. Ihe gosiri na ọ bụ ezigbo mmadụ bụ na Jehova gwara ya, sị: “M ga-anapụta gị [n’ụbọchị ọdachi ga-adakwasị Jeruselem] . . . n’ihi na ị tụkwasịrị m obi.” (Gụọ Jeremaya 39:15-18.) N’ezie, Jehova jara ya mma! Ọ́ bụghị ụdị enyi ahụ ka ị chọrọ?
14. Olee ihe anyị ma banyere ezinụlọ Shefan na ihe ha na Jeremaya mekọrọ?
14 E nwere mmadụ anọ ndị ọzọ bụ́ ndị enyi Jeremaya. Atọ n’ime ha bụ ụmụ Shefan, otu abụrụ nwa nwa ya. Ha si n’ezinụlọ a ma ama na Juda, n’ihi na n’oge Eze Josaya, ọ bụ Shefan bụ odeakwụkwọ ya. Mgbe mbụ ndị iro Jeremaya onye amụma chọrọ igbu ya, ‘ọ bụ Ahaịkam nwa Shefan chebere ya ka a ghara inyefe ya n’aka ìgwè mmadụ ahụ.’ (Jere. 26:24) Ahaịkam nwere nwanne nwoke, nke aha ya bụ Gemaraya. Mgbe Barọk gụpụtaara ndị Juda ihe Chineke kwuru na ya ga-eme Juda na Izrel, nwa Gemaraya bụ́ Mịkaya nụrụ ya, gaa kọọrọ nna ya na ndị isi ndị ọzọ. Ebe ha ma ihe Jehoyakim nwere ike ime, ha gwara Jeremaya na Barọk ka ha gaa zoo. Mgbe eze na-anabataghị ozi Chineke ziri ya, Gemaraya so ná ndị rịọrọ ya ka ọ ghara ịgba akwụkwọ mpịakọta ahụ ọkụ. (Jere. 36:9-25) E nwere onye ọzọ bụ́ nwa Shefan aha ya bụ Elesa. Jeremaya si n’aka ya zigara ndị Juu ndị Babịlọn dọọrọ n’agha akwụkwọ ozi e dere amụma Chineke buru. (Jere. 29:1-3) N’ezinụlọ ahụ naanị, ụmụ atọ Shefan na nwa nwa ya kwadochara onye amụma Chineke. Chetụdị otú Jeremaya si jiri ndị ikom ahụ kpọrọ ihe! Ihe mere ha na ya ji bụrụ enyi abụghị na ụdị nri na mmanya na-amasị ha na-amasị ya ma ọ bụkwanụ na ụdị ntụrụndụ na-amasị ya na-amasị ha. E nwere ihe ka mkpa mere ha ji bụrụ ndị enyi.
LEZIE ANYA N’ỤDỊ NDỊ Ị NA-EMETA ENYI
15. Gịnị ka Jeremaya na-akụziri anyị banyere ndị anyị kwesịrị imeta enyi?
15 I nwere ike ịmụta ihe n’otú Jeremaya si mesoo ndị Juu ibe ya, ma ndị bụ́ ndị ọjọọ ma ndị bụ́ ezigbo mmadụ. Eze, ọtụtụ ndị isi, ndị amụma ụgha, na ndị ọchịagha nyere ya nsogbu ka ọ gbanwee ozi ya. Ma Jeremaya agbanweghị ozi ya. N’ihi ya, ha kpọrọ ya asị. Ma, mkpa Jeremaya abụghị otú ha na ya ga-esi bụrụ enyi. Kemgbe ụwa, ezigbo enyi ya bụ Jehova. Jeremaya dị njikere ikwesị ntụkwasị obi n’ebe Chineke nọ ọ bụrụgodị na ọ ga-eme ka ụfọdụ ndị kpọ ya asị. (Gụọ Abụ Ákwá 3:52-59.) Ma, anyị ahụla na ọ bụghị naanị Jeremaya kpebisiri ike ijere Jehova ozi.
16, 17. (a) Olee otú ezigbo enyi ohu Jehova nwere ike isi nyere ya aka? (b) Ebe ọ sọkwara gị biri, olee ebe ị ga-enweta ezigbo ndị enyi?
16 Ihe mere Ibed-melek ji bụrụ ezigbo enyi Jeremaya bụ na o nwere okwukwe na Jehova ma tụkwasị ya obi. Ibed-melek ji obi ike napụta Jeremaya n’eleghị anya n’azụ. Barọk gakwuuru Jeremaya ọtụtụ mgbe, ya na ya anọọ. O nyekwaara Jeremaya aka zie ndị mmadụ ozi Jehova. Taa, anyị hụrụ ezigbo ndị enyi anyị nọ n’ọgbakọ Ndị Kraịst n’anya otú ahụ a hụrụ ndị ikom ahụ. E nwere otu nwa agbọghọ aha ya bụ Kamerọn. Ọ bụ ọsụ ụzọ oge niile nke dị afọ iri abụọ. O nwere obi ụtọ dị ukwuu n’otú Kara, bụ́ nwanna nwaanyị ọzọ bụ́kwa ọsụ ụzọ, si nyere ya aka. Kamerọn kwuru, sị, “Kara gbara m ume ibute ofufe Jehova ụzọ ná ndụ m, ma n’omume ya ma n’okwu ọnụ ya.” Ebe Kara bi dị anya n’ebe Kamerọn bi. N’agbanyeghị nke ahụ, Kara na-akpọkarị ya n’ekwe ntị ma ọ bụ degara ya akwụkwọ ozi ka ọ mata otú o mere nakwa ka ha gbarịta ibe ha ume. Kamerọn kwuru, sị: “Ọ ma ihe niile banyere ezinụlọ anyị. Ọ ma mgbe nwanne m nwaanyị nwere nsogbu, marakwa otú o si siere m ike mgbe o mechara nupụ isi ma pụọ n’ọgbakọ. O nyeere m aka mgbe ihe ahụ niile na-eme. Amaghị m ihe m gaara eme ma a sị na ọ gbaghị m ume ma nyere m aka. N’eziokwu, otú o si kwado m tọgburu m atọgbu.”
17 N’ọgbakọ Ndị Kraịst, i nwere ike imeta ezigbo ndị enyi, ma ndị gị na ha bụ ọgbọ ma ndị ọzọ. Ha bụ ụmụnna gị ndị nwoke na ndị nwaanyị, bụ́ ndị kweere ihe i kweere, hụkwa Jehova n’anya otú ị hụrụ ya. Ha nwere olileanya i nwere. Ma eleghị anya, ụfọdụ ọnwụnwa na-abịara gị na-abịara ha. Gị na ha nwere ike ịrụ n’ozi ọma. Ha ga-agba gị ume mgbe ihe na-esiri gị ike, gị ana-emekwara ha otú ahụ. Ha ga-eso gị ṅụrịa ọṅụ mgbe i nwere ọganihu n’ozi Jehova. Ihe ọzọ bụ na gị na ha nwere ike ịbụ enyi ruo mgbe ebighị ebi.—Ilu 17:17; 18:24; 27:9.
18. Olee ihe ị mụtara n’ụdị ndị Jeremaya metara enyi?
18 Ihe anyị mụtara n’ụdị ndị Jeremaya metara enyi doro anya. Eziokwu a na-enweghị ike ịgbagha agbagha ị ga-eburu n’obi bụ na i nweghị ike ịnọsi ike n’ihe i kweere ma ọ bụrụ na ndị gị na ha na-akpa bụ ndị kweere ihe dị iche n’ihe Baịbụl na-akụzi. Ime ihe gosiri na anyị kwetara na okwu ahụ bụ eziokwu dị mkpa taa otú ahụ ọ dị n’oge Jeremaya. Jeremaya eṅomighị ọtụtụ ndị Juu ibe ya n’ihi na ọ chọrọ iji ikwesị ntụkwasị obi rụọ ọrụ ya ma nweta ngọzi Jehova. Ọ́ bụghị otú ahụ ka ị chọrọ ime? Ndị Jeremaya metara enyi bụ ndị kweere ihe o kweere nakwa ndị nyeere ya aka ịrụ ọrụ e nyere ya. N’ezie, Ndị Kraịst niile kwesịrị ntụkwasị obi taa kwesịrị ịmụta ihe n’aka Jeremaya banyere ụdị ndị ha kwesịrị imeta enyi!—Ilu 13:20; 22:17.
Olee otú i nwere ike isi ṅomie Jeremaya mgbe ị na-ekpebi ndị kwesịrị ịbụ enyi gị na ndị na-ekwesịghị ịbụ enyi gị?