Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • jr isi 1 p. 4-13
  • “Etinyewo M Okwu M n’Ọnụ Gị”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “Etinyewo M Okwu M n’Ọnụ Gị”
  • Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • CHINEKE HỌỌRỌ ONYE GA-EKWUCHITERE YA
  • JEREMAYA BỤ MMADỤ DỊ KA ANYỊ
  • GỊNỊ KA A GA-ATỤLE N’AKWỤKWỌ A?
  • “Apụghị M Ịgbachi Nkịtị”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Olee Ụdị Ndị Ị Ga-emeta Enyi?
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • “Gwa Ha Okwu A”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
  • Ị̀ Na-ajụ Kwa Ụbọchị, “Olee Ebe Jehova Nọ?”
    Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Chineke Si n’Ọnụ Jeremaya Na-agwa Anyị
jr isi 1 p. 4-13

ISI NKE MBỤ

“Etinyewo M Okwu M n’Ọnụ Gị”

1, 2. Gịnị mere obi ji sie gị ike na ihe Baịbụl kwuru ga-abara gị uru?

BAỊBỤL kwuru, sị: “E nwere enyi nke na-arapara n’ahụ́ karịa nwanne.” (Ilu 18:24) Ì nwere ụdị enyi ahụ? Ị na-atụkwasị ihe ezigbo enyi gị kwuru obi. Ya gwa gị ihe dị mma ma ọ bụ kwuo ihe ọ ga-eme, ị na-ekweta. Ya gwa gị ihe i kwesịrị imezi, o doro anya na ị ga-anabata ihe ọ gwara gị ma mee ya. O gosila gị mgbe niile na ọ chọrọ ka ihe dịrị gị mma, ọbụna mgbe ọ na-enye gị ndụmọdụ. Ọ chọrọ ka ihe gaziere gị. Ị chọkwara ka ọ na-emeso gị otú i si emeso ya, ka enyi gị na ya bụ ghara itisa.

2 E nwere ọtụtụ ihe mere a ga-eji kwuo na ndị Chineke ji dee akwụkwọ ndị dị na Baịbụl bụ ụdị ndị enyi ahụ. Ị na-ekweta ihe ha gwara gị. Obi siri gị ike na ihe ha kwuru ga-abara gị uru. Ọ bụ otú ahụ ka ndị Izrel oge ochie kwesịrị isi were ‘ndị ahụ kwuru ihe Chineke mere ka ha kwuo mgbe mmụọ nsọ na-edu ha.’ (2 Pita 1:20, 21) Ọ bụ Jeremaya ka Chineke ji dee akwụkwọ amụma kacha buo ibu. Ọ bụkwa ya dere Abụ Ákwá na akwụkwọ abụọ ọzọ dị na Baịbụl.

3, 4. Olee otú ụfọdụ ndị si ele akwụkwọ Jeremaya na Abụ Ákwá anya, ma gịnị mere na e kwesịghị isi otú ahụ na-ele ha anya? Nye ihe atụ.

3 Ma, o nwere ike ịbụ na ị chọpụtala na ụfọdụ ndị na-agụ Baịbụl chere na akwụkwọ ndị ahụ Jeremaya dere agbasaghị ha. Ha nwere ike iche na naanị ihe juru n’akwụkwọ Jeremaya na Abụ Ákwá bụ aka ná ntị a dọrọ ndị mmadụ na ihe ọjọọ ga-eme nakwa amụma e buru na mbibi na-abịa.a Ma, ọ̀ bụ otú ahụ ka e kwesịrị isi na-ele akwụkwọ Jeremaya na Abụ Ákwá anya?

4 N’eziokwu, Jeremaya ezoghị ọnụ mgbe ọ na-ede okwu e ji nye ndị mmadụ ndụmọdụ ma dọọ ha aka ná ntị. Ma, ị manụ na enyi na-emekwa otú ahụ mgbe ụfọdụ. Ọbụna Jizọs agbachighị nkịtị mgbe ndị enyi ya, ya bụ, ndịozi ya, kpara àgwà na-ezighị ezi; ọ gbaziri ha n’ezoghị ọnụ. (Mak 9:33-37) N’agbanyeghị nke ahụ, Jizọs bu ihe ọma n’obi na-ezisa ozi ya. O gosiri otú mmadụ ga-esi mee ihe dị Chineke mma ma nweta obi ụtọ n’ọdịnihu. (Mat. 5:3-10, 43-45) Otú ahụ ka akwụkwọ ndị ahụ Jeremaya dere dị. Ha so ‘n’Akwụkwọ Nsọ dum’ nke bara uru ‘iji mee ka ihe guzozie.’ (2 Tim. 3:16) Jeremaya kwuru hoo haa otú Jehova Chineke si ele ndị mmadụ anya, bụ́ ndị na-ekwu n’ọnụ na ha na-efe ya ma ha ana-eme ihe ọjọọ ha kwesịrị ịta ahụhụ ya. Ma, n’akwụkwọ Jeremaya na Abụ Ákwá, e dere ozi olileanya nakwa otú anyị ga-esi enweta ngọzi n’ọdịnihu. Jeremaya bukwara amụma banyere otú Chineke ga-esi emezu nzube ya. Taa, otú amụma ndị ahụ si emezu gbasakwara anyị. N’akwụkwọ abụọ ahụ, ị ga-ahụkwa okwu ọma ndị ga-agba gị ume.—Gụọ Jeremaya 31:13, 33; 33:10, 11; Abụ Ákwá 3:22, 23.

5. Olee uru anyị ga-erite n’akwụkwọ ndị ahụ Jeremaya dere?

5 Ihe Jeremaya dere ga-enyere anyị aka inwe obi ụtọ ugbu a n’etiti ndị Chineke nakwa ndụ ebighị ebi n’ọdịnihu. Dị ka ihe atụ, chee echiche banyere ụmụnna anyị dị n’otu. Ihe o dere ga-enyere anyị aka ime ka anyị na ụmụnna anyị dịkwuo n’otu nakwa ka anyị na-eme ihe Pọl onyeozi kwuru, nke bụ́, “Ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ, nọgidenụ bụrụ ndị a na-agbazi, ndị a na-akasi obi, ndị nwere otu uche, na-ebinụ n’udo; Chineke nke ịhụnanya na nke udo ga-anọnyekwara unu.” (2 Kọr. 13:11) Akwụkwọ ndị ahụ Jeremaya dere gbasakwara ozi ọma anyị na-ekwusa. Ọ bụ eziokwu na anyị na-agwa ndị mmadụ na ugbu a bụ oge ikpeazụ nakwa na a ga-ebibi usoro ihe dị ugbu a n’oge na-adịghị anya, ozi anyị bụ ozi ọma nke na-eme ka ndị mmadụ nwee olileanya. Ihe Jeremaya dere na-abakwara anyị uru kwa ụbọchị. E nwere ọtụtụ ụzọ ozi anyị na ndụ anyị si yie nke Jeremaya. Iji ghọta nke a, tụlee ezinụlọ ebe a mụrụ onye amụma ahụ e ji ama atụ, bụ́ onye Chineke gwara, sị: “Lee, etinyewo m okwu m n’ọnụ gị.”—Jere. 1:9.

Foto dị na peeji nke 6

6, 7. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na Chineke nwere mmasị n’ebe Jeremaya nọ, oleekwa ihe na-eme na Juda mgbe a mụrụ ya?

6 Ọ bụrụ na nwaanyị adị ime, ya na di ya na-echekarị banyere nwa ha ga-amụta. Olee otú ọ ga-adị, oleekwa ihe ọ ga-eme ná ndụ, ya bụ, ihe ga-amasị ya, ọrụ ya, na ihe ọ ga-arụpụta? Ma eleghị anya, ndị mụrụ gị chere banyere ihe ndị ahụ tupu a mụọ gị. Ọ ga-abụrịrị na ndị mụrụ Jeremaya chekwara banyere ihe ndị ahụ. Ma, nke ya pụrụ iche. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Onye kere eluigwe na ụwa nwere ezigbo mmasị ná ndụ Jeremaya nakwa n’ihe ndị ọ ga-eme.—Gụọ Jeremaya 1:5.

7 N’ezie, tupu a mụọ Jeremaya, Chineke hụrụ na ọ ga-abụli onye amụma. O nwere mmasị pụrụ iche n’ebe nwata nwoke ahụ nọ, bụ́ onye a ga-amụ n’ezinụlọ ndị nchụàjà bi n’ebe ugwu nke Jeruselem. A mụrụ ya n’ihe dị ka narị afọ isii na iri ise T.O.A., mgbe ọchịchị ọjọọ nke Eze Manase mere ka e nwee nsogbu na Juda. (Lee chaatị dị na peeji nke 19.) N’ihe ka ukwuu n’ime afọ iri ise na ise Manase chịrị, o mere ihe jọrọ njọ n’anya Jehova. Mgbe ọ chịchara, nwa ya bụ́ Emọn mere ka nna ya. (2 Eze 21:1-9, 19-26) E nwere mgbanwe pụrụ iche mgbe eze ọzọ chịrị Juda. N’ezie, Eze Josaya chọrọ Jehova. N’afọ iri na asatọ nke ọchịchị Josaya, o mere ka a kwụsị ikpere arụsị na Juda. Ọ ga-abụrịrị na ihe ahụ o mere tọrọ ndị mụrụ Jeremaya ụtọ; ọ bụ n’oge ahụ Josaya na-achị ka Chineke nyere nwa ha ọrụ ibu amụma.—2 Ihe 34:3-8.

Gịnị mere i ji kwesị inwe mmasị n’akwụkwọ Jeremaya na Abụ Ákwá?

CHINEKE HỌỌRỌ ONYE GA-EKWUCHITERE YA

8. Olee ọrụ e nyere Jeremaya, oleekwa ihe o mere mgbe e nyere ya ọrụ ahụ?

8 Anyị amaghị afọ ole Jeremaya dị mgbe Chineke gwara ya, sị: “Emere m gị onye amụma nke mba dị iche iche.” Ọ ga-abụ na ọ fọrọ obere ka o ruo iri afọ abụọ na ise, bụ́ afọ ole onye Livaị na-adị tupu ya amalite ije ozi n’ụlọ Chineke. (Ọnụ Ọgụ. 8:24) N’agbanyeghị afọ ole Jeremaya dị, ọ zara, sị: “Ewoo, Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova! Lee, amaghị m okwu ekwu, n’ihi na abụ m nwata.” (Jere. 1:6) Ọ chọghị ịrụ ọrụ ahụ. Ma eleghị anya, o chere na ya ka bụ nwata ma ọ bụkwanụ na ya erughị eru ịrụ nnukwu ọrụ ahụ nakwa ikwu okwu n’ihu ọha, nke bụ́ ọrụ onye amụma.

9, 10. Olee ihe na-eme mgbe Jeremaya malitere ọrụ ibu amụma ya, ma gịnị mere ọrụ ya ji mechaa sie ike?

9 Chineke nyere Jeremaya ọrụ ibu amụma mgbe Eze Josaya nọ na-ekpochapụ ofufe rụrụ arụ ma na-akwado ezi ofufe. N’agbanyeghị otú Jeremaya na Josaya mekọruru ihe, o doro anya na oge ahụ bụụrụ ezi onye amụma ọ bụla oge ọma. Zefanaya na Nehọm jekwara ozi na Juda mgbe Josaya ka malitere ọchịchị ya amalite.b Họlda, bụ́ onye amụma nwaanyị, jekwara ozi na Juda n’oge ahụ, ma o buru amụma na a ga-enwe oge nsogbu. Jeremaya ji anya ya hụ oge nsogbu ahụ. (2 Eze 22:14) N’ezie, mgbe ụfọdụ, ndị enyi Jeremaya, dị ka Ibed-melek na Barọk, napụtara ya ka a ghara igbu ya, ma ọ̀ bụkwanụ chebe ya ka ndị iro ya iwe ji ghara inweta ya.

10 Olee otú obi ga-adị gị ma ọ bụrụ na Chineke agwa gị na ya emeela ka ị bụrụ onye amụma nke ga na-ezi ndị mmadụ ozi ikpe? (Gụọ Jeremaya 1:10.) Chegodị echiche banyere otu n’ime ozi Jeremaya ziri ndị mmadụ. N’afọ 609 T.O.A., ndị agha Babịlọn nọ na-abịa n’ike n’ike ka ha bata na Jeruselem. Eze Zedekaya chọrọ ka Chineke si n’ọnụ Jeremaya zie ya ozi ga-atọ ya ụtọ. Ma, ozi Chineke chọrọ ka e zie eze ahụ abụghị ozi ga-atọ ya ụtọ.—Gụọ Jeremaya 21:4-7, 10.

JEREMAYA BỤ MMADỤ DỊ KA ANYỊ

11. Gịnị mere o ji siere Jeremaya ike ịrụ ọrụ ya, ma olee otú e si mesie ya obi ike?

11 Ka e were ya na a gwara anyị gaa zie ndị eze ọjọọ, ndị nchụàjà na-anaghị akwụwa aka ọtọ, na ndị amụma ụgha ozi amamikpe na-agba agba ná ntị. Ọ bụ ụdị ozi ahụ ka e dunyere Jeremaya. Ma, Chineke nọnyeere ya dị ka ọ nọnyeere anyị. (Jere. 1:7-9) Chineke tụkwasịrị nwa okorobịa ahụ bụ́ Jeremaya obi ma mesie ya obi ike, sị: “Emewo m taa ka ị bụrụ obodo e wusiri ike na ogidi ígwè na mgbidi ọla kọpa iguzogide ala a dum, iguzogide ndị eze Juda na ndị isi ya na ndị nchụàjà ya na ndị bi n’ala a. Ha ga-alụsokwa gị ọgụ, ma ha agaghị emeri gị, n’ihi na ‘anọnyeere m gị,’ ka Jehova kwuru, ‘ịnapụta gị.’”—Jere. 1:18, 19.

12. Olee otú ọnọdụ Jeremaya si yie ọnọdụ anyị taa?

12 Anyị ekwesịghị iche na Jeremaya bụ mmadụ pụrụ iche. Ọ bụ mmadụ dị ka anyị. Ihe ọzọ bụ na, n’agbanyeghị na Jeremaya biri ndụ n’oge ochie, o doro anya na ọnọdụ ya yiri nke anyị. Anyị na mmadụ dị iche iche na-emekọ ihe kwa ụbọchị ma n’ọgbakọ ma n’èzí, dị ka Jeremaya na ndị ọzọ mekọkwara ihe. Ihe a niile socha n’ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Jeremaya, bụ́ mmadụ “nwere ụdị mmetụta anyị na-enwe” dị ka Ịlaịja onye amụma. (Jems 5:17) Ka anyị tụlee ihe ụfọdụ anyị nwere ike ịmụta n’aka Jeremaya.

13, 14. Gịnị mere ụfọdụ Ndị Kraịst nwere ike iji ghọta otú obi dị Jeremaya n’ihi ihe Pash-họ mere ya, dị ka e sere ya na peeji nke 10?

13 Ọ̀ bụ na e nwebeghị mgbe ihe dịịrị gị mma na mgbe ihe siiri gị ike? Otú ahụ ka ọ dị Jeremaya. E nwere mgbe Pash-họ, bụ́ onye nchụàjà a ma ama, tiri Jeremaya ihe ma tinye ya n’ọtọsị. Ọ nọrọ ọtụtụ awa n’ihe ahụ e ji osisi rụọ, nke nwere ike ịbụ ebe a fanyere ụkwụ ya, aka ya, na olu ya. Otú ahụ ọ nọ mere ka ahụ́ dum na-egbu ya mgbu. E wezụga ahụ́ dum na-egbu ya mgbu, ndị na-emegide ya nọkwa na-akparị ya. Ọ bụrụ na ọ bụ gị, ì chere na ị gaara edi mkparị e ji obi ọjọọ na-akparị gị, ọbụna na-eti gị ihe?—Jere. 20:1-4.

Foto dị na peeji nke 10

14 N’ihi ọnọdụ Jeremaya, o jughị anyị anya na o kwuru, sị: “Ka ụbọchị a mụrụ m bụrụ ụbọchị a bụrụ ọnụ! . . . Gịnị mere m ji si n’afọ nne m pụta ka m bịa hụ ọrụ ike na iru uju, ụbọchị ndụ m ewee gwụchaa naanị n’ihere?” (Jere. 20:14-18) O doro anya na obi kwesịrị ịda Jeremaya mbà. Ọ̀ dịtụla mgbe ike ụwa gwụrụ gị, gị echewe ma ọ̀ ka nwere uru ị bara, ma è nwekwara ihe ị na-arụpụta n’ozi gị, ma ọ bụkwanụ chewe ma ọ̀ ka bara uru ife Jehova? Ndị niile obi dịtụrụla otú ahụ nwere ike irite uru ma ọ bụrụ na ha aghọtakwuo ihe mere Jeremaya nakwa ihe Chineke meere ya n’ikpeazụ.

Olee ihe na-amasị gị n’ọrụ Jehova nyere Jeremaya? Gịnị mere o ji bụrụ na ihe mere Jeremaya nwere ike ime gị?

15. Gịnị mere anyị ga-eji rite uru ma anyị chee echiche banyere otú ahụ ọ na-abụ, obi dị Jeremaya mma, obere oge, obi ajọọ ya njọ?

15 Ọ bụ mgbe Jeremaya kwuchara ka a bụkuo Jehova abụ ma too ya ka o kwuru okwu ndị ahụ gosiri na ọ dara mbà n’obi na Jeremaya 20:14-18. (Gụọ Jeremaya 20:12, 13.) Ò nwere mgbe ọ na-abụ, obi dị gị mma ugbu a, ị nọtụ obere, obi ajọọ gị njọ? Obi nwere ike ịdị gị ezigbo ụtọ, obere oge, obi adaa gị mbà. Anyị niile nwere ike irite uru ma anyị tụlee ihe mere Jeremaya. O doro anya na ọ bụ mmadụ dị ka anyị. N’ihi ya, anyị nwere ike irite ezigbo uru ma anyị tụlee ihe ndị Jeremaya mere, bụ́ nwoke Onye Okike ji mere ọnụ na-ekwuru ya.—2 Ihe 36:12, 21, 22; Ezra 1:1.

16. Olee ndị nwere ike irite uru n’ihe Jeremaya mere, nke bụ́ alụghị nwaanyị?

16 E nwere ihe ọzọ mere ụfọdụ ndị ji aghọta otú obi dị Jeremaya. Gịnị ka ọ bụ? Ọ bụ ihe Chineke gwara ya banyere ịlụ nwunye. Chineke nyere Jeremaya iwu pụrụ iche nke siri ike, nke bụ́, alụla nwaanyị. (Gụọ Jeremaya 16:2.) Gịnị mere Jehova ji nye Jeremaya iwu ahụ, oleekwa otú o si metụta ya? Olee ihe a kọrọ n’akụkọ a nke nwere ike ịbara ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị uru, ya bụ, ndị na-alụghị di ma ọ bụ nwunye n’ihi mkpebi ha ma ọ bụkwanụ n’ihi nsogbu? N’eziokwu, ò nwere ihe ọ bụla Chineke gwara Jeremaya nke Ndịàmà lụrụ di ma ọ bụ nwunye ugbu a kwesịrị ichebara echiche? Oleekwanụ maka ndị bụ́ di na nwunye na-amụtaghị “ụmụ ndị ikom na ụmụ ndị inyom”? Olee uru ihe Baịbụl kọrọ banyere Jeremaya ga-abara gị?

17. Gịnị ka okwu ahụ Jeremaya kwuru na Jeremaya 38:20 nwere ike ime ka anyị chebara echiche?

17 Buru n’obi na e nwere mgbe Jeremaya gwara eze na-achị Juda, sị: “Biko, rube isi n’ihe Jehova kwuru bụ́ nke m na-agwa gị, ihe ga-agaziri gị, mkpụrụ obi gị ga-adịrị ndụ.” (Jere. 38:20) Ihe a Baịbụl kwuru bụ ndụmọdụ magburu onwe ya anyị kwesịrị iso mgbe anyị na ndị ọzọ na-emekọ ihe, nke gụnyere ndị na-adịghị efe Jehova, bụ́ ndị anyị nwere ike inyere aka. Ihe ọzọ bụ na otú Jeremaya si meso ndị na-erubere Chineke isi bụụrụ anyị ihe nlereanya taa. N’ezie, anyị ga-amụta ọtụtụ ihe n’aka Jeremaya.

GỊNỊ KA A GA-ATỤLE N’AKWỤKWỌ A?

18, 19. Olee ụzọ ụfọdụ e nwere ike isi mụọ akwụkwọ Jeremaya na Abụ Ákwá?

18 Akwụkwọ a ga-enyere anyị aka ịtụle akwụkwọ Baịbụl bụ́ Jeremaya na Abụ Ákwá ma mụta ihe na ha. Olee otú ọ ga-esi enyere anyị aka? Pọl onyeozi si n’ike mmụọ nsọ dee, sị: “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke, ọ bara uru iji ya zie ihe, iji ya dọọ mmadụ aka ná ntị, iji ya mee ka ihe guzozie, na iji ya nye ọzụzụ n’ezi omume.” (2 Tim. 3:16) Nke ahụ gụnyere akwụkwọ abụọ ahụ anyị ka kpọtụrụ aha.

19 N’eziokwu, e nwere ọtụtụ ụzọ bara uru e nwere ike isi tụlee akwụkwọ Jeremaya na Abụ Ákwá. Dị ka ihe atụ, mmadụ nwere ike ịmụ akwụkwọ abụọ ahụ n’amaokwu n’amaokwu ma gbalịa ịghọta ihe amaokwu nke ọ bụla pụtara. Ma ọ̀ bụkwanụ, mmadụ nwere ike ịmụ banyere ihe ndị yiri ihe na-eme n’oge anyị a, ya bụ, otú ndị a kọrọ akụkọ ha n’akwụkwọ Jeremaya na Abụ Ákwá si yie ndị nọ ndụ ugbu a na otú ihe ndị a kọrọ na ha si yie ihe ndị na-eme n’oge anyị a ma ọ bụkwanụ ihe dị iche na ha. (Gụọ Jeremaya 24:6, 7; 1 Ndị Kọrịnt 3:6.) Ụzọ ọzọ nwere ike ịbụ ịmụ akwụkwọ abụọ ahụ iji chọpụta otú ihe ndị mere n’oge Jeremaya si mee. (Jere. 39:1-9) N’eziokwu, e nwere ike ikwu na ịghọta ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ dị mkpa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịmụ akwụkwọ Jeremaya na Abụ Ákwá ma rite uru na ha. N’ihi ya, Isi nke Abụọ, bụ́ “Ije Ozi ‘n’Oge Ikpeazụ,’” ga-enyere anyị aka ịghọta ihe ụfọdụ dị mkpa mere n’oge Jeremaya, bụ́ ndị ga-eme ka anyị mata ụdị oge o biri ndụ, ghọtakwa otú aka Chineke si dịrị n’ihe ụfọdụ mere n’oge ahụ.

20. N’akwụkwọ a, olee otú anyị ga-esi mụọ akwụkwọ Jeremaya na Abụ Ákwá?

20 Ma ụzọ bụ́ isi e si tụlee akwụkwọ Jeremaya na Abụ Ákwá n’akwụkwọ a dị iche. Otú anyị ga-esi mụọ akwụkwọ abụọ ahụ ga-eme ka anyị ghọta na ha bụ onyinye Chineke nyere anyị iji mee ka anyị na-ebi ndụ e ji mara Ndị Kraịst taa. (Taị. 2:12) Ọ ga-eme ka anyị ghọta n’eziokwu na e nwere ọtụtụ ihe e kwuru n’akwụkwọ abụọ ahụ ‘bara uru ka e jiri ha zie ihe.’ Akwụkwọ Jeremaya na Abụ Ákwá ga-enye anyị ezigbo ndụmọdụ na ihe atụ ndị nwere ike inyere anyị aka ịbụ ndị ruru eru na ndị a kwadebere idi nsogbu ndị na-abịara anyị kwa ụbọchị. Anyị ga-achọpụta na ọ bụ eziokwu, ma ànyị alụọla di ma ọ bụ nwunye ma ọ̀ bụ na anyị alụbeghị, ma ànyị bụ ndị okenye, ndị ọsụ ụzọ, ndị na-akpa afọ ezinụlọ, ndị nwunye, ma ànyị bụ ụmụ akwụkwọ. N’akwụkwọ abụọ a si n’ike mmụọ nsọ, onye ọ bụla n’ime anyị ga-ahụ otú Chineke ga-esi nyere ya aka ‘ịbụ onye a kwadebere ịrụ ezi ọrụ niile.’—2 Tim. 3:17.

Foto dị na peeji nke 12

21. Gịnị mere o ji agụsi gị agụụ ike ịmụ akwụkwọ a?

21 Mgbe ị na-amụ isiokwu nke ọ bụla n’akwụkwọ a, chọọ isi ihe ndị ga-abara gị uru. O doro anya na akwụkwọ Jeremaya na Abụ Ákwá ga-eme ka anyị ghọtakwuo ihe Pọl dere, nke bụ́: “Ihe niile e dere n’oge gara aga, e dere ha iji nye anyị ntụziaka, ka anyị wee site ná ntachi obi anyị na nkasi obi sitere n’Akwụkwọ Nsọ nwee olileanya.”—Rom 15:4.

Olee uru ịmụ akwụkwọ Jeremaya na Abụ Ákwá ga-abara gị n’ihe ị na-eme kwa ụbọchị?

a N’ọtụtụ asụsụ, e si n’aha ahụ bụ́ Jeremaya nweta otu okwu nke pụtara “okwu amamikpe” ma ọ bụ “okwu iwe na nkatọ.” Otu akwụkwọ akụkọ [bụ́ The Washington Post] ji okwu ahụ kọwaa otu fim nke kwuru banyere otú ndị mmadụ si na-egbukpọsị ụmụ anụmanụ na osisi nakwa banyere mgbanwe ihu ígwé.

b Ndị amụma ndị ọzọ ha na Jeremaya mechara jekọọ ozi bụ: Habakọk, Obedaya, Daniel, na Ezikiel. Mgbe e bibiri Jeruselem n’afọ 607 T.O.A., Jeremaya ejeela ozi ihe dị ka afọ iri anọ. Ọ dịkwara ndụ ihe karịrị afọ iri abụọ mgbe mbibi ahụ gachara.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya