Ọdịnihu Dị Aṅaa Ka Ị Chọrọ Ka Ụmụ Gị Nwee?
Ị̀ NA-ELE ụmụ gị anya dị ka ihe nketa bara oké uru? (Abụ Ọma 127:3) Ka ị̀ na-ele ọzụzụ ha anya dị ka ibu arọ n’ụzọ ego nke a na-ejighị n’aka ma a ga-enwe ihe ịga nke ọma na ya? Kama iweta uru ego, ịzụ ụmụ na-efu ego ruo mgbe ha pụrụ ịkwado onwe ha. Dị nnọọ ka ilekọta akụ̀ e ketara eketa na-achọ ezi atụmatụ, otú ahụ ka ịzụ ụmụ n’ụzọ na-aga nke ọma dịkwa.
Nne na nna na-ahụ n’anya na-achọ inye ụmụ ha mmalite dị mma ná ndụ. Ọ bụ ezie na ihe ọjọọ dị iche iche na-agbawa obi pụrụ ime n’ụwa a, ndị nne na nna pụrụ ime ihe dị ukwuu iji chebe ụmụ ha. Tụlee ihe banyere Werner na Eva, bụ́ ndị e hotara n’isiokwu bu ụzọ.a
Mgbe Nne na Nna Na-ahụ n’Anya n’Ezie
Werner na-akọ na kama inwe àgwà nke ọ gbasaghị m, nne na nna ya gosiri ezi mmasị n’ihe na-eme n’ụlọ akwụkwọ. “Enwere m nnọọ ekele nke ukwuu maka aro ndị bara uru ha tụụrụ m, enwekwara m mmetụta na ha lekọtara m anya ma na-akwado m. Dị ka nne na nna, ha kwụsiri nnọọ ike n’ihe, ma amaara m na ha bụ ezi ndị enyi m.” Mgbe Eva nwekwara mgbakasị ahụ n’ihi ọrụ ụlọ akwụkwọ ya nke na ọ dara mba n’obi, nweekwa nsogbu ihi ụra, nne na nna ya, bụ́ Francisco na Inez, tinyekwara oge dị nnọọ ukwuu soro ya kwurịta okwu ma nyere ya aka inwetaghachi nguzozi uche na nke ime mmụọ.
Olee otú Francisco na Inez si chọọ ichebe ụmụ ha ma kwadebe ha maka ndụ dị ka ndị toworo eto? Site n’oge ụmụ ahụ bụ ụmụ ọhụrụ, nne na nna a na-ahụ n’anya na-eme ka ha kere òkè n’ihe omume kwa ụbọchị ha. Kama ịdị na-esonyere nanị ndị enyi ha toworo eto, Inez na Francisco na ụmụ ahụ na-eso n’ebe ọ bụla ha na-aga. Dị ka nne na nna na-ahụ n’anya, ha nyekwara nwa ha nwoke na nwa ha nwanyị ezi nduzi. Inez na-ekwu, sị: “Anyị kụziiri ha ilekọta ụlọ, ịghara imefusị ego, na ilekọta uwe ha. Anyị nyekwaara nke ọ bụla n’ime ha aka ịhọrọ ọrụ na ime ka ibu ọrụ na ihe ime mmụọ ha kwekọọ.”
Lee ka o si dị mkpa ịmara ụmụ gị na inye ha nduzi nne na nna! Ka anyị nyochaa akụkụ atọ ị pụrụ ime nke a: (1) Nyere ụmụ gị aka ịhọrọ ụdị ọrụ ego kwesịrị ekwesị; (2) kwadebe ha ịnagide nrụgide mmetụta uche n’ụlọ akwụkwọ na n’ebe ọrụ; (3) gosi ha otú ha ga-esi gboo mkpa ime mmụọ ha.
Nyere Ha Aka Ịhọrọ Ọrụ Kwesịrị Ekwesị
Ebe ọ bụ na ọrụ ego mmadụ abụghị nanị ọnọdụ ego ya ka ọ na-emetụta kamakwa ọ na-ewepụ ihe dị ukwuu n’oge ya, ezi ịzụ ụmụ na-agụnye ịtụle mmasị na ikike nke nwa nke ọ bụla. Ebe ọ bụ na ọ dịghị onye ọ bụla nke nwere akọ na uche na-achọ ịbụ ibu arọ nye ndị ọzọ, ndị nne na nna kwesịrị ichesi echiche ike banyere otú a pụrụ isi kwadebe nwa ha ịkwado onwe ya na ezinụlọ ya. Ọ̀ ga-adị nwa gị nwoke ma ọ bụ nwa gị nwanyị mkpa ịmụ ọrụ aka iji bie ndụ dị mma? Dị ka nne ma ọ bụ nna na-ahụ n’anya n’ezie, gbalisie ike mgbe nile inyere nwa gị aka ịzụlite àgwà ndị dị ka ọchịchọ ịrụsi ọrụ ike, ịdị njikere ịmụ ihe, na ikike nke isoro ndị ọzọ na-emekọrịta ihe n’ụzọ dị mma.
Tụlee Nicole. Ọ na-asị: “Nne na nna m mere ka m soro ha n’ọrụ mkpocha ha. Ha tụrụ aro ka m na-enye pasent ụfọdụ nke ihe m na-arụta maka mmefu nke ezinụlọ ma debe ihe fọdụrụnụ maka mmefu ma ọ bụ nchekwa nke m. Nke a nyere m echiche dị ukwuu nke ibu ọrụ nke mesịrị baara m nnọọ uru ná ndụ.”
Okwu Chineke, bụ́ Bible, akapịghị ọnụ ụdị ọrụ ego mmadụ kwesịrị ịhọrọ. Ma ọ na-enye ụkpụrụ nduzi ndị bara uru. Dị ka ihe atụ, Pọl onyeozi sịrị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla achọghị ịrụ ọrụ, ya gharakwa iri ihe.” N’idegara ndị Kraịst nọ na Tesalọnaịka akwụkwọ, o kwukwara, sị: “Anyị nụrụ okwu banyere ụfọdụ ndị na-adịghị agazi ije n’etiti unu, ndị na-adịghị arụ ọrụ ọ bụla, kama ha na-etinye aka n’ọrụ nke na-abụghị nke aka ha. Ma ndị dị otú a ka anyị na-enye iwu na-arịọkwa arịrịọ n’ime Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, ka ha were nwayọọ na-arụ ọrụ, riekwa nri nke aka ha.”—2 Ndị Tesalọnaịka 3:10-12.
Ma, inweta ọrụ na-ịkpata ego abụghị nanị ihe a chọrọ ná ndụ. Ndị nwere oké ọchịchọ yiri ka ha ga-emesị ghọọ ndị na-enweghị afọ ojuju, ha pụkwara ịchọpụta na ha ‘na-achọ ijide ifufe.’ (Eklisiastis 1:14) Kama ịdị na-agba ụmụ ha ume ịchụso ịbụ ndị a ma ama na ịba ọgaranya, ndị nne na nna na-eme nke ọma inyere ha aka ịhụ amamihe dị n’okwu Jọn onyeozi ndị sitere n’ike mmụọ nsọ Chineke: “Unu ahụla ụwa, ma ọ bụ ihe nke dị n’ụwa, n’anya. Ọ bụrụ na onye ọ bụla ahụ ụwa n’anya, ịhụnanya nke Nna anyị adịghị n’ime ya. N’ihi na ihe nile nke dị n’ụwa, bụ́ agụụ ihe ọjọọ nke anụ ahụ, na agụụ ihe ọjọọ nke anya, na oké okwu nke ibi obi, esiteghị ná Nna anyị, kama o sitere n’ụwa. Ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye na-eme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Jọn 2:15-17.
Olee Otú Ị Pụrụ Isi Gboo Mkpa Mmetụta Uche Ha?
Dị ka nne ma ọ bụ nna, gịnị ma ị dị ka onye na-azụ ndị na-eme egwuregwu? Ọ dịghị elekwasị anya nanị n’ịzụnye n’ime ndị ahụ na-eme egwuregwu bụ́ ndị ọ na-elekọta ikike nke ịgbasikwu ọsọ ike ma ọ bụ ịwụga n’ebe dị anya karị. Ikekwe, ọ na-agbalịkwa inyere ha aka imeri àgwà ọ bụla na-ezighị ezi, si otú ahụ na-ewusi ikike nke mmetụta uche ha ike. N’ọnọdụ gị, olee otú ị pụrụ isi na-agba ume, na-ewuli elu, ma na-akwali ụmụ gị?
Tụlee Rogério, onye na-eto eto dị afọ 13. E wezụga obi erughị ala n’ihi mgbanwe nke ahụ, o nwere nrụgide mmetụta uche n’ihi adịghị n’otu nke nne na nna ya nakwa elebaraghị ya anya. Gịnị ka a pụrụ imere ndị na-eto eto dị ka ya? Ọ bụ ezie na ọ pụghị ikwe mee izobe ụmụ gị pụọ ná nchegbu na ajọ mmetụta nile, adala mbà n’ọrụ gị dị ka nne ma ọ bụ nna. N’abụghị onye na-echebebiga nwa gị ókè, jiri nghọta dọọ nwa gị aka ná ntị, na-echeta mgbe nile na nwa nke ọ bụla pụrụ iche. Site n’igosi obiọma na ịhụnanya, ị pụrụ ime ihe dị ukwuu ime ka onye na-eto eto nwee mmetụta nke ịnọ ná nchebe. Nke a ga-enyekwara ya aka izere itolite n’enweghị obi ike na ùgwù onwe onye.
N’agbanyeghị otú nne na nna nke gị si nwee ihe ịga nke ọma n’igbo mkpa mmetụta uche gị, ihe atọ pụrụ inyere gị aka inwe ọganihu dị ka ezi nne ma ọ bụ nna na-enye aka: (1) Zere ịbụ onye ihe isi ike ndị nke gị rikpuru nke na ị na-elefuru nsogbu nke ụmụ gị anya bụ́ ndị yiri ka ha dị nta; (2) gbalịa isoro ha na-enwe nkwurịta okwu dị ụtọ ma baa uru kwa ụbọchị; (3) kwalite àgwà ziri ezi metụta otú e si edozi nsogbu na otú e si emeso ndị mmadụ ihe.
N’ileghachi anya azụ mgbe ọ nọ n’afọ iri na ụma, Birgit na-ekwu, sị: “Aghaghị m ịmụta na ị pụghị ịgbanwe ndị mmadụ ịbụ ihe ị chọrọ ka ha bụrụ. Nne m so m tụgharịa uche na ọ bụrụ na m ahụ ihe na-amasịghị m n’ebe ndị ọzọ nọ, ihe m pụrụ ime bụ izere ịdị ka ha. O kwukwara na oge kasị mma ịgbanwe ụzọ m ga-abụ mgbe m ka na-eto eto.”
Ma, ụmụ gị chọrọ ihe karịrị ọrụ na mmetụta uche dị jụụ. Jụọ onwe gị, ‘Ana m ele ịzụ ụmụ anya dị ka ibu ọrụ Chineke nyere?’ Ọ bụrụ na ị na-eme otú ahụ, ị ga-achọ ilekọta mkpa ime mmụọ nke ụmụ gị.
Ụzọ Dị Iche Iche Isi Gboo Mkpa Ime Mmụọ Ha
N’Ozizi Elu Ugwu ya, Jisọs Kraịst sịrị: “Ngọzi na-adịrị ndị [maara mkpa ime, NW] mmụọ ha: n’ihi na alaeze nke eluigwe bụ nke ndị ahụ.” (Matiu 5:3) Gịnị ka igbo mkpa ime mmụọ gụnyere? Ụmụaka na-erite uru dị ukwuu mgbe nne na nna na-esetịpụ ezi ihe nlereanya n’igosipụta okwukwe n’ebe Jehova Chineke nọ. Pọl onyeozi dere, sị: “A sị na okwukwe adịghị ọ bụ ihe a na-apụghị ime, bụ́ ime ihe ga-atọ Chineke ezi ụtọ: n’ihi na onye na-abịakwute Chineke aghaghị ikwe na Ọ dị, na Ọ na-egosikwa Onwe ya Onye na-enyeghachi ndị na-achọ Ya ụgwọ ọrụ.” (Ndị Hibru 11:6) Otú ọ dị, ka okwukwe wee nwee ezi ihe ọ pụtara, ekpere dị mkpa. (Ndị Rom 12:12) Ọ bụrụ na ị mata mkpa ime mmụọ nke gị, ị ga-achọ nduzi Chineke, dị ka nna nke nwa ahụ ghọrọ Samson Onyeikpe a ma ama n’Israel, mere. (Ndị Ikpe 13:8) Ị gaghị ekpe nanị ekpere kamakwa ị ga-agakwuru Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible, maka enyemaka.—2 Timoti 3:16, 17.b
N’agbanyeghị ọrụ nile siri ike nke inye ezi nduzi, nkwado mmetụta uche, na enyemaka ime mmụọ gụnyere, ịzụ ụmụ pụrụ ịbụ ihe na-enyeghachi ụgwọ ọrụ. Otu nna ji ụmụ abụọ na Brazil kwuru, sị: “Apụghịdị m iche n’echiche ịbụ onye na-enweghị ụmụ m. E nwere ihe ọma dị ukwuu anyị pụrụ isoro ha kerịta.” N’ịkọwa ihe mere ụmụ ahụ ji na-eme nke ọma, nne ha na-agbakwụnye, sị: “Anyị na-anọkọ ọnụ mgbe nile, anyị na-agbalịkwa ime ka ihe na-akpali akpali ma dị ụtọ. Nke kasịkwa mkpa, anyị na-ekpere ụmụ anyị ekpere mgbe nile.”
Priscilla na-echetaghachi ịhụnanya na ndidi nke nne na nna ya gosiri ya mgbe ọ bụla o nwere nsogbu. “Ha bụ ezigbo ndị enyi m ma nyere m aka n’ihe nile,” ka ọ na-ekwu. “Dị ka nwatakịrị, ana m enwe mmetụta n’ezie na a na-emeso m dị ka ‘ihe nketa nke [si] n’aka Jehova bịa.’” (Abụ Ọma 127:3) Dị ka ọtụtụ nne na nna ndị ọzọ, gịnị ma i soro ụmụ gị dokwaa oge ka unu nwee ike ịgụkọ Bible na mbipụta ndị Kraịst ọnụ? Ịnọ na gburugburu ebe dị mma na-atụle ihe ndekọ na ụkpụrụ Bible dị iche iche pụrụ inyere ụmụ gị aka inwe obi ike na inwe ezi olileanya maka ọdịnihu.
Mgbe Ụmụaka Nile Ga-anọ ná Nchebe
Ọ bụ ezie na ọdịnihu na-eyi ihe olileanya na-adịghị na ya nye ọtụtụ ụmụaka taa, Okwu Chineke na-emesi obi ike na ụwa ga-abụ ebe obibi dị nchebe nye ihe a kpọrọ mmadụ n’isi nso. Cheedị banyere mgbe ndị nne na nna na-agaghị echegbu onwe ha banyere nchebe nke ụmụ ha n’ụwa ọhụrụ Chineke kwere ná nkwa! (2 Pita 3:13) Gbalịa iji anya nke uche gị hụ mmezu dị ebube nke amụma a: “Anụ ọhịa wolf na nwa atụrụ ga-anọkwa, agụ na nwa ewu ga-amakpukọkwa; nwa ehi na nwa ọdụm na nwa anụ e mere ka ọ maa abụba ga-adịkwa n’otu ebe; nwatakịrị ga na-edukwa ha.” (Aịsaịa 11:6) Ọbụna taa, ịnọ ná nchebe ime mmụọ a kọwara n’okwu ndị a na-enwe mmezu ihe atụ n’etiti ndị na-ejere Jehova ozi. N’etiti ha, ị ga-enwe mmetụta nke nlekọta ịhụnanya Chineke. Ọ bụrụ na i gosipụta ịhụnanya n’ebe Chineke nọ, ị pụrụ inwe obi ike na ọ na-aghọta mmetụta ndị ị na-enwe dị ka nne ma ọ bụ nna, ọ ga-enyekwara gị aka ịnagide nchegbu na ọnwụnwa ndị pụrụ ịbịara gị. Mụọ Okwu ya ma tụkwasị olileanya gị n’Alaeze ya.
Nyere ụmụ gị aka ịnọ n’ụzọ na-eduga ná ndụ ebighị ebi site n’isetịpụ ezi ihe nlereanya. Ọ bụrụ na i zobe onwe gị n’ebe Jehova Chineke nọ, ọdịnihu gị na nke ụmụ gị ga-agabiga atụmanya gị nile. Ị pụrụ inwe otu ụdị obi ike ahụ ọbụ abụ ahụ nwere bụ́ onye bụrụ, sị: “Ka ihe Jehova tọọkwa gị ụtọ; Ọ ga-enyekwa gị ihe nile obi gị na-arịọ.”—Abụ Ọma 37:4.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a E ji aha nnọchianya mee ihe n’isiokwu a.
b Lee isi nke 5 ruo 7 n’akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.