Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 7/15 p. 9-14
  • Kpachara Anya Banyere Enweghị Okwukwe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kpachara Anya Banyere Enweghị Okwukwe
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Kpatara Ndụmọdụ Siri Ike Otú A?
  • Onye Ka Mosis Ukwuu
  • “Unu Emela Ka Obi Unu Sie Ike”
  • Ihe Mmụta Nye Anyị
  • Adala Mbà n’Ọsọ nke Ndụ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Akwụkwọ Ozi Ga-enyere Anyị Aka Ịtachi Obi Ruo Ọgwụgwụ
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
  • Ka Anyị Dị n’Etiti Ndị Kwere Ekwe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 7/15 p. 9-14

Kpachara Anya Banyere Enweghị Okwukwe

“Lezienụ anya, ụmụnna m, ka ajọ obi nke ekweghị ekwe ghara ịdị n’ime onye ọ bụla n’etiti unu ma e leghị anya, n’iwezụga onwe ya n’ebe Chineke dị ndụ nọ.”—NDỊ HIBRU 3:12.

1. Eziokwu dị aṅaa na-awụ akpata oyi n’ahụ ka okwu Pọl gwara ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru na-eweta n’uche anyị?

LEE echiche na-atụ egwu ọ bụ—na ndị sobu Jehova nwee mmekọrịta onwe onye pụrụ ịzụlite “ajọ obi,” ma ‘wezụga onwe ha n’ebe Chineke dị ndụ nọ’! Leekwa ịdọ aka ná ntị nke a bụ! Ọ bụghị ndị na-ekweghị ekwe ka Pọl degaara okwu ndị a, kama ọ bụ ndị raraworo ndụ ha nye Jehova ná ndabere nke okwukwe n’àjà mgbapụta Jisọs Kraịst.

2. Ajụjụ ndị dị aṅaa dị anyị mkpa ịtụle?

2 Olee otú onye nọ n’ọnọdụ ime mmụọ a gọziri agọzi dị otú ahụ ga-esi zụlite “ajọ obi nke ekweghị ekwe”? N’ezie, olee otú onye detụworo ịhụnanya Chineke na obiọma ya na-erughịrị mmadụ ire pụrụ isi mara ụma wezụga onwe ya n’ebe ọ nọ? Nke a ọ̀ pụkwara ime onye ọ bụla n’ime anyị? Ndị a bụ okwu ndị na-akpali echiche, ọ dịkwa anyị mkpa ileba anya n’ihe mere e ji nye ịdọ aka ná ntị a.—1 Ndị Kọrint 10:11.

Gịnị Kpatara Ndụmọdụ Siri Ike Otú A?

3. Kọwaa ọnọdụ ndị na-emetụta ndị Kraịst narị afọ mbụ n’ime na gburugburu Jerusalem.

3 O yiri ka Pọl o degaara ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru nọ na Judia akwụkwọ ozi ya na 61 O.A. Otu onye ọkọ akụkọ ihe mere eme kwuru na nke a bụ oge mgbe “udo ma ọ bụ nchebe na-adịghịrị nwoke ọ bụla nke ji ihe akpọrọ ihe, nke na-eme ihe n’eziokwu, n’obodo Jerusalem ma ọ bụ n’ebe ọ bụla ọzọ n’ógbè ahụ nile.” Ọ bụ oge mmebi iwu na ime ihe ike, nke a kpaliri site na ngwakọta nke ọnụnọ ndị agha Rom na-emegbu emegbu, isi ọnwụ nke Ndị Agha Mmegide Bụ́ Ndị Juu na-emegide ndị Rom, na omume ime mpụ dị iche iche nke ndị ohi bụ́ ndị jiri oge ọgba aghara ahụ mere uru. Ihe a nile mere ka ihe siere ndị Kraịst oké ike, bụ́ ndị gbalịsiri ike ịghara itinye aka n’okwu ndị dị otú ahụ. (1 Timoti 2:1, 2) N’ezie, n’ihi nnọpụiche ha, ụfọdụ lere ha anya dị ka ndị na-ekwesịghị isoro ọha mmadụ nọrọ, ọbụna ndị na-agba ọchịchị mgba okpuru. E mesokarịrị ndị Kraịst omume ọjọọ, ihe onwunwe onwe onye funahụkwara ha.—Ndị Hibru 10:32-34.

4. Olee nrụgide okpukpe nke ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru nọ na ya?

4 Ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru nọkwa n’oké nrụgide dị n’ụdị okpukpe. Ịnụ ọkụ n’obi nke ndị na-eso ụzọ Jisọs kwesịrị ntụkwasị obi na mmụba gara ngwa ngwa nke ọgbakọ ndị Kraịst si na nke ahụ pụta kpaliri ekworo na iwe ndị Juu—karịsịa ndị ndú okpukpe ha. Ha mere ihe nile ha nwere ike iji majaa ma kpagbuo ụmụazụ Jisọs Kraịst.a (Ọrụ 6:8-14; 21:27-30; 23:12, 13; 24:1-9) Ọ bụrụgodị na a kpagbughị ụfọdụ ndị Kraịst n’ụzọ pụtara ìhè, ndị Juu kwara ha emo ma jiri ha mere ihe ọchị. E ledara Iso Ụzọ Kraịst anya dị ka okpukpe a ka hiwere ọhụrụ nke na-enweghị ịma mma nke okpukpe ndị Juu, na-enweghị ụlọ nsọ, na-enweghị òtù ndị nchụàjà, na-enweghị ememe, na-enweghị àjà ndị a na-achụ mgbe nile, na ihe ndị ọzọ. Ọbụna e gburu onye ndú ha, bụ́ Jisọs, dị ka onye omekome a mara ikpe ọnwụ. Iji kpee okpukpe ha, ndị Kraịst aghaghị inwe okwukwe, obi ike, na ntachi obi.

5. N’ihi gịnị ka o ji dị ndị Kraịst nọ na Judia mkpa ịnọgide na-amụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ?

5 Karịsịa, ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru nọ na Judia na-ebi n’oge dị oké mkpa n’akụkọ ihe mere eme nke mba ahụ. Ọtụtụ ihe nke Onyenwe ha, bụ́ Jisọs Kraịst, kwuru ga-aka ọgwụgwụ nke usoro ihe nke ndị Juu akara emeworị. Ọgwụgwụ apụghị ịdị anya. Iji lanarị, ndị Kraịst aghaghị ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ, dịrịkwa njikere ‘ịgbalaga n’ugwu.’ (Matiu 24:6, 15, 16) Hà ga-enwe okwukwe na ume ime mmụọ dị mkpa iji mee ihe ozugbo, dị ka Jisọs tụziworo? O yiri ka e nwetụrụ obi abụọ.

6. Olee ihe dị ndị Kraịst nọ na Judia mkpa ngwa ngwa?

6 N’afọ iri nke ikpeazụ tupu ntisa nke usoro ihe ndị Juu dum, ọ pụtara ìhè na ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru nọ n’okpuru oké nrụgide sitere n’ime ọgbakọ na nke sitere n’èzí. Ha nwere mkpa agbamume. Ma ha chọkwara ndụmọdụ na nduzi iji nyere ha aka ịhụ na ụzọ ha họrọwooro bụ nke ziri ezi nakwa na ha atabeghị ahụhụ ma tachie obi n’efu. Ọ bụ ihe obi ụtọ na Pọl mere ihe banyere ọnọdụ ahụ ma nyere ha aka.

7. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee mmasị n’ihe Pọl degaara ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru?

7 Ihe Pọl degaara ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru kwesịrị ịmasị anyị nke ukwuu. N’ihi gịnị? N’ihi na anyị na-ebi n’oge dị ka nke ha. Kwa ụbọchị anyị na-enweta nrụgide sitere n’ụwa nke nọ n’okpuru nchịkwa Setan. (1 Jọn 5:19) Ihe na-emezu n’anya anyị bụ amụma ndị Jisọs na ndị ozi buru banyere mgbe ikpeazụ na “nke ọgwụgwụ oge a.” (Matiu 24:3-14; 2 Timoti 3:1-5; 2 Pita 3:3, 4; Mkpughe 6:1-8) Karịsịa, ọ dị anyị mkpa ịmụrụ anya n’ụzọ ime mmụọ ka anyị wee “ka n’ike ịgbanarị ihe nile ndị a nke gaje ime.”—Luk 21:36.

Onye Ka Mosis Ukwuu

8. Site n’ikwu ihe e dekọrọ na Ndị Hibru 3:1, olee ihe Pọl na-agba ndị Kraịst ibe ya ume ime?

8 N’ikwu otu isi ihe dị mkpa, Pọl dere, sị: “Tụgharịanụ uche n’Onyeozi na Onyeisi Nchụàjà nke nkwupụta anyị, bụ́ Jisọs.” (Ndị Hibru 3:1) ‘Ịtụgharị uche’ pụtara “ịhụ ihe nke ọma . . . , ịghọtazu ihe, ịtụle ihe nke ọma.” (Vine’s Expository Dictionary of Old and New Testament Words) N’ihi ya, Pọl na-agba ndị kwere ekwe ibe ya ume ime mgbalị siri ike iji nweta ezi nghọta nke òkè Jisọs keere n’okwukwe na nzọpụta ha. Ime nke a ga-eme ka mkpebi ha ịnọgidesi ike n’okwukwe sie ike. Mgbe ahụ, gịnị bụ òkè Jisọs keere, n’ihi gịnịkwa ka anyị kwesịrị iji ‘tụgharịa uche’ na ya?

9. N’ihi gịnị ka Pọl ji zoo aka n’ebe Jisọs nọ dị ka “Onyeozi” na “Onyeisi Nchụàjà”?

9 Pọl jiri okwu bụ́ “Onyeozi” na “Onyeisi Nchụàjà” mee ihe banyere Jisọs. “Onyeozi” bụ onye e zipụrụ ezipụ, n’ebe a kwa o metụtara ụzọ Chineke si eso ihe a kpọrọ mmadụ emekọrịta ihe. “Onyeisi Nchụàjà” bụ onye ụmụ mmadụ pụrụ isi n’aka ya jekwuru Chineke. Ndokwa abụọ a dị mkpa nye ezi ofufe, Jisọs bụkwa ha abụọ. Ọ bụ ya ka e si n’eluigwe zite ịkụziri ihe a kpọrọ mmadụ eziokwu banyere Chineke. (Jọn 1:18; 3:16; 14:6) Jisọs bụkwa onye a họpụtara dị ka Onyeisi Nchụàjà ihe atụ ná ndokwa ụlọ nsọ ime mmụọ nke Jehova maka mgbaghara mmehie. (Ndị Hibru 4:14, 15; 1 Jọn 2:1, 2) Ọ bụrụ na anyị enwee ekele n’ezie banyere ngọzi ndị anyị pụrụ inweta site n’aka Jisọs, anyị ga-enwe obi ike na mkpebisi ike ịnọgidesi ike n’okwukwe.

10. (a) Olee otú Pọl si nyere ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru aka ịghọta nkarị Iso Ụzọ Kraịst karịrị okpukpe ndị Juu? (b) Eziokwu dị aṅaa a maara ebe nile ka Pọl kpọtụrụ uche na ya iji mesie ihe ọ na-ekwu ike?

10 Iji mesie uru nke okwukwe ndị Kraịst ike, Pọl jiri Jisọs tụnyere Mosis, bụ́ onye ndị Juu lere anya dị ka onye amụma kasị ukwuu n’etiti ndị nna nna ha. Ọ bụrụ na ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru pụrụ isite n’obi dum ghọta eziokwu ahụ bụ́ na Jisọs ka Mosis ukwuu, ha agaghị enwe ihe mere ha ga-eji nwee obi abụọ n’ọkịka nke Iso Ụzọ Kraịst karịrị okpukpe ndị Juu. Pọl mere ka ọ pụta ìhè na ọ bụ ezie na a gụrụ Mosis n’onye ruru eru ịbụ onye e nyefere “ụlọ” Chineke n’aka—mba, ma ọ bụ ọgbakọ, nke Israel—ọ bụ nanị oje ozi, ma ọ bụ ohu kwesịrị ntụkwasị obi. (Ọnụ Ọgụgụ 12:7) N’aka nke ọzọ, Jisọs bụ Ọkpara, onyenwenụ nke ụlọ ahụ. (1 Ndị Kọrint 11:3; Ndị Hibru 3:2,3, 5) Iji mesie ihe ọ na-ekwu ike, Pọl hotara eziokwu a a maara ebe nile: “N’ihi na ezinụlọ ọ bụla nwere onye rụrụ ya; ma Onye rụrụ ihe nile bụ Chineke.” (Ndị Hibru 3:4) Ọ dịghị onye ga-agbagha na Chineke ka onye ọ bụla ukwuu, n’ihi ọ bụ Onye Owuwu, ma ọ bụ Onye Okike nke mmadụ nile. Mgbe ahụ, n’ụzọ ezi uche dị na ya, ebe ọ bụ na Jisọs bụ onye ya na Chineke na-arụkọ ọrụ, ọ ghaghị ịdị ukwuu karịa ihe nile ọzọ e kere eke, tinyere Mosis.—Ilu 8:30; Ndị Kọlọsi 1:15-17.

11, 12. Olee ihe Pọl gbara ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru ume ijigidesi “ike ruo ọgwụgwụ,” oleekwa otú anyị pụrụ isi tinye ndụmọdụ ya n’ọrụ?

11 N’ezie, ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru nọ n’ọnọdụ dị nnọọ mma. Pọl chetaara ha na ha bụ “ndị nketa nke ọkpụkpọ nke eluigwe,” bụ́ ihe ùgwù a ga-agụ n’ihe dị oké ọnụ ahịa karịa ihe ọ bụla nke usoro ihe ndị Juu nwere inye. (Ndị Hibru 3:1) Okwu Pọl aghaghị imeworị ka ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ nwee obi ekele na ha gaje inweta ihe nketa ọhụrụ kama ịkwa ụta na ha ahapụwo ihe ndị metụtara ihe nketa ndị Juu ha. (Ndị Filipaị 3:8) N’ịgba ha ume ijigidesi ihe ùgwù ha ike, gharakwa iwere ya n’ihe dị nta, Pọl sịrị: “Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi dị ka Ọkpara, Nke bụ́ onyeisi n’ezinụlọ [Chineke]; Onye anyị onwe anyị bụ ezinụlọ Ya, ma ọ bụrụ na anyị jidesie nkwuwa okwu anyị na ịnya isi nke olileanya anyị ike ruo ọgwụgwụ ihe nile.”—Ndị Hibru 3:6.

12 Ee, ọ bụrụ na ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru ga-alanarị ọgwụgwụ na-eru nso nke usoro ihe ndị Juu, ọ dị ha mkpa ijigidesi olileanya ha nke Chineke na-enye “ike ruo ọgwụgwụ.” Anyị aghaghị ime otu ihe ahụ taa ma ọ bụrụ na anyị chọrọ ịlanarị ọgwụgwụ nke usoro ihe a. (Matiu 24:13) Anyị agaghị ekwe ka nchegbu nke ndụ, enweghị mmasị nke ndị mmadụ, ma ọ bụ ọchịchọ ezughị okè nke anyị mee ka anyị daa mbà n’okwukwe anyị nwere ná nkwa Chineke. (Luk 21:16-19) Iji hụ otú anyị pụrụ isi wusie onwe anyị ike, ka anyị ṅaa ntị n’okwu Pọl ndị ọzọ.

“Unu Emela Ka Obi Unu Sie Ike”

13. Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka Pọl nyere, oleekwa otú o si jiri Abụ Ọma nke 95 mee ihe?

13 Mgbe ọ tụlesịrị ọnọdụ ihu ọma nke ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru, Pọl nyere ịdọ aka ná ntị a: “Dị ka Mmụọ Nsọ na-asị, Taa, ọ bụrụ na unu ga-anụ olu Ya, unu emela ka obi unu sie ike, dị ka n’ịkpasu obi ilu ahụ, dị ka e mere n’ụbọchị ọnwụnwa ahụ n’ọhịa.” (Ndị Hibru 3:7, 8) Pọl na-ehota ihe dị n’Abụ Ọma nke 95, n’ihi ya kwa ọ pụrụ ikwu na “Mmụọ Nsọ na-asị.”b (Abụ Ọma 95:7, 8; Ọpụpụ 17:1-7) Akwụkwọ Nsọ bụ ihe e ji ike mmụọ nsọ Chineke dee.—2 Timoti 3:16.

14. Olee otú ndị Israel si meghachi omume nye ihe Jehova mewooro ha, n’ihi gịnịkwa?

14 Mgbe a tọhapụsịrị ha n’ịbụ ohu n’Ijipt, e nyere ndị Israel ihe ùgwù dị ukwuu nke isoro Jehova banye ná mmekọrịta ọgbụgba ndụ. (Ọpụpụ 19:4, 5; 24:7, 8) Otú ọ dị, kama igosipụta ekele maka ihe Chineke mewooro ha, n’oge na-adịghị anya ha nupụrụ isi. (Ọnụ Ọgụgụ 13:25–14:10) Olee otú nke ahụ pụrụ isiworị mee? Pọl zoro aka n’ihe kpatara ya: ime ka obi ha sie ike. Ma olee otú obi ndị ihe na-emetụta, ndị na-anabatakwa Okwu Chineke ga-esi sie ike? Gịnịkwa ka anyị na-aghaghị ime iji gbochie nke a?

15. (a) Olee otú e siworo nụ ‘olu Chineke,’ n’oge ochie na n’oge a? (b) Olee ajụjụ ndị dị mkpa ka anyị jụọ onwe anyị banyere ‘olu Chineke’?

15 Pọl ji nkebi ahịrịokwu dabeere n’ọnọdụ bụ́ “ọ bụrụ na unu ga-anụ olu Ya” malite ịdọ aka ná ntị ya. Chineke gwara ndị ya okwu site n’ọnụ Mosis na ndị amụma ọzọ. E mesịa, Jehova gwara ha okwu site n’ọnụ Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst. (Ndị Hibru 1:1, 2) Taa, anyị nwere Okwu Chineke zuru ezu e dere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible Nsọ. Anyị nwekwara “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche,” onye Jisọs họpụtara inye nri ime mmụọ “n’oge ya.” (Matiu 24:45-47) N’ihi ya, Chineke ka na-ekwu okwu. Ma ànyị na-aṅa ntị? Dị ka ihe atụ, olee otú anyị si emeghachi omume nye ndụmọdụ banyere uwe na ejiji ma ọ bụ ntụrụndụ na egwú ndị anyị na-ahọrọ? Ànyị ‘na-anụ olu Ya,’ ya bụ, ṅaa ntị ma rube isi n’ihe anyị na-anụ? Ọ bụrụ na anyị nwere àgwà nke ime ngọpụ ma ọ bụ ịjụ ịnara ndụmọdụ ahụ, anyị na-ekpughepụ onwe anyị nye ihe ize ndụ zoro ezo nke ime ka obi anyị sie ike.

16. Olee otu ụzọ nke obi anyị pụrụ isi sie ike?

16 Obi anyị pụkwara isi ike ma ọ bụrụ na anyị agbahapụ ihe anyị pụrụ ime na ihe anyị kwesịrị ime. (Jemes 4:17) N’agbanyeghị ihe nile Jehova meere ndị Israel, ha egosipụtaghị okwukwe, nupụụrụ Mosis isi, họrọ ikwere akụkọ ọjọọ banyere Kenean, ma jụ ịbanye n’Ala Nkwa ahụ. (Ọnụ Ọgụgụ 14:1-4) N’ihi ya Jehova nyere iwu na ha ga-anọ n’ọzara afọ 40—oge zuru ezu ka ndị so ná ndị na-enweghị okwukwe nke ọgbọ ahụ nwụsịa. N’iwesa ha iwe, Chineke kwuru, sị: “Ha na-ejehie mgbe nile n’obi ha: ma ndị ahụ amaghị ụzọ m nile; dị ka M ṅụrụ iyi n’iwe m, ha agaghị aba n’izu ike m ma ọlị.” (Ndị Hibru 3:9-11) Ànyị na-ahụ ihe mmụta dị na nke a nye anyị?

Ihe Mmụta Nye Anyị

17. Ọ bụ ezie na ha hụrụ oké ọrụ Jehova ma nụ nkwupụta ya, n’ihi gịnị ka ndị Israel na-ejighị nwee okwukwe?

17 Ọgbọ nke ndị Israel ahụ si n’Ijipt pụta jiri anya ha hụ ma jiri ntị ha nụ ọrụ na okwu dị ike nke Jehova. N’agbanyeghị nke ahụ, ha enweghị okwukwe na Chineke pụrụ iduru ha banye n’Ala Nkwa ahụ n’udo. N’ihi gịnị? “Ndị ahụ amaghị ụzọ m nile,” ka Jehova kwuru. Ha maara ihe Jehova kwuworo, meekwa, ma ha azụlitebeghị obi ike na ntụkwasị obi n’ikike o nwere ilekọta ha. Ha tinyebigara uche ókè ná mkpa na ọchịchọ onwe ha nke na ha echebaraghị ụzọ na nzube Chineke oké echiche. Ee, ha enweghị okwukwe ná nkwa ya.

18. Dị ka Pọl si kwuo, olee omume ga-arụpụta “ajọ obi nke ekweghị ekwe”?

18 Okwu ọzọ ndị a nke a gwara ndị Hibru na-emetụta anyị n’otu aka ahụ: “Lezienụ anya, ụmụnna m, ka ajọ obi nke ekweghị ekwe ghara ịdị n’ime onye ọ bụla n’etiti unu ma e leghị anya, n’iwezụga onwe ya n’ebe Chineke dị ndụ nọ.” (Ndị Hibru 3:12) Pọl kwutere isi ihe nke okwu ahụ site n’ịrụtụ aka na “ajọ obi nke ekweghị ekwe” bụ ihe si ‘n’iwezụga onwe onye n’ebe Chineke dị ndụ nọ’ pụta. Ná mmalite akwụkwọ ozi a, o kwuru banyere ‘mbupụ’ n’ihi aṅaghị ntị. (Ndị Hibru 2:1) Otú ọ dị, okwu Grik a sụgharịrị ịbụ “iwezụga” pụtara “iguzopụ,” ya na okwu ahụ bụ́ “ndapụ n’ezi ofufe,” nwekwara njikọ. Ọ na-egosi nguzogide, mwezụga, na nhapụ e ji nlelị mara ụma ma kpachara anya mee.

19. Olee otú aṅaghị ntị na ndụmọdụ pụrụ isi duje n’ihe dị oké njọ? Nye ihe atụ.

19 Ya mere, ihe mmụta dị na ya bụ na ọ bụrụ na anyị adaba n’àgwà nke ‘anụghị olu Ya,’ na-eleghara ndụmọdụ Jehova nyere site n’Okwu ya na òtù ohu ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, ọ gaghị adị anya tupu obi anyị akpọọ nkụ, sie ike. Dị ka ihe atụ, mmadụ abụọ na-alụbeghị dị na nwunye pụrụ ịkpatụ onwe ha nso gabiga ókè. Gịnị ma ha leghara okwu ahụ anya? Nke ahụ ọ̀ ga-egbochi ha imeghachi ihe ha mere, ka nke ahụ ọ̀ ga-eme ka ọ dịrị ha nnọọ mfe ime ya ọzọ? N’otu aka ahụ, mgbe òtù ohu ahụ nyere ndụmọdụ banyere mkpa ọ dị ime nhọrọ n’egwú na ntụrụndụ anyị, na ihe ndị ọzọ, ànyị na-eji ekele anara ya ma mee mgbanwe n’ebe ọ dị mkpa? Pọl gbara anyị ume ‘ka anyị ghara ịhapụ nzukọ nke onwe anyị.’ (Ndị Hibru 10:24, 25) N’agbanyeghị ndụmọdụ a, ụfọdụ na-ele nzukọ ndị Kraịst anya dị ka ihe na-adịghị oké mkpa. Ha pụrụ iche na ịhapụ ụfọdụ n’ime ha ma ọ bụ ọbụna ileghara nzukọ ụfọdụ anya kpam kpam enweghị ihe ọ ga-arụpụta.

20. N’ihi gịnị ka o ji dị oké mkpa na anyị ga-anara ndụmọdụ Akwụkwọ Nsọ n’ụzọ ziri ezi?

20 Ọ bụrụ na anyị azaghachighị “olu” Jehova, nke dapụtara nke ọma n’ime Akwụkwọ Nsọ na ná mbipụta ndị dabeere na Bible n’ụzọ ziri ezi, n’oge na-adịghị anya anyị ga-ahụ onwe anyị ka anyị ‘na-ewezụga onwe anyị n’ebe Chineke dị ndụ nọ.’ Ileghara ndụmọdụ anya n’ụzọ na-apụtachaghị ìhè pụrụ ịghọ n’ụzọ dị mfe iwetu ala, ịkatọ na iguzogide ya n’ụzọ pụtara ìhè. Ọ bụrụ na e dozighị ya, ihe ọ na-arụpụta bụ “ajọ obi nke ekweghị ekwe,” ịgbakekwa site n’ụzọ dị otú ahụ na-esikarị nnọọ ike. (Tụlee Ndị Efesọs 4:19.) Jeremaịa dere n’ụzọ kwesịrị ekwesị, sị: “Obi dị aghụghọ karịa ihe nile, ihe na-adịghị ngwọta ka ọ bụkwa: ònye ga-amara ya?” (Jeremaịa 17:9) N’ihi nke a, Pọl gbara ndị kwere ekwe ibe ya bụ́ ndị Hibru ume, sị: “Na-arịọrịtanụ ibe unu arịrịọ kwa ụbọchị, n’ogologo oge a a na-akpọ ya Taa; ka obi onye ọ bụla n’etiti unu ghara ime etili site n’aghụghọ nke mmehie.”—Ndị Hibru 3:13.

21. Olee ihe a gbara anyị nile ume ime, atụmanya dịkwa aṅaa ka anyị nwere?

21 Lee obi ụtọ anyị nwere na Jehova ka na-agwa anyị okwu taa, site n’Okwu ya na nzukọ ya! Anyị nwere ekele na “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-anọgide na-enyere anyị aka ‘ijidesi mmalite nke ndabere anyị ike ruo ọgwụgwụ ihe nile.’ (Ndị Hibru 3:14) Ugbu a bụ oge maka anyị ịzaghachi n’ịhụnanya na nduzi Chineke. Ka anyị na-eme otú ahụ, anyị pụrụ inweta otu n’ime nkwa ọzọ nke Jehova ndị magburu onwe ha—nke ‘ịba’ n’izu ike ya. (Ndị Hibru 4:3, 10) Nke ahụ bụ ihe ọzọ nke Pọl sooro ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru tụlee, ọ bụkwa nke anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Josephus kọrọ na ngwa ngwa Festọs nwụsịrị, Ananus (Ananaịas) nke ịrọ òtù nke ndị Sadusii ghọrọ onyeisi nchụàjà. Ọ kpọtara Jemes, onye otu nne ji ya na Jisọs, na ndị na-eso ụzọ ndị ọzọ n’ihu Sanhedrin, maakwa ha ikpe ọnwụ ma jiri okwute tụgbuo ha.

b Ihe àmà na-egosi na Pọl hotara ihe sitere na Septuagint nke Grik, nke na-asụgharị okwu Hibru maka “Meriba” dị ka “iseokwu” na “Masa” dị ka “ọnwụnwa.” Lee peji nke 350 na 379 n’ime mpịakọta nke 2 nke Insight on the Scriptures, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

◻ N’ihi gịnị ka Pọl ji degara ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru ndụmọdụ siri ike otú ahụ?

◻ Olee otú Pọl si nyere ndị Kraịst bụ́ ndị Hibru aka ịghọta na ha nwere ihe ka ndụ n’okpuru okpukpe ndị Juu mma?

◻ Olee otú obi mmadụ si esi ike?

◻ Olee ihe anyị na-aghaghị ime iji zere ịzụlite “ajọ obi nke ekweghị ekwe”?

[Foto dị na peeji nke 10]

Ị̀ na-egosipụta okwukwe na Jisọs, bụ́ Mosis Ka Ukwuu?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya