Nzukọ Ije Ozi Ubi
1 Ozi Alaeze Anyị nke August 1995 setịpụrụ ụkpụrụ nduzi ụfọdu maka nzukọ ije ozi ubi. A na-eme mgbanwe ụfọdụ ugbu a n’ihe e kwuru n’isiokwu ahụ. O kwuru na mgbe ọ bụla e nwere nzukọ ije ozi ubi mgbe nzukọ ụtụtụ Sunday gasịrị n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, o kwesịrị ịbụ otu onye na-eduzi ya mgbe nile, ebe ìgwè ọmụmụ akwụkwọ nke ọ bụla ga-ezukọ n’ebe dị iche n’ime Ụlọ Nzukọ Alaeze; ndị nduzi ha ga-ekenye ókèala na ndị ga-arụkọ ọrụ maka ìgwè ndị nke ha, mgbe ahụ kwa a ga-ekpe otu ekpere mmechi maka mmadụ nile.
2 A na-eme mgbanwe ugbu a iji nye ohere ka ọgbakọ mee ndokwa ihe kasị mma maka ọnọdụ ndị ha nwere. N’ọnọdụ ụfọdụ ọ pụrụ ịbụ na otu nzukọ ije ozi ubi kwesịrị ekwesị. N’ọnọdụ ndị ọzọ ọ pụrụ ịkasị mma ka ìgwè ọmụmụ akwụkwọ nke ọ bụla nwee nzukọ nke ha maka ije ozi ubi n’akụkụ dị iche n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Nke ahụ na-adịkarị otú ahụ n’ebe e nwere ebe dị iche iche, dị ka ụlọ akwụkwọ nke abụọ, ọbá akwụkwọ, ma ọ bụ ebe ọzọ n’ogige unu bụ́ nke ga-enye ohere ka ìgwè ndị ahụ zukọọ iche iche n’emereghị ibe ha ụzụ. Anyị na-ahapụ ya n’uche ndị okenye ikpebi dị ka ọnọdụ ha si dị.
3 Otu ihe ahụ metụtakwara ekpere. A pụrụ ikpe ekpere tupu ma ọ bụ mgbe e kenyesịrị ókèala na ndị ga-arụkọ ọrụ. Ọnọdụ e nwere n’ọgbakọ ga-ekpebi ihe ga-akasị dị irè. Isi ihe dị mkpa bụ ka a nọrọ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze buru ụzọ mee ndokwa, tupu ìgwè ahụ apụọ baa n’ókèala ahụ, ka a ghara inwe ìgwè ndị buru ibu nke ụmụnna na-akwụgharị n’ókèala ahụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na e nwee onye mesịrị sonyere ìgwè ahụ, a pụrụ ikenye ya ókèala na onye ya na ya ga-arụkọ ọrụ.
4 Ya mere, e nweghị iwu ọ bụla a na-eti banyere otú e kwesịrị isi duzie nzukọ ije ozi ubi. Ma mmadụ nile kwesịrị ịgbalịsi ike ịrụ ọrụ maka ịdị n’otu na udo n’etiti ụmụnna, ka ha wee nwee ike kere òkè zuru ezu n’ije ozi ubi. Ọnọdụ ọgbakọ kwesịrị ikpebi ihe kasị mma maka ọgbakọ, na-eburu n’uche ntụziaka Akwụkwọ Nsọ dị ná 1 Ndị Kọrint 14:40 bụ́: “Ka e mee ihe nile n’ụzọ dị mma n’anya, na n’usoro.”