Mgbe Ndị Mmadụ Na-anọghị n’Ụlọ
1. Olee ihe ịma aka a na-enwetakarị n’ozi ụlọ n’ụlọ?
1 N’ọtụtụ ebe, ọ na-esiwanye ike inweta ndị mmadụ n’ụlọ. ‘N’oge ndị a siri ike obibi,’ ọnọdụ na-amanye ọtụtụ ndị ịrụ ọrụ ruo ọtụtụ awa n’ụbọchị iji hụ ma hà ga-enweta ihe ha ga-eji gboo mkpa ha ndị bụ́ isi. (2 Tim. 3:1) Ihe mere na anyị adịghị enweta ụfọdụ ndị n’ụlọ nwere ike ịbụ na ha gara ịzụrụ ihe ma ọ bụ ịtụrụ ndụ. Olee otú anyị pụrụ isi nweta ndị dị otú ahụ ma zie ha ozi ọma?
2. Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na anyị echefughị ndị anyị na-enwetaghị n’ụlọ?
2 Na-enwe Ihe Ndekọ Dị Mma: Ihe mbụ ị ga-eme bụ idetu adres nke ndị ị na-enwetaghị n’ụlọ. Nke a dị mkpa karịsịa ma ọ bụrụ na unu na-arụcha ókèala unu ugboro ugboro. Ị̀ na-edetu aha okporo ámá ahụ, nọmba e nyere ókèala ahụ, aha gị, na akara ụbọchị ahụ? Ị pụrụ ịhapụ oghere ebe a pụrụ idenyekwu ihe ma gị ma ọ bụ onye nkwusa ọzọ gaghachi na nke onye ahụ ị na-enwetaghị n’ụlọ.
3. Olee aro ụfọdụ a tụrụ banyere otú a pụrụ isi mee ka ndị a na-enwetaghị n’ụlọ nụ ozi ọma ahụ?
3 Gaghachi n’Oge Ọzọ: Ma eleghị anya, ndị na-anọghị n’ụlọ n’oge ụtụtụ ma ọ bụ n’oge ehihie mgbe a gara ozi ọma etiti izu nwere ike ịnọ ya ná mgbede nke ụbọchị ahụ ma ọ bụkwanụ ná ngwụsị izu. Ị̀ pụrụ ịhazigharị oge gị iji gaghachi n’oge ga-aka mma inweta ha n’ụlọ? (1 Kọr. 10:24) Ọ bụrụ na ị pụghị ịhazigharị ya, i nwere ike iwere akwụkwọ i ji dekọọ ndị ị na-enwetaghị n’ụlọ nye onye nkwusa nke pụrụ ịgaghachi n’oge ọzọ dị iche. Ma ọ bụkwanụ, gị edegara ndị ị na-enwetaghị n’ụlọ akwụkwọ ozi. Obi pụrụ ịdị ndị nkwusa ahụ́ ha na-adịghị ekwe ha gaa ozi ụlọ n’ụlọ ụtọ inyere gị aka n’akụkụ a.
4. Olee ahụmahụ na-egosi mkpa ọ dị ịgaghachi na nke ndị anyị na-enwetaghị n’ụlọ?
4 E nwere otu ahụmahụ na-egosi mkpa ọ dị ịnọgide na-agba mbọ iji hụ na anyị nwetara ndị na-anọghị n’ụlọ mgbe anyị gara na nke ha. Mgbe ndị nkwusa gara ugboro ugboro n’ụlọ otu onye ruo afọ atọ, ha mesịrị nweta ya. Ha chọpụtara na ọ nọgidela na-ele ma ọ̀ ga-ahụ Onyeàmà ga-abịa maliteghachi ịmụrụ ya Bible ọ na-amụbu tupu ya akwabata n’ókèala ahụ.
5. Olee mgbe a na-ewere na a rụzuola ókèala?
5 Na-arụzunụ Ókèala Unu: Olee mgbe a na-ewere na a rụzuola ókèala? Ọ na-abụkarị mgbe e merela mgbalị zuru ezu iji hụ na e nwetara mmadụ n’ụlọ ọ bụla dị n’ókèala ahụ. O nwere ike kwesị ekwesị ịhapụ traktị ma ọ bụ magazin ndị ochie n’ụlọ ndị a na-enwetaghị mmadụ na ha n’ebe ọ na-agaghị adịrị ndị na-agafe agafe mfe ịhụ ya, karịsịa n’ókèala ndị a na-adịghị arụ ugboro ugboro. E kwesịrị ime ka nwanna na-elekọta ókèala mara ozugbo ka o wee nwee ike ideba ya n’ihe ndekọ ya.
6. Gịnị mere anyị kwesịrị iji hụ na anyị kwusaara onye ọ bụla nọ n’ókèala anyị ozi ọma?
6 Ruo n’ókè o kwere mee, anyị chọrọ ịhụ na anyị mere ka ọtụtụ ndị nweta ohere nke ịmụta ịkpọku aha Jehova ka e wee zọpụta ha. (Rom 10:13, 14) Nke a na-agụnye ndị anyị na-enwetaghị n’ụlọ mgbe anyị gara ozi site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Dị ka Pọl onyeozi, mee ka ọ bụrụ ọchịchọ gị “ịgbasi àmà ike banyere ozi ọma nke obiọma ahụ na-erughịrị mmadụ nke Chineke.”—Ọrụ 20:24.