Kesaa Akụkọ Alaeze nke 35 n’Ụzọ Sara Mbara
1 October na November ga-abụrụ anyị nile ọnwa ịrụsi ọrụ ike. N’ime ụbọchị 11 mbụ nke October, anyị ga-enyefe ụtụ maka Teta! ma ọ bụ Ụlọ Nche ma ọ bụ maka magazin abụọ ahụ. E mesịa, malite na Sunday, October 12, ruo Sunday, November 16, anyị ga-esonye ná nkesa zuru ụwa ọnụ nke Akụkọ Alaeze nke 35. Ọ ga-abụrụ anyị ihe ùgwù iwegara ndị nile bi n’ógbè anyị ozi dị mkpa. Ọ bụ azịza nye ajụjụ bụ́, “Ọ̀ Dị Mgbe Mmadụ Nile Ga-ahụ Ibe Ha n’Anya?” N’oge mkpọsa a pụrụ iche, anyị ga-ekesa Akụkọ Alaeze nke 35 n’ime izu. Ná ngwụsị izu, tinyere inyefe Akụkọ Alaeze, anyị ga-enyefe ụtụ maka magazin Ụlọ Nche na Teta! N’ebe a na-anaraghị ụtụ, a pụrụ inyefe mkpụrụ magazin ole na ole.
2 Ònye Pụrụ Ikere Òkè? Dị ka a na-emekarị, ndị okenye ga-ebute nnọọ ụzọ n’ọrụ a. Ọ na-amasị onye ọ bụla ikesa Akụkọ Alaeze, ihe ịrụ ụka adịghịkwa ya na ọnụ ọgụgụ dị nnọọ ukwuu nke ndị nkwusa ga-edebanye aha dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka n’otu n’ime ọnwa mkpọsa ndị a ma ọ bụ na ha abụọ. Ndị nkwusa ndị ọzọ ga-achọ itinyekwu oge karị n’ozi ahụ.
3 Ì nwere onye ị na-amụrụ Bible bụ́ onye gamiworo n’ọmụmụ ihe ya nke akwụkwọ Ihe Ọmụma na onye ga-eru eru n’isi nso ikere òkè n’ije ozi ubi? Ikekwe ọ pụrụ ịghọ onye nkwusa a na-emebeghị baptism n’oge iji kere òkè ná mkpọsa Akụkọ Alaeze ahụ. Ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ nke dị mfe agwụla ihe dị mkpa iji webata traktị a. Dị ka ihe atụ, mmadụ pụrụ ịsị: “Ozi a dị oké mkpa nke na a na-ekesa ya n’ụwa nile n’ime ọnwa a n’asụsụ 169. M ga-achọ ka i nwee nke gị.” Ọbụna ụmụntakịrị pụrụ ikere òkè dị mma n’ọrụ a na-akpali akpali.
4 Ndị nduzi ọmụmụ akwụkwọ kwesịrị ịgba onye ọ bụla nọ n’ìgwè ha ume ikere òkè zuru ezu ná nkesa nke Akụkọ Alaeze nke 35. A pụkwara inwe ndị nkwusa ghọworo ndị na-adịghị arụ ọrụ ma ha ga-amalitekwa ije ozi ọzọ n’ozi ahụ ma ha nweta agbamume dị mkpa. Tupu mkpọsa ahụ eruo, ndị okenye kwesịrị ileta onye ọ bụla n’ime ndị a iji lee ihe a pụrụ ime iji nyere ha aka isonyere ndị nkwusa nweworo ahụmahụ n’akụkụ a nke ozi a.
5 Olee Mgbe Anyị Pụrụ Izukọ Maka Ije Ozi? Ọrụ a nile ga-achọ ndokwa ịgba àmà ìgwè bụ́ ndị doro ahụ na ndị dị irè. Ebe ọ bụla o kwere omume, e kwesịrị ịhazi nzukọ ije ozi n’ụbọchị ọ bụla n’ime izu, ná ngwụsị izu, na n’uhuruchi. E kwesịrị inwe ha n’oge ga-eme ka ndị nkwusa na ndị ọsụ ụzọ nwee ike jiri oge ịgba àmà ahụ mee ihe nile ha nwere ike ime. A pụkwara ime ndokwa izukọ ná mgbede maka abamuru nke ụmụ akwụkwọ, ndị oge ọrụ ha na-agbanwe agbanwe, na ndị ọzọ. Onye nlekọta ije ozi kwesịrị ịhụ na e nwere ókèala buru ibu maka ụlọ na ụlọ na ógbè azụmahịa ka onye ọ bụla nwee ike ikere òkè zuru ezu n’ọrụ a. N’ebe e nwere ọtụtụ ndị nkwusa, ha kwesịrị ịdị akọ banyere mmadụ ole na-arụ ọrụ n’otu akụkụ nke ókèala.
6 Gịnị Banyere Ndị Na-anọghị n’Ụlọ? Anyị chọrọ ịgwa ọtụtụ ndị nwe ụlọ okwu ihu na ihu dị ka o kwere omume iji kọwaa ihe mere ha kwesịrị iji gụọ Akụkọ Alaeze nke 35. Ya mere ọ bụrụ na ọ dịghị onye nọ n’ụlọ mgbe ị gara, detuo adres ebe ahụ ma gaa ọzọ n’oge dị iche n’ụbọchị. Ọ bụrụ na ka izu ikpeazụ nke mkpọsa ahụ na-erule mgbalị gị ijekwu ndị a nwe ụlọ enwebeghị isi, i nwere ike ịhapụ otu Akụkọ Alaeze ahụ n’ọnụ ụzọ n’ebe ndị na-agafe n’ámá na-agaghị ahụ ya. N’ebe ndị mmadụ bi, mụrụ anya inyefe ndị pụrụ ịdị na-agafe n’okporo ámá Akụkọ Alaeze. Mgbe ị na-arụ ọrụ n’ime obodo na n’ebe e nwere ókèala buru oké ibu ịgazu n’oge mkpọsa ahụ, a pụrụ ịhapụ otu Akụkọ Alaeze na nke ndị na-anọghị n’ụlọ ná nleta mbụ.
7 Gịnị Bụ Ebumnobi Anyị? Ọgbakọ nile kwesịrị ịgbalị iji Akụkọ Alaeze ha dum jezuo ókèala ha nile tupu mkpọsa ahụ agwụsịa na November 16. Ọ bụrụ na ókèala e kenyere ọgbakọ unu buru oké ibu, ọ bụrụkwa na ọ dịghị ize ndụ ịga nanị gị kama gị na onye ọzọ iso, ị pụrụ ịhụ ya dị ka ihe bara uru ime otú ahụ. Nke a ga-enyere gị aka iji ozi ọma ahụ jekwuru ọtụtụ ndị kwesịrị ekwesị dị ka o kwere omume. (Mat. 10:11) Ọ pụrụ ịba uru ịchị traktị ole na ole n’aka gị na Bible n’ime akpa uwe ma ọ bụ pọọsụ gị, kama ibu akpa. Hụ na i mere ndekọ dị mma nke ebe a chọtara mmasị.
8 Ị̀ Dị Njikere Ịmalite? Ndị okenye kwesịrị ime atụmatụ magazin ole ọzọ ọgbakọ ha ga-achọ, ha kwesịkwara ịtụ ọda kwekọrọ na ya. Ọ dịghị mkpa ịtụ ọda Akụkọ Alaeze nke 35, ebe a ga-ebugara ọgbakọ ọ bụla ụfọdụ. Ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ndị nke oge nile, na ndị nke inyeaka ga-enwe 60 n’otu n’otu ikesa, ebe a ga-ekenye ndị nkwusa ọgbakọ 20 maka otu onye. Ọrụ anyị kwesịrị anyị. Ị̀ na-anụ ọkụ n’obi ikere òkè n’ọrụ obi ụtọ a? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ na-agụsi gị agụụ ike. Ka anyị kesaa ozi ahụ dị mkpa dabeere na Bible dị n’Akụkọ Alaeze nke 35 n’ụzọ kasị saa mbara!