Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chebe Ụmụ Gị?
MGBE ọ gụsịrị akwụkwọ n’otu ụlọ akwụkwọ dị n’ógbè ha ruo ọtụtụ afọ, Wernera na ihe dị ka ndị na-eto eto 3,000 ndị ọzọ bidoro ọmụmụ akwụkwọ dị elu na São Paulo, Brazil. Na nke mbụ ya, ọ hụrụ ụmụ akwụkwọ ibe ya ka ha na-ere ma jiri ajọ ọgwụ na-eme ihe. N’ịbụ onye nwere obere ahụ, n’oge na-adịghị anya, ọ ghọrọ onye ụmụ akwụkwọ ndị tọrọ ya tinyere n’ememe nnabata na-eweda n’ala ma dị ize ndụ.
Nwanne nwanyị Werner, bụ́ Eva nwekwara nsogbu. N’ịchọ ime ike ya nile, ọ mụsiri nnọọ ihe ike nke na o nwere oké ike ọgwụgwụ na mkpaghasị uche. Dị ka ndị ọzọ nọ n’oge uto, ma nchebe anụ ahụ ma nke uche dị Werner na Eva mkpa. Enyemaka dị aṅaa dị ụmụ gị mkpa? Olee otú ị pụrụ isi kwadebe ha maka ndụ dị ka ndị toworo eto? N’ezie, ọdịnihu dị aṅaa ka ị chọrọ ka ụmụ gị nwee?
Ha Chọrọ Ihe Karịrị Ihe E Ji Ebi Ndụ
Chee echiche nwa oge banyere ihe ịma aka ndị nne na nna na-eche ihu n’ichebe ụmụ ha taa. N’ihi ndalata n’ọdịdị nke ndụ ezinụlọ na mmụba nke ịda ogbenye, n’ọtụtụ ala ọnụ ọgụgụ ụmụaka ndị na-ebi n’okporo ámá na-arị elu. Iji ụmụaka mere ọdibo bụ ihe echebeghị ndị na-eto eto site ná nrigbu na-eweta. Iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi na-ebibikwa ọtụtụ ndị na-eto eto. Dị ka ihe atụ, mgbe otu onye Brazil nọ n’afọ iri na ụma ghọrọ onye ọgwụ ọjọọ riri ahụ, udo pụrụ n’ụlọ ya. E wezụga mkpaghasị uche nke nne na nna ya nwere, e nwere ọgụ na mgba nke inweta ego a ga-eji mee ka ọ gbakee, ndị na-ere nicotine obi tara mmiri bịara n’ụlọ ha sị ka ọ kwụọ ụgwọ o ji ha.
Otú ọ dị, n’agbanyeghị nrụgide nke ndụ, ọtụtụ ndị nne na nna na-anọgide n’ọgụ na mgba nke ọ bụghị nanị inye ụmụ ha nri, uwe, na ebe obibi kamakwa ichebe ha pụọ n’ime ihe ike, iji ọgwụ eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, na nsogbu ndị ọzọ. Nke a bụ mgbalị magburu onwe ya, ma ò zuru ezu? Gịnị banyere nchebe pụọ ná mmerụ ahụ uche na nke ime mmụọ? Ọtụtụ na-aghọta na ịzụ ụmụ n’ụzọ na-aga nke ọma na-agụnye ịgbaso ihe ịma aka ndị na-agụnye ime nhọrọ ndị enyi na ntụrụndụ nke ụmụ ha mgba. Ma, olee otú ndị nne na nna pụrụ isi zere ichebebiga ókè ma ọ bụ ịnakwerebiga ihe ọ bụla ókè? A na-akpọ gị òkù ịtụle azịza ndị dị n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a E ji aha nnọchianya mee ihe n’isiokwu a.