Ntụleghachi Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke
Ntụleghachi e mechiri akwụkwọ na-eme n’ihe omume ndị e mere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke n’izu nile nke January 1 ruo April 22, 1996. Jiri mpempe akwụkwọ ọzọ detuo azịza nye ọnụ ọgụgụ ajụjụ ole i nwere ike n’oge e nyere.
[Rịba ama: N’oge ntụleghachi odide ahụ, nanị Bible ka a pụrụ iji mee ihe n’ịza ajụjụ ọ bụla. Ntụaka ndị na-eso ajụjụ ndị ahụ bụ maka iji mee nnyocha onwe onye gị. Nọmba peji na paragraf nwere ike ha agaghị apụta n’izo aka nile gaa n’Ụlọ Nche.]
Zaa Eziokwu ma ọ bụ Ụgha banyere nke ọ bụla n’okwu ndị na-esonụ:
1. Ọ bụrụhaala na onye Kraịst chere na ya na-eme ihe ziri ezi, mkpebi ya aghaghị ịdị mma. (Ilu 14:12) [uw p. 8 para. 8(2)]
2. Ọ bụ Krisendọm malitere nkụzi Atọ n’Ime Otu. [uw-IB p. 15, para. 8]
3. Ebe ọ bụ na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ okpukpe nile n’ụwa dum na-akụzi na mkpụrụ obi mmadụ adịghị anwụ anwụ, na ọ na-adị ndụ gaa n’ihu mgbe a nwụsịrị, anyị aghaghị ịnakwere nke a dị ka eziokwu. [td 37A]
4. Site n’iji Ndị Rom 1:7 tụnyere Ndị Rom 8:16, a pụrụ ịhụ na Pọl na-ezo aka n’ebe ihe nile a kpọrọ mmadụ nọ dị ka “ụmụ Chineke.” [uw p. 26 para. 12(3)]
5. Ọgbụgba ndụ ahụ e kwuru na Jeremaịa 31:31, 33 na-ezo aka n’ọgbụgba ndụ maka Alaeze nke Jisọs so ụmụazụ ya e tere mmanụ na-agba. [Ọgụgụ Bible kwa izu]
6. Ọ bụ Jeremaịa dere akwụkwọ Abụ Ákwá mgbe mbibi Jerusalem gasịrị. [Ọgụgụ Bible kwa izu]
7. N’Iju Mmiri ụbọchị Noa, mmiri ekpuchighị ụwa dum, kama ọ bụ nanị akụkụ ebe ụmụ mmadụ bi. [my Akụkọ nke 10]
8. Nna, Ọkpara na Mmụọ Nsọ bụ ndị atọ hà nhata, ndị jikọtara ọnụ bụrụ otu ezi Chineke ahụ. [td 6A]
9. Mmadụ enweghị ngwọta ọ bụla ma ọlị nye nhụjuanya nke ụwa. [td 2F]
10. N’ụbọchị Noa, ndị mmụọ ozi nwogharịrị enwogharị ji ime ihe ike mejupụta ụwa. [my Akụkọ nke 8]
Zaa ajụjụ ndị na-esonụ:
11. Ebe ọ bụ na oké ịhụnanya Jehova nwere kwaliri ya izite Ọkpara ya ka o wee nye ndụ ya n’ihi anyị, gịnị ka ịhụnanya anyị n’ebe Chineke nọ kwesịrị ịkwali anyị ime? (2 Kọr. 5:14, 15) [uw p. 14 para. 6]
12. Gịnị ka ijegharị n’aha Jehova pụtara? [uw p. 18 para. 14]
13. Gịnị ka anyị na-amụta banyere àgwà dị iche iche nke Jehova site n’ịgụ akwụkwọ Abụ Ákwá? (Abụ Ákwá 3:22, 23, 32) [Ọgụgụ Bible kwa izu]
14. N’ụzọ dị aṅaa ka àgwà Jekọb na Ịsọ si dịrịta nnọọ iche? [my Akụkọ nke 17]
15. Kwuo ihe ndị mere na onye Kraịst aghaghị ịbụ onyeàmà. [td 20A]
16. Gịnị bụ ihe anọ ndị bụ isi na-eme ka e nwee ịdị n’otu nke ndị Jehova na-anụ ụtọ ya taa? [uw p. 8-9 para. 8, 9]
17. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ide ihe odide nkwekọrịta mgbe e so ndị anyị na ha na-efekọ Jehova na-abanye ná mmekọrịta azụmahịa? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w 5/1/95 p. 30.]
18. Tụkwasị n’àgwà ndị bụ isi Jehova nwere bụ́ ịhụnanya, ikpe ziri ezi, amamihe, na ike, gịnị ka anyị pụrụ ịmụta banyere àgwà ya ndị dị mma site n’Ọpụpụ 34:6, Abụ Ọma 86:5, na Ọrụ 10:34, 35? [uw-IB p. 13 para. 3]
19. Mgbe e jisịrị Luk 5:12, 13 tụnyere Jọn 14:9, 10, n’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwubie na Jehova nwere ọmịiko dị nro n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ na-ata ahụhụ nọ? [uw p. 25 para. 12(1)]
20. Gịnị ka eke na ogwurugwu ahụ pụtara na nke mbụ ya mgbe iju mmiri ahụ gasịrị pụtara? [my Akụkọ nke 11]
21. Ihe mmụta dị aṅaa ka anyị pụrụ ịmụta site n’eziokwu ahụ bụ na nwunye Lọt tụfuru ndụ ya ma ghọọ ogidi nnu mgbe ọ na-agbapụ na Sọdọm? [my Akụkọ nke 15]
22. Àgwà dị aṅaa ka Abraham gosipụtara n’ụzọ pụrụ iche nke mere ka o nweta utu aha bụ́ “Enyi Chineke”? [my Akụkọ nke 13]
23. Ònye bụ isi n’ịkpata mkpagbu nke ụwa? [td 2C]
24. Mgbe Jehova gwara Jeremaịa, sị: “Nara iko mmanya nke ọnụma nke a n’aka m, mee ka mba nile ṅụọ ya, bụ́ ndị Mụ onwe m na-eziga gị jekwuru,” gịnị ka o bu n’uche? (Jer. 25:15) [Ọgụgụ Bible kwa izu]
25. Olee mgbe ihe omume ndị a kọrọ banyere ha na Jeremaịa 52:5-11 weere ọnọdụ? [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w 4/1/88 p. 14 para. 18.]
Họrọ azịza ziri ezi na nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
26. Bible bụ Okwu Chineke n’ihi na (ndị nsụgharị kpọrọ ya aha ahụ; ndị ikom na-asọpụrụ Chineke dere ya; Chineke duziri kpọmkwem odide ya). [uw p. 20 para. 2]
27. Ọ bụrụ na ị gụọ nanị (otu peji; peji abụọ; peji anọ) nke Bible kwa ụbọchị, ị ga-agụzu ya n’ihe dị ka (ọnwa isii; ọnwa itoolu; otu afọ). [uw p. 24 para. 9]
28. Jehova ‘rara Jeremaịa ụra’ n’ihi na O (ji ụra rabaa ya n’ikwusa ozi nke amamikpe; ji ya rụzuo ihe ọ na-agaraghị enwe ike ime n’ike nke onwe ya; wetaghị mbibi Jeremaịa buworo n’amụma). (Jer. 20:7) [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w 5/1/89 p. 31.]
Denye okwu ma ọ bụ ahịrị okwu nke dị mkpa iji dejuo nke ọ bụla n’ime okwu ndị na-esonụ:
29. Ebed-melek sere onyinyo _________________________, ndị a ga-echebe n’_________________________ n’ihi na ha mere _________________________ n’ime ụmụnna Kraịst enyi, nyekwara ha aka. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w 4/1/83 p. 27 para. 11.]
30. Ọ bụ ezie na e kwuru banyere Jisọs dị ka “chi,” na Jọn 17:3, ọ kpọrọ Jehova ‘onye _________________________ bụ ezi Chineke,’ na Jọn 20:17 kwa o zoro aka n’ebe Jehova nọ dị ka “Chineke________________________ na Chineke_________________________.” [uw p. 18 para. 12]
Jikọta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a na okwu ndị e depụtara n’okpuru:
Ilu 3:5, 6; Jer. 23:33; 32:9, 10; Abụ Ákwá 3:44; Mkpu. 15:3, 4.
31. Ihe ndabere maka ezi ịdị n’otu nke ofufe bụ ịmata Jehova na ịdị ndụ kwekọrọ n’ụzọ ezi omume ya. [uw p. 5 para. 1]
32. Ụzọ ndụ anyị dum—n’agbanyeghị ebe anyị nọ, n’agbanyeghị ihe anyị na-eme—kwesịrị igosipụta na echiche anyị na nzube anyị kwekọrọ n’uche Chineke. [uw p. 10 para. 11]
33. Jehova adịghị aṅa ntị n’ekpere ndị ajọ omume. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w 7/15/87 p. 15.]
34. Ozi amụma dị arọ sitere n’Okwu Chineke jupụtara n’ikpe ọmụma, na-ama ọkwa mbibi dị nso nke Krisendọm. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w 3/1/94 p. 12 para. 18, 20.]
35. Mgbe e so ndị anyị na ha na-efekọ Jehova na-abanye ná mmekọrịta azụmahịa, ide ihe odide nkwekọrịta pụrụ igbochi nghọtahie ndị pụrụ ibilite n’oge dị n’ihu. [Ọgụgụ Bible kwa izu; lee w 5/1/95 p. 30.]