Ọgbakọ Unu Ò Nwere Ókèala Buru Ibu?
1 Site n’obodo ukwu ndị dị na Judia ruo n’ime ime obodo ndị dị na Galili, Jizọs gbara àmà n’ụzọ sara mbara n’ókèala buru ibu nke Izrel oge ochie dum. (Mak 1:38, 39; Luk 23:5) Anyị onwe anyị kwa aghaghị iji ozi ọma ahụ gakwuru ọtụtụ ndị mmadụ dị ka o kwere mee. (Mak 13:10) Otú ọ dị, nke a pụrụ ịbụ ihe ịma aka. N’ihi gịnị?
2 Ọtụtụ ọgbakọ dị na Nigeria nwere ókèala ndị ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụ ime ime obodo, ndị ruru ọtụtụ kilomita. Gịnị ka anyị pụrụ ime iji nyere ndị bi n’ókèala ndị dị otú ahụ sara mbara aka ịmụta eziokwu banyere Jehova, Jizọs, na Alaeze ahụ?
3 Jiri Nlezianya Mee Atụmatụ: Ọ dị onye nlekọta ije ozi na ohu na-ahụ maka ókèala mkpa iduzi mgbalị ọgbakọ na-eme iji rụzuo ihe kasị mma. Ikekwe, a pụrụ iwepụta ụbọchị Saturday ndị pụrụ iche bụ́ mgbe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ nwere ike iji otu ụbọchị zuru ezu rụọ ọrụ ahụ. Mgbe a na-arụ ọrụ n’ókèala ndị tere aka, meenụ atụmatụ ịnọ n’ozi ubi ruo oge ka ukwuu ma ya kwe mee, na-ewere nri unu ga-eri n’ehihie. Unu pụrụ izukọ maka ozi n’oge karịa ka unu na-emebu iji wepụta oge maka ime njem gaa n’ókèala ahụ ma ọ bụkwanụ unu enwee nzukọ maka ozi ubi na nso ógbè unu na-aga ịrụ ọrụ na ya. Meenụ ka ìgwè ndị ozi nke ọ bụla dị obere ka onye ọ bụla nwee ụlọ zuru ezu ọ ga-akpọtụrụ. Meenụ ndokwa ịrụ ọrụ n’ime ime obodo n’oge ihu igwe na ọnọdụ okporo ụzọ dị mma n’afọ. Hazienụ ókèala n’ụzọ otu ìgwè ndị ozi ga-enwe ike ịkpọtụrụ ụlọ nile dị n’ebe ahụ n’ozuzu ha.
4 Jidenụ n’aka na unu ji akwụkwọ zuru ezu. Ọ bụrụ na a dịghị arụkebe ọrụ n’ókèala ahụ, ọ pụrụ ikwesị ekwesị ịhapụ otu traktị ma ọ bụ magazin metụworo ochie n’ụlọ ndị mmadụ na-anọghị na ha.
5 Nye Nkwado Zuru Ezu: Ịrụ ọrụ n’ókèala buru ibu chọrọ nkwado nke onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ. Mgbe ọ dị mkpa ịkwọ ụgbọala gatee aka, ndị na-emekọ njem ahụ ọnụ pụrụ ịtụkọta ego maka ịgba mmanụ ụgbọala. Unu kwesịrị iji nghọta mee ihe mgbe unu chọtara ndị nwe ụlọ bụ́ ndị dị njikere inwe mkparịta ụka. Burunụ n’uche mgbe nile mkpa ọ dị iru mmadụ nile nọ n’ókèala ahụ. Ọ bụrụ na unu achọọ ịnọgide soro onye nwere mmasị na-ekwurịta okwu ruo ogologo oge, gịnị ma unu mee ndokwa ime nletaghachi mgbe unu rụzusịrị ókèala e kenyere unu?
6 Meenụ ndokwa a kapịrị ọnụ ịlaghachikwuru ndị nile gosiri mmasị. E wezụga adres ha, gbalịanụ inweta nọmba fon onye ahụ nwere mmasị ka unu wee nwee ike ịkpọtụrụ ya ma gbakwuoro ya àmà site na telifon. Ọ bụrụ na okporo ụzọ ndị dị n’ime ime obodo enweghị aha ma ọ bụkwanụ na ụlọ ndị dị na ya enweghị nọmba, jirinụ nlezianya see map ma ọ bụ detuo nkọwa nke otú a ga-esi chọta onye ahụ nwere mmasị ná nletaghachi.
7 Lee ihe ùgwù ọ bụụrụ anyị imezu ntụziaka Jizọs: “N’obodo ukwu ma ọ bụ n’obodo nta ọ bụla unu na-abanye, chọpụtanụ onye kwesịrị ekwesị n’ime ya”! (Mat. 10:11) N’ezie, Jehova ga-agọzi mgbalị unu ka unu ji ọchịchọ obi na-ewepụta onwe unu ịrụ ọrụ a kasị akwụghachi ụgwọ!