Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 7/15 p. 14-19
  • Ị̀ Banyewo n’Izu Ike Chineke?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ị̀ Banyewo n’Izu Ike Chineke?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Chineke Zuru Ike n’Ọrụ Ya
  • Israel Abanyeghị n’Izu Ike Chineke
  • Otu Izu Ike Ka Fọdụrụ
  • Banye n’Izu Ike Chineke
  • Okwu Chineke Na-arụsi Ọrụ Ike
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Gịnị Bụ Izu Ike Chineke?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
  • “E Nwere Oge A Kara Aka Maka” Ịrụ Ọrụ na Izu Ike
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2019
  • Iwu Ò Ji Ndị Kraịst Idebe Ụbọchị Izu Ike?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 7/15 p. 14-19

Ị̀ Banyewo n’Izu Ike Chineke?

“Onye bataworo n’izu ike [Chineke], ya onwe ya ezuwokwa ike n’ọrụ ya nile.”—NDỊ HIBRU 4:10.

1. N’ihi gịnị ka izu ike ji bụrụ ihe a na-achọsi ike?

IZU ike. Lee okwu dị ụtọ ma maa nnọọ mma ọ bụ! N’ịbụ ndị bi n’ụwa taa nke na-eme ihe ọsọ ọsọ, ihe ka ọtụtụ n’ime anyị ga-ekwere na izutụ ike dị nnọọ mma. Ma ndị na-eto eto ma ndị okenye, ma ndị lụrụ dị na nwunye ma ndị na-alụghị, anyị pụrụ ịnọ n’oké nrụgide ma nwee ike ọgwụgwụ nanị site ná ndụ a na-adị kwa ụbọchị. Nye ndị nwere nkwarụ, ụbọchị ọ bụla bụ ihe ịma aka. Dị ka Akwụkwọ Nsọ na-ekwu, “ihe e kere eke nile na-asụkọ ude, ime na-emekọkwa ha, ruo ugbu a.” (Ndị Rom 8:22) Onye na-ezu ike abụchaghị onye dị umengwụ. Izu ike bụ mkpa mmadụ nke a na-aghaghị igbo.

2. Site n’ole mgbe ka Jehova nọworo na-ezu ike?

2 Jehova Chineke n’onwe ya anọwo na-ezu ike. N’akwụkwọ Jenesis, anyị na-agụ, sị: “E wee kesịa eluigwe na ụwa, na usuu ha nile. Chineke wee jesịa ozi Ya n’ụbọchị nke asaa, bụ́ nke O jere; O wee kwụsị n’ụbọchị nke asaa ahụ n’ozi Ya nile nke O jere.” Jehova weere ‘ụbọchị nke asaa ahụ,’ n’ihe dị mkpa n’ụzọ pụrụ iche, n’ihi na ihe ndekọ ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ gara n’ihu ikwu, sị: “Chineke wee gọzie ụbọchị nke asaa ahụ, dookwa ya nsọ.”—Jenesis 2:1-3.

Chineke Zuru Ike n’Ọrụ Ya

3. Gịnị bụ ihe na-apụghị ịbụ ihe mere Chineke jiri zuo ike?

3 N’ihi gịnị ka Chineke jiri zuo ike “n’ụbọchị nke asaa”? Otú ọ dị, o zughị ike n’ihi na ike gwụrụ ya. Jehova nwere ‘ịba ụba nke ike,’ “Ọ dịghị ada mbà, ike adịghị agwụkwa Ya.” (Aịsaịa 40:26, 28) Chineke ezughịkwa ike n’ihi na ọ dị ya mkpa ịkwụsịtụ nwa oge ma ọ bụ ijitụ nwayọọ, n’ihi na Jisọs gwara anyị, sị: “Nna m na-arụ ọrụ ruo ugbu a, Mụ onwe m na-arụkwa ọrụ.” (Jọn 5:17) Otú o sina dị, “Chineke bụ Mmụọ,” otú ahụ si arụ ọrụ na mkpa nke ihe ndị e kere eke a na-ahụ anya adịghịkwa akpara ya ókè.—Jọn 4:24.

4. N’ụzọ dị aṅaa ka “ụbọchị nke asaa ahụ” ji dị iche “n’ụbọchị” isii ndị bu ya ụzọ?

4 Olee otú anyị pụrụ isi nweta nghọta ụfọdụ n’ihe mere Chineke ji zuo ike “n’ụbọchị nke asaa”? Site n’ịrịba ama na ọ bụ ezie na obi dị ya ụtọ nke ukwuu n’ihe ọ rụzuru n’ogologo oge nke “ụbọchị” okike isii gaferenụ, Chineke gọziri “ụbọchị nke asaa” ahụ kpọmkwem ma doo ya “nsọ.” Concise Oxford Dictionary na-akọwa ihe dị “nsọ” dị ka “ihe a raara nye ma ọ bụ dopụ iche kpam kpam (nye chi ma ọ bụ nzube ụfọdụ nke okpukpe).” N’ihi ya, Jehova ịgọzi “ụbọchị nke asaa ahụ” ma doo ya nsọ na-egosi na ya na “izu ike” ya aghaghị inwetụ njikọ n’uche na nzube ya dị nsọ kama ịbụ nke e jikọrọ ya na ihe ọ bụla dị ya mkpa. Gịnị bụ njikọ ahụ?

5. Olee ihe ndị Chineke mere ka ha malite ọrụ “n’ụbọchị” okike isii ndị mbụ?

5 N’ime “ụbọchị” okike isii ndị bu ụzọ, Chineke emewo usoro ịrụ ọrụ na iwu nile na-achịkwa ọrụ nke ụwa na ihe nile dị ya gburugburu ma mee ka ha malite ọrụ. Ugbu a ndị ọkà mmụta sayensị na-amụta otú e si mee ihe ndị a n’ụzọ dị ebube. Ka ọ na-eru njedebe nke “ụbọchị nke isii,” Chineke kere mmadụ abụọ mbụ ahụ ma debe ha ‘n’ogige Iden, n’ebe ọwụwa anyanwụ.’ N’ikpeazụ, Chineke kwupụtara nzube ya banyere ezinụlọ mmadụ na ụwa n’okwu amụma ndị a: “Mụọnụ ọmụmụ, baanụ ụba, jupụta ụwa, buda ya n’okpuru onwe unu; nweekwanụ ike n’ahụ azụ nke oké osimiri, na n’ahụ anụ ufe nke eluigwe, na n’ahụ anụ nile ọ bụla dị ndụ nke na-akpụ akpụ n’elu ụwa.”—Jenesis 1:28, 31; 2:8.

6. (a) Ná njedebe nke “ụbọchị nke isii,” olee otú ihe nile Chineke keworo dị ya? (b) N’echiche dị aṅaa ka “ụbọchị nke asaa ahụ” dị nsọ?

6 Ka “ụbọchị nke isii” nke okike bịara na njedebe, ihe ndekọ ahụ na-agwa anyị, sị: “Chineke wee hụ ihe nile ọ bụla O mere, ma, lee, ọ dị mma nke ukwuu.” (Jenesis 1:31) Ihe nile Chineke meworo juru ya afọ. O si otú a zuo ike, ma ọ bụ kwụsị ịga n’ihu, n’ọrụ okike n’ihe banyere ụwa. Otú ọ dị, n’agbanyeghị izu okè na ịma mma nke ogige paradaịs ahụ mgbe ahụ, ọ gbasapụrụ nanị n’ebe dị nta, e nwekwara nanị mmadụ abụọ e kere eke n’ụwa. Ọ ga-ewe oge tupu ụwa na ezinụlọ mmadụ eruo ọnọdụ nke Chineke zubere. N’ihi nke a, o wepụtara “ụbọchị nke asaa” nke ga-enye ihe nile o keworo “n’ụbọchị” isii ndị bu ụzọ ohere ịmụba n’ụzọ kwekọrọ n’uche ya dị nsọ. (Tụlee Ndị Efesọs 1:11.) Ka “ụbọchị nke asaa ahụ” na-abịa na njedebe ya, ụwa ga-aghọwo paradaịs zuru ụwa ọnụ nke ezinụlọ mmadụ zuru okè bi n’ime ya ruo mgbe ebighị ebi. (Aịsaịa 45:18) E doro “ụbọchị nke asaa ahụ” iche, ma ọ bụ rara ya nye maka nrụzu na mmezu nke uche Chineke banyere ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ. N’echiche ahụ ọ dị “nsọ.”

7. (a) N’echiche dị aṅaa ka Chineke zuru ike “n’ụbọchị nke asaa”? (b) Olee otú ihe nile ga-adị mgbe “ụbọchị nke asaa ahụ” bịara ná njedebe ya?

7 Ya mere Chineke zuru ike site n’ọrụ okike ya “n’ụbọchị nke asaa.” Ọ dị nnọọ ka a ga-asị na ọ kwụsịrị ma kwere ka ihe o mere ka ọ malite ọrụ rụchaa ọrụ ya. O nwere obi ike zuru ezu na ka ọ na-erule ná njedebe nke “ụbọchị nke asaa ahụ,” ihe nile ga-adịwo kpọmkwem dị ka o zubere. Ọ bụrụgodị na e nwewo ihe mgbochi, a ga-emeriwo ha. Ihe nile a kpọrọ mmadụ na-erube isi ga-erite uru mgbe uche Chineke ga-emezucha. O nweghị ihe ga-egbochi nke a n’ihi na ngọzi Chineke dịkwasịrị “ụbọchị nke asaa ahụ,” o dokwara ya “nsọ.” Lee atụmanya dị ebube ọ bụ maka ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi!

Israel Abanyeghị n’Izu Ike Chineke

8. Olee mgbe, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka ndị Israel si malite idebe Ụbọchị Izu Ike?

8 Mba Israel ritere uru site na ndokwa Jehova maka ọrụ na izu ike. Ọbụna tupu o nye ndị Israel Iwu ahụ n’Ugwu Saịnaị, Chineke gwara ha site n’ọnụ Mosis, sị: “Leenụ, n’ihi na Jehova enyewo unu ụbọchị izu ike, n’ihi nke a Ya onwe ya na-enye unu nri nke ụbọchị abụọ n’ụbọchị nke isii; nọdụnụ, onye ọ bụla n’ebe ọ nọ, ka onye ọ bụla ghara isi n’ọnọdụ ya pụọ n’ụbọchị nke asaa.” Ihe si na ya pụta bụ na “ndị Israel wee kwụsị ịrụ ọrụ n’ụbọchị nke asaa.”—Ọpụpụ 16:22-30.

9. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe doro anya na iwu Ụbọchị Izu Ike ahụ bụ mgbanwe ndị Israel nabatara?

9 Ndokwa a bụ ihe ọhụrụ nye ndị Israel, bụ́ ndị a ka gbapụtasịrị site n’ịbụ ohu n’Ijipt. Ọ bụ ezie na ndị Ijipt na mba ndị ọzọ na-agụ oge n’ogologo oge nke ụbọchị ise ruo iri, o yighị ka e kwere ka ndị Israel nọ n’ohu nwee ụbọchị izu ike. (Tụlee Ọpụpụ 5:1-9.) Ya mere ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwubi na ndị Israel nabatara mgbanwe a. Kama ịdị na-ele ihe a chọrọ maka Ụbọchị Izu Ike ahụ anya dị ka ibu arọ ma ọ bụ ihe mgbochi, ha kwesịrị inweworị obi ụtọ ịgbaso ya. N’ezie, Chineke mesịrị gwa ha na Ụbọchị Izu Ike ahụ ga-abụrụ ha ihe ncheta nke ịbụ ohu ha n’Ijipt na mgbapụta ọ gbapụtara ha.—Deuterọnọmi 5:15.

10, 11. (a) Site n’irube isi, olee ihe ndị Israel gaara elepụ anya inweta? (b) N’ihi gịnị ka ndị Israel na-ejighị banye n’izu ike Chineke?

10 Ọ bụrụ na ndị Israel bụ́ ndị soro Mosis si n’Ijipt pụta rubewororị isi, ha gaara enweworị ihe ùgwù nke ịbanye n’ala nkwa ahụ “nke mmiri ara ehi na mmanụ aṅụ na-erù na ya.” (Ọpụpụ 3:8) N’ebe ahụ ha gaara enwetaworị ezi izu ike, ọ bụghị nanị n’Ụbọchị Izu Ike kama n’oge ndụ ha nile. (Deuterọnọmi 12:9, 10) Otú ọ dị, nke ahụ emechaghị dịrị otú ahụ. Banyere ha, Pọl onyeozi dere, sị: “Ole ndị, mgbe ha nụrụ, kpasuru obi ilu? ọ́ bụghịkwa ndị nile ndị siri n’Ijipt pụta site n’aka Mosis? Ma ole ndị ka ọnụma dị Ya n’obi megide [afọ iri anọ]? ọ́ bụghị ndị mehiere, ndị ozu ha dara n’ime ọhịa? Ma ole ndị ka Ọ ṅụrụ iyi na ha agaghị aba n’izu ike Ya, ma ọ́ bụghị ndị na-ekwenyeghị? Anyị rịbakwara ama na ha apụghị ịba n’ime n’ihi ekweghị ekwe.”—Ndị Hibru 3:16-19.

11 Lee ihe mmụta dị ike ọ bụ nye anyị! N’ihi enweghị okwukwe ha n’ebe Jehova nọ, ọgbọ ahụ enwetaghị izu ike nke o kweworo ha ná nkwa. Kama nke ahụ, ha lara n’iyi n’ọzara. Ha achọpụtaghị na dị ka ụmụ Abraham, e jikọtara ha n’ụzọ chiri anya n’uche Chineke iweta ngọzi maka mba nile nke ụwa. (Jenesis 17:7, 8; 22:18) Kama ịrụ ọrụ kwekọrọ n’uche Chineke, ọchịchọ ihe nke ụwa na ịchọ ọdịmma onwe onye nanị dọpụrụ uche ha kpam kpam. Ka anyị ghara ịdaba n’ụzọ dị otú ahụ!—1 Ndị Kọrint 10:6, 10.

Otu Izu Ike Ka Fọdụrụ

12. Olee atụmanya ka dịịrị ndị Kraịst narị afọ mbụ, oleekwa otú ha pụrụ isi nweta ya?

12 Ka ọ kọwapụtasịrị ụzọ Israel na-esighị banye n’izu ike Chineke n’ihi enweghị okwukwe, Pọl chere ndị kwere ekwe ibe ya ihu. Dị ka a rịbara ama ná Ndị Hibru 4:1-5, o mesiri ha obi ike na “nkwa ịba n’izu ike [Chineke] fọdụrụ.” Pọl gbara ha ume inwe okwukwe ‘n’ozi ọma’ ahụ, n’ihi na “anyị, bụ́ ndị kwere ekwe, na-aba n’izu ike ahụ.” Ebe ọ bụ na àjà mgbapụta Jisọs ewepụworị Iwu ahụ, Pọl adịghị ezo aka n’ebe a n’izu ike nkịtị nke Ụbọchị Izu Ike ahụ nyere. (Ndị Kọlọsi 2:13, 14) Site n’ihota Jenesis 2:2 na Abụ Ọma 95:11, Pọl na-agba ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru ume ka ha banye n’izu ike Chineke.

13. N’ihota Abụ Ọma nke 95, n’ihi gịnị ga Pọl ji dọrọ uche gaa n’okwu bụ́ “taa”?

13 Ikwe omume nke ịbanye n’izu Chineke kwesịrị ịbụworị “ozi ọma” nye ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru, dị nnọọ ka izu ike nke Ụbọchị Izu Ike kwesịrị ịbụworị “ozi ọma” nye ndị Israel bu ha ụzọ. N’ihi ya, Pọl gbara ndị kwere ekwe ibe ya ume ka ha ghara ime otu mmehie ihe ahụ Israel mere n’ọzara. N’izo aka n’ihe bụ́ Abụ ọma 95:7, 8 ugbu a, ọ dọọrọ uche gaa n’okwu ahụ bụ “taa,” ọ bụ ezie na o ruworị ogologo oge eri Chineke zuru ike site n’okike. (Ndị Hibru 4:6, 7) Gịnị ka Pọl na-ekwu? Ọ bụ na “ụbọchị nke asaa ahụ,” bụ́ nke Chineke dopụrụ iche iji nye ohere ka e mezuo nzube ya banyere ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ, ka na-arụ ọrụ ya. Ya mere, ọ dị ngwa ka ndị Kraịst ibe ya na-arụ ọrụ n’ụzọ kwekọrọ ná nzube ahụ kama itinye uche ná nchụso ọdịmma onwe onye nanị. Ọ kpọsara ịdọ aka ná ntị ahụ ọzọ, sị: “Unu emela ka obi unu sie ike.”

14. Olee otú Pọl siri gosi na “izu ike” Chineke ka fọdụrụ?

14 Tụkwasị na nke a, Pọl gosiri na “izu ike” ahụ e kwere ná nkwa abụghị nanị ihe banyere ibi n’Ala Nkwa ahụ n’okpuru idu ndú Joshua. (Joshua 21:44) “N’ihi na a sị na Joshua mererị ka ha zuru ike,” ka Pọl rụrụ ụka, “[Chineke agaghị] adị na-ekwu okwu banyere ụbọchị ọzọ mgbe ihe ndị a gasịrị.” N’ihi nke ahụ, Pọl gbakwụnyere: “Idebe ụbọchị izu ike fọdụụrụ ndị nke Chineke.” (Ndị Hibru 4:8, 9) Gịnị bụ “idebe ụbọchị izu ike” ahụ?

Banye n’Izu Ike Chineke

15, 16. (a) Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “idebe ụbọchị izu ike” pụtara? (b) Gịnị ka ọ pụtara bụ́ ‘izu ike site n’ọrụ nke onwe onye’?

15 A sụgharịrị okwu ahụ bụ́ “idebe ụbọchị izu ike” site n’otu okwu Grik pụtara “izuru ike.” (Kingdom Interlinear) Prọfesọ William Lane kwuru, sị: “Okwu ahụ nwetara ọdịiche ya site ná ntụziaka Ụbọchị Izu Ike nke malitere n’okpukpe ndị Juu ná ndabere nke Ọpụpụ 20:8-10, bụ́ ebe e mesiri ya ike na izu ike na otuto dịkọtara ọnụ . . . [Ọ] na-emesi ike akụkụ pụrụ iche nke ime ememe na ọṅụ, nke e gosipụtara ná nsọpụrụ na n’otuto nke Chineke.” Ya mere, izu ike ahụ e kwere ná nkwa abụghị nanị ịtọhapụ n’ọrụ. Ọ bụ mgbanwe site n’ọrụ na-agwụ ike, nke na-enweghị nzube gaa n’ozi ọṅụ nke na-asọpụrụ Chineke.

16 E mere ka nke a pụta ìhè n’okwu Pọl ndị na-esonụ: “N’ihi na onye bataworo n’izu ike ya, ya onwe ya ezuwokwa ike n’ọrụ ya nile, dị ka Chineke zuru ike n’ọrụ nke aka Ya.” (Ndị Hibru 4:10) Chineke ezughị ike n’ụbọchị asaa nke okike n’ihi ike ọgwụgwụ. Kama, ọ kwụsịrị ịrụ ọrụ okike nke ụwa iji nye ohere ka ọrụ aka ya tolite ma bịa n’ebube zuru ezu, iji nye ya otuto na nsọpụrụ. Dị ka akụkụ nke ihe ndị Chineke kere, anyị kwesịkwara ikwekọ ná ndokwa ahụ. Anyị kwesịrị ‘izuru ike site n’ọrụ nke onwe anyị,’ ya bụ, anyị kwesịrị ịkwụsị ịdị na-anwa igosi Chineke na anyị ziri ezi ná mgbalị inweta nzọpụta. Kama nke ahụ, anyị kwesịrị inwe okwukwe na nzọpụta anyị na-adabere n’àjà mgbapụta nke Jisọs Kraịst, nke a ga-esite na ya wetaghachi ihe nile ọzọ ikwekọ ná nzube Chineke.—Ndị Efesọs 1:8-14; Ndị Kọlọsi 1:19, 20.

Okwu Chineke Na-arụsi Ọrụ Ike

17. Ụzọ dị aṅaa nke Israel anụ ahụ gbasoro ka anyị na-aghaghị izere?

17 Ndị Israel abanyeghị n’izu ike nke Chineke kwere ná nkwa n’ihi nnupụisi na enweghị okwukwe ha. N’ihi ya, Pọl gbara ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru ume, sị: “Ya mere ka anyị na-anụ ọkụ n’obi ịba n’izu ike ahụ, ka onye ọ bụla ghara ịda n’otu ihe nṅomi ahụ nke ekwenyeghị ekwenye.” (Ndị Hibru 4:11) Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị Juu nke narị afọ mbụ egosipụtaghị okwukwe na Jisọs, ọtụtụ n’ime ha takwara ahụhụ nke ukwuu mgbe usoro ihe nke ndị Juu bịara ná njedebe ya na 70 O.A. Lee oge dị oké mkpa ọ bụ na anyị nwere okwukwe ná nkwa Chineke taa!

18. (a) Olee ihe ndị Pọl kwuru mere a ga-eji gosipụta okwukwe n’okwu Chineke? (b) Olee otú okwu Chineke siri “dị nkọ karịa mma agha ọ bụla nwere ihu abụọ”?

18 Anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji gosipụta okwukwe n’okwu Jehova. Pọl dere, sị: “Okwu Chineke dị ndụ, na-arụsikwa ọrụ ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ọ bụla nke nwere ihu abụọ, na-adụkwa ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ, ma nkwonkwo ma ụmị, bụrụkwa ihe nwere ike ịtụpụta echiche na izù nile nke obi.” (Ndị Hibru 4:12) Ee, okwu, ma ọ bụ ozi Chineke, dị “nkọ karịa mma agha ọ bụla nke nwere ihu abụọ.” Ọ dị ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru mkpa icheta ihe mere ndị nna nna ha. N’ileghara ikpe Jehova nke bụ́ na ha ga-ala n’iyi n’ọzara anya, ha nwara ịbanye n’Ala Nkwa ahụ. Ma Mosis dọrọ ha aka ná ntị, sị: “Ndị Amalek na ndị Kenean nọ n’ebe ahụ n’ihu unu, unu ga-adakwa site ná mma agha.” Mgbe ndị Israel jiri nnupụisi gaa n’ihu, “ndị Amalek wee rịdata, ha na ndị Kenean, bụ́ ndị bi n’ugwu ahụ, ha wee tigbuo ha, tipịakwa ha ruo Họma.” (Ọnụ Ọgụgụ 14:39-45) Okwu Jehova dị nkọ karịa mma agha ọ bụla nwere ihu abụọ, o dokwara anya na onye ọ bụla maara ụma na-eleghara ya anya ga-enweta ihe si na ya pụta.—Ndị Galetia 6:7-9.

19. Olee otú okwu Chineke si ‘adụ’ n’ụzọ dị ike, n’ihi gịnịkwa ka anyị kwesịrị iji kweta na anyị ga-aza Chineke ajụjụ?

19 Lee otú okwu Chineke si ‘na-adụ ruo n’ikewa mkpụrụ obi na mmụọ, ma nkwonkwo ma ụmị’ n’ụzọ dị ike! Ọ na-abami n’echiche na ebumnobi nke ndị mmadụ, n’ụzọ ihe atụ na-adụba ruo n’ụmị nke dị n’ime ime ọkpụkpụ! Ọ bụ ezie ndị Israel a tọhapụrụ site n’ịbụ ohu n’Ijipt ekwerewo idebe Iwu ahụ, Jehova maara na n’ime ime obi ha, ha enweghị ekele maka ndokwa ya na ihe ndị ọ chọrọ ha n’aka. (Abụ Ọma 95:7-11) Kama ime uche ya, ha tinyere uche n’imezu ọchịchọ anụ ahụ ha. N’ihi ya, ha abanyeghị n’izu ike nke Chineke kwere ná nkwa kama ha lara n’iyi n’ọzara. Ọ dị anyị mkpa iburu nke ahụ n’obi, n’ihi na ‘ọ dịghị ihe e kere eke nke na-apụtaghị ìhè n’ihu Chineke: kama ihe nile gba ọtọ bụrụkwa ihe e megheworo n’anya Ya, bụ́ Onye anyị ga-akọrọ akụkọ banyere omume anyị.’ (Ndị Hibru 4:13) Ya mere ka anyị mezuo nrara anyị raara onwe anyị nye Jehova ma ghara ‘iwezụga onwe anyị ịla n’iyi.’—Ndị Hibru 10:39.

20. Gịnị dị n’ihu, oleekwa ihe anyị na-aghaghị ime ugbu a iji banye n’izu ike Chineke?

20 Ọ bụ ezie na “ụbọchị nke asaa”—ụbọchị izu ike Chineke—ka na-aga n’ihu, ọ mụ anya ná mmezu nke nzube ya banyere ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ. N’isi nso, Eze Mesaịa, bụ́ Jisọs Kraịst, ga-eme ihe iji wepụ ndị nile na-emegide uche Chineke, tinyere Setan bụ́ Ekwensu, n’ụwa. N’oge Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, Jisọs na 144,000 ndị ọchịchị ibe ya ga-eweta ụwa na ihe a kpọrọ mmadụ n’ọnọdụ zuru ezu nke Chineke zubeworo. (Mkpughe 14:1; 20:1-6) Ugbu a bụ oge maka anyị igosi na ndụ anyị hiwere isi n’uche Jehova Chineke. Kama ịdị na-achọ igosi Chineke na anyị ziri ezi na ịchọ nanị ọdịmma onwe anyị, ugbu a bụ oge maka anyị ‘izu ike site n’ọrụ nke onwe anyị’ ma jiri obi dum jee ozi maka ọdịmma Alaeze. Site n’ime nke ahụ na site n’ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye Nna anyị nke eluigwe, bụ́ Jehova, anyị ga-enwe ihe ùgwù nke inweta abamuru nke izu ike Chineke ugbu a na ruo mgbe ebighị ebi.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

◻ Maka nzube dị aṅaa ka Chineke jiri zuo ike “n’ụbọchị nke asaa”?

◻ Olee izu ike ndị Israel gaara enwetaworị, ma n’ihi gịnị ka ha na-ejighị banye n’ime ya?

◻ Gịnị ka anyị na-aghaghị ime iji banye n’izu ike Chineke?

◻ Olee otú okwu Chineke si dị ndụ, dị ike, dịkwa nkọ karịa mma agha ọ bụla nwere ihu abụọ?

[Foto dị na peeji nke 16, 17]

Ndị Israel debere Ụbọchị Izu Ike, ma ha abanyeghị n’izu ike Chineke. Ị̀ maara ihe kpatara ya?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya