Ihe Ncheta Maka Ememe Ncheta
Ememe Ncheta dabara na Sunday, March 23. Ndị okenye kwesịrị ichebara ihe ndị na-esonụ echiche:
◼ N’isetịpụ oge nzukọ ahu, jide n’aka na a gaghị ebugharị ihe nnọchianya ndị ahụ ruo mgbe anyanwụ dasịrị.
◼ E kwesịrị ịgwa mmadụ nile, tinyere onye ọkà okwu, banyere oge na ebe a ga-eme ememe ahụ kpọmkwem.
◼ E kwesịrị inweta ụdị achịcha na mmanya kwesịrị ekwesị, kwadebekwa ha.—Lee Ụlọ Nche February 15, 1985, peji nke 19.
◼ E kwesịrị iweta efere, iko nkụwa, na table na ákwà e ji ekpuchi table ndị kwesịrị ekwesị n’ụlọ nzukọ n’oge ma hazie ha.
◼ E kwesịrị ihichasị Ụlọ Nzukọ Alaeze ma ọ bụ ebe ọzọ a na-ezukọ nke ọma tupu oge eruo.
◼ E kwesịrị ịhọpụta ndị atendantị na ndị ga-ebugharị ihe nnọchianya ndị ahụ ma gwa ha tupu oge eruo banyere ụkpụrụ kwesịrị ekwesị na ọrụ ha.
◼ E kwesịrị ime ndokwa inye onye ọ bụla n’ime ndị e tere mmanụ, bụ́ onye nwere nkwarụ, na-enweghịkwa ike ịbịa ihe nnọchianya ndị ahụ.
◼ Mgbe a haziri ihe karịrị otu ememe n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze, e kwesịrị inwe ezi mmekọrịta ihe n’etiti ọgbakọ ndị o metụtara iji zere mgbakọta na-adịghị mkpa n’ụlọ nchere, ụzọ mbanye, okporo ámá, na ebe a na-adọba ụgbọala.