Mkpọsa Pụrụ Iche A Ga-eme na February 19–March 18!
1 “A Ga-ebibi Okpukpe Ụgha n’Oge Na-adịghị Anya!” Nke ahụ bụ isiokwu Akụkọ Alaeze nke 37, bụ́ nke a na-ekesa n’ụwa nile. N’ọkara mbụ nke ọnwa February, anyị ga-enyefe akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso. Malite na Monday, February 19, ruo Sunday, March 18, anyị ga-ekesa Akụkọ Alaeze nke 37. Ná ngwụsị izu ndị dabara n’oge a ga-ekesa akwụkwọ ahụ, anyị ga-enyefekọta ya na magazin ndị ọhụrụ anyị nwere.
2 Olee Ndị Ga-eso Kesaa Ya: A na-agba ume ka ndị nile na-ejechi ozi ọma anya soro kesaa ya. Ụfọdụ nwere ike iwere ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. Ì nwere ụmụaka ma ọ bụ ndị ị na-amụrụ Bible, bụ́ ndị na-enwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ? Nyere ha aka ka ha gakwuru ndị okenye iji mata ma hà ruru eru ịghọ ndị nkwusa a na-emebeghị baptizim. Ndị okenye kwesịrị ịgakwuru ndị nkwusa na-adịghị ejekwa ozi iji gbaa ha ume iso kesaa akwụkwọ a, ikekwe site n’ikenye ha na ndị nkwusa ma nke a na-akọ.
3 Anyị na-aga izitere ọgbakọ nile Akụkọ Alaeze nke 37 ole ga-ezuru ha, ka ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ wee nwee ike inweta mkpụrụ 50 ma ọ dịkarịa ala. E nwere ike inye ndị nwere mmasị, bụ́ ndị na-aghọbeghị ndị nkwusa, mkpụrụ ise ka ha nye ndị ezinụlọ ha na ndị enyi ha. Mmadụ nile kwesịrị idekọ mkpụrụ ole ha nyefere ma dee ya n’azụ akwụkwọ ha ga-eji enye akụkọ ozi ubi ha maka ọnwa February na March. Odeakwụkwọ ọgbakọ ga-agụkọta ole ọgbakọ unu nyefere ma zitere ya alaka ụlọ ọrụ ná ngwụsị nke ọnwa ọ bụla. Ọ bụrụ na o nwere Akụkọ Alaeze nke fọdụrụnụ mgbe oge e nyere maka inyefe ya gafecharala, unu ka nwekwara ike iji ya jee ozi.
4 Ihe A Ga-ekwu: Ekwula ogologo okwu mgbe ị na-enyefe Akụkọ Alaeze ahụ ka i wee nwee ike inyefe ọtụtụ. I nwere ike ikwu, sị: “Dị ka otu ụzọ m si ejere ọha mmadụ ozi, eso m ekesa ozi a dị mkpa a na-ekesa n’ụwa nile. Nke a bụ nke gị. Ana m enye gị ya n’efu. Biko gụọ ya.” Hụ na i deturu aha ndị nile nwere mmasị.
5 Otú Unu Ga-esi Hụ na Onye Ọ Bụla Nọ n’Ókèala Unu Nwetara Ya: Kama ịdị na-eke Akụkọ Alaeze ahụ n’okporo ámá, hụ na ị gara kesaara ya ndị mmadụ n’ụlọ ha nakwa n’ebe ndị a na-azụ ahịa. Rịba ebe ndị mmadụ na-anọghị n’ụlọ ama, ma hụ na ị gaghachiri n’oge ọzọ ma ọ bụ n’ụbọchị ọzọ n’otu izu ahụ. Malite n’ụbọchị Monday, March 12, unu nwere ike ịkpafanye otu akwụkwọ ahụ n’ebe unu na-enwetaghị mmadụ n’ụlọ. Ma, ọ bụrụ na ọgbakọ unu nwere nnukwu ókèala nke na unu agaghị agachali ya n’ime oge ahụ e nyere, ndị okenye nwere ike ikpebi ma à ga-amalite ịkpafanye Akụkọ Alaeze n’ebe ndị a na-enwetaghị mmadụ n’ụlọ n’oge nile ahụ a ga-eke akwụkwọ ahụ.
6 Oge a ga-ebibi “Babilọn Ukwu ahụ” ji ọsọ na-abịa. Ọ dị mkpa ka ndị mmadụ si na ya pụta tupu e bibie ya kpamkpam. (Mkpu. 14:8; 18:8) Malite ugbu a mewe ndokwa iso kesaa Akụkọ Alaeze a a ga-ekesa n’ụwa nile iji mee ka mmadụ nile mara na a ga-ebibi okpukpe ụgha n’oge na-adịghị anya!