Igbe Ajụjụ
◼ Mgbe a kpọrọ ọgbakọ inye aka n’ime ndokwa maka olili ozu, ajụjụ ndị na-esonụ pụrụ ibilite:
Ònye kwesịrị ikwu okwu olili ozu ahụ? Nke a bụ mkpebi ndị òtù ezinụlọ ga-eme. Ha pụrụ ịhọrọ nwanna nwoke ọ bụla e mere baptism nke nwere ezi nguzo. Ọ bụrụ na a gwa òtù ndị okenye ka ha chọta onye ọkà okwu, dị ka ọ na-adịkarị, ha ga-ahọrọ otu okenye ruru eru ka o kwuo okwu dabeere ná ndepụta Society. Ọ bụ ezie na ọ bụghị nke itobiga onye ahụ nwụrụ anwụ ókè, ọ pụrụ ikwesị ekwesị ịdọrọ uche gaa n’àgwà ihe nlereanya o gosipụtara.
À pụrụ iji Ụlọ Nzukọ Alaeze mee ihe? A pụrụ ma ọ bụrụ na òtù ndị okenye enyewo ikike ya, ọ bụrụkwa na o gbochighị nzukọ a na-enwe oge nile. A pụrụ iji ụlọ nzukọ ahụ mee ihe ma ọ bụrụ na onye ahụ nwụrụ anwụ nwere aha ọma, bụrụkwa onye òtù ọgbakọ ahụ ma ọ bụ bụrụ nwa onye òtù nke ọgbakọ ahụ. Ọ bụrụ na onye ahụ aghọwo onye ọha na eze mara n’ihi àgwà na-abụghị nke ndị Kraịst, ma ọ bụ ọ bụrụ na e nwere ihe ndị ọzọ pụrụ iwetara ọgbakọ aha ọjọọ, ndị okenye pụrụ ikpebi ịghara ikwe ka e jiri ụlọ nzukọ ahụ mee ihe.—Lee akwụkwọ Ozi Anyị, peji nke 62-63.
Dị ka ọ na-adịkarị, a dịghị eji Ụlọ Nzukọ Alaeze eme ihe maka olili ozu nke ndị na-ekweghị ekwe. A pụrụ inwe ọdịiche ma ọ bụrụ na ndị òtù ezinụlọ nke onye ahụ nwụrụ anwụ na-esonyeresi ọgbakọ ike dị ka ndị nkwusa e mere baptism, na onye ahụ nwụrụ anwụ bụ onye ọnụ ọgụgụ dị ukwuu n’ọgbakọ maara na o nwere àgwà dị mma n’ebe eziokwu ahụ dị na aha ọma n’ihi àgwà ya ziri ezi n’ógbè ahụ, na ọ dịghịkwa omenala ndị ụwa e tinyekọrọ n’usoro ihe omume ahụ.
Mgbe a na-enye ikike iji Ụlọ Nzukọ Alaeze mee ihe, ndị okenye ga-atụle ma ọ̀ bụ omenala ịtụ anya ịhụ igbe ozu ahụ n’oge ememe olili ya. Ọ bụrụ na ọ bụ, ha pụrụ ikwe ka e bubata ya n’ụlọ nzukọ ahụ.
Gịnị banyere olili ozu nke ndị ụwa? Ọ bụrụ na onye ahụ nwụrụ anwụ nwere aha ọma n’ógbè ahụ, nwanna nwoke pụrụ ikwu okwu Bible na-akasi obi n’ụlọ ma ọ bụ n’èzí nke onye ahụ nwụrụ anwụ ma ọ bụ n’akụkụ ili. Ọgbakọ ga-ajụ ịhụ banyere olili ozu nke onye a maara maka omume rụrụ arụ, iwu na-akwadoghị ma ọ bụ onye ụzọ ndụ ya na-emegide ụkpụrụ Bible n’ụzọ dị oké njọ. N’ezie nwanna nwoke agaghị esoro onye ụkọchukwu kere òkè n’iduzi ememe nke okpukpe ndị ọzọ ga-eso mee, ma ọ bụ n’olili ozu ọ bụla e mere na chọọchị Babilọn Ukwu ahụ.
Gịnị ma ọ bụrụ na onye ahụ nwụrụ anwụ bụ onye a chụpụrụ n’ọgbakọ? Ọgbakọ n’ozuzu ya agaghị etinye aka. A gaghị eji Ụlọ Nzukọ Alaeze mee ihe. Ọ bụrụ na onye ahụ anọwo na-enye ihe àmà nke nchegharị, na-egosipụtakwa ọchịchọ ịbụ onye a nabataghachiri, akọ na uche nwanna nwoke pụrụ ikwe ya ka o kwuo okwu Bible n’ụlọ ma ọ bụ n’èzí onye ahụ nwụrụ anwụ ma ọ bụ n’akụkụ ili iji gbaa àmà nye ndị na-ekweghị ekwe na ịkasi ndị ikwu obi. Otú ọ dị, tupu o mee mkpebi a, ọ ga-abụ ihe amamihe dị n’ime ya ka nwanna nwoke ahụ kpọtụrụ òtù ndị okenye ma chebara ihe ndị ha pụrụ ikwu echiche. N’ọnọdụ ndị ọ na-agaghị abụ ihe amamihe ka nwanna nwoke tinye aka, ọ pụrụ ikwesị ekwesị ka nwanna nwoke bụ onye òtù ezinụlọ nke onye ahụ nwụrụ anwụ kwuo okwu iji kasie ndị ikwu obi.—Lee Ụlọ Nche December 15, 1981, peji nke 31; na December 1, 1977, peji nke 731-732.
A pụrụ ịchọtakwu ntụziaka ná mbipụta Ụlọ Nche nke October 15, 1990, peji nke 30-31; December 15, 1981, peji nke 31; September 15, 1980, peji nke 5-7; December 1, 1978, peji nke 4-8; December 1, 1977, peji nke 731-732; March 15, 1970 (Bekee), peji nke 191-192; na Teta! nke September 8, 1990 (Bekee), peji nke 22-23, na nke March 22, 1977 (Bekee), peji nke 12-15.