ISI NKE IRI
Ị̀ Na-ajụ Kwa Ụbọchị, “Olee Ebe Jehova Nọ?”
1, 2. (a) Olee otú mmekọrịta ndị Juu na Chineke dị n’oge Jeremaya? (b) Gịnị ka ndị Juda kwesịrị ime n’ihi ọnọdụ ha?
ANYA MMIRI juru Jeremaya n’anya. Ihe na-ewute ya bụ ọnọdụ ndị obodo ya na amụma Chineke mere ka o buo banyere ọdịnihu ha. Ọ dị ya ka isi ya na anya ya bụrụ isi mmiri ka o nwee ike na-ebe ákwá n’akwụsịghị akwụsị. Jeremaya kwesịrị iruru obodo ya uju. (Jere. 9:1-3; gụọ Jeremaya 8:20, 21.) Ndị Juu jụrụ iwu Chineke. Ha erubeghịkwa isi n’ihe Jehova kwuru. N’ihi ya, ọdachi ga-adakwasị ha.—Jere. 6:19; 9:13.
2 Ma ọtụtụ ndị bi na Juda enweghị mmasị n’ezie ịma otú Jehova si ele àgwà ha anya. Ọ na-atọgbu ha atọgbu ịnụ ka ndị ndú okpukpe ha na-agwa ha na o nweghị ihe ga-emenụ. (Jere. 5:31; 6:14) Ha dị ka onye ọrịa nke chọrọ dọkịta ga-agwa ya ihe ga-eme ya obi ụtọ ma ghara ịgwa ya ihe na-egosi na ọrịa ya dị ezigbo njọ. Ọ bụrụ na ọrịa jisiri gị ike, ị́ gaghị achọ ka e lee gị ahụ́ nke ọma chọpụta ihe na-eme gị, ka e nwee ike ịgwọ gị n’egbughị oge? Ndị Juu n’oge Jeremaya kwesịrị ịchọ ịmata otú mmekọrịta ha na Chineke dị n’eziokwu. Ha kwesịrị ịjụ, sị: “Olee ebe Jehova nọ?”—Jere. 2:6, 8.
3. (a) Olee otú ndị Juu gaara esi zaa ajụjụ ahụ bụ́ “Olee ebe Jehova nọ?” (b) Olee otu ụzọ ndị Juu gaara esi chọọ Jehova?
3 A sị na ndị Juu na-ajụ, sị, “Olee ebe Jehova nọ?” ha gaara na-achọ nduzi ya mgbe ha chọrọ ikpebi ihe ha ga-eme, ma n’obere ihe ma ná nnukwu ihe. N’oge ahụ, ndị Juu emeghị otú ahụ. Ma mgbe e mechara ka Jeruselem tọgbọrọ n’efu, ha esikwa Babịlọn lọta, ha kwesịrị ‘ịchọ Jehova.’ Ha mee otú ahụ, ha ga-achọta ya ma mara ụzọ ya. (Gụọ Jeremaya 29:13, 14.) Olee otú ha ga-esi eme ya? Otu ụzọ bụ iji obi ha dum rịọ Chineke n’ekpere ka o duzie ha. Ọ bụ ihe Eze Devid mere. Ọ rịọrọ Chineke, sị: “Jehova, biko, mee ka m mara ụzọ gị; zi m ụzọ gị.” (Ọma 25:4) Cheta ihe Onye ahụ na-anụ ekpere si n’ọnụ Jeremaya gwa ndị ya ka ha mee n’afọ nke iri nke ọchịchị Eze Zedekaya. Ọ gwara ha, sị: “Kpọkuo m, m ga-aza gị n’egbughị oge, m ga-agwa gị oké ihe ndị a na-apụghị ịghọta aghọta, ndị ị na-amaghị.” (Jere. 33:3) Ọ bụrụ na eze ahụ na mba ahụ nke si n’ezi ofufe dapụ akpọkuo Chineke, ọ ga-ekpughere ha ihe ndị ha “na-apụghị ịghọta aghọta,” ya bụ, na a ga-eme ka Jeruselem tọgbọrọ n’efu ma wughachi ya mgbe afọ iri asaa gachara.
4, 5. Olee ụzọ ndị ọzọ ndị Chineke gaara esi chọọ Jehova?
4 Ụzọ ọzọ ndị Juu gaara esi chọọ Jehova bụ ịtụle akụkọ banyere ndị Chineke n’oge gara aga nakwa otú Jehova si mesoo ha ihe. Ha gaara esi otú ahụ cheta ihe ndị mere Jehova obi ụtọ na ihe ndị kpasuru ya iwe. Ha nwere akwụkwọ ndị Mozis dere na ọtụtụ akwụkwọ e si n’ike mmụọ nsọ dee banyere ndị Chineke, tinyere akwụkwọ ndị kọrọ banyere ndị eze Izrel na Juda. A sị na ndị Juu n’oge Jeremaya tụgharịrị uche n’ihe ndị ahụ ma gee ezi ndị amụma Chineke ntị, ha gaara aghọta azịza nke ajụjụ bụ́ “Olee ebe Jehova nọ?”
5 Ụzọ nke atọ ndị Juu ahụ gaara esi chọọ Jehova bụ ịmụta ihe n’ihe ndị mere ná ndụ ha nakwa ná ndụ ndị ọzọ. Ọ pụtaghị na naanị otú ha ga-esi mụta ihe bụ ime ihe, hụ uru na ọghọm dị na ya. Kama nke ahụ, ọ gaara abara ha uru ma a sị na ha tụgharịrị uche n’ihe ndị ha mere n’oge gara aga na otú Jehova si lee omume ha anya. A sị na ha na-eleru anya ala, ha gaara aghọta otú Chineke si ele àgwà ha anya.—Ilu 17:10.
6. Olee otú ihe Job mere nwere ike isi gbaa gị ume?
6 Ma, ka anyị tụlee otú ihe ahụ si gbasa oge anyị a. Mgbe ọ bụla ị na-ekpebi ihe ị ga-eme, ị̀ na-ajụ, sị, “Olee ebe Jehova nọ?” O nwere ike ịdị ụfọdụ ndị ka ha anaghị ajụkarị ajụjụ ahụ mgbe ha na-eme mkpebi. Ọ bụrụ na ọ bụ otú ahụ ka ọ dị gị, adala mbà. Nna ochie ahụ bụ́ Job nwekwara ụdị nsogbu ahụ. Mgbe ihe siiri ya ike, ọ malitere iche naanị banyere onwe ya. Ọ bụ ya mere Elaịhu ji chetara ya ihe ụmụ mmadụ na-emekarị, ya bụ, “Ọ dịghị onye sịrị, ‘Olee ebe Chineke, bụ́ Onye Ukwu nke kere m, nọ?’” (Job 35:10) Elaịhu gbara Job ume, sị: “Chebara ọrụ dị ebube nke Chineke echiche.” (Job 37:14) Job kwesịrị iche echiche banyere oké ọrụ ndị Jehova rụrụ n’ihe ndị o kere eke nakwa n’otú o sirila mesoo ụmụ mmadụ ihe. Ihe ndị mere ná ndụ Job nyeere ya aka ịghọta ụzọ Jehova. Mgbe Job dichara nsogbu ndị bịaara ya ma hụ otú Jehova si wepụ nsogbu ndị ahụ, o kwuru, sị: “M kwuru okwu, ma aghọtaghị m ihe ndị karịrị m ịghọta, bụ́ ihe m na-amaghị. Ọ bụ n’akụkọ ka m nụrụ banyere gị, ma ugbu a, anya m na-ahụ gị.”—Job 42:3, 5.
7. Dị ka e sere na peeji nke 116, olee ihe ọzọ anyị ga-atụle?
7 Onye amụma bụ́ Jeremaya chọrọ Jehova mgbe niile ma chọta ya. O meghị ka ndị obodo ya. N’ọtụtụ afọ o jeere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi, ọ nọgidere na-ajụ, sị: “Olee ebe Jehova nọ?” N’ihe ọzọ a ga-ekwu n’isiokwu a, ihe Jeremaya mere ga-egosi anyị otú ekpere, ịmụ ihe nakwa ihe ndị na-eme ná ndụ anyị ga-esi nyere anyị aka ịchọ Jehova ma chọta ya.—1 Ihe 28:9.
Gịnị ka mmadụ ịjụ “Olee ebe Jehova nọ?” pụtara? Olee ụzọ ụfọdụ ndị Juu n’oge Jeremaya gaara esi jụọ ajụjụ ahụ?
JEREMAYA KPEGAARA JEHOVA EKPERE
8. Olee mgbe Jeremaya kpegaara Jehova ekpere?
8 N’afọ ndị ahụ Chineke si n’ọnụ Jeremaya na-ezi mba Juda ozi, Jeremaya chọrọ Jehova, jiri obi ya dum na-ekpegara ya ekpere. Ọ rịọrọ Chineke ka ọ kwado ya mgbe Chineke gwara ya ka o zie ndị mmadụ ozi na-agaghị adị ha mma, mgbe ọ dị ya ka ya kwụsị ịrụ ọrụ Chineke nyere ya nakwa mgbe ọ na-aghọtaghị ihe mere ihe ụfọdụ ji na-eme. Chineke zara ekpere ya ma gwa ya ihe ndị ọ ga-eme. Ka anyị tụlee ihe atụ ụfọdụ.
9. (a) Olee otú Jeremaya si kwuo ihe dị ya n’obi na Jeremaya 15:15, 16, oleekwa ihe Jehova meere ya? (b) Gịnị mere i ji chee na ọ dị mkpa ka i kwuo otú obi dị gị mgbe ị na-ekpe ekpere?
9 E nwere mgbe Chineke gwara Jeremaya ka o zie ndị mmadụ ozi amamikpe, ya adị ya ka mmadụ niile hà na-akọcha ya. N’ihi ya, onye amụma ahụ rịọrọ Chineke ka o cheta ya. Tụlee ekpere ya nke e dere na Jeremaya 15:15, 16, bụ́ ebe ọ nọ kwuo otú obi dị ya n’ihi ihe Chineke zara ya. (Gụọ ya.) N’ekpere ahụ, Jeremaya kwuru ihe na-ewute ya. Ma mgbe o nwetara okwu Chineke, rie ya, ọ malitere inwe ọṅụ! Jehova nyeere ya aka ịghọta na ọ bụụrụ ya ihe ùgwù ịbụ onye a kpọkwasịrị aha Chineke na izi ndị ọzọ ozi Chineke. O mere ka Jeremaya ghọta nke ọma otú Jehova si ele okwu ahụ anya. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe ahụ?
10. Olee ihe Chineke mere mgbe onye amụma ahụ sịrị na ya agaghị ekwu okwu ọzọ n’aha Jehova?
10 N’oge ọzọ mgbe onye nchụàjà bụ́ Pash-họ nwa Ịma tichara Jeremaya ihe, Jeremaya sịrị na ya agaghị ekwu okwu ọzọ n’aha Jehova. Olee otú Chineke si zaa ekpere Jeremaya? (Gụọ Jeremaya 20:8, 9.) Baịbụl agwaghị anyị na otú Chineke si zaa ekpere Jeremaya bụ isi n’eluigwe gwa ya okwu. Ma Chineke mere ka okwu ya dị ka ọkụ na-ere ere nke e mechibidoro ụzọ n’ime ọkpụkpụ Jeremaya. O nweghịzi ihe ọzọ ọ ga-eme ma ọ́ bụghị ikwusa ya. N’ezie, ihe mere ka Jeremaya nọgide na-eme ihe Chineke chọrọ ka o mee bụ ịgwa Chineke otú ọ dị ya n’obi n’eziokwu ma kwe ka ihe ọ matara bụ́ uche Chineke ruo ya n’obi.
11, 12. Mgbe Jeremaya jụrụ ihe mere o ji yie ka ihe ọ̀ na-agaziri ndị ajọ omume, olee otú Jehova si zaa ajụjụ ya?
11 Obi adịghị Jeremaya mma mgbe ọ hụrụ na ihe na-agaziri ndị ajọ omume. (Gụọ Jeremaya 12:1, 3.) Ọ bụ eziokwu na onye amụma ahụ anatụghị ekwu na Jehova abụghị onye ezi omume, ọ chọrọ ịma ihe Jehova ga-aza ya ná “mkpesa” o meere ya. Otú Jeremaya si kwuo nnọọ otú obi dị ya mere ka o doo anya na ya na Chineke dị n’ezigbo mma otú ahụ nwatakịrị na nna ya nke hụrụ ya n’anya na-adị ná mma. Ma nsogbu Jeremaya bụ na ọ ghọtaghị ihe mere ihe ji na-agaziri ọtụtụ ndị Juu n’agbanyeghị na ha bụ ndị ajọ omume. Ihe Jehova zara Jeremaya ò juru ya afọ? Jehova mesiri ya obi ike na ya ga-efopụ ndị ajọ omume dị ka ahịhịa. (Jere. 12:14) Mgbe Jeremaya hụrụ ihe Chineke mere n’ihi ekpere o kpegaara ya, ọ ga-abụrịrị na o mere ka obi sie ya ike na Chineke ga-ekpe ikpe ziri ezi. O doro anya na o mere ka Jeremaya na-ekpegakwuru Chineke bụ́ Nna ya ekpere ma na-agwa ya otú obi dị ya.
12 Mgbe ọ fọrọ ntakịrị ka Zedekaya chịchaa, bụ́ mgbe ndị Babịlọn nọchibidoro Jeruselem, Jeremaya kwuru na anya Jehova ‘na-ahụ ụzọ niile nke ụmụ mmadụ, iji kwụọ onye ọ bụla ụgwọ dị ka ụzọ ya si dị nakwa dị ka ihe o metara si dị.’ (Jere. 32:19) Jeremaya ghọtara nke ọma otú Jehova si ele ikpe ziri ezi anya, na Chineke na-ahụ ihe onye ọ bụla na-eme, na-anụkwa ekpere ndị ohu ya ji obi ha dum na-ekpegara ya. Ọ ga-emekwa ka ha hụkwuo ihe na-egosi na ọ na-akwụ “onye ọ bụla ụgwọ dị ka ụzọ ya si dị nakwa dị ka ihe o metara si dị.”
13. Gịnị mere obi ji sie gị ike na uche Chineke ga-emezurịrị?
13 O nwere ike ịdị anyị ka anyị enweghị obi abụọ ọ bụla ma Chineke ọ̀ ga-ekpe ikpe ziri ezi nakwa ma amamihe ọ̀ dị n’otú o si emezu nzube ya ugbu a nakwa n’otú ọ ga-esi mezuo ya n’ọdịnihu. Ma o nwere ike ịbara anyị uru ma anyị chebara ihe mere Jeremaya echiche ma kwuo otú ọ dị anyị n’obi mgbe anyị na-ekpe ekpere. Ọ bụrụ na anyị emee otú ahụ, ọ ga-eme ka obi sikwuo anyị ike na Jehova ga-emezurịrị nzube ya. Ọ bụrụgodị na anyị aghọtachaghị ihe mere ihe ụfọdụ na-eme ugbu a ji na-eme, ma ọ bụkwanụ ihe mere nzube Chineke emezubeghị otú anyị tụrụ anya ya, anyị nwere ike ịgwa ya n’ekpere na obi siri anyị ike na ọ bụ ya ka ihe niile dị n’aka. Uche ya ga-emezu otú o si chọọ nakwa mgbe ọ maara ga-akacha mma. Ọ ga-emezurịrị; anyị ekwesịghị inwe obi abụọ. Anyị ga na-ajụ “Olee ebe Jehova nọ?” nke pụtara na anyị ga na-ekpe ekpere ka anyị ghọta ihe bụ́ uche ya nakwa ihe na-egosi na ọ na-emezu.—Job 36:5-7, 26.
Olee otú uru Jeremaya ritere mgbe ọ chọrọ Jehova site n’ikpegara ya ekpere si mee ka obi sie gị ike?
JEREMAYA JI OBI YA MARA JEHOVA
14. Olee otú anyị si mara na Jeremaya chọpụtara ihe ndị a kọrọ banyere ndị Chineke tupu oge ya?
14 N’ihe banyere ajụjụ ahụ bụ́ “Olee ebe Jehova nọ?” Jeremaya ghọtara na ya kwesịrị ‘ịmara Jehova.’ (Jere. 9:24) Mgbe ọ na-ede akwụkwọ ndị a na-akpọ Ndị Eze nke Mbụ na Ndị Eze nke Abụọ ugbu a, ọ ga-abụrịrị na ọ mụrụ ihe ndị a kọrọ banyere ndị Chineke n’oge gara aga. O kwuru banyere akwụkwọ ndị dị ka “akwụkwọ e dekọrọ ihe Sọlọmọn mere,” “akwụkwọ ihe ndị mere n’ụbọchị ndị eze Izrel,” na “akwụkwọ ihe ndị mere n’ụbọchị ndị eze Juda.” (1 Eze 11:41; 14:19; 15:7) N’ihi ya, ọ ghọtara ihe Jehova mere mgbe ihe ụfọdụ mere. Jeremaya matara ihe ndị mere Jehova obi ụtọ nakwa otú o si lee mkpebi ndị mmadụ mere anya. Ọ gụkwara akwụkwọ ndị e nwere mgbe ahụ, bụ́ ndị e dere n’ike mmụọ nsọ, dị ka ndị ahụ Mozis, Jọshụa, Samuel, Devid, na Sọlọmọn dere. O doro anya na ọ mụtara ọtụtụ ihe banyere ndị amụma bu ya ụzọ nakwa ndị amụma ha na ya dịkọrọ ndụ. Olee otú ihe ndị ahụ Jeremaya mụrụ si baara ya uru?
15. Olee uru o nwere ike ịbụ na Jeremaya ritere n’ihi ihe ọ chọpụtara banyere amụma Ịlaịja?
15 Ọ bụ Jeremaya dere akụkọ banyere Jezibel, bụ́ nwaanyị ọjọọ Eze Ehab nke Sameria lụrụ. O dekwara ihe Ịlaịja kwuru, nke bụ́ na nkịta ga-erichapụ Jezibel n’ibé ala dị na Jezril. (1 Eze 21:23) Ị ma na ihe ahụ Jeremaya dere mezuru mgbe ihe dị ka afọ iri na anọ gachara. E si na windo tụda Jezibel, Jihu ejiri ịnyịnya ya rịa ya elu, nkịta eriekwa anụ ya. (2 Eze 9:31-37) Ọ ga-abụrịrị na ihe Jeremaya chọpụtara banyere amụma Ịlaịja na otú ihe niile banyere amụma ahụ si mezuo mere ka okwukwe o nwere n’okwu Chineke sie ike. N’eziokwu, ihe nyeere onye amụma ahụ aka ịtachi obi bụ okwukwe o nwere n’ihi ịmụ banyere ihe Jehova mere n’oge gara aga.
16, 17. Olee ihe i chere nyeere Jeremaya aka ịnọgide na-adọ ndị eze ọjọọ na-achị n’oge ya aka ná ntị?
16 Ka anyị tụlee ihe atụ ọzọ. Olee ihe i chere nyeere Jeremaya aka ịnọgide na-adọ ndị eze ọjọọ dị ka Jehoyakim na Zedekaya aka ná ntị n’agbanyeghị na a nọ na-akpagbu ya? Isi ihe kpatara ya bụ na Jehova mere ka Jeremaya bụrụ “obodo e wusiri ike na ogidi ígwè na mgbidi ọla kọpa” n’ebe ndị eze Juda nọ. (Jere. 1:18, 19) Ma anyị ekwesịghị ichefu na Jeremaya chọpụtara ọtụtụ ihe banyere ndị eze chịrị Juda na Izrel tupu oge ya. O dere na Manase ‘wuuru ìgwè ihe niile dị n’eluigwe ebe ịchụàjà dị iche iche n’ogige abụọ ndị dị n’ụlọ Jehova,’ jiri nwa ya chụọ àjà nsure ọkụ, wụfuokwa ọbara na-emeghị ihe ọjọọ n’ebe ọ dị nnọọ ukwuu. (2 Eze 21:1-7, 16; gụọ Jeremaya 15:4.) N’agbanyeghị nke ahụ, ọ ga-abụrịrị na Jeremaya ma na mgbe Manese wedara onwe ya ala ma na-ekpeku Jehova ekpere, “ọ nabatara arịrịọ ya” ma mee ka eze laghachi Jeruselem.—Gụọ 2 Ihe E Mere 33:12, 13.
17 N’akwụkwọ ndị ahụ Jeremaya dere, o kwughị banyere ebere Jehova meere Manase. Ma Manase nwụrụ ihe dị ka afọ iri na ise tupu Jeremaya amalite ọrụ ibu amụma ya. N’ihi ya, ọ ga-abụrịrị na onye amụma ahụ nụrụ ihe merenụ mgbe eze ahụ chegharịrị n’ihe ọjọọ ọ na-emebu. O doro anya na ihe Jeremaya chọpụtara banyere àgwà ọjọọ Manase na ihe si na ya pụta nyeere ya aka ịhụ uru ọ bara ịgba ndị eze dị ka Zedekaya ume ka ha chọọ ebere Jehova na obiọma ya. Eze nke ndị mmadụ ma na ọ na-ekpere arụsị ma na-awụfu ọbara nwedịrị ike ichegharị, a gbagharakwa ya. A sị na ị bụ Jeremaya, ihe ndị ị chọpụtara banyere Manase ọ̀ gaara agba gị ume, mee ka ị na-atachi obi mgbe ndị eze ọjọọ ndị ọzọ na-achị?
JEREMAYA MỤTARA IHE N’IHE MERE YA NAKWA N’IHE MERE NDỊ ỌZỌ
18. Olee ihe o nwere ike ịbụ na Jeremaya mụtara n’ihe mere Yuraịja, gịnịkwa mere i ji zaa otú ahụ?
18 N’oge Jeremaya na-ebu amụma ya, o doro anya na ọ mụtara ihe n’àgwà ndị ha na ya bukọrọ amụma kpara mgbe ụfọdụ. Otu n’ime ha bụ Yuraịja onye amụma, bụ́ onye buru amụma mgbe Jehoyakim na-achị na a ga-ebibi Jeruselem na Juda. Ma Yuraịja tụrụ Eze Jehoyakim ụjọ, gbalaga Ijipt. Eze mechara ziga ndị ikom ụfọdụ ka ha gaa Ijipt kpọlata Yuraịja. O wee gbuo ya. (Jere. 26:20-23) Ì chere na Jeremaya mụtara ihe n’ihe ahụ mere Yuraịja? Ihe gosiri na Jeremaya mụtara ihe bụ na ọ nọgidere na-adọ ndị Juu aka ná ntị na a ga-ebibi obodo ha. Ọ na-agadị n’ogige ụlọ nsọ adọ ha aka ná ntị. Jeremaya nwere obi ike mgbe niile, Jehova ahapụghịkwa ya. O doro anya na ọ bụ Chineke mere ka Ahaịkam nwa Shefan chebe Jeremaya bụ́ onye nwere obi ike.—Jere. 26:24.
19. Gịnị ka Jeremaya ghọtara n’otú ahụ Jehova zipụrụ ndị amụma ya ọtụtụ ugboro ka ha dọọ ndị ya aka ná ntị?
19 Jeremaya mụtakwara ihe n’otú Jehova si si n’aka ya dọọ ndị ya aka ná ntị. N’afọ nke anọ nke ọchịchị Jehoyakim, Jehova gwara Jeremaya ka o dee ihe niile o kwuru malite n’oge Josaya ruo mgbe ahụ. Gịnị mere Chineke ji gwa ya ka o dee ihe niile ahụ? Ọ bụ iji gbaa ndị mmadụ ume ka ha hapụ ihe ọjọọ ha na-eme, ka a gbagharakwa ha. (Gụọ Jeremaya 36:1-3.) Jeremaya rịọkwara ndị Juda ka ha kwụsị omume rụrụ arụ ha na-eme. Ọ na-ebili n’isi ụtụtụ na-ezi ha ozi ịdọ aka ná ntị Chineke ziri ya. (Jere. 44:4) Ị̀ hụlanụ na ihe mere ná ndụ Jeremaya mere ka ọ ghọta na ihe mere Chineke ji zipụ ndị amụma ya bụ na o nwere ọmịiko n’ebe ndị ya nọ? Í cheghị na o mere ka Jeremaya nwee ọmịiko? (2 Ihe 36:15) O nwere ike ime ka ị ghọta ihe mere na, mgbe Jeremaya lanahụchara mbibi Jeruselem, o kwuru, sị: “Ọ bụ obiọma Jehova mere na anyị anwụchabeghị, n’ihi na ebere ya agaghị agwụ agwụ. Ha na-adị ọhụrụ kwa ụtụtụ.”—Ákwá 3:22, 23.
Mgbe Jeremaya chọpụtara otú Chineke si meso ndị ya ihe n’oge gara aga ma tụgharịa uche n’ihe mere ná ndụ ya nakwa ná ndụ ndị ọzọ, olee uru ọ ga-abụrịrị na o ritere? Gịnị ka anyị kwesịrị ịmụta n’ihe ahụ o mere?
Ị̀ NA-AJỤ KWA ỤBỌCHỊ, “OLEE EBE JEHOVA NỌ?”
20. Olee otú ị ga-esi ṅomie Jeremaya n’ịchọ Jehova?
20 Ná mkpebi ndị ị na-eme kwa ụbọchị, ị̀ na-agbalị ịchọpụta ihe bụ́ uche Chineke, ya bụ, ịjụ “Olee ebe Jehova nọ?” (Jere. 2:6-8) Jeremaya emeghị ka ndị Juu ha na ya dịkọrọ ndụ. Ọ chọrọ mgbe niile ka Onye Pụrụ Ime Ihe Niile nyere ya aka ịghọta ihe o kwesịrị ime. Mgbe anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị iṅomi Jeremaya ma gbalịa ịmata ihe bụ́ uche Jehova.
21. Olee ụdị ekpere nwere ike inyere gị aka n’ozi gị, dị ka mgbe mmadụ ji obi ọjọọ gwa gị okwu?
21 Ọ bụghị naanị mgbe mmadụ na-eme mkpebi dị oké mkpa ná ndụ ya ka o kwesịrị ịchọ Chineke. Dị ka ihe atụ, ì kwesịrị ịchọ Jehova mgbe ị na-ekpebi ma ị̀ ga-aga ozi ọma n’ụbọchị i bu n’obi ịga ozi ọma? Ma eleghị anya, i tetara n’ụra ma chọpụta na mmiri na-eru, nke nwere ike ime ka ịga ozi ọma siere gị ike. O nwere ike ịbụ na ebe e kwuru a ga-arụ n’ụbọchị ahụ n’ozi ọma ụlọ n’ụlọ bụ ókèala a rụrụla ugboro ugboro. I nwere ike icheta na ụfọdụ ndị bi ebe ahụ ji aghụghọ wetuo olu ma gwa gị na ha achọghị ịnụ ma ọ bụkwanụ jiri ọnụ ọjọọ chụpụ gị. N’isi ụtụtụ ahụ, ì nwere ike ikpe ekpere jụọ “Olee ebe Jehova nọ?” Ime otú ahụ nwere ike inyere gị aka icheta uru ozi ahụ ị na-ekwusa bara, meekwa ka ị ghọtakwuo na Chineke chọrọ ka ị na-ekwusa ya. O nwere ike ime ka okwu Jehova bụrụ ihe na-eme ka obi tọọ gị ụtọ na ihe na-enye gị ọṅụ otú ahụ ọ dị Jeremaya. (Jere. 15:16, 20) Ọ bụrụ na i mechaa gaa ozi ọma ma hụ onye dị obi ọjọọ ma ọ bụ onye a na-atụ egwu, i nwere ike ikpe ekpere ọzọ gwa Chineke otú obi dị gị. Ị̀ ga-eme otú ahụ? Echefula na o nwere ike inye gị mmụọ nsọ nke ga-enyere gị aka ime ihe i kwesịrị ime, meekwa ka ị kwụsị ịtụ ụjọ ma jiri ịnụ ọkụ n’obi zisaa ozi Chineke.—Luk 12:11, 12.
22. Olee ihe nwere ike ime ka Chineke ghara ịnụ ekpere ụfọdụ?
22 Anyị kwesịrị ịghọta na ọ dị ihe nwere ike ime ka Chineke ghara ịnụ ụfọdụ ekpere. (Gụọ Abụ Ákwá 3:44.) Jehova anụghị ekpere ndị Juu ahụ bụ́ ndị nnupụisi n’ihi na ha ‘na-ewepụ ntị ha ka ha ghara ịnụ iwu ya’ ma nọgide na-emebi iwu. (Ilu 28:9) O doro anya na Jeremaya mụtara na ọ bụrụ na mmadụ anaghị eme ihe o kpere n’ekpere, ọ ga-ewute Chineke. Ọ bụkwa ihe anyị kwesịrị ịmụta. O nwekwara ike ime ka ọ ghara ịnụ ekpere onye ahụ. N’ezie, anyị ekwesịghị ime ihe ọ bụla nwere ike iwute Jehova.
23, 24. (a) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịmata ihe bụ́ uche Jehova? (b) Olee otú i nwere ike isi mee ka ihe ị na-amụ n’onwe gị bakwuoro gị uru?
23 E wezụga iji obi anyị dum rịọ Jehova ka o duzie anyị, anyị kwesịrị ịnọgide na-amụ ihe n’onwe anyị n’ihi na ọ bụ ụzọ bụ́ isi e si amata uche Jehova. A bịa n’ịmụ ihe, anyị nwere ihe Jeremaya na-enweghị. Anyị nwere Baịbụl zuru ezu. Jeremaya chọpụtara ọtụtụ ihe nyeere ya aka ide akwụkwọ ya nke si n’ike mmụọ nsọ, bụ́ nke kọrọ banyere ndị Chineke. I nwere ike iṅomi ya, mụọ Okwu Chineke ma chọọ nduzi ya, ya bụ, ịjụ, sị: “Olee ebe Jehova nọ?” Ọ bụrụ na ị na-achọ ịmata uche ya, ọ pụtara na ị tụkwasịrị ya obi, ị ‘ga-adịkwa ka osisi a kụrụ n’akụkụ mmiri, nke gbanyere mgbọrọgwụ n’akụkụ ọwa mmiri.’—Gụọ Jeremaya 17:5-8.
24 Mgbe ị na-agụ Akwụkwọ Nsọ ma na-atụgharị uche na ya, gbalịa ghọta ihe Jehova chọrọ ka i mee mgbe ihe dị iche iche mere. I nwere ike ịchọ ụkpụrụ Baịbụl ndị i kwesịrị icheta ma jiri ha kpebie ihe ị ga-eme. Mgbe ị na-agụ Okwu Chineke ma gụta akụkọ ndị a kọrọ banyere ndị mmadụ ma ọ bụ gụọ banyere iwu Chineke, ụkpụrụ ya, na okwu amamihe ndị o kwuru, chee echiche otú ihe ndị ahụ kwesịrị isi baara gị uru ná mkpebi ndị ị na-eme kwa ụbọchị. Ọ bụrụ na ị jụọ, sị, “Olee ebe Jehova nọ?” o nwere ike isi n’Okwu ya e dere ede mee ka ị ghọta ihe i kwesịrị ime mgbe ihe siiri gị ezigbo ike. I nwere ike isi na Baịbụl ghọta “oké ihe ndị a na-apụghị ịghọta aghọta, ndị ị na-amaghị” ma ọ bụ ndị a kọwara n’ụzọ ọzọ.—Jere. 33:3.
25, 26. Olee otú ihe mere anyị na ihe mere ndị ọzọ nwere ike isi baara anyị uru?
25 I nwekwara ike ịtụle ihe ndị mere gị na ihe ndị mere ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịhụ na ụfọdụ na-akwụsị ịtụkwasị Jehova obi otú ahụ Yuraịja mere. (2 Tim. 4:10) I nwere ike ịmụta ihe n’ihe mere ha ma zere ọdachi dakwasịrị ha. Na-echeta mgbe niile otú Jehova si egosi gị obiọma, nakwa na Jeremaya kelere Chineke maka ebere ya na ọmịiko ya. N’agbanyeghị otú nsogbu gị siruru ike, echela na ihe banyere gị anaghị emetụ Onye Kasị Ihe Niile Elu n’obi. Ihe banyere gị na-emetụ ya n’obi otú ahụ nke Jeremaya metụrụ ya.
26 Ka ị na-atụgharị uche n’otú Jehova si emeso ndị mmadụ ihe taa, ị ga-aghọta na o si n’ụzọ dị iche iche na-eduzi ndị mmadụ kwa ụbọchị. Na Japan, otu nwanna nwaanyị na-eto eto aha ya bụ Aki chere na ya erughị eru ịbụ Onye Kraịst. Otu ụbọchị, ka Aki na nwunye onye nlekọta sekit nọ n’ozi ọma, o kwuru, sị: “Ọ na-adị m ka Jehova ọ̀ chọrọ isi n’ọnụ ya gbụpụ m, ma m ka tapaara ya n’egbugbere ọnụ, na-arịọ ya ka o nyetụkwuo m oge.” Nwunye onye nlekọta sekit ahụ lere ya anya ná mkpụrụ anya ma gwa ya, sị: “Ọ dịtụbeghị mgbe m chere na ị bụ Onye Kraịst dị ṅaraṅara!” Aki mechara chebara okwu ahụ na-agba ume echiche. N’eziokwu, o nweghị ihe gosiri n’ezie na ọ dịtụla mgbe Jehova weere Aki na ọ dị ṅaraṅara. Aki mechara kpegara Jehova ekpere, sị: “Ziga m ebe ọ bụla masịrị gị. M ga-eme ihe ọ bụla ị chọrọ ka m mee.” N’oge na-adịghị anya, ọ gara otu obodo dị ná mba ọzọ, bụ́ ebe e nwere ndị nkwusa ole na ole na-asụ Japaniiz. Ha chọrọ onye na-asụ asụsụ ahụ, nke ga-ekwe ibi n’ebe ahụ ma soro ha na-eje ozi. O mechara bụrụ na ọ bụ n’obodo ahụ ka a mụrụ Aki, nke mere ka ọ dịrị ya mfe ịkwaga ebe ahụ ma nyere ha aka. Ma oleekwanụ ebe ọ ga-ebi? Otu nwanna nwaanyị nyere ya otu ọnụ ụlọ, bụ́ ebe nwa ya nwaanyị si kwapụ. Aki kwuru, sị: “Ihe niile na-adaba nnọọ otú m si chọọ ya. Jehova na-emeghere m ụzọ.”
27. N’ihe ọ bụla anyị na-eme, gịnị mere anyị ji kwesị ịjụ onwe anyị “Olee ebe Jehova nọ?”
27 Ọtụtụ ụmụnna anyị nwere ike ikwu oge dị iche iche ha ghọtara na Chineke duziri ha, ma eleghị anya, mgbe ha na-agụ Baịbụl ma ọ bụ na-amụ ihe n’onwe ha. O nwere ike ịbụ na ụdị ihe ahụ emetụla gị. O kwesịrị ime ka gị na Jehova dịkwuo ná mma, meekwa ka i jiri obi gị dum na-ekpeku ya ekpere mgbe niile karịa ka ị na-emebu. Ka obi sie gị ike na ọ bụrụ na anyị ana-ajụ kwa ụbọchị “Olee ebe Jehova nọ?” ọ ga-egosi anyị ụzọ ya.—Aịza. 30:21.
Olee otú i nwere ike isi chọta azịza nke ajụjụ bụ́ “Olee ebe Jehova nọ?” Olee ụzọ ndị i nwere ike isi chọọ nduzi Chineke?