Ụzọ Ndị Kraịst Si Ele Omenala Olili Ozu Anya
ỌNWỤ mberede, a na-atụghị anya ya nke onye a hụrụ n’anya bụ nnọọ ihe dị mwute. Ọ na-akpata nkụja, nke oké ihe mgbu nke uche na-esochi. Ikiri onye a hụrụ n’anya ka ọ na-ada n’ụra ọnwụ mgbe ọ rịasịrị ọrịa na-egbu mgbu nke were ogologo oge dị iche, ma ihe mwute na mmetụta nke oké mfu ya na-adịgide.
N’agbanyeghị ọnọdụ nke ọnwụ onye a hụrụ n’anya, onye mmadụ nwụnahụrụ chọrọ nkwado na nkasi obi. Onye Kraịst mmadụ nwụnahụrụ pụkwara iche mkpagbu ihu site n’aka ndị na-esi ọnwụ na ha ga-eme omenala olili ozu ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. Nke a bụ ihe a na-ahụkarị n’ọtụtụ mba Africa nakwa n’akụkụ ụfọdụ ndị ọzọ nke ụwa.
Gịnị ga-enyere onye Kraịst mmadụ nwụnahụrụ aka izere omenala olili ozu ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị? Olee otú ndị kwere ekwe ibe ya ga-esi nye nkwado n’oge ọnwụnwa dị otú ahụ? Azịza nye ajụjụ ndị a bụ ihe gbasara onye ọ bụla nke chọrọ ime ihe na-atọ Jehova ụtọ, n’ihi na “okpukpe Chineke nke dị ọcha, nke a na-emerụghịkwa emerụ n’ihu Chineke anyị, bụ́ Nna anyị, bụ nke a, ileta ụmụ mgbei na ndị inyom di ha nwụrụ n’ime mkpagbu ha, na idebe onwe ya n’enweghị ntụpọ site n’ụwa.”—Jemes 1:27.
E Jikọtara Ya na Otu Nkwenkwe
Otu ihe a maara nke ọma na-ejikọta ọtụtụ omenala olili ozu bụ nkwenkwe ahụ bụ́ na ndị nwụrụ anwụ na-adịgide ndụ n’ógbè a na-adịghị ahụ anya nke ndị nna ochie. Iji mee ka obi dajụọ ha, ọtụtụ ndị na-eru újú na-ewere ya dị ka ibu ọrụ ime ememe okpukpe ụfọdụ. Ma ọ bụ ha na-atụ ụjọ na ha ga-emejọ ndị agbata obi bụ́ ndị kweere na ihe ọjọọ ga-abịakwasị ógbè ahụ ma ọ bụrụ na e meghị ememe ahụ.
Ezi onye Kraịst agaghị ekwe ka egwu mmadụ merie ya wee kere òkè n’omenala ndị na-adịghị amasị Chineke. (Ilu 29:25; Matiu 10:28) Bible na-egosi na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, n’ihi na ọ na-asị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla . . . Ọ dịghị ọrụ, ma ọ bụ iche echiche, ma ọ bụ ihe ọmụma, ma ọ bụ amamihe, dị na [Sheol, NW] ebe gị onwe gị na-ala.” (Eklisiastis 9:5, 10) Ya mere, Jehova Chineke dọrọ ndị ya nke oge ochie aka ná ntị ka ha ghara ịnwa ime ka obi ndị nwụrụ anwụ dajụọ ma ọ bụ soro ha kwurịta okwu. (Deuterọnọmi 14:1; 18:10-12; Aịsaịa 8:19, 20) Eziokwu Bible ndị a na-emegide ọtụtụ omenala olili ozu ndị a ma ama.
Gịnị Banyere “Nsacha n’Ụzọ Mmekọahụ”?
Ná mba ụfọdụ nke etiti Africa, a na-atụ anya na onye di ma ọ bụ nwunye ya nwụrụ ga-esoro onye ikwu dị nso nke onye ahụ nwụrụ anwụ nwee mmekọahụ. Ọ bụrụ na e meghị nke a, e kweere na onye ahụ nwụrụ anwụ ga-emerụ ndị fọdụrụ n’ezinụlọ ahụ ahụ. A kpọrọ ememe a “nsacha n’ụzọ mmekọahụ.” Ma Bible na-akọwa mmekọahụ ọ bụla na-abụghị n’alụmdi na nwunye dị ka “ịkwa iko.” Ebe ọ bụ na ndị Kraịst ‘ga-agbanarị ịkwa iko,’ ha ji obi ike na-eguzogide omenala a Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị.—1 Ndị Kọrint 6:18.
Tụlee otu nwanyị di ya nwụrụ aha ya bụ Mercy.a Mgbe di ya nwụrụ na 1989, ndị ikwu chọrọ ka o soro onye ikwu bụ́ nwoke wee mee nsacha n’ụzọ mmekọahụ. Ọ jụrụ ajụ, na-akọwa na ememe ahụ megidere iwu Chineke. N’iwe, ndị ikwu ahụ lawara mgbe ha gwachara ya okwu ọjọọ. Mgbe otu ọnwa gasịrị ha wakporo ụlọ ya, na-ewepụsị gbamgbam e ji kụọ elu ụlọ ya. “Okpukpe gị pụrụ ilekọta gị,” ka ha kwuru.
Ọgbakọ kasiri Mercy obi, ọbụna rụọkwara ya ụlọ ọhụrụ. Nke a masịrị nnọọ ndị agbata obi nke na ụfọdụ kpebiri ikere òkè n’ihe owuwu ahụ, nwunye chiifu bụ́ onye Katọlik bụ onye mbụ wetara ahịhịa maka elu ụlọ ahụ. Omume ikwesị ntụkwasị obi Mercy gbara ụmụ ya ume. Ha anọ araraworị onwe ha nye Jehova Chineke kemgbe ahụ, otu gakwara Ụlọ Akwụkwọ Ọzụzụ Ndị Ozi n’oge na-adịbeghị anya.
N’ihi omenala nke nsacha n’ụzọ mmekọahụ, ụfọdụ ndị Kraịst ekwewo ka a rụgide ha ịlụ onye na-ekweghị ekwe. Dị ka ihe atụ, otu nwoke nwunye ya nwụrụ nọ n’afọ ndị 70 ya gbaara ngwa ngwa ga lụọ otu nwa agbọghọ ka na-eto eto bụ́ onye ikwu nke nwunye ya nwụrụ anwụ. Site n’ime nke a, ọ pụrụ ikwu na o mewo nsacha n’ụzọ mmekọahụ. Otú ọ dị, usoro dị otú a megidere ndụmọdụ Bible nke bụ na ndị Kraịst kwesịrị ịlụ “nanị n’ime Onyenwe anyị.”—1 Ndị Kọrint 7:39.
Ememe Ịmụ Anya Abalị Nile
N’ọtụtụ mba, ndị na-eru újú na-agbakọta n’ụlọ onye ahụ nwụrụ anwụ ma mụọ anya abalị nile. Ịmụ anya ndị a na-agụnyekarị oriri na egwú na-ada oké ụda. E kweere na nke a ga-eme ka obi dajụọ onye nwụrụ anwụ ma chebe ndị fọdụrụ n’ezinụlọ ahụ pụọ n’ịta amoosu. A pụrụ ikwu okwu otuto efu iji nweta ihu ọma nke onye ahụ nwụrụ anwụ. Mgbe otu okwu gasịrị, ndị ahụ na-eru újú pụrụ ịbụ otu abụ okpukpe tupu onye ọzọ eguzoro ọtọ ikwu okwu. Nke a pụrụ ịga n’ihu ruo mgbe chi bọrọ.b
Ezi onye Kraịst adịghị ekere òkè n’ụdị ememe ịmụ anya abalị nile ahụ n’ihi na Bible na-egosi na ndị nwụrụ anwụ apụghị inyere ndị dị ndụ aka ma ọ bụ merụọ ha ahụ. (Jenesis 3:19; Abụ Ọma 146:3, 4; Jọn 11:11-14) Akwụkwọ Nsọ katọrọ mgbaasị. (Mkpughe 9:21; 22:15) Otú ọ dị, ọ pụrụ ịbụ ihe siri ike nye nwanyị onye Kraịst di ya nwụrụ igbochi ndị ọzọ iwebata omume mgbaasị. Ha pụrụ isi ọnwụ na ha ga-amụ anya abalị nile n’ụlọ ya. Gịnị ka ndị kwere ekwe ibe ha pụrụ ime iji nyere ndị Kraịst mmadụ nwụnahụrụ aka bụ́ ndị na-eche mkpagbu ọzọ a ihu?
Ọtụtụ mgbe ndị okenye enwewo ike ịkwado ezinụlọ onye Kraịst mmadụ nwụnahụrụ site n’isoro ndị ikwu na ndị agbata obi tụgharịa uche. Mgbe ntụgharị uche dị otú ahụ gasịrị, ndị a pụrụ ikweta ịhapụ ụlọ ahụ n’udo ma gbakọtakwa ọzọ maka olili ozu ahụ n’ụbọchị ọzọ. Ma gịnị ma ọ bụrụ na ụfọdụ achọọ ịlụ ọgụ? Ịgbalị ịnọgide soro ha na-atụgharị uche pụrụ ịkpata ime ihe ike. ‘Ohu nke Onyenwe anyị aghaghị ịbụ onye na-adịghị alụ ọgụ, kama ọ ghaghị ịnagide ihe ọjọọ.’ (2 Timoti 2:24) Ya mere ọ bụrụ na ndị ikwu na-adịghị ekwenye ekwenye ejiri ike weghara ihe, ọ pụrụ ịbụ na nwanyị onye Kraịst di ya nwụrụ na ụmụ ya agaghị enwe ike igbochi nke a. Ma ha adịghị ekere òkè n’ememe okpukpe ụgha ọ bụla nke a na-eme n’ụlọ ha, n’ihi na ha na-erube isi n’iwu Bible ahụ bụ́: “Unu na ndị na-ekweghị ekwe ekekọtala onwe unu.”—2 Ndị Kọrint 6:14.
Ụkpụrụ a metụtakwara olili ozu. Ndịàmà Jehova adịghị ekere òkè n’ịbụ abụ, ikpe ekpere, ma ọ bụ ememe nke onyeozi nke okpukpe ụgha na-eduzi. Ọ bụrụ na ndị Kraịst bụ́ ndị òtù ezinụlọ elee ya anya dị ka ihe kwesịrị ekwesị ịga ihe omume dị otú ahụ, ha adịghị ekere òkè.—2 Ndị Kọrint 6:17; Mkpughe 18:4.
Ememe Olili Ozu Ndị Nwere Ùgwù
Ememe olili ozu nke Ndịàmà Jehova duziri adịghị agụnye ememe okpukpe ndị e zubere iji mee ka obi dajụọ ndị nwụrụ anwụ. A na-ekwu okwu Bible n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, n’ebe a na-edozi ozu, n’ụlọ onye ahụ nwụrụ anwụ, ma ọ bụ n’akụkụ ili. Nzube nke okwu ahụ bụ iji kasie ndị ahụ mmadụ nwụnahụrụ obi site n’ịkọwa ihe Bible na-ekwu banyere ọnwụ na olileanya nke mbilite n’ọnwụ. (Jọn 11:25; Ndị Rom 5:12; 2 Pita 3:13) A pụrụ ịbụ abụ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, a na-emechikwa ihe omume ahụ site n’ekpere na-akasi obi.
N’oge na-adịbeghị anya, e duziri ememe olili ozu dị ka nke a maka otu n’ime Ndịàmà Jehova bụ́ nwanne nwanyị kasị nta nke Nelson Mandela, onyeisi ala nke South Africa. Mgbe ememe ahụ gasịrị, onyeisi ala ahụ kelere ọkà okwu ahụ nke ọma. Ọtụtụ ndị oké ozu na ndị nọ n’ọkwá dị elu bịara. “Nke a bụ olili ozu kasị nwee ùgwù m gatụworo,” ka otu onye minista ọchịchị mba ahụ kwuru.
Ákwà Mkpé Ò Ziri Ezi?
Ndịàmà Jehova na-eru újú maka ọnwụ nke ndị a hụrụ n’anya. Dị ka Jisọs, ha pụrụ ibe ákwá. (Jọn 11:35, 36) Ma ha adịghị ewere ya dị ka ihe dị mkpa igosipụta iru újú ha n’ihu ọha site n’ụfọdụ ihe àmà a na-ahụ anya. (Tụlee Matiu 6:16-18.) N’ọtụtụ ala, a na-atụ anya ka ndị inyom di ha nwụrụ yiri ákwà mkpé iji mee ka obi dajụọ onye ahụ nwụrụ anwụ. A ghaghị iyi akwa ndị a ruo ọtụtụ ọnwa ma ọ bụ ọbụna otu afọ mgbe olili ozu ahụ gasịrị, iyipụ ha bụkwa oge maka ememe ọzọ.
A na-ewere egosighị ihe àmà nke iru újú dị ka imejọ onye ahụ nwụrụ anwụ. N’ihi nke a, n’akụkụ ụfọdụ nke Swaziland, ndị chiifu ebo dị iche iche achụpụwo Ndịàmà Jehova n’ụlọ nke aka ha nakwa n’ala ha. Otú ọ dị, ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi dị otú a abụrụwo ndị ụmụnna ime mmụọ ha bi ebe ọzọ lekọtaworo mgbe nile.
Ụlọikpe Ukwu nke Swaziland ekpelaworo Ndịàmà Jehova ikpe, na-ekwu na e kwesịrị ịhapụ ha ka ha laghachi n’ụlọ nakwa n’ala ha. N’okwu ikpe ọzọ, e nyere otu nwanyị onye Kraịst di ya nwụrụ ohere ịnọ n’ụlọ ya mgbe o wepụtasịrị akwụkwọ ozi na tepụ e kwubara ihe n’ime ya bụ́ ebe di ya nwụrụ anwụ nọ kwuo hoo haa na nwunye ya agaghị eyi ákwà mkpé. N’ụzọ dị otú a, o gosiri n’ezie na ọ na-akwanyere di ya ùgwù.
E nwere uru dị ukwuu n’inye ntụziaka olili ozu doro anya tupu mmadụ anwụọ, karịsịa n’ebe ndị a na-emekarị ememe ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. Tụlee ihe atụ nke Victor, onye bi na Cameroon. O deturu usoro ihe omume a ga-agbaso n’olili ozu ya. N’ezinụlọ ya, e nwere ọtụtụ ndị a na-egere olu ha nọ n’ọha mmadụ nwere omenala siri ike banyere ịkwanyere ndị nwụrụ anwụ ùgwù, tinyere ife okpokoro isi mmadụ ofufe. Ebe Victor bụ onye òtù ezinụlọ a na-akwanyere ùgwù, ọ maara na ma e leghị anya a ga-eme okpokoro isi ya otú ahụ. Ya mere o nyere ntụziaka doro anya banyere otú Ndịàmà Jehova ga-esi mee ememe olili ozu ya. Nke a mere ka ọnọdụ ahụ dịtụrụ nwunye ya na ụmụ ya mfe, a gbakwara ezi àmà n’ógbè ahụ.
Zere Iṅomi Omenala Akwụkwọ Nsọ Na-akwadoghị
Ụfọdụ ndị nwere ihe ọmụma nke Bible abụrụwo ndị egwu na-atụ iguzo dị ka ndị dị iche. Iji zere mkpagbu, ha agbalịwo ime ka obi dị ndị agbata obi ha mma site n’ime ka o yie ka ha na-eme ememe ịmụ anya ọdịnala maka onye ahụ nwụrụ anwụ. Ọ bụ ezie na ọ dị mma ileta onye ahụ mmadụ nwụnahụrụ iji kasie ya obi n’onwe anyị, nke a achọghị ka e duzie ntakịrị ememe olili ozu n’ụlọ onye ahụ mmadụ nwụnahụrụ kwa abalị tupu olili ozu ahụ kpọmkwem eruo. Ime nke a pụrụ iwetara ndị na-ahụ ihe na-aganụ ihe mkpọbi ụkwụ, ebe ọ pụrụ inye ha echiche na ndị na-eme ya ekwenyeghị n’ezie n’ihe Bible na-ekwu banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ.—1 Ndị Kọrint 10:32.
Bible na-agba ndị Kraịst ume idebe ofufe Chineke n’ọkwá mbụ ná ndụ na iji oge ha mee ihe n’ụzọ amamihe dị na ya. (Matiu 6:33; Ndị Efesọs 5:15, 16) Otú ọ di, n’ebe ụfọdụ, a kwụsịwo ihe omume ọgbakọ ruo otu izu ma ọ bụ karịa n’ihi olili ozu. Nsogbu a adịghị nanị n’Africa. Banyere otu olili ozu, otu akụkọ si n’Ebe Ndịda America na-ekwu, sị: “Nzukọ ndị Kraịst atọ nwere ọnụ ọgụgụ mmadụ dị ala nke ukwuu. A kwadoghị ozi ubi ruo ihe dị ka ụbọchị iri. Ọbụna ndị na-anọghị n’ọgbakọ na ndị a na-eduziri Bible nwere ihe ijuanya nakwa mmechuihu ịhụ ụfọdụ n’ime ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị ka ha na-ekere òkè.”
N’obodo ụfọdụ, ezinụlọ mmadụ nwụnahụrụ pụrụ ịkpọ ndị enyi ole na ole òkù n’ụlọ ha maka obere ntụrụndụ mgbe olili ozu ahụ gasịrị. Ma n’ọtụtụ akụkụ Africa, ọtụtụ narị ndị bịara olili ozu ahụ na-agbada n’ụlọ onye ahụ nwụrụ anwụ ma tụọ anya ememe, bụ́ ebe a na-achụkarị anụmanụ n’àjà. Ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst eṅomiwo omenala a, na-enye echiche na ha na-eri oriri omenala iji mee ka obi dajụọ onye ahụ nwụrụ anwụ.
Ememe olili ozu nke Ndịàmà Jehova duziri adịghị atụkwasị ibu arọ imefu oké ego n’isi ndị mmadụ nwụnahụrụ. Ya mere o kwesịghị ịdị mkpa ime ndokwa pụrụ iche maka ndị bịaranụ inye ego iji nweta ego dị ukwuu e mefuru n’olili ozu. Ọ bụrụ na ndị inyom dị ha nwụrụ bụ́ ndị ogbenye apụghị iwetali ego a ga-emefu maka ihe ndị dị mkpa, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ ga-enwe obi ụtọ inye aka. Ọ bụrụ na enyemaka dị otú ahụ ezughị, ndị okenye pụrụ ime ndokwa inye enyemaka ihe onwunwe maka ndị kwesịrị ka e meere ha otú ahụ.—1 Timoti 5:3, 4.
Omenala olili ozu adịghị emegide ụkpụrụ Bible mgbe nile. Mgbe ha megidere ya, ndị Kraịst na-ekpebisi ike ime ihe kwekọrọ n’Akwụkwọ Nsọ.c (Ọrụ 5:29) Ọ bụ ezie na nke a pụrụ iwetakwu mkpagbu, ọtụtụ ndị ohu Chineke pụrụ ịgba akaebe na ha enwewo ihe ịga nke ọma n’izute ule ndị dị otú ahụ. Ha emewo otú ahụ site n’ike sitere n’aka Jehova, bụ́ “Chineke nke nkasi obi nile,” nakwa site n’enyemaka ịhụnanya nke ndị kwere ekwe ibe ha bụ́ ndị kasiworo ha obi ná mkpagbu ha.—2 Ndị Kọrint 1:3, 4.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a E ji aha ndochi mee ihe n’isiokwu a.
b N’ìgwè asụsụ na ọdịbendị ụfọdụ okwu ahụ bụ́ “ịmụ anya” metụtara nleta dị mkpirikpi iji kasie onye ahụ mmadụ nwụnahụrụ obi. O nwere ike ọ gaghị agụnye ihe Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị. Lee Teta! (Bekee) nke May 22, 1979, peji nke 27-28.
c Ebe o yiri ka omenala olili ozu ọ ga-eweta ule siri ike nye onye Kraịst, ndị okenye pụrụ ịkwadebe ndị na-achọ ime baptism maka ihe pụrụ ịbịa n’ọdịnihu. Mgbe a na-esoro ndị ọhụrụ a zukọọ iji tụlee ajụjụ ndị sitere n’akwụkwọ Nhazi E Mere Iji Jezuo Ozi Anyị, e kwesịrị ileba anya nke ọma ná nkebi bụ́, “Mkpụrụ Obi, Mmehie na Ọnwụ” na “Ngwakọrịta Okwukwe.” Ha abụọ nwere ajụjụ ndị a pụrụ ịjụ maka nkwurịta okwu. Ebe a bụ ebe ndị okenye pụrụ inye ihe ọmụma banyere omenala olili ozu ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị ka onye ahụ na-achọ ka e mee ya baptism wee mara ihe Okwu Chineke chọrọ ya n’aka ma ọ bụrụ na ụdị ọnọdụ ndị dị otú ahụ echee ya ihu.
[Igbe dị na peeji nke 23]
Ndị A Gọziri Maka Nguzo Ha Siri Ike
Sibongili bụ onye Kraịst nwere obi ike di ya nwụrụ bi na Swaziland. Mgbe di ya nwụsịrị na nso nso a, ọ jụrụ ịgbaso omenala ndị ọtụtụ chere na ọ ga-eme ka obi dajụọ onye ahụ nwụrụ anwụ. Dị ka ihe atụ, ọ kpụghị ntutu isi ya. (Deuterọnọmi 14:1) Mmadụ asatọ so n’ezinụlọ ya were iwe banyere nke a ma kpụchapụ ya ntutu isi ya n’ike. Ha gbochikwara Ndịàmà Jehova ịbịa nleta n’ụlọ ahụ iji nye Sibongili nkasi obi. Otú ọ dị, ndị ọzọ nwere mmasị n’ozi Alaeze ahụ nwere obi ụtọ iji akwụkwọ ozi agbamume nke ndị okenye dere leta ya. N’ụbọchị a tụrụ anya na Sibongili ga-eyikwasị ákwà mkpé, ihe dị ịtụnanya mere. Otu onye na-ekwu ihe a na-eme n’ezinụlọ ahụ kpọkọrọ nzukọ iji tụlee ọjụjụ ọ jụrụ ikwenye n’omenala iru újú ọdịnala.
Sibongili na-akọ, sị: “Ha jụrụ ma nkwenkwe okpukpe m ò nyere m ohere igosipụta iru újú site n’iyikwasị uwe mwụda ịgba mkpé ojii ahụ. Mgbe m kọwasịworo nguzo m, ha gwara m na ha agaghị amanye m amanye. Dị ka ihe iju anya nye m, ha nile rịọrọ mgbaghara maka imeso m ihe n’ike nakwa maka ịkpụchapụ ntutu isi m n’ụzọ megidere ọchịchọ m. Ha nile rịọrọ m ka m gbaghara ha.” Ka e mesịrị, nwanne Sibongili nke nwanyị kwupụtara nkwenye ya na Ndịàmà Jehova nwere ezi okpukpe ahụ, ọ rịọkwara ka e duziere ya ọmụmụ Bible.
Tụlee ihe atụ ọzọ: Otu nwoke onye South Africa aha ya bụ Benjamin dị afọ 29 mgbe ọ nụrụ banyere ọnwụ mberede nke nna ya. N’oge ahụ, Benjamin bụ nanị Onyeàmà nọ n’ezinụlọ ya. Mgbe a na-eme ememe ili ozu ahụ, a tụrụ anya ka onye ọ bụla kwụrụ n’ahịrị gafee ili ahụ, ma wụkwasị ájá e kpojuru aka n’elu igbe ozu ahụ.* Mgbe olili ozu ahụ gasịrị, a kpụchasịrị ntutu isi nke ndị ezinụlọ ya nile. Ebe ọ bụ na Benjamin ekereghị òkè n’ihe omume ndị a, ndị agbata obi na ndị ezinụlọ ya buru amụma na mmụọ nke nna ya nwụrụ anwụ ga-ata ya ahụhụ.
“N’ihi na m tụkwasịrị Jehova obi, ọ dịghị ihe mere m,” ka Benjamin na-ekwu. Ndị ezinụlọ ya rịbara ama otú ihe si wee gaara ya. Ka oge na-aga, ụfọdụ n’ime ha malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible ma bụrụkwa ndị e mere baptism ná ngosipụta nke nrara ha raara onwe ha nye Chineke. Gịnị banyere Benjamin? Ọ banyere ọrụ ikwusa ozi ọma oge nile. N’afọ ole na ole ndị gara aga, o nwewo ihe ùgwù mara mma nke ijere ọgbakọ Ndịàmà Jehova ozi dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
Ụfọdụ nwere ike ha agaghị ahụ ihe dị njọ n’ịtụnye okooko osisi ma ọ bụ ájá e kpojuru aka n’ime ili. Otú ọ dị, onye Kraịst ga-ezere omume a ma ọ bụrụ na ndị obodo na-ele ya anya dị ka otu ụzọ nke isi mee ka obi dajụọ onye ahụ nwụrụ anwụ ma ọ bụ ọ bụrụ na ọ bụ akụkụ nke ememe nke onyeozi nke okpukpe ụgha na-eduzi.—Lee Teta! (Bekee) March 22, 1977, peji nke 15.