Ruo Ndị Di Ma Ọ Bụ Nwunye Na-abụghị Ndịàmà
1 Ọ bụ ihe na-akpata oké ọṅụ mgbe ndị di na nwunye dị n’otu n’ezi ofufe. Otú ọ dị, n’ọtụtụ ezinụlọ nanị otu n’ime di na nwunye nabataworo ụzọ eziokwu ahụ. Olee otú anyị pụrụ isi ruo di ma ọ bụ nwunye ndị a na-abụghị Ndịàmà ma gbaa ha ume isoro anyị na-efe Jehova?—1 Tim. 2:1-4.
2 Ghọta Echiche Ha: Ọ bụ ezie na ụfọdụ di ma ọ bụ nwunye na-abụghị Ndịàmà pụrụ ịbụ ndị mmegide, nsogbu ahụ na-abụkarị nke enweghị mmasị ma ọ bụ nghọtahie. Mmadụ pụrụ iche na e leghaara ya anya ma ọ bụ nwee ekworo n’ebe ọdịmma ime mmụọ nke di ma ọ bụ nwunye ya nwetara ọhụrụ. “N’ịnọ nanị m n’ụlọ, ọ dị m ka a gbahapụrụ m,” ka otu di na-echeta. “O yiri m ka nwunye m na ụmụ m na-ahapụ m,” ka ọzọ na-ekwu. Ụfọdụ ndị ikom pụrụ iche na okpukpe na-anara ha ezinụlọ ha. (Lee Ụlọ Nche, August 15, 1990, peji nke 20-23.) Ọ bụ ya mere o ji akasị mma, ma o kwe mee, ịgụnye di na nwunye ya ná nhazi ọmụmụ Bible ebe obibi site ná mmalite.
3 Rụọnụ Ọrụ Dị Ka Otu Ìgwè: Otu di na nwunye bụ́ Ndịàmà rụkọrọ ọrụ ọnụ n’ụzọ dị irè n’inyere ndị di na nwunye aka ịbata n’eziokwu. Mgbe nwanna nwanyị ahụ guzobesịịrị onye bụ nwunye ọmụmụ ihe, nwanna nwoke ahụ ga-eleta di ya. Ọ na-enwekarị ike ịmalitere di ya ọmụmụ ihe.
4 Nwee Omume Enyi ma Na-ele Ọbịa: Ezinụlọ ndị dị n’ọgbakọ pụrụ inye aka site n’inwe mmasị n’ezinụlọ ndị a na-ejikọbeghị ọnụ n’ezi ofufe. Nleta ole na ole dị ka enyi pụrụ inyere di ma ọ bụ nwunye na-abụghị Onyeàmà aka ịhụ Ndịàmà Jehova dị ka ndị Kraịst na-ekpo ọkụ, na-eche maka ndị ọzọ bụ́ ndị bu ọdịmma kasịnụ nke onye ọ bụla n’obi.
5 Site n’oge ruo n’oge, ndị okenye pụrụ ịtụleghachi mbọ a gbara ná nso nso a iji ruo ndị di ma ọ bụ nwunye na-abụghị Ndịàmà ma kpebie ihe ọzọ a pụrụ ime n’olileanya nke irite ha n’uru nye Jehova.—1 Pita 3:1.