Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 7/15 p. 7-8
  • Tikikọs—Ohu Ibe A Tụkwasịrị Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Tikikọs—Ohu Ibe A Tụkwasịrị Obi
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ozi Enyemaka Gaa Jerusalem
  • Site Rom Gaa Kọlọsi
  • Nlekọta n’Ọrụ Ndị Dị Anya
  • Ị Ga-enyeliri Ndị Ọzọ Aka, Mee Ka Ha Dị Ike
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Ndị Ha na Pọl Rụkọrọ Ọrụ—Hà Bụ Ole Ndị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Na-eje Ije n’Ụzọ Jehova
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Bụrụ Onye A Ga-atụkwasịli Obi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 7/15 p. 7-8

Tikikọs—Ohu Ibe A Tụkwasịrị Obi

N’OGE dị iche iche, Tikikọs so Pọl onyeozi mee njem ma jee ozi dị ka onye na-ejere ya ozi. Ọ bụ onye ozi nke a pụrụ itinye ego na ibu ọrụ nlekọta dị iche iche n’aka. Ebe ọ bụ na Akwụkwọ Nsọ na-eme ka ọ pụta ìhè na ọ bụ onye a pụrụ ịtụkwasị obi—bụ́ àgwà dị ndị Kraịst nile oké mkpa—ikekwe ọ ga-amasị gị ịmakwu banyere ya.

Pọl kọwara Tikikọs dị ka ‘nwanna ya ọ hụrụ n’anya, bụrụkwa onye kwesịrị ntụkwasị obi n’ije ozi, bụrụkwa ohu ibe ya n’ime Onyenwe anyị.’ (Ndị Kọlọsi 4:7) N’ihi gịnị ka onyeozi ahụ ji lee ya anya n’ụzọ dị otú ahụ?

Ozi Enyemaka Gaa Jerusalem

Mkpa ihe onwunwe bilitere n’etiti ndị Kraịst bi na Judia n’ihe dị ka 55 O.A. Site n’enyemaka nke ọgbakọ ndị dị na Europe na Asia Minor, Pọl haziri ntụkọta ihe iji nyere ha aka. Tikikọs, bụ́ onye si n’ógbè Esia, keere òkè n’ozi enyemaka ahụ.

Mgbe o nyesịrị ntụziaka n’otú a ga-esi elekọta ụtụ a, Pọl tụrụ aro ka e ziga ndị ikom a pụrụ ịtụkwasị obi na Jerusalem ma ọ bụ ka ha soro ya gaa ebe ahụ, na-ebu ihe ndị ahụ a tụtara. (1 Ndị Kọrint 16:1-4) Mgbe ọ malitere n’ogologo njem ahụ site na Gris gaa Jerusalem, ụfọdụ ndị ikom sonyeere ya, ihe àmà na-egosi na otu n’ime ha bụ Tikikọs. (Ọrụ 20:4) Ìgwè buru ibu otú ahụ pụrụ ịdịworị mkpa n’ihi na ha bu ego ọtụtụ ọgbakọ nyefere ha. Mkpa inwe nchebe pụrụ ịbụworị ihe pụtara ìhè kpatara ya, ebe ọ bụ na ndị na-apụnara mmadụ ihe adịghị ekwe ka a gafee n’udo.—2 Ndị Kọrint 11:26.

Ebe ọ bụ na Aristakọs na Trọfimọs so Pọl gaa Jerusalem, ụfọdụ na-eche na o yiri ka Tikikọs na ndị ọzọ ahụ mekwara otú ahụ. (Ọrụ 21:29; 24:17; 27:1, 2) Ebe ọ bụ na Tikikọs so rụọ ọrụ inyeaka a, ọ bụ otu n’ime ụfọdụ ndị a tụrụ aro ịbụ “nwanna” ahụ so Taịtọs rụọ ọrụ na Gris iji dokwaa ntụkọta ihe ahụ, bụrụkwa onye ‘nzukọ Kraịst nile họpụtara ka ọ na-eso Pọl n’ije ije n’amara nke a.’ (2 Ndị Kọrint 8:18, 19; 12:18) Ọ bụrụ na ọrụ mbụ Tikikọs rụzuru bụ nke chọrọ onye a pụrụ ịtụkwasị obi, nke abụọ ya adịghị ala karịa nke ahụ.

Site Rom Gaa Kọlọsi

Afọ ise ma ọ bụ isii n’ihu (60-61 O.A.), Pọl nọ na-atụ anya ịbụ onye a tọhapụrụ site ná mkpọrọ mbụ ya na Rom. Tikikọs nọnyeere ya, ọtụtụ narị kilomita site n’ụlọ. Ugbu a Tikikọs na-alaghachi n’Esia. Nke a mere ka Pọl nwee ike izigara ndị Kraịst nọ n’ógbè ahụ akwụkwọ ozi na izighachi ohu Faịlimọn gbara ọsọ, bụ́ Ọnisimọs, na Kọlọsi. Tikikọs na Ọnisimọs ji ma ọ dịkarịa ala akwụkwọ ozi atọ ndị e denyere ugbu a n’ime Bible—otu nye ndị Efesọs, otu nye ndị Kọlọsi, na otu nye Faịlimọn. Ọ pụrụ ịbụworị na e nyekwara ọgbakọ dị na Leọdisia otu akwụkwọ ozi, bụ́ obodo ukwu dị ihe dị ka kilomita 18 site na Kọlọsi.—Ndị Efesọs 6:21; Ndị Kọlọsi 4:7-9, 16; Faịlimọn 10-12.

Tikikọs abụghị nnọọ onye na-ekesa akwụkwọ ozi nkịtị. Ọ bụ onye na-ejere mmadụ ozi a tụkwasịrị obi, n’ihi na Pọl dere, sị: “Mmadụ nke ga-eme ka unu mara ihe nile banyere mụ onwe m bụ Tikikọs, onye bụ́ nwanna anyị ahụ a hụrụ n’anya, bụrụkwa onye kwesịrị ntụkwasị obi n’ije ozi, bụrụkwa ohu ibe m n’ime Onyenwe anyị: onye m na-ezitere unu ime ihe a, ka unu wee mara otú ihe na-agara anyị, ka o wee kasiekwa obi unu.”—Ndị Kọlọsi 4:7, 8.

Ọkà mmụta bụ́ E. Randolph Richards na-akọwa na onye na-ekesa akwụkwọ ozi “na-abụkarị onye na-ejikọ onye dere ihe na ndị e deere ya tụkwasị ná njikọ dị n’ihe e dere ede. . . . [Otu ihe mere] e ji achọ onye a pụrụ ịtụkwasị obi ga-eji ya gaa bụ [na] ọ na-ejikarị ihe ọmụma ntụkwasị. Akwụkwọ ozi pụrụ ịkọwa otu ọnọdụ n’ụzọ dị nkenke, na-abụkarị n’ụzọ onye dere ya si hụ ya, ma a na-atụ onye ji ya aga anya n’aka ịkọwara onye ahụ e deere ya ihe ọmụma nile.” Ọ bụ ezie na akwụkwọ ozi pụrụ ịbụ nke na-ezi ihe ma ọ bụ na-ekwu banyere okwu ndị chọrọ ime ihe ngwa ngwa, onye ozi a tụkwasịrị obi ga-ezi ihe ndị ọzọ n’ọnụ.

Akwụkwọ ozi ndị ahụ e degaara ndị Efesọs, ndị Kọlọsi, na Faịlimọn na-ekwu ihe dị nta banyere otú ihe si agara Pọl. Ya mere Tikikọs aghaghị inye ihe ọmụma onwe onye, kọwaa ọnọdụ Pọl na Rom, ghọtakwa ọnọdụ ndị dị n’ọgbakọ ndị ahụ nke ọma iji nwee ike inye agbamume. Ọ bụ nanị ndị a pụrụ ịdabere na ha ịnọchite anya onye zigara ha n’ụzọ ikwesị ntụkwasị obi ka e nyefere ozi na ibu ọrụ ndị dị otú a. Tikikọs bụ nwoke dị otú ahụ.

Nlekọta n’Ọrụ Ndị Dị Anya

Mgbe a tọhapụsịrị ya n’ojiji e ji ya n’ime ụlọ ya na Rom, Pọl chere echiche izipụ Tikikọs ma ọ bụ Atemas gakwuru Taịtọs n’àgwàetiti Krit. (Taịtọs 1:5; 3:12) N’oge ịtụ mkpọrọ nke abụọ Pọl na Rom (ma e leghị anya n’ihe dị ka 65 O.A.), onyeozi ahụ zigara Tikikọs ọzọ n’Efesọs, ikekwe iji nọchie anya Timoti, bụ́ onye pụrụ imezi njem iji nọnyere Pọl.—2 Timoti 4:9, 12.

O doghị anya ma Tikikọs ọ̀ gara ma Krit ma Efesọs n’oge a. Ka o sina dị, izo aka ndị dị otú a na-enye echiche na ọ nọgidere dị ka otu n’ime ndị ha na Pọl kpachiri anya ruo afọ ndị ikpeazụ nke ozi onyeozi ahụ. Ọ bụrụ na Pọl nọ na-eche banyere iziga ya n’ozi ndị chọrọ onye a pụrụ ịtụkwasị obi na ma e leghị anya sie ike n’ọnọdụ Timoti na Taịtọs, o doro anya na Tikikọs aghọwo onye Kraịst tozuru okè bụ́ onye nlekọta. (Tụlee 1 Timoti 1:3; Taịtọs 1:10-13.) Ịdị njikere ya ime njem na ịbụ onye e ji eme ihe n’ọrụ ndị dị anya mere ka ọ baara Pọl na ọgbakọ ndị Kraịst n’ozuzu ya uru.

Taa, ndị Kraịst na-achụ onwe onye n’àjà ji ọchịchọ obi na-ejere Chineke ozi n’ọgbakọ dị iche iche nke Ndịàmà Jehova ma ọ bụ nye onwe ha iji kwalite ọdịmma Alaeze n’ebe ọzọ. Ọtụtụ puku ejiriwo ọṅụ nakwere ọrụ dị ka ndị ozi ala ọzọ, ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị, ndị ozi nke mba nile n’ihe owuwu, n’isi ụlọ ọrụ ụwa nke Watch Tower Society, ma ọ bụ n’otu n’ime alaka ya dị iche iche. Dị ka Tikikọs, ha abụghị ndị a ma ama, ma ha bụ ndị na-arụsi ọrụ ike, ‘ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’ije ozi’ bụ́ ndị ihe ha na-amasị Chineke ma bụrụ ndị ndị Kraịst ndị ọzọ hụrụ n’anya dị ka ‘ndị ohu ibe ha n’ime Onyenwe anyị,’ bụ́ ndị a pụrụ ịtụkwasị obi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya