Ọnụ Ụzọ Dị Ukwuu Na-eduga n’Ịrụ Ọrụ Ghere Oghe
1 Dị ka onye nkwusa na-anụ ọkụ n’obi, Pọl ji uchu chọọ ókèala ebe ndị e nwere mkpa ka ukwuu, otu n’ime ha bụ obodo Efesọs. O nwere nnọọ ihe ịga nke ọma n’ime nkwusa n’ebe ahụ nke na o degaara ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ, sị: “E megheworo m ọnụ ụzọ dị ukwuu nke a ga-ejikwa rụsie ọrụ ike.” (1 Kọr. 16:9) Pọl nọgidere na-eje ozi n’ókèala ahụ ma nyere ọtụtụ ndị Efesọs aka ịghọ ndị kwere ekwe.—Ọrụ 19:1-20, 26.
2 Taa, e megheworo anyị ọnụ ụzọ dị ukwuu nke na-eduga n’ọrụ. Anyị nwere ọkpụkpọ òkù inyere ọgbakọ ndị na-enweghị ike ijezu ókèala ha nke ọma kwa afọ aka. Otú a, mgbalị anyị pụrụ igbo mkpa dị n’ebe ụfọdụ.—Tụlee 2 Ndị Kọrint 8:13-15.
3 Ị̀ Pụrụ Ije Ozi n’Ebe E Nwere Mkpa Ka Ukwuu? Ì jiriwo ekpere tụlee ikwe omume nke ije ozi n’ebe ọzọ? Ị pụrụ inwe ike inyere otu ọgbakọ dị n’obodo nke gị aka. Gịnị ma ị gwa onye nlekọta sekit banyere okwu ahụ ma hụ aro ọ ga-atụ? Ma ọ bụ ọ pụrụ ịbụ na n’ime ókèala nke ọgbakọ gị, e nwere ọtụtụ ndị ntị chiri ma ọ bụ ndị na-asụ asụsụ ọzọ ndị ọ na-adịbeghị onye nweworo ike ịhụ maka ha. Iji gboo mkpa nke a, ị̀ pụrụ ijisi ike mụta asụsụ ha? Ọzọkwa, ikekwe e nweworị ìgwè ma ọ bụ ọgbakọ na-asụ asụsụ ọzọ bụ́ nke dị nso nọworo ‘na-arịọ Onyenwe anyị maka ndị ọrụ Alaeze ka ukwuu.’ (Mat. 9:37, 38) Ọ bụrụ otú ahụ, ì nwere ike inye aka?
4 N’afọ iri ndị na-adịbeghị anya, ọtụtụ puku ezinụlọ ndị Kraịst akwagawo ala ọzọ iji kere òkè ka zuo ezu n’ọrụ owuwe ihe ubi. Otu di na nwunye mere nke a kwuru, sị: “Anyị chọrọ ijere Jehova ozi ebe anyị pụrụ ime ihe kasị mma.” Ọ bụrụ na i nwere ọchịchọ a ma hụ ya dị ka ihe ga-ekwe omume ịkwaga ebe ọzọ ná mba a ma ọ bụ ọ bụrụ na i ruru eru ije ozi n’ala ọzọ, gị na ndị okenye ọgbakọ gị buru ụzọ tụlee nzube gị.
5 Ọ bụrụ na ị chọrọ ịjụ Society maka ebe e nwere mkpa, nye Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ akwụkwọ ozi nke na-egosi ọchịchọ gị kpọmkwem. Ha ga-edenyekwu okwu ha ma zigara ya Society. Ka o sina dị, ruo ogologo oge ọnụ ụzọ dị ukwuu na-eduga n’ọrụ ghere oghe, ka anyị nile nọgide jiri ọrụ n’aka n’ije ozi Jehova.—1 Kọr. 15:58.