April—Oge Iji ‘Dọgbuo Onwe Anyị n’Ọrụ Ma Gbasie Mgba Ike’
1 Izu ndị dị Ememe Ncheta nso na-abụrụ ndị Jehova oge ntụgharị uche. Nke a bụ oge ịtụgharị uche n’ihe ọnwụ Kraịst rụzuru na ịtụle olileanya nke Chineke na-enye anyị bụ́ nke ọbara Jisọs a wụsịrị mere ka o kwe omume. Ka ị na-eche echiche laa azụ n’April 19 nke afọ gara aga, gịnị ka ị na-echeta? Ị̀ pụrụ icheta ihu ndị ị hụrụ n’uhuruchi ahụ? ọnọdụ ime mmụọ bụ́ ịgba e nwere n’Ememe Ncheta ahụ? ntụle ahụ dị mkpa nke a tụlere ihe ndị dị na Bible na ekpere ndị sitere n’obi? Ikekwe i kpebisiri ike igosipụta n’ụzọ zuru ezu karị ekele miri emi i nwere maka ịhụnanya Jehova na Jisọs gosiri gị. Olee otú ntụgharị uche dị otú ahụ si emetụta gị ugbu a?
2 O doro anya na ndị Jehova na-egosipụta ekele n’ụzọ karịrị okwu ọnụ nkịtị. (Kọl. 3:15, 17) Karịsịa, n’April gara aga, anyị mere mgbalị iji gosipụta ekele anyị nwere maka ndokwa ndị Jehova mere maka nzọpụta anyị site n’ijesi ozi ndị Kraịst ike. Ndị ọsụ ụzọ inyeaka ruru ọtụtụ puku, na-eji pasent 32 karịa ọnụ ọgụgụ e nwere n’otu ọnwa ahụ n’afọ bu ya ụzọ na Nigeria. Mgbalị ha, tinyere nke ndị nkwusa Alaeze ndị ọzọ, mere ka e nwee ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu nke awa, magazin e tinyere, na nletaghachi. Ịhụ ọtụtụ puku ọmụmụ Bible ndị a malitere nakwa ọnụ ọgụgụ ọhụrụ kasị elu nke ndị bịara Ememe Ncheta mere ka anyị nwekwuo ọṅụ!
3 N’ezie, anyị iji olileanya anyị n’aka na-akwali anyị ime ihe. Ọ bụ nnọọ dị ka Pọl onyeozi dere, sị: “Ọ bụ iru nke a ka anyị na-adọgbu onwe anyị n’ọrụ, na-agbasikwa mgba ike, n’ihi na anyị elewo anya Chineke dị ndụ, Onye bụ́ Onye nzọpụta mmadụ nile, ma nke kachasịnụ Onye nzọpụta nke ndị kwere ekwe.”—1 Tim. 4:10.
4 N’oge Ememe Ncheta a, olee otú ị ga-esi gosipụta okwukwe i nwere ná ndokwa ndị Jehova na-eme maka ndụ? N’April gara aga, anyị nwere ọnụ ọgụgụ nke abụọ kasị elu nke ndị nkwusa Alaeze e nwetụrụla na Nigeria. Ànyị pụrụ ịkarị ọnụ ọgụgụ ahụ n’April a? Anyị pụrụ nnọọ ime ya. Ma ọ ga-adị mkpa ka onye nkwusa ọ bụla, ma nke e mere baptism ma nke a na-emebeghị baptism kere òkè. Ọtụtụ ndị ọhụrụ pụkwara iru eru ikere òkè. N’ihi ya, ka ị na-eme atụmatụ ịdọgbu onwe gị n’ọrụ na ịgbasi mgba ike n’April a, tụlee ụzọ ndị ị pụrụ isi kpalie ndị ọzọ, gụnyere ndị ọhụrụ na ndị na-enwechaghị ahụmahụ, isonyere gị.
5 Inyere Ụfọdụ Aka Ịmaliteghachi Ozi Ha: Ọ bụrụ na ị maara ụfọdụ ndị na-agabeghị ozi ubi ruo otu ọnwa ma ọ bụ abụọ, ikekwe ị pụrụ ịgba ha ume ma kpọọ ha ka ha sonyere gị n’ozi ubi. Ọ bụrụ na ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ adịghị ejekwa ozi, ndị okenye ga-eme mgbalị pụrụ iche ileta ha ma gbaa ha ume ịmaliteghachi n’April.
6 Anyị nile aghaghị ịnọgide na-arịọ ka mmụọ Jehova wusie anyị ike n’ozi ya. (Luk 11:13) Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji nweta mmụọ ahụ? Ịdị na-agụ Okwu Chineke e dere site n’ike mmụọ nsọ. (2 Tim. 3:16, 17) Anyị aghaghịkwa ‘ịnụ ihe Mmụọ Nsọ na-agwa nzukọ Kraịst’ site n’ịnọ ná nzukọ ise nile a na-enwe kwa izu. (Mkpu. 3:6) Ugbu a bụ oge dị mma inyere ndị na-adịghị ejechi ozi anya na ndị na-adịghị ejekwa ozi aka imeziwanye otú ha si amụ ihe ma malite ịgachi nzukọ anya. (Abụ Ọma 50:23) Anyị na-eme nke a ka anyị na-elebara ọdịmma ime mmụọ anyị anya nke ọma. Ma, ọ dị ihe ọzọ a chọrọ.
7 Pọl onyeozi kọwara na Chineke na-enye “ndị na-erubere ya isi dị ka onye na-achị achị,” mmụọ nsọ ya. (Ọrụ 5:32, NW) Nrubeisi dị otú ahụ na-agụnye ịṅa ntị n’iwu ‘ikwusara ndị mmadụ na ikwusikwa ike.’ (Ọrụ 1:8; 10:42) N’ihi ya, n’agbanyeghị na ọ bụ eziokwu na mmụọ Chineke dị anyị mkpa iji wusie anyị ike ime nkwusa, ọ bụkwa eziokwu na ka anyị na-amalite igosipụta ọchịchọ anyị nwere ime ihe na-atọ Jehova ụtọ, ọ na-enyere anyị aka ọbụna karị. Ka anyị ghara ileda mkpa ọ dị ime ihe ndị mbụ ahụ anya bụ́ iji obi anyị na-erubere ya isi!
8 Inyere Ndị Na-eto Eto Aka: Ndị nne na nna, ùnu ahụwo ihe àmà na-egosi na ụmụ unu chọrọ ịgwa ndị ọzọ banyere eziokwu ahụ? Hà anọwo na-esonyere unu n’ozi ubi? Hà na-egosi ezi ihe nlereanya n’àgwà ha? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị mere unu ji ala azụ? Jekwurunụ otu onye so na Kọmitii Ije Ozi Ọgbakọ ma hụ ma nwa unu ò ruru ka e were ya dị ka onye nkwusa n’April a. (Lee akwụkwọ Ozi Anyị, peeji nke 100.) Matanụ na ụmụ unu pụrụ ịtụnye ụtụ n’ụzọ dị ukwuu n’iti mkpu otuto nye Jehova n’oge Ememe Ncheta a.—Mat. 21:15, 16.
9 Otu nne bụ́ onye Kraịst na Georgia, U.S.A., na-agba nwa ya nwanyị na-eto eto ume mgbe nile ịgwa ndị ọzọ banyere Jehova. N’afọ gara aga, ka nwa agbọghọ nta ahụ na mama ya na-arụkọ ọrụ n’ozi, o nyefere otu nwoke broshuọ Na-achọ ma kọwaara ya ndepụta isiokwu ndị dị n’ime ya ná nkenke. Nwoke ahụ jụrụ ya, sị: “Ị dị afọ ole?” Ọ sịrị: “Afọ asaa.” O juru nwoke ahụ anya ịhụ ka o ziri ozi ọma n’ụzọ doro anya. Ihe mere o ji dị ya otú ahụ bụ na o sotụrụ Ndịàmà mgbe ọ bụ nwata ma ọ dịghị mgbe o ji eziokwu ahụ kpọrọ ihe dị ka ụzọ ndụ. N’oge na-adịghị anya, a malitere iduziri nwoke ahụ, nwunye ya, na nwa ya nwanyị ọmụmụ Bible.
10 Ọtụtụ ndị na-eto eto abụrụlarị ndị nkwusa, anyị na-enwekwa obi ụtọ mgbe ha so anyị na-eje ozi. Ndị ntorobịa a pụrụ ịkwali ndị ọgbọ ha ndị ọzọ ma gbaa ha ume. Ma April bụkwa oge kwesịrị ekwesị maka ezinụlọ dị iche iche iwusi ihe nkekọ ha ike ma wulite ọnọdụ ime mmụọ ha site n’ijekọ ozi dị nsọ ọnụ. Ndị isi ezinụlọ kwesịrị ibute ụzọ na nke a.—Ilu 24:27.
11 Inyere Ndị Ọhụrụ Aka: Gịnị banyere ndị ọhụrụ ị na-amụrụ Bible? Hà pụrụ ịtụnye ụtụ ná mgbalị ahụ pụrụ iche n’April a? Ikekwe ha gosipụtara ọchịchọ nke ịgwa ndị ọzọ ihe ha na-amụta mgbe unu mụrụ isi 2, paragraf nke 22, ma ọ bụ isi 11, paragraf nke 14, n’akwụkwọ Ihe Ọmụma. Ọ bụrụ na unu erutewela ná ngwụsị nke akwụkwọ ahụ, kwadebe iso ha kwurịta nke a n’ụzọ doro anya ka unu na-amụ isi 18, paragraf nke 8, bụ́ nke na-ekwu, sị: “Ma eleghị anya ọ na-agụsi gị agụụ ike ịgwa ndị ikwu gị, ndị enyi gị, na ndị ọzọ ihe ị na-amụta. N’ezie, ị pụrụ ịdị na-emeworị nke a, ọbụna dị ka Jisọs so ndị ọzọ kerịta ozi ọma ahụ n’ọnọdụ mberede dị iche iche. (Luk 10:38, 39; Jọn 4:6-15) Ugbu a ị pụrụ ịchọ ime karịa nke ahụ.” Nke a ọ̀ bụ otú ọ dị ndị ị na-amụrụ ihe?
12 Onye ị na-amụrụ ihe ò kweere n’Okwu Chineke? Ọ̀ nọwo na-etinye ụkpụrụ Bible n’ọrụ? Ò mewo ka ndụ ya kwekọọ n’ụkpụrụ Chineke? Ọ̀ nọwo na-abịa nzukọ ọgbakọ? Ọ̀ chọrọ ijere Jehova Chineke ozi? Mgbe ahụ, gịnị ma ị gbaa ya ume iso ndị okenye kwurịta okwu ka ha wee nwee ike ikpebi ma o ruru eru ịghọ onye nkwusa a na-emebeghị baptism iji soro gị rụọ ọrụ n’April? (Lee akwụkwọ Ozi Anyị, peeji nke 97-100.) N’ụzọ dị otú a, ọ pụrụ ịmalite ịhụ kpọmkwem otú nzukọ Jehova ga-esi akwado ya ná mgbalị ndị ọ na-eme ijere Jehova ozi.
13 Ọ bụ eziokwu na ụfọdụ ndị a na-amụrụ ihe na-enwe ọganihu ngwa ngwa karịa ndị ọzọ. N’ihi ya, n’ikwekọ ná ntụziaka dị n’Ozi Alaeze Anyị nke June 2000 peeji nke 4, paragraf nke 5-6, ọtụtụ ndị anọwo na-amụrụ ndị gosiworo mmasị na mbụ akwụkwọ nke abụọ bụ́ ndị chọkwuru enyemaka iji sonyesiere anyị ike. Anyị adịghị akwụsị inwe olileanya na ndị a nwere obi eziokwu ga-aghọ ndị na-eso ụzọ Kraịst, “ma ọ̀ bụ ná mkpirikpi oge ma ọ̀ bụ n’ogologo oge.” (Ọrụ 26:29, NW) Ma, ọ bụrụ na a pụrụ ịkọwa n’ụzọ kasị mma oge ị nọworo na-amụrụ onye ahụ ihe dị ka ‘ogologo oge,’ oge Ememe Ncheta a ọ̀ pụrụ ịbụ ohere dị mma ka onye ị na-amụrụ ihe malite igosipụta otú ekele o nwere maka ihe mgbapụta Kraịst si mie emie?
14 Otú A Pụrụ Isi Nyere Ha Aka Ikere Òkè: Anyị na-amụta ihe dị ukwuu banyere inyere ndị ruru eru aka ịmalite ije ozi site n’ịtụle otú Jisọs si zụọ ndị ọzọ. O zuteghị nnọọ ìgwè mmadụ ma gwa ndị na-eso ụzọ ya ka ha malite ịgwa ha okwu. O buru ụzọ mesie mkpa ọrụ nkwusa ahụ dị ike, gbaa ha ume inwe àgwà nke ikpe ekpere, mgbe ahụkwa nye ha ihe atọ dị mkpa: onye òtù ọrụ, ókèala a ga-arụ ọrụ na ya, na ozi. (Mat. 9:35-38; 10:5-7; Mak 6:7; Luk 9:2, 6) Ị pụrụ ime otu ihe ahụ. Ma ị̀ ga na-enyere nwa gị aka, nyere onye ọhụrụ ị na-amụrụ ihe, ma ọ bụ onye na-enyebeghị akụkọ ozi ọ bụla ruo oge ụfọdụ, aka, ọ ga-ekwesị ekwesị ime mgbalị pụrụ iche ịgbaso ebumnobi ndị na-esonụ.
15 Kọwapụta Mkpa Ọ Dị: Mee ka onye ahụ ghọta mkpa ọrụ nkwusa dị. Kwuo okwu n’ụzọ ziri ezi banyere ya. Kọọ ahụmahụ ndị na-egosi ihe ọgbakọ na-arụzu n’ozi ahụ. Gosipụta mmụọ nke Jisọs kwupụtara na Matiu 9:36-38. Gbaa onye ahụ nke gaje ịghọ onye nkwusa ma ọ bụ onye ahụ na-adịghị ejekwa ozi ume ka ọ na-ekpe ekpere banyere òkè ọ ga-ekere n’onwe ya n’ozi ahụ nakwa maka ọganihu nke ọrụ ahụ n’ụwa nile.
16 Gbaa Onye ahụ Ume Iche Echiche Banyere Ọtụtụ Ohere E Nwere Iji Gbaa Àmà: Kwuo ohere e nwere maka isoro ìgwè ọmụmụ akwụkwọ zukọọ maka ịgba àmà site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Kwuo okwu banyere isoro ndị ikwu na ndị onye ahụ maara na-akparịta ụka ma ọ bụ isoro ndị ọrụ ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe ya na-ekwurịta okwu n’oge ezumike maka nri ehihie. Mgbe mmadụ ji ụgbọ njem ọha na eze na-eme njem, ọ pụrụ ịmalite mkparịta ụka ọtụtụ mgbe nanị site n’igosi mmasị n’ebe ndị njem ibe ya nọ. Mgbe anyị bu ụzọ mee nke a, ọ na-emeghekarị ohere maka ịgba àmà dị mma. N’ezie, e nwere ọtụtụ ohere dịnụ isoro ndị ọzọ kerịta olileanya anyị “site n’otu ụbọchị ruo n’ụbọchị ọzọ.”—Abụ Ọma 96:2, 3.
17 Otú ọ dị, ikekwe ọ ga-aka mma ka gị na onye nkwusa ọhụrụ ahụ rụkọọ ọrụ site n’ụlọ ruo n’ụlọ ngwa ngwa o kwere mee. Ọ bụrụ na i setịpụwo ihe mgbaru ọsọ nke ịmụba ozi gị n’April, jụọ ohu na-ahụ maka ókèala ma è nwere ókèala dị nso. Ọ bụrụ na e nwere, nke a ga-enye gị ohere ịrụ ya nke ọma. Dị ka ihe atụ, mgbe i jesịrị ozi ma ọ bụ na-eje nzukọ ma ọ bụ ebe ndị ọzọ, ị pụrụ ịchọpụta na o nwere onye nọ n’otu ụlọ ebe ị na-enwetabughị mmadụ ma ọ bụ n’ebe e gosiri mmasị. Ọ bụrụ na o kwesịrị ekwesị, mee nleta dị mkpirikpi n’ebe ahụ mgbe ọ ga-akasị aba uru. N’aka nke ya, nke a ga-atụnye ụtụ n’afọ ojuju na ọṅụ i na-enwe n’ozi.
18 Kwadebe Ozi Na-adọrọ Mmasị: Ọ bụ otu ihe mmadụ ịchọ izisa ozi Alaeze ahụ, ma, ọ bụ nnọọ ihe ọzọ onye ahụ inwe obi ike banyere otú o si ezisa ya, karịsịa ma ọ bụrụ na ọ bụ onye ọhụrụ ma ọ bụ na o jebeghị ozi ruo ogologo oge. Inyere ndị ọhụrụ na ndị na-adịghị ejekwa ozi aka ime nkwadebe kwesịrị oge e tinyere maka ya. Nzukọ Ije Ozi na nzukọ maka ozi ubi pụrụ inye echiche ndị bara uru, ma e nweghị ihe ọ bụla e ji edochi nkwadebe onwe onye.
19 Olee otú ị pụrụ isi nyere ndị ọhụrụ aka ịkwadebe maka ozi? Jiri iche magazin n’ihu mmadụ malite, meekwa ka ọ dị mfe ma dị nkenke! Gwa ha ka ha chee echiche banyere ihe a kọrọ n’akụkọ nke ga-emetụta ndị nọ n’ókèala unu, mgbe ahụkwa, chọta otu isi ihe dị n’otu n’ime magazin ndị ọhụrụ nke kwuru maka ya. Gị na ha mụgharịa ụzọ iche ihe n’ihu ahụ, ma jirinụ ya mee ihe n’ozi ngwa ngwa o kwere mee.
20 Wulite Ohere Anyị Nwere Inwe Mmụba n’Ọdịnihu: Ndị bịara Ememe Ncheta n’afọ gara aga n’ụwa nile karịrị nde 14.8. Ọnụ ọgụgụ ndị nyere akụkọ ozi dị ka ndị nkwusa karịrị nanị nde isii. Nke a pụtara na ihe dị ka nde mmadụ 8.8 nwere nnọọ mmasị ịbịa ihe omume a pụrụ iche bụ́ ebe ha nụrụ ka a kọwara otu n’ime ozizi ndị bụ́ isi nke Bible. Ha matara ụfọdụ n’ime anyị kpọmkwem, bụ́ nke masịrị ha n’ụzọ dị ukwuu ma eleghị anya. Ọtụtụ n’ime ha na-ekwu okwu dị mma banyere anyị, na-enye onyinye maka ọrụ anyị zuru ụwa ọnụ, ma na-agọpụrụ anyị n’ihu ndị ọzọ. Ìgwè mmadụ a buru ibu na-anọchite anya ohere e nwere maka inwe mmụba n’ọdịnihu. Gịnị ka anyị pụrụ ime iji nyere ha aka inwekwu ọganihu?
21 Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ndị ọhụrụ na-abịa Ememe Ncheta na-eme nke a n’ihi na otu onye n’ime anyị kpọrọ ha òkù. Nke a na-apụtakarị na ha nwere ma ọ dịghị ihe ọzọ otu onye ha maara n’etiti ndị na-ege ntị. Ọ bụrụ na mmadụ bịara n’ihi òkù anyị kpọrọ ya, anyị nwere ibu ọrụ nke ime ka ahụ ruo ya ala ma nyere ya aka irite uru zuru ezu n’ihe omume ahụ. Ebe ọ bụ na ụlọ nzukọ ahụ ga-eju eju, nyere ya aka ịchọta oche. Nye ya Bible, ma gwa ya ka o sonyere gị n’iji akwụkwọ abụ gị eme ihe. Zaa ajụjụ ọ bụla ọ pụrụ ịjụ. Ezi mmasị i gosiri ya pụrụ ịbụ isi ihe ga-ewulite mmasị ya. N’ezie, anyị nile nwere ibu ọrụ a—ọ bụrụ na anyị ahụ ihu anyị na-amaghị, ka anyị nabata onye ahụ nke ọma ma soro ya kparịta ụka ná mkpirikpi iji mata ya.
22 Ịga Ememe Ncheta pụrụ inwe mmetụta n’ezie n’otú mmadụ si eche echiche. Eziokwu ahụ bụ́ na ọ bịara nzukọ ahụ pụrụ ịpụta na ọ chọtabeghị ihe ọ na-achọ n’ebe ọzọ nakwa na anyị na-ezi ihe o chere na ọ dị mkpa ka ya nyochakwuo nke ọma. Nkọwa a kọwara ndokwa dị ebube e mere maka ihe mgbapụta pụrụ ịbụ mkpughe dị ukwuu nye onye na-amaghị ihe ọ bụla banyere ịhụnanya a na-akpaaraghị ókè nke Jehova. Ọ pụrụ ịhụ ngwa ngwa na anyị dị iche—nwee obi eziokwu, omume enyi, ịhụnanya, na nkwanye ùgwù. Ụlọ nzukọ anyị eyighị ihe ọ pụrụ ịhụwo na chọọchị dị iche iche bụ́ ebe ndị e nwere ihe oyiyi dị iche iche na ememe ndị na-enweghị isi. O doro anya na ndị ọhụrụ ga-ahụ na ndị na-ege ntị sitere n’ọnọdụ dị iche iche ná ndụ nakwa na a dịghị anakọta ụtụ. Ihe ndị a ha matara pụrụ ịbụ ihe mkpali dị ike nke ga-eme ka ha bịa ọzọ.
23 Mgbe e mesịrị Ememe Ncheta, mmadụ kwesịrị ịdị ngwa inyere onye ọhụrụ nke ọ bụla bịaranụ aka ozugbo. Ọ bụrụ na ị kpọrọ ndị ọhụrụ òkù, i nwere ibu ọrụ pụrụ iche. Tupu ha alawa, jide n’aka na ha maara banyere nzukọ ndị ọzọ a na-enwe n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Kwuo isiokwu nke okwu ihu ọha ọzọ a ga-ekwu. Mee ka ha mara ebe na oge a na-enwe Ọmụmụ Akwụkwọ Ọgbakọ nke kasị dịrị ụlọ ha nso.
24 Mee ndokwa maka ije leta ha n’ụlọ ha dị ka ndị enyi. Jide n’aka na ha nwere broshuọ Na-achọ na akwụkwọ Ihe Ọmụma, bụ́ ndị ga-enyere ha aka ịmara ozizi ndị bụ́ isi nke Bible. Ọ bụrụ na ha amụwabeghị ihe, kwuo ka ị na-eduziri ha ọmụmụ Bible. Tụọrọ ha aro ka ha gụọ broshuọ bụ́ Ndịàmà Jehova, bụ́ nke na-enye nkọwa doro anya banyere otú anyị si arụ ọrụ dị ka nzukọ. N’ebe ọ ga-ekwe omume, kpọọ ha ka ha kirie vidio anyị dị iche iche, dị ka Our Whole Association of Brothers. Mee ndokwa ka ha mata ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ. Nọgide na-akpọtụrụ ndị ọhụrụ n’ọnwa ndị dị n’ihu; kpọọ ha òkù ịbịa nzukọ n’oge nleta nke onye nlekọta sekit ma ọ bụ mgbe unu nwere mgbakọ sekit ma ọ bụ ụbọchị mgbakọ pụrụ iche. Mee ka ha nwee ohere zuru ezu igosipụta onwe ha dị ka “ndị e doro ịnata ndụ ebighị ebi”!—Ọrụ 13:48.
25 Ihe Ndị Okenye Pụrụ Ime: Ihe ịga nke ọma a ga-enwe ná mgbalị ahụ siri ike a ga-eme n’ozi n’April a ga-adabere n’ụzọ dị ukwuu n’ebe ndị okenye nọ. Ọ bụrụ na ị bụ onye nduzi ọmụmụ akwụkwọ, depụta ihe ndị ị pụrụ ime iji nyere mmadụ nile nọ n’ìgwè ọmụmụ akwụkwọ ọgbakọ gị aka ikere òkè n’ọrụ ndị ahụ pụrụ iche. È nwere ndị na-eto eto, ndị ọhụrụ, ndị na-adịghị ejechi ozi anya, ma ọ bụ ndị na-adịghị ejekwa ozi e kenyere n’ìgwè gị? Mee nchọpụta iji hụ ma ndị nne na nna, ndị ọsụ ụzọ, ma ọ bụ ndị nkwusa ndị ọzọ hà emewo ihe iji nyere ha aka. Nyere ha aka n’onwe gị n’ụzọ ọ bụla kwere gị omume. Otu nwanna nwanyị na-ejechighị ozi ubi anya ruo afọ abụọ tinyere ihe karịrị awa 50 n’ozi n’April gara aga. Gịnị kpatara o ji mee ihe dị iche? O kwuru na ọ bụ nleta ọzụzụ atụrụ na-ewuli elu nke ndị okenye letara ya kpatara ya.
26 Ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi kwesịrị ịrụkọ ọrụ iji hụ na e nwere ókèala, magazin, na akwụkwọ ga-ezu maka ọnwa ahụ na-abịanụ. À pụrụ imekwu ndokwa maka nzukọ ozi ubi? Ọ bụrụ otú ahụ, meenụ ka a mara ndokwa ndị ahụ pụrụ iche. Karịsịa, n’ekpere unu na-ekpe n’ihu ọha na nke onwe onye unu, na-arịọnụ ka ngọzi Jehova dịkwasị ọnwa ahụ anyị ga-arụ ọrụ Alaeze dị ukwuu na ya.—Rom 15:30, 31; 2 Tesa. 3:1.
27 N’April gara aga n’otu ọgbakọ dị na North Carolina, ndị okenye gbara ume n’ezie ka a rụọ ọrụ dị ukwuu n’ozi. Kwa izu ná nzukọ, ha na-agwa ndị nkwusa ka ha jiri ekpere tụlee ma ha pụrụ ịbanye n’ọrụ ọsụ ụzọ inyeaka. N’ohere ọ bụla dapụtaranụ, ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi na-eji ịnụ ọkụ n’obi ekwu okwu banyere ime ka April bụrụ ọnwa kasị mma e nwetụrụla. N’ihi ya, pasent 58 nke ndị nkwusa, gụnyere ndị okenye na ndị ohu na-eje ozi nile, rụrụ ọrụ ọsụ ụzọ n’ọnwa ahụ!
28 Ọṅụ nke Dị n’Ikere Òkè Zuru Ezu: Gịnị bụ ngọzi ndị dị ‘n’ịdọgbu onwe anyị n’ọrụ na ịgbasi mgba ike’ n’ozi? (1 Tim. 4:10) Banyere ọrụ ndị ọgbakọ ha ji ịnụ ọkụ n’obi rụọ n’April gara aga, ndị okenye ahụ a kpọtụrụ uche n’elu dere, sị: “Ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị na-ekwukarị okwu banyere ịhụnanya dị ukwuu ha nwere n’ebe ibe ha nọ na otú ha na ibe ha si na-akpachikwu anya kemgbe ha malitere ịrụ ọrụ ka ukwuu n’ozi ubi.”
29 Ọ gụsiri otu nwanna nwoke na-eto eto nwere nkwarụ agụụ ike ikere òkè n’ọrụ ahụ pụrụ iche n’April gara aga. Site n’atụmatụ e ji nlezianya mee nakwa site n’enyemaka mama ya na ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ime mmụọ ya, ọ rụpụtara ihe n’ọnwa ahụ dị ka ọsụ ụzọ inyeaka. Olee otú ahụmahụ ahụ dị ya? O kwuru, sị: “Na nke mbụ ya ná ndụ m, adị m ka nwoke ahụ ya zuru okè.”
30 Obi abụọ adịghị ya na Jehova na-agọzi n’ụba ndị ji ihe ùgwù ha nke ịgwa ndị ọzọ banyere ọbụbụeze ya akpọrọ oké ihe. (Abụ Ọma 145:11, 12) Ka anyị na-eme ememe ncheta nke ọnwụ Onyenwe anyị, anyị na-aghọta na ngọzi ndị na-abịa n’ihi ịsọpụrụ Chineke ga-aba nnọọ ụba karị n’ọdịnihu. Pọl onyeozi ji mmasị na-atụsi anya ụgwọ ọrụ nke ndụ ebighị ebi ike. Ma, ọ maara na nke a abụghị ihe ọ ga-agbachi nnọọ nkịtị ma na-ele anya ya. O dere, sị: “Ana m adọgbukwa onwe m n’ọrụ ime ihe a, na-agbasi mgba ike dị ka ịrụsi ọrụ ike nke Ya si dị, nke na-arụsi ike n’ime m n’ike.” (Kọl. 1:29) Jehova, site n’aka Jisọs, mere ka Pọl dị ike ijezu ozi na-azọpụta ndụ, Ọ pụkwara imere anyị otu ihe ahụ taa. Nke ahụ ọ̀ bụ ahụmahụ ị ga-enwe n’onwe gị n’April a?
Igbe dị na peeji nke 3]
Ònye Ka Ị Pụrụ Ịgba Ume Ka O Mee Nkwusa n’April?
Ọ̀ bụ nwa gị?
Ọ̀ bụ onye ị na-amụrụ Bible?
Ọ̀ bụ onye na-adịghị ejekwa ozi?