Ihe Ncheta Maka Ememe Ncheta
Ememe Ncheta nke afọ a dabara na Sunday, April 8. Ndị okenye kwesịrị ilebara ihe ndị na-esonụ anya:
◼ N’iyi oge maka nzukọ ahụ, jidenụ n’aka na a gaghị ebugharị ihe nnọchianya ndị ahụ ruo mgbe anyanwụ dasịrị.
◼ E kwesịrị ịgwa mmadụ nile, tinyere onye ọkà okwu, kpọmkwem oge na ebe a ga-eme ememe ahụ.
◼ E kwesịrị inweta ụdị achịcha na mmanya kwesịrị ekwesị, kwadebekwa ha.—Lee Ụlọ Nche February 15, 1985, peeji nke 19.
◼ E kwesịrị iweta efere, iko, na ákwà tebụl kwesịrị ekwesị n’ụlọ nzukọ ma hazie ha tupu oge eruo.
◼ E kwesịrị ihichasị Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ ebe ọzọ a ga-ezukọ nke ọma tupu oge eruo.
◼ E kwesịrị ịhọpụta ndị atendantị na ndị ga-ebugharị ihe nnọchianya ndị ahụ ma gwa ha banyere ọrụ ha na ụkpụrụ kwesịrị ekwesị tupu oge eruo.
◼ E kwesịrị ime ndokwa ibujere onye ọ bụla so ná ndị e tere mmanụ, bụ́ onye nwere nkwarụ, nke na-enweghịkwa ike ịbịa, ihe nnọchianya ndị ahụ.
◼ Mgbe e mere ndokwa ka ihe karịrị otu ọgbakọ jiri otu Ụlọ Nzukọ Alaeze mee ihe, e kwesịrị inwe ezi mmekọrịta ihe n’etiti ọgbakọ ndị o metụtara iji zere mgbakọta na-adịghị mkpa n’ụzọ mbata, okporo ụzọ, na n’ebe ndọba ụgbọala.