“Narị Afọ Iri Ọhụrụ—Gịnị Na-echere Gị n’Ọdịnihu?”
1 Ajụjụ ahụ anọwo na-adị n’uche ndị mmadụ gburugburu ụwa. Ọ bụ ezie na ihe a kpọrọ mmadụ arụzuola ihe dị ukwuu n’ime ọtụtụ narị afọ, ndị mmadụ enweela ndakpọ olileanya n’ihi na a ka nwere nsogbu ndị bụ́ isi mekpọworo ụmụ mmadụ ọnụ ruo ọtụtụ puku afọ. (Job 14:1; Abụ Ọma 90:10) Olee ebe ihe a kpọrọ mmadụ pụrụ isi nweta ahụ efe?
2 N’ọnwa October na November, anyị ga-enwe ohere pụrụ iche nke inye ndị agbata obi anyị azịza nke ajụjụ ahụ. N’ụzọ dị aṅaa? Site ná nkesa nke Akụkọ Alaeze nke 36. A kpọrọ ya “Narị Afọ Iri Ọhụrụ—Gịnị Na-echere Gị n’Ọdịnihu?” N’ọkara mbụ nke ọnwa October, anyị ga-enyefe magazin Ụlọ Nche na Teta! Malitezie na Monday, October 16, ruo Friday, November 17, anyị ga-ekere òkè ná nkesa kpụ ọkụ n’ọnụ nke Akụkọ Alaeze nke 36. N’oge mkpọsa a, anyị ga-elekwasị anya n’inyefe Akụkọ Alaeze nke 36 n’etiti izu. Ná ngwụsị izu, anyị ga-enyefekọta ya na magazin ndị ọhụrụ.
3 Ị̀ Ga-ekere Òkè Zuru Ezu? Ndị okenye, ndị ohu na-eje ozi, na ndị ọsụ ụzọ ga-achọ ibute ụzọ ná mkpọsa a, ebe ọ bụ na ha nọ n’ihu n’ọrụ ahụ. Ọtụtụ ndị nkwusa emegharịwo ọnọdụ ha iji sụọ ụzọ inyeaka n’otu ma ọ bụ n’ọnwa abụọ ahụ a ga-eme nkesa ahụ. Ndị ọzọ na-eme atụmatụ itinyekwu oge n’ozi karịa otú ha na-emebu.
4 Ndị nduzi Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ pụrụ inye aka n’ịgba onye ọ bụla so n’ìgwè ha ume ikere òkè zuru ezu ná nkesa nke Akụkọ Alaeze nke 36. A pụrụ inwe ụfọdụ ndị nkwusa na-adịghị ejekwa ozi n’ọrụ nkwusa ahụ. Ndị okenye kwesịrị ịga leta ndị a iji hụ ihe a pụrụ ime iji nyere ha aka. Ikekwe, a pụrụ ime ndokwa ka onye nkwusa nwere ahụmahụ soro onye ọ bụla na-adịghị ejekwa ozi rụọ ọrụ n’ubi n’ọnwa ndị a. Ụzọ dị mfe nke isi chee Akụkọ Alaeze nke 36 n’ihu mmadu pụrụ ịbụ nanị ihe dị mkpa iji tụteghachi ndị nkwusa a.
5 Nke a ga-abụkwa ohere dị mma maka ndị a na-amụrụ Bible bụ́ ndị gamiworo n’akwụkwọ Ihe Ọmụma ma ruo eruo dị ka ndị nkwusa a na-emebeghị baptism ịmalite ikere òkè n’ozi. Ọbụna ndị na-eto eto pụrụ ikere òkè dị mma n’ọrụ a na-enye obi ụtọ.
6 Ụzọ iche ihe n’ihu mmadụ nke dị mfe agwụla ihe a chọrọ. Ị pụrụ ikwu, sị:
◼ “Ewepụtawo m oge m n’afọ ofufo iji nye aka kesaara ezinụlọ ọ bụla nọ na [kpọọ aha obodo ma ọ bụ steeti a] ozi a dị oké mkpa. Nke a bụ nke gị. Biko gụọ ya.” Ụfọdụ pụrụ ịhọrọ ịghara ibu akpa ozi ọma mgbe a na-ekesa Akụkọ Alaeze nke 36.
7 Nzukọ Ndị A Haziri nke Ọma Maka Ozi Ubi: Ndị okenye aghaghị ịhụ na ndokwa ndị e mere maka ịgba àmà ga-edo ahụ ma kwe omume. Onye nlekọta ije ozi, karịsịa, kwesịrị ijide n’aka na e nwere ókèala buru ibu maka ozi ụlọ n’ụlọ nakwa ógbè azụmahịa ka onye ọ bụla wee nwee ike ikere òkè zuru ezu n’ọrụ ahụ. N’ebe ọ bụla o kwere omume, e kwesịrị ịhazi nzukọ maka ije ozi ubi maka ụbọchị nke ọ bụla n’ime izu, ngwụsị izu, na uhuruchi. A pụrụ ime ndokwa izukọta ná ngwụsị nke oge ehihie maka abamuru nke ụmụ akwụkwọ, ndị oge ọrụ ha na-agbanwe agbanwe, na ndị ọzọ.
8 Ihe A Ga-eme Banyere Ndị Na-anọghị n’Ụlọ: Ihe mgbaru ọsọ anyị bụ ịgwa ọtụtụ ndị nwe ụlọ ruo n’ókè o kwere omume, okwu. Ọ bụrụ na ọ dịghị onye nọ mgbe ị gara, detuo adres ebe ahụ ma gaghachi n’oge dị iche n’ụbọchị. Ọ bụrụ na i nwebeghị ike inweta ndị nwe ụlọ n’ụlọ ka ọ na-erule n’izu ikpeazụ nke mkpọsa ahụ, ị pụrụ idebere ha otu Akụkọ Alaeze nke 36 n’ebe ndị na-agafe agafe na-agaghị ahụ ya. Ndị okenye ọgbakọ pụrụ ịgwa ọgbakọ ka ha debere ndị na-anọghị n’ụlọ otu Akụkọ Alaeze nke 36 ná nleta mbụ mgbe a na-arụ ime ime obodo na ógbè ebe ndị e nwere ókèala karịrị nke a pụrụ ịrụzu n’oge mkpọsa ahụ.
9 Ka Aka Dịrị Anyị n’Ọrụ! Ọgbakọ nile kwesịrị ịgbalị ịrụzu ókèala ha tupu mkpọsa ahụ akwụsị na November 17. Ọ bụrụ na ókèala unu buru oké ibu, ụfọdụ ndị nkwusa pụrụ ịrụ nanị ha n’ebe nke a ga-ekwe omume ma ghara ịdị ize ndụ. Ndokwa a ga-eme ka ọ dị mfe karị irute ọtụtụ ndị kwesịrị ekwesị ruo n’ókè o kwere omume. Jide n’aka na i nwere ezigbo ihe ndekọ nke ndị nile nwere mmasị ị chọtara.
10 Ndị okenye kwesịrị ime atụmatụ magazin ole ọgbakọ ha ga-achọkwu ma tụọ ọda kwekọrọ na ya. Ọ dịghị mkpa ịtụ ọda Akụkọ Alaeze nke 36, ebe a na-ebugara ya ọgbakọ ọ bụla. Ndị ọsụ ụzọ pụrụ iche, ndị nke oge nile, na ndị nke inyeaka ga-enweta 128 n’otu n’otu maka ikesa, ebe a ga-ewere 48 nye ndị nkwusa ọgbakọ n’otu n’otu. N’ihi ya, ị̀ dị njikere ma nwee ịnụ ọkụ n’obi ịmalite ọrụ a pụrụ iche? Lee ihe ùgwù anyị nwere ime ka ndị agbata obi anyị nile mara ihe Chineke kweworo ná nkwa maka ọdịnihu dị nso!