ISI NKE 10
Ụzọ Dị Iche Iche Anyị Nwere Ike Isi Jekwuoro Jehova Ozi
MGBE Jizọs chọrọ izipụ ndị na-eso ụzọ ya ka ha gaa kwusaa ozi ọma Alaeze Chineke, ọ gwara ha, sị: “Ihe ubi hiri nne, ma ndị ọrụ dị ole na ole.” Ebe ọ bụ na ihe ubi hiri nne, ọ gwakwara ha, sị: “Na-arịọnụ Onye nwe owuwe ihe ubi ahụ ka o ziga ndị ọrụ n’owuwe ihe ubi ya.” (Mat. 9:37, 38) Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya otú ha ga-esi ezi ozi ọma. Ọ gwakwara ha ihe gosiri na oge agwụla agwụ. Ọ sịrị: “Unu agaghị agazu obodo ndị dị n’Izrel ma ọlị ruo mgbe Nwa nke mmadụ ga-abịarute.”—Mat. 10:23.
2 Taa, e nwere ọtụtụ ndị anyị ga-ezi ozi ọma. A ga-ekwusarịrị ozi ọma Alaeze Chineke tupu e bibie ụwa ọjọọ a. Oge agwụkwala agwụ. (Mak 13:10) Ubi ahụ Jizọs kwuru okwu ya nọchiri anya ụwa. N’ihi ya, anyị ga-ezi ọtụtụ ndị ozi ọma otú ahụ Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya mere. Ma, ndị anyị ga-ezi ozi ọma karịrị ndị ha ziri ozi ọma. Anyị dị ole na ole ma e jiri anyị tụnyere ọtụtụ ijeri mmadụ nọ n’ụwa. Ma, obi siri anyị ike na Jehova ga-enyere anyị aka. A ga-ekwusa ozi ọma Alaeze Chineke n’ụwa niile, ma ọgwụgwụ ga-abịa mgbe Jehova chọrọ. Ebe ọ dị otú ahụ, ànyị ga-ebunụ ụzọ na-achọ Alaeze Chineke ka anyị nwee ike ijezu ozi anyị? Gịnị na gịnị ka anyị nwere ike iji ndụ anyị mee ná nzukọ Jehova ka anyị nwee ike ijezu ozi anyị?
3 Jizọs kwuru ihe Jehova chọrọ ka ndị na-efe ya na-eme. Ọ sịrị: “Jiri obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum, jirikwa ike gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Mak 12:30) Jehova chọrọ ka anyị jiri obi anyị niile na-ejere ya ozi. Ihe nke a pụtara bụ na anyị kwesịrị ime ihe niile anyị nwere ike ime n’ozi Jehova. Ọ ga-egosi na ofufe anyị na-efe Jehova si anyị n’obi nakwa na anyị si n’ala ala obi anyị nyefee ya onwe anyị. (2 Tim. 2:15) E nwere ụzọ dị iche iche anyị nwere ike isi jeere Jehova ozi ebe ọ bụ na ike anyị na ọnọdụ anyị abụghị otu. Ugbu a, leba anya n’ụfọdụ n’ime ha, jirikwa aka gị kpebie otú i nwere ike isi jekwuoro Jehova ozi.
ỊGHỌ ONYE NKWUSA
4 Ndị niile batara n’ọgbakọ kwesịrị ịna-ekwusa ozi ọma. Ọ bụ ọrụ kachanụ Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya rụọ. (Mat. 24:14; 28:19, 20) Onye na-eso ụzọ Jizọs Kraịst na-amalitekarị ozugbo e ziri ya ozi ọma gwawa ndị ọzọ ihe ọ na-amụta. Ọ bụ ihe Andru, Filip, Kọnịliọs, na ndị ọzọ mere. (Jọn 1:40, 41, 43-45; Ọrụ 10:1, 2, 24; 16:14, 15, 25-34) Ọ̀ pụtara na mmadụ nwere ike ịna-ezi ndị ọzọ ozi ọma tupudị ya emee baptizim? Ee. Ozugbo mmadụ ghọrọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, ọ ga na-esozi ọgbakọ aga ozi ụlọ n’ụlọ. O nwekwara ike isi ụzọ ndị ọzọ anyị si ekwusa ozi ọma na-ezi ndị mmadụ ozi ọma otú o nwere ike.
5 E mechaa onye nkwusa baptizim, o doro anya na ọ ga-achọ ime ihe niile o nwere ike ime iji zie ndị mmadụ ozi ọma. Ma ụmụnna nwoke ma ụmụnna nwaanyị na-ekwusa ozi ọma. Ọ bụ ezigbo ihe ọma ka Jehova meere anyị ebe o kwere ka anyị na-ekwusa ozi ọma Alaeze ya. Onye ọ bụla n’ime anyị wepụtara onwe ya ijekwuru Jehova ozi ga-enwe ezigbo obi ụtọ.
IJE OZI N’EBE A CHỌKWURU NDỊ NKWUSA
6 O nwere ike ịbụ na ọ naghị ara ahụ́ unu ezichaa ozi ọma n’ókèala unu n’ihi na o bughị ibu. Ya dị otú ahụ, i nwere ike ịchọ ịkwaga n’ebe a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma. (Ọrụ 16:9) Ọ bụrụ na ị bụ okenye ma ọ bụ ohu na-eje ozi, e nwere ike inwe ọgbakọ ga-achọ ka ị bịa nyere ha aka. Onye nlekọta sekit unu nwere ike ịgwa gị otú i nwere ike isi gaa nyere ọgbakọ ọzọ nọ na sekit unu aka. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịga nyere ọgbakọ nọ na sekit ọzọ aka, alaka ụlọ ọrụ dị n’obodo gị ga-akọrọ gị otú ị ga-esi eme ya.
7 Ị̀ ga-achọ ịga ebe a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma ná mba ọzọ? Ọ bụrụ na ị ga-achọ, i kwesịrị ichebara ya ezigbo echiche. Gị na ndị okenye ọgbakọ unu kwurịta ya. Ụdị njem a agaghị adịchara ma gị ma onye ọ bụla gị na ya ga-eso aga mfe. (Luk 14:28) Ọ bụrụ na ị gaghị anọte aka ebe ahụ, ọ ga-akacha mma ka ị nọrọ ná mba unu jee ụdị ozi a.
8 Ná mba ụfọdụ, ụmụnna ndị a na-ahọpụta ka ha lekọtawa ọgbakọ bụ ndị na-anọtebeghị aka n’ọgbakọ. Ụmụnna ndị a dị umeala n’obi, ha ga-achọkwa ka ndị okenye ma nke a na-akọ gafeta n’ọgbakọ ha na-edu ndú. Ọ bụrụ na ị bụ okenye ma chọọ ịkwaga n’otu n’ime mba ndị a, buru n’obi na ihe mere i ji aga ebe ahụ abụghị ka ị nọchie ụmụnna ndị ahụ. Kama, ọ bụ ka i soro ha na-elekọta ọgbakọ. Nyere ha aka ka ha ruo eruo ịna-elekọta ọgbakọ. (1 Tim. 3:1) Na-enwere ha ndidi ma ọ bụrụ na otú ha si eme ihe ụfọdụ abụghị otú e si eme ha ná mba unu. Jiri ihe ndị ị mụtarala kemgbe ị bụ okenye nyere ụmụnna ndị ahụ aka. Ọ bụrụ na i mechaa laghachi obodo gị, aka i nyeere ndị okenye ọgbakọ ahụ ga-eme ka ha nwee ike ilekọta ọgbakọ ha nke ọma.
9 Tupu alaka ụlọ ọrụ agwa gị aha ọgbakọ ndị i nwere ike ịga nyere aka, Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ unu ga-edegara ha akwụkwọ ozi ga-egosi na ha kwadoro ka ị gaa. Ha ga-eme otú ahụ ma ị̀ bụ okenye, ohu na-eje ozi, ọsụ ụzọ oge niile, ma ị̀ bụ naanị onye nkwusa. Ha ga-ezite akwụkwọ ozi a nakwa akwụkwọ ozi nke gịnwa dere i ji chọọ ka alaka ụlọ ọrụ mba ị chọrọ ịga kọwaara gị otú ebe ahụ dị.
IZI OZI ỌMA N’ASỤSỤ ỌZỌ
10 Ihe ọzọ ga-enyere gị aka ijekwuru Jehova ozi bụ ịmụ asụsụ ọzọ, dị ka asụsụ ndị ogbi. Ọ bụrụ na ị chọrọ ịmụ asụsụ ọzọ ka i nwee ike iji ya na-ezi ndị mmadụ ozi ọma, kọọrọ ya ndị okenye unu na onye nlekọta sekit unu. Ha ga-atụrụ gị aro ihe ị ga-eme, gbaakwa gị ume. Ụfọdụ sekit anatala alaka ụlọ ọrụ ikike ma hazie klas a na-akụziri ụfọdụ ndị nkwusa na ụfọdụ ndị ọsụ ụzọ asụsụ ọzọ ha ga-eji na-ezi ozi ọma.
ỊSỤ ỤZỌ
11 Onye nkwusa ọ bụla kwesịrị ịma ihe mmadụ ga-eme ka o nwee ike ịbụ ọsụ ụzọ inyeaka, ọsụ ụzọ oge niile, ọsụ ụzọ pụrụ iche ma ọ bụ ije ozi oge niile ndị ọzọ. Tupu mmadụ abụrụ ọsụ ụzọ, ọ ga-abụrịrị onye nkwusa e mere baptizim ma na-akpa àgwà ọma. Ọ ga-enwekwa ike ịna-ewepụta oge ọ ga-eji na-arụta awa ole a chọrọ ka onye ọsụ ụzọ na-arụta n’ozi ọma. Ọ bụ Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ na-ahọpụta ndị ọsụ ụzọ inyeaka na ndị ọsụ ụzọ oge niile. Ma, ọ bụ alaka ụlọ ọrụ na-ahọpụta ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche.
12 Nwanna nwere ike ịbụ ọsụ ụzọ inyeaka otu ọnwa ma ọ bụ karịa. O nwekwara ike ịrụrụ ya gawa n’ekwughị mgbe ọ ga-akwụsị. Ọtụtụ ụmụnna na-asụ ụzọ inyeaka n’oge ndị pụrụ iche, dị ka, n’oge a na-echeta ọnwụ Jizọs ma ọ bụ mgbe onye nlekọta sekit bịara ileta ọgbakọ ha. Ụfọdụ na-asụ ụzọ inyeaka n’ọnwa ndị ha nọ n’ezumike. Ụmụ akwụkwọ ndị merela baptizim nwere ike ịsụ ụzọ inyeaka n’oge ha nọ n’ezumike. Ndị nkwusa nwere ike ikpebi ịsụ ụzọ inyeaka n’ọnwa Mach na Eprel, ma ọ bụ n’ọnwa onye nlekọta sekit bịara ileta ọgbakọ ha, bụ́ oge a na-ewepụ ihe n’awa ole ndị ọsụ ụzọ inyeaka nwere ike inye. N’agbanyeghị otú ihe si dịrị gị, ọ bụrụ na ị na-akpa ezi àgwà, nwee ike ịrụta awa ole a chọrọ, dejupụtakwa fọm ọsụ ụzọ inyeaka maka otu ọnwa ma ọ bụ karịa, ndị okenye ga-abịanye aka na ya, obi ga-atọkwa ha ụtọ na ị chọrọ ijekwuru Jehova ozi.
13 Tupu ị bụrụ ọsụ ụzọ oge niile, ị ga-adị njikere ịna-arụta awa ole a chọrọ ka ndị ọsụ ụzọ na-arụta kwa afọ. Ị ga na-eso ọgbakọ unu eje ozi. Ndị ọsụ ụzọ ndị ji ozi ha kpọrọ ihe na-abara ọgbakọ ha ezigbo uru. Ha na-eme ka ozi ọma na-atọ ụmụnna ụtọ, na-agbakwa ndị ọzọ ume ka ha bụrụ ndị ọsụ ụzọ. Ma, tupu ị bụrụ ọsụ ụzọ oge niile, ị ga-abụrịrị onye nkwusa e mere baptizim ruo ọnwa isii.
14 Ọ na-abụkarị ụfọdụ ndị ọsụ ụzọ oge niile na-eme nke ọma n’ozi ha ka alaka ụlọ ọrụ na-ahọpụta ka ha bụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche. Ha ga-abụ ndị ga-ekwe ịga ebe ọ bụla alaka ụlọ ọrụ zigara ha. Ebe a na-eziga ha na-abụkarị ebe ha ga-achọta ndị nwere mmasị ịnụ Okwu Chineke ma hiwe ọgbakọ ọhụrụ ebe ahụ. Mgbe ụfọdụ, a na-eziga ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche n’ọgbakọ na-anaghị arụzu ókèala ha. A na-ezigakwa ụfọdụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, bụ́ ndị okenye, n’ọgbakọ e nwere ndị nkwusa ole na ole ka ha nyere ha aka, ọ bụrụgodị na ha na-arụzu ókèala ha. A na-enye ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche ego mmachi akpa ha ji egbo mkpa ha. E nwere ụfọdụ ndị a na-ahọpụta ka ha bụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche nwa oge.
NDỊ OZI ALA ỌZỌ
15 Ọ bụ Kọmitii Ije Ozi nke Òtù Na-achị Isi na-ahọpụta ndị ozi ala ọzọ. Ma, ọ bụ Kọmitii Alaka obodo e zigara ha na-eziga ha n’obodo ndị mepere emepe ha ga-anọ na-eje ozi. Ha na-eme ka ụmụnna jiri ozi ọma na ọrụ ndị a na-arụ n’ọgbakọ kpọrọ ihe. A na-azụkarị ndị ozi ala ọzọ n’Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze. A na-achọtara ha ụlọ, na-enyekwa ha ego mmachi akpa ha ji egbo mkpa ha.
NDỊ NLEKỌTA SEKIT
16 Ọ bụ Òtù Na-achị Isi na-ahọpụta ndị nlekọta sekit. Tupu a họpụta ha, ha na-ebu ụzọ enyere ndị nlekọta sekit aka eleta ọgbakọ mgbe ụfọdụ. Ọ bụ otú a ka e si azụ ha maka ịbụ ndị nlekọta sekit. Ndị nlekọta sekit hụrụ ụmụnna ha n’anya ma jiri ozi Jehova kpọrọ ihe. Ha bụ ndị ọsụ ụzọ ji ozi ha kpọrọ ihe, na-amụchi Baịbụl anya ma na-akụzi ihe nke ọma. A ma ha ama na ha na-akpa àgwà e ji mara ndị nwere mmụọ nsọ Chineke. Ha ga-abụ ndị nwere ezi uche na nghọta, ha agaghịkwa abụ ndị na-emefe ihe ókè. Ọ bụrụ na onye a ga-ahọpụta ka ọ bụrụ onye nlekọta sekit alụọla nwaanyị, nwunye ya ga-abụ onye na-akpa ezi àgwà nakwa onye ya na ndị mmadụ dị ná mma. Nwunye ya ga-abụkwa onye na-ezi ozi ọma nke ọma. Ọ ga-abụ onye na-edo onwe ya n’okpuru di ya. O kwesịghị ịbụ onye na-ekpebiri di ya ihe ọ ga-eme ma ọ bụ onye na-achọ ka okwu bie n’ọnụ ya. Ihe ndị nlekọta sekit na ndị nwunye ha na-arụ karịrị akarị. N’ihi ya, ndị chọrọ ịbụ ndị nlekọta sekit kwesịrị ịbụ ndị ahụ́ gbasiri ike. Ndị ọsụ ụzọ anaghị etinye akwụkwọ ka a họpụta ha ka ha bụrụ ndị nlekọta sekit. Kama, ha na-agwa onye nlekọta sekit ha na ọ na-agụ ha agụụ ịbụ ndị nlekọta sekit. Onye nlekọta sekit ahụ ga-agwazi ha ihe ha ga-eme.
ỤLỌ AKWỤKWỌ NDỊ E NWERE NÁ NZUKỌ JEHOVA
17 Ụlọ Akwụkwọ Maka Ndị Na-ekwusa Ozi Ọma Alaeze: A chọkwuru ndị nkwusa ga na-ezi ozi ọma n’ókèala ndị a na-anaghị ezikarị ozi ọma na ha nakwa ndị ga na-enyere ọgbakọ ndị nọ ebe ahụ aka. N’ihi ya, ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nakwa ndị di na nwunye nwere ike itinye akwụkwọ ka ha gaa ụlọ akwụkwọ a. A na-ezipụ ndị gara ụlọ akwụkwọ a ka ha bụrụ ndị ọsụ ụzọ oge niile n’ebe a chọkwuru ndị ga na-ekwusa ozi ọma ná mba ha. Ma, e nwere ike inye ụfọdụ n’ime ha ọrụ ndị ọzọ ná mba ha ma ọ bụ ná mba ọzọ ma ha kweta ịrụ ha. E nwekwara ike izipụ ụfọdụ ndị gara ụlọ akwụkwọ a ka ha bụrụ ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ụfọdụ abụrụ nke nwa oge. Ndị ọsụ ụzọ chọrọ ịga ụlọ akwụkwọ a kwesịrị ịga nnọkọ a na-enwe ná mgbakọ ukwu maka ndị chọrọ ịga ya.
18 Ụlọ Akwụkwọ Gilied: Ụmụnna ndị na-alụbeghị di ma ọ bụ nwunye nakwa ndị di na nwunye nwere ike ịga ụlọ akwụkwọ a. Ha ga-abụ ndị ma Bekee asụ. Ha ga-abụkwa ndị nọ n’ozi oge niile pụrụ iche. Ha ga-abụkwa ndị ga-enweli ike ime ka ihe na-aga aga n’ọgbakọ ma ọ bụ na Betel. Ha kwesịrị ịbụ ndị na-eji obi ha niile ejere ụmụnna ha ozi, ndị na-emeda obi enyere ụmụnna ha aka ịmụta ihe Baịbụl na nzukọ a na-akụzi nakwa ịna-eme ha eme. Ọ bụ Kọmitii Alaka na-enye ndị nwere ike ịga ụlọ akwụkwọ a fọm ha ga-edejupụta. A na-eziga ndị gara ụlọ akwụkwọ a ebe ha ga-aga kwusawa ozi ọma ma ọ bụ rụwa ọrụ na Betel. O nwere ike ịbụ ná mba ha ma ọ bụkwanụ ná mba ọzọ.
IJE OZI NA BETEL
19 Ije ozi na Betel bụ ihe ọma pụrụ iche. Betel pụtara “Ụlọ Chineke.” Aha a dabara adaba n’ihi na ọ bụ na Betel ka a na-anọ ahazi ọrụ nzukọ Jehova na-arụ. Ụmụnna nwoke na ụmụnna nwaanyị na-eje ozi na Betel na-arụ ọrụ dị mkpa. Ha na-asụgharị akwụkwọ anyị dị iche iche e ji amụ Baịbụl, na-ebipụta ha ma na-ebugara ha ọgbakọ dị iche iche. Ọrụ ha na-arụ na-enyere Òtù Na-achị Isi aka ịna-elekọta ọgbakọ Ndịàmà Jehova n’ụwa niile. Ọtụtụ ndị Betel bụ́ ndị nsụgharị bi n’ebe a na-asụ asụsụ ha na-asụgharị na-arụ ọrụ ha. Nke a na-enyere ha aka ịnụ otú ndị mmadụ si asụ asụsụ ahụ kwa ụbọchị. Ọ na-enyekwara ha aka ịma ma ndị mmadụ hà na-aghọta ihe ndị ha na-asụgharị.
20 Ọtụtụ ọrụ a na-arụ na Betel bụ ọrụ e ji ike ọkpụkpụ aka arụ. N’ihi ya, ndị a na-akpọkarị ka ha jewe ozi na Betel bụ ụmụnna nwoke merela baptizim, ndị na-akatabeghị ahụ́, ndị ahụ́ gbasiri ike, na ndị dị ike ọrụ. Ọ bụrụ na a chọkwuru ndị ga na-eje ozi n’alaka ụlọ ọrụ na-elekọta obodo unu, ya abụrụkwa na ị chọrọ ịga, i nwere ike ịjụ ndị okenye ọgbakọ unu ka ha gwa gị ihe ị ga-eme.
ỊRỤRỤ NZUKỌ JEHOVA ỤLỌ
21 Ịrụrụ nzukọ Jehova ụlọ bụ otu n’ime ozi ndị dị nsọ anyị na-ejere Chineke. O yiri ụdị ọrụ ahụ a rụrụ mgbe a na-arụ ụlọ nsọ Sọlọmọn. (1 Eze 8:13-18) Ọtụtụ ụmụnna, ma ndị nwoke ma ndị nwaanyị, na-eji obi ha niile ewepụta oge ha na ihe ndị ọzọ ha nwere enye aka n’ọrụ a.
22 Ị̀ ga-enweli ike iso na-arụ ọrụ a? Ọ bụrụ na i meela baptizim, chọọkwa iso na-arụ ọrụ a, ụmụnna na-ahụ maka ịrụrụ nzukọ Jehova ụlọ n’ógbè unu ga-achọ ka ị bịa nye aka, ha dịkwa njikere ịzụ gị ma ọ bụrụ na ị machaghị otú e si arụ ụlọ. Ọ bụrụ na ị bụ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim, i nwere ike inye aka mgbe a na-arụzigharị Ụlọ Nzukọ Alaeze unu ma ọ bụ mgbe a na-arụrụ unu nke ọhụrụ. Gwa ndị okenye ọgbakọ unu na ị ga-achọ inye aka. E nweela ụfọdụ ndị mere baptizim a họpụtara ka ha soro na-arụrụ nzukọ Jehova ụlọ ná mba ndị ọzọ.
23 E nwere ụzọ dị iche iche mmadụ nwere ike isi soro na-arụrụ nzukọ Jehova ụlọ. Ndị nkwusa e mere baptizim na-eme nke ọma n’ọgbakọ, ndị ịrụ ụlọ dotụrụ anya, nwere ike iso ná ndị na-enyere Ndị Na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze aka. Ụfọdụ n’ime ha na-enye aka arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị dị nso n’ebe ha bi. E nwekwara ndị nke alaka ụlọ ọrụ na-ahọpụta ka ha gaa ebe dị anya nye aka rụọ ọrụ izu abụọ ma ọ bụdị ruo ọnwa atọ. Ihe a na-akpọ ndị nke alaka ụlọ ọrụ na-ahọpụta ka ọrụ ha bụrụ ịna-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze bụ ndị na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze, a na-akpọkwa onye si mba ọzọ bịa na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze onye ọrụ si mba ọzọ. Ọ bụ ndị na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na ndị alaka ụlọ ọrụ họpụtara ka ha na-enyere ha aka na-aga arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ọ bụla a chọrọ ka a rụọ. Ụmụnna ndị na-enye aka arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze ndị dị nso n’ebe ha bi na ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ a na-arụrụ Ụlọ Nzukọ Alaeze na-enyekwa aka. Ọ na-abụ Ndị Na-arụ Ụlọ Nzukọ Alaeze rụchaa otu, ha agafee n’ọzọ. Nke ọ bụla ha na-arụ na-adị n’ebe alaka ụlọ ọrụ mba ha na-elekọta.
OLEE IHE NDỊ I KPEBIRI IMEKWU N’OZI JEHOVA?
24 Ọ bụrụ na i nyefeela Jehova onwe gị, ị chọrọ ijere ya ozi ruo mgbe ebighị ebi. Ma, olee ihe ndị i kpebiri imekwu n’ozi Jehova? Ọ bụrụ na i nwee ihe ndị i kpebiri imekwu n’ozi Jehova, ọ ga-enyere gị aka iji ndụ gị na ihe ndị i nwere eme ihe bara uru. (1 Kọr. 9:26) Ihe ndị ahụ i kpebiri ime ga-enyere gị aka ịna-eme nke ọma n’ofufe Chineke. Ọ ga-enyekwara gị aka ilekwasị anya n’ihe ndị ka mkpa ka ị na-agbalịsi ike iru eru ịrụ ọrụ ndị ọzọ n’ọgbakọ.—Fil. 1:10; 1 Tim. 4:15, 16.
25 Anyị kwesịrị ịna-ejere Chineke ozi otú Pọl onyeozi si jeere ya. (1 Kọr. 11:1) Pọl ji ike ya niile jeere Jehova ozi. Ọ ghọtara na e nwere ụzọ dị iche iche Jehova chọrọ ka o si jekwuoro ya ozi. Ọ gwara Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt, sị: “E megheworo m ọnụ ụzọ buru ibu nke na-eduga n’ịrụ ọrụ.” Ọ bụkwa otú ahụ ka ọ dị anyị. E nwere ụzọ dị iche iche anyị nwere ike isi jekwuoro Jehova ozi n’ọgbakọ anyị, nke ka nke, n’ihe gbasara ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Ma, dị ka Pọl, e nwere ọtụtụ “ndị mmegide” na-agaghị achọ ka anyị banye ‘n’ọnụ ụzọ a buru ibu.’ (1 Kọr. 16:9) Pọl mere ihe niile o nwere ike ime ka o nwee ike ịbanye. O kwuru, sị: “M na-etipụta ahụ́ m ọnyá, na-achị ya dị ka ohu.” (1 Kọr. 9:24-27) Ànyị na-eme otú a Pọl mere?
Ọ bụrụ na i nwee ihe ndị i kpebiri imekwu n’ozi Jehova, ọ ga-enyere gị aka iji ndụ gị na ihe ndị i nwere na-eme ihe bara uru
26 Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ikpebi otú ọ ga-esi jekwuoro Jehova ozi otú ike kwere ya. Ọtụtụ ndị nọ n’ozi oge niile taa kpebiri mgbe ha dị obere na ha ga-abanye na ya ma ha too. Ndị mụrụ ha na ndị ọzọ gbakwara ha ume ka ha mee otú ahụ. Ha esikwala otú a jiri oge ha niile na-ejere Jehova ozi n’akwaghị mmakwaara. (Ilu 10:22) Otú ọzọ anyị nwere ike isi jekwuoro Jehova ozi bụ ije ozi ọma kwa izu, ịmụrụ ndị mmadụ Baịbụl ma ọ bụ iwepụtakwu oge akwadebe ihe ndị a ga-amụ n’ọmụmụ ihe. Ihe ka mkpa bụ ka anyị na-eme uche Jehova ma gbasie mbọ ike jezuo ozi anyị. Anyị mee otú ahụ, anyị ga na-eto Jehova ma na-efe ya ruo mgbe ebighị ebi.—Luk 13:24; 1 Tim. 4:7b, 8.