“Na-anụrụ Ọrụ Ọma Ọkụ” n’April!
1 Afọ gara aga a gbara àmà na-enweghị atụ mgbe e kesara gburugburu ụwa ọtụtụ nde Akụkọ Alaeze nke 34. Ma ndị nkwusa ọgbakọ ma ndị ọsụ ụzọ ji ịnụ ọkụ n’obi kere òkè n’ọrụ a na-akpali akpali. Ì so ha? Ọ bụrụ na i so, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ikere òkè ná mkpọsa ahụ dị ịrịba ama tọrọ gị ụtọ nke ukwuu. Ugbu a ị pụrụ ịdị na-ajụ sị, Olee ‘ọrụ ọma’ na-echere anyị n’afọ a?—Taị. 2:14.
2 N’April na ná mmalite May, anyị ga-enwe obi ụtọ ikesa mbipụta pụrụ iche nke magazin Teta!, mbipụta May 8, 1996, nke nwere isiokwu bụ́ “Mgbe Agha Na-agaghị Adịkwa.” Ebe isiokwu a ga-adọrọ mmasị ọtụtụ ndị nwe ụlọ, anyị ga-agbalịsi ike ikesa magazin a n’ụzọ kasị saa mbara. N’ihi ịdị mkpa nke ihe ọmụma o bu, e kwesịrị inyefe mbipụta Teta! a n’April banye na May, ruo mgbe ha nile gwụsịrị.
3 Ihe Mgbaru Ọsọ Anyị—Ndị Nkwusa Nile Ikere Òkè: Ọ ga-abụ n’ezie ihe agbamume ma ọ bụrụ na onye nkwusa ọ bụla ná mba a nwere ike ikere òkè n’ọrụ nkwusa ahụ n’April. Ebe Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst ka dị ọhụrụ n’uche, anyị ga-achọ n’ezie igosi ekele anyị maka ịdị mma Chineke site n’ịchụ kpọmkwem “àjà, bụ́ otuto” n’ozi ubi.—Hib. 13:15.
4 E kwesịrị iji ịdị uchu tinye mgbalị iji mata mkpa onye òtù bụla nke ọgbakọ ka mmadụ nile wee nwee ike ikere òkè n’ịnụ ọkụ n’obi n’ozi n’April. (Rom 15:1) Ndị nduzi ọmụmụ akwụkwọ kwesịrị ịmata nke ọma ọnọdụ ndị nọ n’ìgwè ha ma nye aka n’ụzọ dị irè mgbe ọ dị mkpa. Ọ̀ dị onye nwere mkpa usoro ime njem? Ònye pụrụ igbo ya? Ọ̀ dị ndị na-eme ihere ma ọ bụ na-enwe ahụ erughị ala? Ndị nkwusa nwere ahụmahụ karị hà pụrụ isoro ha rụkọọ ọrụ? Gịnị banyere ndị ahụ na-esichaghị ike ma ọ bụ ndị ọrịa? Hà pụrụ ikere òkè n’ịgba àmà site n’ide akwụkwọ ozi ma ọ bụ n’ọrụ ọzọ na-amị mkpụrụ?
5 Ụfọdụ ndị ghọworo ndị na-adịkwaghị eje ozi anọgidewo na-anata agbamume ime mmụọ, a pụkwara ịkpali ha ikere òkè ọzọ n’ọrụ nkwusa ahụ. Mkpọsa ahụ a ga-eji Teta! pụrụ iche mee ga-enye ha ohere magburu onwe ya ka ha maliteghachi ije ozi.
6 Zụọ Ndị Na-eto Eto Ikere Òkè: Ọtụtụ ụmụ Ndịàmà Jehova esorowo ndị mụrụ ha gaa site n’ụlọ ruo n’ụlọ ruo ọtụtụ afọ, ọ bụ ezie na ha amalitebeghị ije ozi dị ka ndị nkwusa a na-emebeghị baptism. Ugbu a ọ̀ bụ oge ha ịmalite? Obi ha ọ̀ na-akwali ha, ha dịkwa njikere ikere òkè dị irè n’ọrụ ụlọ n’ụlọ? Ndị isi ezinụlọ kwesịrị iwepụta oge n’oge ọmụmụ Bible ezinụlọ iji nyere ụmụ ha ruru eru aka ịkwadebe ụzọ izi ozi ọma nke kwekọrọ n’afọ ndụ na ikike nke onye nke ọ bụla. Ndị ka okenye pụrụ ịhọrọ ajụjụ na-akpali echiche nke ha ga-eji kpalite mmasị onye nwe ụlọ wee gosizie azịza ya dị na magazin ahụ. Obere ụmụaka pụrụ ịgba àmà dị irè n’okwu ole na ole nanị. Dị ka ihe atụ, ha pụrụ ịgba onye nwe ụlọ ume ka ọ “gụọ magazin pụrụ iche nke a na-enyefe gburugburu ụwa n’ọnwa a.” Dị ka akụkụ nke nkwadebe ezinụlọ gị, hụ na i tinyere aro maka imeri okwu mgbochi ndị a na-anụkarị. Ị ga-ahụ ọtụtụ aro ndị dị mma n’akwụkwọ Reasoning. N’oge nri na n’oge ndị ọzọ kwesịrị ekwesị, gbaa ndị òtù ezinụlọ ume ịkọ ahụmahụ ndị ha nweworo n’ozi ubi.
7 Ndị A Na-eduziri Ọmụmụ Bible Ruru Eru Na-ewere Orụ Jisọs Rụrụ: Jisọs akparaghị nkụzi ya ókè nanị n’inye ntụziaka n’okwu ozizi. O sooro ndị ọ na-akụziri ihe gaa ozi ma kụziere ha ụzọ isi mee nkwusa. (Luk 8:1; 10:1-11) Gịnị bụ ọnọdụ dị taa? A na-eduzi ihe karịrị otu ụzọ n’ụzọ anọ nke otu nde ọmụmụ Bible na Nigeria. N’enweghị obi abụọ, site n’agbamume kwesịrị ekwesị ọtụtụ n’ime ndị a a na-eduziri ọmụmụ ihe pụrụ iwere nzọụkwụ nke na-esonụ n’ọzụzụ ha ma ruo eru ije ozi dị ka ndị nkwusa a na-emebeghị baptism n’April.
8 Ọ bụrụ na ị na-eduzi ọmụmụ Bible, tụlee ajụjụ ndị a: Onye ahụ a na-eduziri ọmụmụ ihe ọ̀ na-enwe ọganihu, na-ekwekọ n’afọ ndụ na ikike ya? Ọ̀ malitewo iso ndị ọzọ na-ekerịta okwukwe ya na mberede? Ọ̀ na-eyikwasị “mmadụ ọhụrụ ahụ”? (Kọl. 3:10) Ò nwere iru eru maka ndị nkwusa a na-emebeghị baptism, ndị e depụtara na peji nke 97 ruo 99 nke akwụkwọ Ozi Anyị? Ọ bụrụ na i kwere na o ruru eru, gịnị ma i soro ya tụlee okwu ahụ? Ụfọdụ ndị a na-eduziri ọmụmụ ihe chọrọ nanị ọkpụkpọ òkù kpọmkwem ikere òkè n’ọrụ ahụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na onye ahụ a na-eduziri ọmụmụ ihe nwere ọchịchọ ya, ọ ga-adị mkpa na mbụ ka onye isi oche ndị nlekọta dokwaa ka e soro abụọ n’ime ndị okenye kwurịta okwu dị ka a na-emekarị. N’aka nke ọzọ, otu ihe pụrụ ịdị na-adọghachi onye ahụ a na-eduziri ọmụmụ ihe azụ. Ma eleghị anya otu n’ime ndị okenye pụrụ isonyere gị n’ọmụmụ Bible ahụ ma mee ka onye ahụ a na-eduziri ọmụmụ ihe kwuo okwu banyere uche ya n’ebe eziokwu ahụ dị. Mgbe onye okenye ahụ ṅasịrị ntị n’ihe onye ahụ a na-eduziri ọmụmụ ihe nwere ikwu, ọ pụrụ inwe ike ịtụ aro ndị dị irè, ha na enyemaka Akwụkwọ Nsọ.
9 ‘Zụchapụta Oge’ Ịsụ Ụzọ Inyeaka: Kwa afọ n’oge Ememe Ncheta, obi ekele maka ihe mgbapụta ahụ na-akwali ọtụtụ puku mmadụ ‘ịzụchapụta’ oge iji bụrụ ndị ọsụ ụzọ inyeaka. (Efe. 5:15-17) Ọ bụ ezie na àjà ụfọdụ dị mkpa, ụgwọ ọrụ ya dị ukwuu. Ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị ntorobịa na-eji oge ezumike asụ ụzọ inyeaka. Ndị meworo okenye na-arụ ọrụ oge nile na-eji uhuruchi na ngwụsị izu eme ihe zuru ezu n’otu ọrụ a. N’ihi ya, a marawo ezinụlọ dum dị iche iche ịbụ ndị na-asụkọ ụzọ inyeaka ọnụ! N’ọgbakọ ụfọdụ, ihe ka ọnụ ọgụgụ ná ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na ndị nwunye ha edebanyewo aha ha dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka. N’ịbụ ndị ihe nlereanya ịnụ ọkụ n’obi ha kpaliri, ndị ọzọ agbasowo otu ihe ahụ, nke na pasent dị ukwuu nke ọgbakọ na-eje ozi dị ka ndị ọsụ ụzọ inyeaka n’April.
10 Ma ì nwere ike ịsụ ụzọ inyeaka ma ọ bụ na i nweghị, chọọ ụzọ isi mụbaa ozi gị n’ubi n’April. Setịpụrụ onwe gị ihe mgbaru ọsọ onwe onye, nke ga-ewe mgbalị ụfọdụ iji ruo ya ma bụrụ nke a pụrụ iru eru. Ọchịchọ gị ‘imefu ihe i nwere na ikwe ka e mefuo gị’ n’ozi Jehova, dị ka ọnọdụ gị onwe gị si dị, ga-enwe ngọzi ya.—2 Kọr. 12:15.
11 Nzukọ Ije Ozi Ubi: E kwesịrị ịhazi nzukọ ije ozi ubi kwa ụbọchị n’oge mkpọsa Teta! ahụ, n’oge ga-ekwe ka a malite ozi n’oge. E kwesịkwara ime ndokwa maka ịgba àmà uhuruchi. Ihe ka ọnụ ọgụgụ ná ndị nkwusa ga na-ekere òkè n’ozi ubi ná ngwụsị izu, ya mere ọgbakọ nile kwesịrị idokwa nzukọ ije ozi ubi na Saturday nile, ma n’ụtụtụ ma n’ehihie, n’oge nile nke nkesa Teta! ahụ pụrụ iche.
12 Ndị na-eduzi nzukọ ije ozi ubi kwesịrị ịhụ na e nwere ókèala buru ibu. E kwesịrị ibu ụzọ rụzuo ókèala a na-arụbeghị ọrụ n’isi nso. Otú ọ dị, e kwesịghị ịrụ ọrụ n’ókèala na-enweghị ndị e kenyere ya bụ́ nke Society na-elekọta n’enwetaghị ikike Society. Ì ji otu ókèala ma ọ bụ karịa nke onwe gị a na-arụzubeghị n’isi nso a? Ọ bụrụ na enyemaka ga-adị gị mkpa n’ịrụ ọrụ na ha n’oge mkpọsa ahụ, gwa onye nlekọta ije ozi ma ọ bụ nwanna na-ahụ maka ókèala okwu, ha ga-enwekwa obi ụtọ idokwa ka i nweta enyemaka ụfọdụ.
13 Magazin Ole Ka Ị Ga-etinye? Ajụjụ ahụ dịịrị onye ọ bụla ịza. N’ikpebi magazin ole ị pụrụ itinye n’oge mkpọsa ahụ, tụlee ụdị ókèala ị ga na-arụ ọrụ na ya, afọ ndụ gị, ahụ ike gị, oge ị pụrụ itinye n’ọrụ ahụ, na ihe ndị ọzọ. Otú ọ dị, rịba ama ihe ncheta e nyere ná mbipụta Ụlọ Nche nke January 1, 1994: “Dị ka ihe atụ, ndị nkwusa pụrụ inwe mgbaru ọsọ, ihe dị ka magazin iri kwa ọnwa, dabere n’otú ọnọdụ ha dị; ndị ọsụ ụzọ pụrụ ịgbalị maka iri itoolu.” Ihe mgbaru ọsọ yiri nke ahụ ọ̀ ga-abụ ihe ezi uche dị ya n’ọnọdụ gị?
14 Ndị Okenye—Iji Nlezianya Mee Atụmatụ Dị Mkpa: Jidenụ n’aka na, ma o kwe omume, a ga-eji mbipụta Teta! ahụ pụrụ iche gazuo ókèala nile nke ọgbakọ. E kwesịrị iji nlezianya leruo anya n’ịrụ ọrụ n’ókèala achụmnta ego ọ bụla e kenyere ọgbakọ. Ndị ga-arụ ọrụ na ya kwesịrị ịkwadebe nke ọma ma jie ejiji dị mma. Ọtụtụ okwu adịghị mkpa. Mgbe a na-ejekwu ọchụ nta ego, ị pụrụ ikwu na ị dịghị enwetakarị ndị ọchụ nta ego n’ụlọ, ya mere ị bịara n’ebe ọ na-achụ nta ego iji chee otu isiokwu nke ga-amasị ya nnọọ n’ihu ya. Mgbe ahụ ị pụrụ ná mkpirikpi ikerịta otu isi ihe kpọmkwem dị na magazin ahụ. E kwesịkwara ịhazi nke ọma iji magazin agba àmà okporo ámá n’ime ókèala ọgbakọ. Ụzọ kasị irè isi kere òkè n’ọrụ okporo ámá bụ ibute ụzọ n’ijekwuru ndị na-agafe, kama ichere ka ha bịakwute gị. Ebe ọha mmadụ ga na-ele gị anya, i kwesịrị iburu n’uche inwe ọdịdị dị ùgwù. A pụrụ inwe ebe ndị ọzọ n’ókèala gị a pụrụ ịrụ ọrụ n’oge mkpọsa ahụ, dị ka ọdụ ụgbọ elu, ụlọ ọgwụ, ọdụ ụgbọ ala, na ahịa. Òtù ndị okenye kwesịrị ikpebi ndokwa kwesịrị ekwesị ndị a pụrụ ime maka ịgba àmà n’ógbè ndị a nke ókèala ọgbakọ gị.
15 Jehova bụ onye ọrụ ike na-adịghị agwụ. (Jọn 5:17) O kere eluigwe na ụwa nakwa ihe ọkụkụ na anụmanụ nile; ma ọ nọgidere na-arụ ọrụ ruo mgbe o kere ihe kasị elu ọ rụzuru n’elu ụwa—mmadụ. Eziokwu bụ na anyị nwere ndụ bụ ihe sitere kpọmkwem na Chineke inwe ọchịchọ obi ịrụ ọrụ. Dị ka ‘ndị na-eṅomi Chineke,’ ịhụnanya anyị n’ebe ọ nọ kwesịrị ịkwali anyị ‘ịnụrụ ọrụ ọma ọkụ.’ (Efe. 5:1; Taị. 2:14) Ebe Jehova ruru eru ịnara mgbalị anyị kasị mma, ebe ọ bụkwa na ọchịchọ ịmị mkpụrụ bụ njimara nke onye na-anụ ọkụ, anyị kwesịrị inwe mmasị n’ịrụ ọrụ dị mma n’ozi ahụ. N’ezie, Jehova na-eji àjà ọ bụla anyị chụụrụ ya akpọrọ ihe, ọrụ anyị adịghịkwa mgbe ọ na-abụ n’efu. (1 Kọr. 15:58) Ya mere, site n’obi ekele, ka anyị tinye onwe anyị n’ọrụ ịnụ ọkụ n’obi n’April, na-ejide nnwapụta na ngọzi Jehova, nakwa ihe ịga nke ọma bara ụba n’aka!