Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 57 p. 138-p. 139 para. 1
  • Jehova Zigara Jeremaya Ka O Kwusaa Okwu Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jehova Zigara Jeremaya Ka O Kwusaa Okwu Ya
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jeremaya Akwụsịghị Ịgwa Ndị Mmadụ Ihe Jehova Kwuru
    Kụziere Ụmụ Gị Ihe
  • “Apụghị M Ịgbachi Nkịtị”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Olee Ụdị Ndị Ị Ga-emeta Enyi?
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • “Etinyewo M Okwu M n’Ọnụ Gị”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 57 p. 138-p. 139 para. 1
Ebe Jeremaya nọ n’ihu ndị okenye kụwaa ite ụrọ

ISI NKE 57

Jehova Zigara Jeremaya Ka O Kwusaa Okwu Ya

Jehova họọrọ Jeremaya ka ọ bụrụ onye amụma na Juda. Ọ gwara ya ka o kwusaara ndị Juda okwu ya ma dọọ ha aka ná ntị ka ha kwụsị ihe ọjọọ ha na-eme. Ma Jeremaya gwara ya, sị: ‘Jehova, abụ m nwata. Amaghị m ihe m ga-agwa ha agwa.’ Jehova gwara ya, sị: ‘Ụjọ atụla gị. M ga-agwa gị ihe ị ga-ekwu. M ga-enyere gị aka.’

Jehova gwara Jeremaya ka ọ kpọkọta ndị okenye Juda, nọrọkwa n’ihu ha kụwaa ite ụrọ ma kwuo, sị: ‘A ga-ebibi Jeruselem otú a m si kụwaa ite ụrọ a.’ Mgbe Jeremaya mere ihe ahụ Jehova gwara ya, ezigbo iwe were ndị okenye ahụ. Otu onye nchụàjà aha ya bụ Pash-họ tiri Jeremaya ihe ma tinye ya n’ọtọsị. Jeremaya nọgidere n’ọtọsị ahụ chi abọọ. Mgbe chi bọrọ, Pash-họ hapụrụ Jeremaya. Jeremaya kwuru, sị: ‘Ihe a akarịala. M ga-akwụsị ikwu gbasara Jehova.’ Ma, ọ̀ kwụsịrị ikwu gbasara ya? Mba. Jeremaya chebakwuuru ozi ya echiche ma kwuo, sị: ‘Okwu Jehova dị ka ọkụ na-ere m n’ime ahụ́. Agaghị m akwụsị ikwusa okwu ya.’ Jeremaya nọgidere na-adọ ndị Juda aka ná ntị.

Mgbe ọtụtụ afọ gachara, e nwere eze ọhụrụ na Juda. Ozi Jeremaya nọ na-ekwusa adịghị ndị nchụàjà na ndị amụma ụgha mma. Ha gwara ndị isi, sị: “E kwesịrị igbu nwoke a.” Jeremaya gwara ha, sị: ‘Ọ bụrụ na unu egbuo m, unu gburu onye aka ya dị ọcha. Ihe m na-agwa unu bụ ihe Jehova kwuru, ọ bụghị okwu nke m.’ Mgbe ndị isi nụrụ ihe a o kwuru, ha sịrị: “E kwesịghị igbu nwoke a.”

Jeremaya akwụsịghị ikwusa okwu Chineke. Ihe a were ndị isi Juda ezigbo iwe. Ha gwara eze ka o gbuo Jeremaya. Eze gwara ha ka ha mee Jeremaya ihe ọ bụla masịrị ha. Ha kpọọrọ Jeremaya tụba n’olulu miri emi nke pọtọpọtọ juru, chee na ọ ga-anọ ebe ahụ nwụọ. Jeremaya bidoro imikpu n’ime pọtọpọtọ ahụ.

Ebe Ibed-melek na ndị ha na ya so na-akpọpụta Jeremaya n’olulu

Otu nwoke na-eje ozi n’obí eze, onye aha ya bụ Ibed-melek, gaziri gwa eze, sị: ‘Ndị isi atụbala Jeremaya n’olulu. Anyị hapụ ya ebe ahụ, ọ ga-anwụ.’ Eze gwara Ibed-melek ka ọ kpọrọ ụmụ nwoke iri atọ gaa kpọpụta Jeremaya n’olulu ahụ. Jeremaya ekweghị ka ihe ọ bụla mee ka ọ kwụsị ikwusa okwu Jehova. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịna-eme ka Jeremaya?

“Mmadụ niile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m. Ma, ọ bụ onye tachiri obi ruo ọgwụgwụ ka a ga-azọpụta.”​—Matiu 10:22

Ajụjụ: Gịnị mere Jeremaya ji rubere Jehova isi, ma mgbe ọ bụ nwata? Olee ndị chọrọ ime ka Jeremaya kwụsị ikwusa okwu Jehova?

Jeremaya 1:1-19; 19:1-11; 20:1-13; 25:8-11; 26:7-16; 38:1-13

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya