Nkesa Pụrụ Iche A Ga-ekesa Traktị Malite na January 19 Ruo February 15, 2009!
1 Malite na Monday, January 19, 2009, ruokwa izu anọ zuru ezu, anyị ga-ekesa traktị bụ́ Ị̀ Chọrọ Ịma nke Bụ́ Eziokwu? n’ụzọ pụrụ iche. Anyị na-atụ anya na nkesa a pụrụ iche a ga-ekesa traktị a n’ụwa niile ga-eme ka ndị mmadụ nwekwuo mmasị n’akwụkwọ naanị ya na-akụzi eziokwu.—Jọn 17:17.
2 Traktị ahụ ji Baịbụl zaa ajụjụ isii ndị a dị mkpa n’ụzọ doro anya: “Chineke ọ̀ na-eche banyere anyị n’ezie?” “Ọ̀ dị mgbe agha na ahụhụ ga-akwụsị?” “Olee ihe na-eme anyị mgbe anyị nwụrụ?” “Ọ̀ dị olileanya ndị nwụrụ anwụ nwere?” “Olee otú m ga-esi kpee ekpere Chineke anụ ya?” na “Olee otú m ga-esi nwee obi ụtọ ná ndụ?” Chọọchị dị iche iche nke Krisendọm azabeghị ajụjụ ndị a n’ụzọ na-eju afọ. Ọbụna ọtụtụ ndị na-anaghị akpọ onwe ha Ndị Kraịst ajụọla ajụjụ ndị dị otú ahụ, ma o nwere ike ịbụ na ha amaghị na Baịbụl zara ajụjụ ndị a n’ụzọ doro anya. N’ihi ya, ihe dị na traktị a kwesịrị ịmasị ọtụtụ ndị.
3 Kesaanụ Ya n’Ókèala Unu Niile: Gbaanụ mbọ ikesa ya n’ókèala ebe ndị unu na-eje ozi ụlọ na ụlọ ruo n’ókè unu nwere ike. Ọ bụrụ na ókèala unu buru ibu, ndị okenye unu nwere ike ịgwa unu ka unu dowe otu traktị ahụ n’ebe ndị nwe ụlọ ga-ahụ ya mgbe ha lọtara ma ọ bụrụ na unu ezuteghị ha n’ụlọ mgbe mbụ unu rụrụ ebe ahụ. Cheta inye ndị agbata obi gị, ndị ikwu gị, ndị gị na ha na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe gị, na ndị ọzọ gị na ha na-ekwurịtakarị okwu traktị a. I nwekwara ike ịhazi oge gị iji rụọ ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa January ma ọ bụ February 2009. Ì nwere nwa ma ọ bụ onye ị na-amụrụ ihe nke na-eme nke ọma n’ọgbakọ, bụ́kwa onye nwere ike iru eru iso anyị kesaa traktị a dị ka onye nkwusa a na-emebeghị baptizim? Ya bụrụ otú ahụ, gwa ndị okenye.
4 Ihe Ị Ga-ekwu: Iji hụ na traktị a ruru ọtụtụ ndị aka, ọ ga-akasị mma ka ị ghara ikwu ogologo okwu mgbe ị na-enye mmadụ traktị ahụ. I nwere nnọọ ike ịjụ ndị nwe ụlọ otu n’ime ajụjụ isii ndị ahụ dị n’azụ traktị ahụ ma gwazie ha ebe azịza ya dị n’ime ya. Nke a ga-eme ka ọ dịrị ndị nkwusa niile mfe ime ka okwu ha kwekọọ ná mkpa nke ndị bi n’ókèala unu. Ya bụrụ na mmadụ egosi mmasị, detuo ya ma gaara ya nletaghachi. Ná ngwụsị izu, a ga na-enyefekọta traktị ahụ na magazin ndị ọhụrụ. Mgbe nkesa traktị ahụ gwụrụ na February 15, 2009, anyị ga na-enyefe akwụkwọ bụ́ Bịaruo Jehova Nso. A ga-eji traktị nke ọ bụla fọrọ afọ na-eje ozi otú e si eji ndị nke ọzọ e nwere n’ọgbakọ eje.
5 Malitere Mmadụ Ọmụmụ Baịbụl: E dere traktị a kpọmkwem iji nyere anyị aka ịmalitere ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl. Mgbe ị gaghachiri na nke onye gosiri mmasị, i nwere ike ịjụ ya eziokwu Baịbụl nke kasiri ya obi ma ọ bụ mee ka obi ruo ya ala. Gosi ya azụ traktị ahụ bụ́ ebe e kwuru banyere otú anyị si eduziri ndị mmadụ ọmụmụ Baịbụl, nyefezie ya akwụkwọ Bible Na-akụzi. Ya bụrụ na o kwe omume, gị na ya tụlee otu paragraf ma ọ bụ paragraf abụọ n’isiokwu nke kasị kwuo banyere ihe ahụ o kwuru.
6 Jehova na-achọ ndị ga-efe ya ofufe “n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:23) Ka anyị niile soro kesaa traktị a iji nyere ndị ọzọ aka ịmata eziokwu ahụ!