Ndị Ntorobịa—Gịnị Ka Unu Ga-eji Ndụ Unu Mee?
“ACHỌRỌ m inweta ihe kachasị mma ná ndụ.” Nke ahụ bụ ihe otu nwata nwanyị nọ n’afọ iri na ụma kwuru. Obi abụọ adịghị ya na gị onwe gị kwa chọrọ otu ihe ahụ. Ma olee nnọọ otú ị ga-esi nweta ihe “kachasị mma” ná ndụ? Usoro mgbasa ozi nakwa ndị ọgbọ gị, ma eleghị anya ọbụna ndị nkụzi gị, pụrụ ịsị na a na-enweta ihe kachasị mma ná ndụ site n’ịkpata nnukwu ego na inwe ọrụ dị ùgwù—ịbụ onye nwere ihe ịga nke ọma!
Otú ọ dị, Bible na-adọ ndị na-eto eto aka ná ntị na ịchụso inwe ihe ịga nke ọma n’ụzọ ihe onwunwe bụ nanị “ịchọ ijide ifufe.” (Eklisiastis 4:4) Otu ihe bụ na ọ bụ ndị na-eto eto ole na ole na-aghọ ọgaranya ma bụrụ ndị a ma ama. Ndị na-emesị ghọọ ndị bara ọgaranya na-achọtakịrị onwe ha n’ọnọdụ nkụda mmụọ dị ukwuu. “O yiri igbe tọgbọ chakoo,” ka otu onye ntorobịa bụ́ onye Britain, onye chụsoworo agụmakwụkwọ dị elu, na-ekwu. “Ozugbo i lebara anya n’ime ya, ọ dịghị ihe ị ga-ahụ.” N’eziokwu, mgbe ụfọdụ ọrụ pụrụ ime ka mmadụ baa ọgaranya ma bụrụ onye a ma ama. Ma ọ gaghị egbo “mkpa nke ime mmụọ” gị. (Matiu 5:3) E wezụga nke ahụ, 1 Jọn 2:17 na-adọ aka ná ntị na “ụwa na-agabiga.” Ọ bụrụgodị na i nwee ike inwe ihe ịga nke ọma n’ụwa a, ọ gaghị adịte aka.
Ya mere Eklisiastis 12:1 na-agba ndị na-eto eto ume, sị: “Cheta Onye Okike gị mgbe ị ka na-eto eto.” (Today’s English Version) Ee, ụzọ kasị mma isi jiri ndụ gị na-eme ihe bụ n’ijere Jehova Chineke ozi. Ma, ị ghaghị ibu ụzọ ruo eru ijere Chineke ozi. Olee otú ị pụrụ isi ruo eru? Oleekwa ihe ijere Chineke ozi na-agụnye?
Iru Eru Ịbụ Onyeàmà nke Jehova
Nke mbụ, ị ghaghị ịzụlite ọchịchọ ijere Chineke ozi—ọchịchọ ahụ adịghịkwa abịara onwe ya, ọ bụrụgodị na ndị mụrụ gị bụ Ndị Kraịst. Ị ghaghị iso Jehova nwee mmekọrịta onwe onye. “Ikpe ekpere na-enyere gị aka iso Jehova na-enwe mmekọrịta onwe onye,” ka otu nwatakịrị nwanyị nọ n’afọ iri na ụma na-ekwu.—Abụ Ọma 62:8; Jems 4:8.
Ndị Rom 12:2 na-eme ka nzọụkwụ ọzọ ị na-aghaghị ịgbaso pụta ìhè. Ọ na-asị: “Na-anwapụtara onwe unu ihe bụ́ uche Chineke nke ziri ezi na nke a na-anara nke ọma na nke zuru okè.” Ọ̀ dịtụwo mgbe i nwere obi abụọ n’ụfọdụ n’ime ihe ndị a kụziwooro gị? Mgbe ahụ, gbasoo ndụmọdụ Bible ma ‘nwapụtara onwe gị’ na ihe ndị a bụ eziokwu! Mee nnyocha n’onwe gị. Na-agụ Bible na akwụkwọ ndị dabeere na Bible. Otú ọ dị, ịmụ banyere Chineke abụghị nanị okwu metụtara iji ọgụgụ isi eme ihe. Wepụta oge tụgharịa uche n’ihe ị na-agụ ka o wee bamie abamie n’ime obi ihe atụ gị. Nke a ga-eme ka ịhụnanya i nwere n’ebe Chineke nọ bukwuo ibu.—Abụ Ọma 1:2, 3.
Ọzọ, gbalịa isoro ndị ọzọ na-ekerịta ihe ndị ị na-amụta, ikekwe gị na ụmụ akwụkwọ ibe gị site n’ịgba àmà mberede. Ime nkwusa site n’ụlọ ruo n’ụlọ bụ nzọụkwụ ọzọ. Mgbe ụfọdụ ị pụrụ izute nwa akwụkwọ ibe gị mgbe ị nọ na-eme nkwusa, nke a pụkwara ime ka i nwee ahụ́ erughị ala na mbụ. Ma Bible na-agba anyị ume ka “ihere ozi ọma ahụ” ghara ime anyị. (Ndị Rom 1:16) Ị na-ewegara ndị mmadụ ozi na-enye ndụ na olileanya! N’ihi gịnị ka ihere ga-eji na-eme gị maka ya?
Ugbu a, ọ bụrụ na ndị mụrụ gị bụ Ndị Kraịst, ọ pụrụ ịbụ na ị maliteworị isonyere ha n’ọrụ a. Ma ị̀ pụrụ ime ihe karịrị iguzo n’ọnụ ụzọ ma gbachi nkịtị ma ọ bụ nanị inyefe magazin na traktị? Ị̀ ga-enwe ike ikwu okwu n’ọnụ ụzọ n’onwe gị, jiri Bible zie onye nwe ụlọ ihe? Ọ bụrụ na ị gaghị emeli ya, mgbe ahụ nweta enyemaka site n’aka ndị mụrụ gị ma ọ bụ site n’aka onye òtù ọgbakọ tozuru okè. Mee ya ihe mgbaru ọsọ gị iru eru dị ka onye nkwusa ozi ọma a na-emebeghị baptizim!
Ka oge na-aga, a ga-akpali gị ime nraranye—na-ekwe Chineke nkwa na ị ga na-ejere ya ozi malite mgbe ahụ gaa n’ihu. (Ndị Rom 12:1) Otú ọ dị, nraranye abụghị nanị ihe dịịrị mmadụ. Chineke chọrọ ka mmadụ nile mee “nkwupụta ihu ọha maka nzọpụta.” (Ndị Rom 10:10) N’oge a ga-eme gị baptizim, ị ga-ebu ụzọ jiri ọnụ mee nkwupụta nke okwukwe gị. Baptizim n’ime mmiri ga-esochi. (Matiu 28:19, 20) N’eziokwu, baptizim bụ nzọụkwụ dị oké mkpa. Ma alala azụ n’ihi na ị na-eche na i nwere ike ịda n’ụzọ ụfọdụ. Ọ bụrụ na ị dabere n’ebe Chineke nọ maka ume, ọ ga-enye gị “ike karịrị ike nkịtị” iji nyere gị aka iguzosi ike.—2 Ndị Kọrint 4:7; 1 Pita 5:10.
Mgbe e mere gị baptizim, ị na-aghọ otu n’ime Ndịàmà Jehova. (Aịsaia 43:10) Nke a kwesịrị inwe mmetụta dị ịrịba ama n’otú ị ga-esi eji ndụ gị mee ihe. Nraranye na-agụnye ‘ịjụ onwe gị.’ (Matiu 16:24) Ị pụrụ ịhapụ ihe mgbaru ọsọ na ọchịchọ onwe onye ụfọdụ ma ‘buru ụzọ na-achọ alaeze Chineke.’ (Matiu 6:33) Ya mere, nraranye na baptizim na-emepere mmadụ ọtụtụ ohere ime otú ahụ. Ka anyị tụlee ụfọdụ n’ime ha.
Ohere Dị Iche Iche Iji Jeere Chineke Ozi Oge Nile
● Ịsụ ụzọ bụ otu n’ime ụdị ohere ahụ. Onye nkwusa bụ́ onye ọsụ ụzọ bụ Onye Kraịst e meworo baptizim nke na-esetịpụ ezi ihe nlereanya, onye meworo ndokwa ịdị na-etinye awa 70 ma ọ dịkarịa ala kwa ọnwa n’ikwusa ozi ọma. Ịdị na-etinyekwu oge n’ozi ubi ga-enyere gị aka ịzụlite nkà ime nkwusa na nke izi ihe gị. Ọtụtụ ndị ọsụ ụzọ enwetawo ọṅụ nke inyere ndị ha na-amụrụ Bible aka ịghọ Ndịàmà e mere baptizim. Olee ọrụ ego pụrụ ịdị na-akpali akpali ma na-enye afọ ojuju ka ya?
Iji na-ahụ maka ihe ndị ha na-emefu, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị ọsụ ụzọ na-arụ ọrụ ego nwa oge. Ọtụtụ na-ebu ụzọ mee atụmatụ maka ibu ọrụ a site n’ịmụ ọrụ aka n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ site n’aka ndị mụrụ ha. Ọ bụrụ na gị na ndị mụrụ gị chere na ọ ga-aba uru ka i nwetakwuo ọzụzụ ụfọdụ mgbe ị gachara ụlọ akwụkwọ sekọndrị, jide n’aka na ebumnobi gị bụ, ọ bụghị iji kpata ego buru ibu, kama iji kwadoo ozi gị nakwa ma eleghị anya ije ozi dị ka onye ozi oge nile.
Otú ọ dị, ihe bụ́ isi ná ndụ onye ọsụ ụzọ abụghị ọrụ ego ya, kama ozi ya—inyere ndị ọzọ aka inweta ndụ! Gịnị ma i debe ịsụ ụzọ dị ka ihe mgbaru ọsọ gị? Ịsụ ụzọ na-edugakarị n’ihe ùgwù ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị ọsụ ụzọ na-akwaga n’ebe e nwere mkpa ka ukwuu maka ndị nkwusa Alaeze. Ndị ọzọ na-amụta asụsụ ala ọzọ ma na-eje ozi n’ọgbakọ dị n’ógbè ha nke na-eji asụsụ ala ọzọ eme ihe, ma ọ bụ ọbụna n’ala ọzọ. Ee, ịsụ ụzọ bụ ụzọ ndụ na-eweta ụgwọ ọrụ!
● Ozi ala ọzọ bụ ohere ọzọ ghere oghe. Kemgbe 1943, Watchtower Bible School of Gilead enyewo ndị ọsụ ụzọ ruru eru ọzụzụ bụ́ ịgba maka ozi ala ọzọ. A na-ekenye ndị gụsịrị akwụkwọ ọrụ ije ozi dị ka ndị nkwusa oge nile n’ala ndị ọzọ. N’ọtụtụ n’ime ala ndị a, ọnọdụ ibi ndụ tara akpụ, ya mere ezi ahụ́ ike na ume dị oké mkpa maka ije ozi ala ọzọ. N’agbanyeghị nke ahụ, ndị ozi ala ọzọ na-adị ndụ na-akpali akpali, nke na-eweta afọ ojuju.
● Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi bụ nke e guzobere iji zụọ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi ruru eru, ndị na-alụbeghị nwunye. Ọzụzụ ahụ kpụ ọkụ n’ọnụ nke na-ewe izu asatọ na-agụnye isiokwu ndị dị ka ọrụ ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi, ime nhazi, na ikwu okwu n’ihu ọha. A na-ekenye ụfọdụ ndị ọrụ ije ozi ná mba ha. A na-agwa ndị ọzọ ka ha gaa ozi n’ala ọzọ.
● Ozi Betel na-agụnye ije ozi dị ka onye ọrụ afọ ofufo n’otu n’ime ihe owuwu alaka nke Ndịàmà Jehova. Ụfọdụ ndị òtù ezinụlọ Betel na-arụ ọrụ kpọmkwem n’ibipụta akwụkwọ ndị e ji amụ Bible. Ndị ọzọ na-arụ ọrụ ndị na-enye aka n’ibipụta akwụkwọ, ọrụ ndị dị ka ilekọta ụlọ na ngwá ọrụ ma ọ bụ ịhụ maka mkpa anụ ahụ́ nke ndị òtù ezinụlọ Betel. Ọrụ nile bụ ihe ùgwù ije ozi dị nsọ nye Jehova. Ọzọkwa, ndị nọ na Betel nwere ọṅụ nke ịmara na ihe ọ bụla ha na-arụ, ọ na-abara ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ụmụnna ha gburugburu ụwa uru.
Mgbe ụfọdụ a na-akpọ ụmụnna ndị nwere nkà pụrụ iche ije ozi na Betel. Otú ọ dị, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ na-anata ọzụzụ ha mgbe ha bịara. Ndị nọ na Betel adịghị eje ozi n’ihi uru ihe onwunwe kama ha nwere afọ ojuju ná ndokwa ndị e mere maka ihe oriri, ebe obibi, na obere ego mmachi akpa maka mmefu ndị ha na-eme n’onwe ha. Otu onye na-eto eto bụ́ onye òtù ezinụlọ Betel si otú a kọwaa ozi ya: “Ọ magburu onwe ya! Usoro ihe omume anyị siri ike, ma enwetawo m ọtụtụ ngọzi n’ije ozi n’ebe a.”
● Ije ozi ná mba nile na-enye mmadụ ohere ikere òkè n’iwu alaka ụlọ ọrụ na Ụlọ Nzukọ Alaeze dị iche iche. Ndị ozi nke mba nile, dị ka a na-akpọ ha, na-aga n’ala ndị ọzọ iji nye aka n’ọrụ owuwu ihe ndị dị otú ahụ. Nke a bụ otu ụdị nke ozi dị nsọ, nke yiri ọrụ nke ndị wuru ụlọ nsọ Solomọn rụrụ. (1 Ndị Eze 8:13-18) Ndokwa ndị e mere maka ilekọta ndị ozi mba nile yiri ndị e mere maka ezinụlọ Betel. Lee ihe ùgwù ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị a nwere n’ije ozi n’ọrụ a na-ewetara Jehova otuto!
Jiri Obi Gị Dum Na-ejere Jehova Ozi
Ijere Jehova ozi bụ ụzọ kasị mma nke isi jiri ndụ gị na-eme ihe. Gịnị ma ị tụlee isetịpụrụ onwe gị ihe mgbaru ọsọ nke ijere Chineke ozi oge nile? Soro ndị mụrụ gị, ndị okenye ọgbakọ unu, na onye nlekọta sekit unu kwurịta banyere ozi oge nile. Ọ bụrụ na i nwere mmasị na Betel, Gilead, ma ọ bụ n’Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi, gaa nzukọ maka ndị ga-achọ itinye akwụkwọ maka ha bụ nke a na-enwe ná mgbakọ sekit na nke distrikti.
N’eziokwu, ọ bụghị mmadụ nile pụrụ iru eru ma ọ bụ nwee ike ije ozi oge nile. Mgbe ụfọdụ nsogbu ahụ́ ike, ọnọdụ ego, na ibu ọrụ ezinụlọ na-akpara ihe mmadụ pụrụ ime ókè. Ọbụna otú ahụ, Ndị Kraịst nile raara onwe ha nye aghaghị irube isi n’iwu Bible ahụ bụ́: “Ị ghaghị iji obi gị dum, jirikwa mkpụrụ obi gị dum, jirikwa uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Matiu 22:37) Jehova chọrọ ka i mee ihe nile ọnọdụ gị nyere gị ohere ime. Ya mere, n’agbanyeghị ihe bụ ọnọdụ gị, mee ijere Jehova ozi ihe bụ́ isi ná ndụ gị. Setịpụ ihe mgbaru ọsọ ọchịchị Chineke ndị ị pụrụ iru. Ee, “cheta Onye Okike gị mgbe ị ka na-eto eto”—a ga-agọzikwa gị ruo mgbe ebighị ebi n’ihi ime otú ahụ!
Ọ gwụkwala ma e gosiri nsụgharị ọzọ, nsụgharị Bible e ji mee ihe maka Akwụkwọ Nsọ Grik bụ Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ Grik nke Ndị Kraịst, nsụgharị e jikwa mee ihe maka Akwụkwọ Nsọ Hibru bụ Bible Nsọ nke Union Version. E mewo ka nsụpe okwu nke nsụgharị abụọ ahụ kwekọọ n’ụdị e ji eme ihe n’oge a.