Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w07 11/15 p. 31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mee Ka Ụbọchị Agbamakwụkwọ Gị Wetakwuoro Gị Ọṅụ Ma Dịkwuo Ùgwù
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Agbamakwụkwọ Ndị Na-enye Ọṅụ Bụ́ Ndị Na-ewetara Jehova Nsọpụrụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Agbamakwụkwọ Ndị Na-asọpụrụ Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Igbe Ajụjụ
    Ozi Alaeze Anyi—2008
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
w07 11/15 p. 31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Onyeàmà Jehova ò kwesịrị ịga agbamakwụkwọ nke onye ikwu ya ma ọ bụ onye ọzọ na-abụghị Onyeàmà?

Agbamakwụkwọ bụ ihe na-enye ọṅụ, ọ dịghịkwa ihe ọjọọ dị n’Onye Kraịst ịchọ ikere òkè n’ọṅụ ahụ. N’ezie, ụmụaka a kpọrọ òkù ịga kwesịrị ige ndị mụrụ ha ma ọ bụ ndị na-elekọta ha ntị, bụ́ ndị ga-ekpebi ma hà ga-aga ma ọ bụ na ha agaghị aga. (Ndị Efesọs 6:1-3) Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na nwoke na-abụghị Onyeàmà Jehova agwa nwunye ya bụ́ Onyeàmà ka o soro ya gaa agbamakwụkwọ na chọọchị? Akọnuche nwanyị ahụ nwere ike ikwe ya ịga ma kpebisie ike ịghara iso mee ihe ọ bụla metụtara okpukpe a ga-eme n’ebe ahụ.

N’ihi ya, ọ bụkarị mmadụ ga-ekpebiri onwe ya ma ọ̀ ga-aga agbamakwụkwọ ma ọ bụ na ọ gaghị aga. Otú ọ dị, Onye Kraịst nke ọ bụla kwesịrị iburu n’uche na ọ ga-aza Jehova ajụjụ, o kwesịkwara ịtụle ọtụtụ ụkpụrụ Akwụkwọ Nsọ mgbe ọ na-ekpebi ma ọ̀ ga-aga agbamakwụkwọ nke onye na-abụghị Onyeàmà.

Ihe Onye Kraịst kwesịrị ichebara echiche karịsịa bụ ime ihe ga-atọ Chineke ụtọ. Jizọs kwuru, sị: “Chineke bụ Mmụọ, ndị na-efe ya aghaghịkwa ife ofufe n’ime mmụọ na n’eziokwu.” (Jọn 4:24) N’ihi ya, Ndịàmà Jehova anaghị eso ndị ọzọ eme ememe okpukpe ha, dị ka ikpe ekpere ma ọ bụ ime ememe okpukpe ndị megidere eziokwu Bible.—2 Ndị Kọrint 6:14-17.

Onye Kraịst maara na mkpebi ya nwekwara ike imetụta ndị ọzọ. Ọ bụrụ na i kpebie ịga, iwe ọ̀ ga-ewe ndị ikwu gị ma ọ bụrụ na ị jụ iso mee ihe nile a ga-eme n’agbamakwụkwọ ahụ? I kwesịkwara ichebara otú o nwere ike isi metụta ndị kwere ekwe ibe gị echiche. (Ndị Rom 14:13) Ya bụrụgodị na gị na ndị ezinụlọ gị ekwubie na ọ dịghị nsogbu ọ bụla ịga agbamakwụkwọ nke onye na-abụghị Onyeàmà ga-akpata, ò nwere ike imetụta ụmụnna gị Ndị Kraịst n’ụzọ na-adịghị mma? Ò nwere ike imerụ akọnuche nke ụfọdụ n’ime ha ahụ́?

Agbamakwụkwọ nke ndị ikwu na-abụghị Ndịàmà nwere ike ime ka mmadụ banye n’ọnọdụ amaghị ihe a ga-eme. Gịnị ma a sị gị soro ná ndị na-enyere ndị na-alụ di na nwunye ọhụrụ aka? Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na di ma ọ bụ nwunye gị abụghị Onyeàmà ma chọọ ikere òkè zuru ezu n’agbamakwụkwọ ahụ? Ya bụrụ na agbamakwụkwọ ahụ bụ nke a ga-anọ n’ụlọ ọrụ gọọmentị mee, nke ọkàikpe ma ọ bụ onye ọrụ gọọmentị ga-eduzi, ịga ya nwere nnọọ ike iyi igere ikpe n’ụlọikpe.

Ma, agbamakwụkwọ a ga-anọ n’ụlọ okpukpe mee ma ọ bụ nke onye ụkọchukwu ga-eduzi na-eweta nsogbu ndị ọzọ. Iji gbasoo akọnuche gị e ji Bible zụọ na iji zere ime ihe ndị megidere ihe ndị i kweere ma ọ bụ ime ihe ga-emechu ndị nwe agbamakwụkwọ ahụ ihu, i nwere ike ikpebi ịghara ịga. (Ilu 22:3) I nwere ike ime ka ihe ghara isiri gị na ezinụlọ gị ike site n’ịkọwara ha ihe ndị dabeere na Bible i kweere tupu oge eruo, gwa ha ihe ndị ị ga-emeli na ihe ndị ị na-agaghị emeli ma ọ bụ ma eleghị anya tụọrọ ha aro ụzọ ọzọ ha ga-esi mee ihe ụfọdụ.

Mgbe ụfọdụ Ndị Kraịst jisịrị nlezianya tụlee ihe nile metụtara okwu ahụ, ha nwere ike ikpebi na ọ gaghị adị njọ ịga agbamakwụkwọ nke onye na-abụghị Onyeàmà ma ghara ikere òkè n’ihe ọ bụla metụtara okpukpe a ga-eme n’ebe ahụ. Ma ọ bụrụ na Onye Kraịst achọpụta na ọ bụrụ na ya agaa, na e nwere ike ịnwa ya ọnwụnwa ime ihe ndị megidere ụkpụrụ Chineke, o nwere ike ikpebi na ọghọm dị na ya karịrị uru ọ bụla ya nwere ike irite. Ọ bụrụ na o kpebie na ya agaghị aga agbamakwụkwọ ahụ, ma chọọ ịga oriri a ga-eme mgbe ememe ahụ gasịrị, ebe ọ bụ na a kpọrọ ya akpọ, o kwesịrị ikpebisi ike ‘ime ihe nile iji nye Chineke otuto.’ (1 Ndị Kọrint 10:31) A bịa ná mkpebi ndị dị otú ahụ, “onye ọ bụla ga-ebu ibu nke ya.” (Ndị Galeshia 6:5) N’ihi ya, n’agbanyeghị ihe i kpebiri ime, cheta na ọ dị ezigbo mkpa ịnọgide na-enwe akọnuche dị ọcha n’ihu Jehova Chineke.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya