Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyi Na-ajụ
◼ N’ihi gịnị ka New World Translation jị sụgharịa okwu Hibru ahụ bụ ‘a-rum’ nke dị na Jenesis 3:1 dị ka “dị akọ” ebe nsụgharị Bible ndị ọzọ na-asị “dị aghụghọ” ma ọ bụ “dị garagara”?
Akụkụ Akwụkwọ nsọ ahụ na-agụ, sị: “Ugbu a, agwọ ahụ gosiri onwe ya ịbụ nke dị akọ karịsịa anụ ọhịa nile ọ bụla nke Jehova Chineke meworo. O wee malite ịgwa nwanyị ahụ, si: ‘Ọ̀ bụ otú ahụ n’ezie na Chineke sịrị na unu agaghị eri mkpụrụ sitere n’osisi ọ bụla nke ubi ahụ?’“—NW.
N’llu 12:23 na n’ebe ndị ọzọ. New World Translation na-asụgharị okwu Hibru ahụ bụ ‘a-rum’ dị ka “maara ihe,” nke bụ otu n’ime ihe ndị bụ isi okwu ahụ pụtara mgbe e ji ya mee ihe banyere ụmụ mmadụ. Ma dị ka ọ dịkwa n’ihe banyere ọtụtụ okwu dị iche iche, ‘a-rum’ nwere ihe dị iche iche ọ pụtara. Dị ka ihe atụ, Benjamin Davidson na-akọwa ‘a-rum’ n’ụzọ dị otú a: “I. nkà, aghụghọ, nzuzo.—ll. ezi uche, dị akọ”— The Analytical Hebrew and Chaldee Lexicon.
Ya mere, n’ihi gịnị ka New World Translation ji họrọ nkọwa nọ n’ọnọdụ nke abụọ, bụ “dị akọ” na Jenesis 3:1? Nhọrọ ahụ kwekọrọ ná nsụgharị ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, mgbe a sụgharịrị Jenesis 3:1 gaa n’asụsụ Grik ná mbipụta Septuagint nke narị afọ nke atọ T.O.A. ejiri okwu ahụ bụ phro’ni-mos mee ihe—bụ otu okwu ahu e mesịrị jiri mee ihe na Matiu 10:16: “Unu aghaghị ịbụ ndị dị akọ dị ka agwọ, dịrịkwa nwayọọ dị ka nduru.”—Today’s English Version.
Onye ọkà mmụta ihe banyere ndị Hibru bụ́ Ludwig Koehler kwuru laa azụ na 1945, sị: “Agwọ na-eme ihere. A pụrụ ịkọwa nke a nke ọma n’asụsụ Grik n’okwu ahụ bụ phronimos, n’ihi na site n’ime ihere ma ọ bụ iji akọ mee ihe n’ụzọ dị otú a, agwọ ahụ na-egosipụta na o nwere, na-ejikwa phrenes na-eme ihe.” N’ebe a, phre’nes pụtara ụdị amamihe e bụ pụta ụwa nke anụmanụ ndị ọzọ na-egosipụtakwa.—Tụlee Ilu 30:24.
Otú ọ dị, e nwere ihe ka mkpa mere e ji jiri okwu ahụ bụ “dị akọ” mee ihe kama ịbụ “maara ihe” ma ọ bụ “dị garagara” na Jenesis 3:1.Ọ bụrụ na e kwụọ n’ebe a na agwọ ahụ dị garagara kpọmkwem tupu a kọwaa ya dị ka nke rafuru Iv ime mmehie, ọ pụrụ iduje ọtụtụ ndị na-agụ ya gaa n’ikwubi na Bible na-egosipụta na ọ bụ agwọ nkịtị chepụtara atụmatụ nke a n’ihi ịdị garagara pụrụ iche nke ya onwe ya nwere. Nkọwa dị otú ahụ ga-eme ka ihe ndekọ ahụ yie nnọọ akụkọ ifo—bụrụkwa akụkọ ifo nke dị nnọọ nzuzu.
Kama nke ahụ, Bible na-akụzi na e nwere ihe dị nnọọ ukwuu karia agwọ dị garagara nke na-eme ihe n’ebe ahụ n’ogige Iden. Mkpughe 12:9 mere ka a mata Setan bụ Ekwensu n’ụzọ doro anya dị ka “agwọ ochie” ahụ. Ọ bụ ya bụ ike a na-adịghị ahụ anya nke karịrị ike mmadụ nke na-eduzi anụ ahụ dị ala nke na-akpụ akpụ n’ụzọ onye bụ ọkà n’ịgbanwegharị ụda olu ya si eduzi ihe a kpụrụ akpụ ndị o ji na-eme ihe. Akọ agwọ bụ pụta ụwa mere ka ọ bụrụ ihe kwesịrị nnọọ ekwesị ịhọrọ iji mezuo ihe aghụghọ nke ahụ. Mgbe ọ na-emeghị ihere wee pụọ dị ka o si emebu kama nwee anya ike imeghe ọnụ ya wee malite ịgwa Iv okwu, ọ dọọrọ mmasị Iv n’ụzọ dị irè ọbụna karị.
Okwu Chineke nke sitere n’ike mmụọ ya enweghị akụkọ ifo ọ bụla n’ime ya, sitekwa n’ime nsụgharị ziri ezi, New World Translation na-enyere anyị aka ịghọta eziokwu nke a.—2 Timoti 3:16.
◼ Ebe Ndịàmà jehova matara na ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla, n’ihi gịnị ka ha ji chee na ọ dị mkpa ime ememe ili ozu nke ndị kwere ekwe ibe ha?
Ezi ihe ọmụma sitere na Bible banyere ọnọdụ nke ndị nwụrụ anwụ na-echebe Ndịàmà Jehova pụọ n’inwe àgwà na-ezighị ezi na n’ihe omume amamihe na-adịghị na ha ndị pụrụ isi na ha pụta n’oge ememe ili ozu. Ọ na-enyekwa ha ihe mere ha ga-eji jee ememe ili ozu nke ndị Kraist.
Okwu Chineke na-egosi ’n’ụzọ doro anya na mgbe mmadụ nwụrụ, ọ dịghị anọgide na-adị ndụ dị ka mkpụrụ obi nke na-adịghị anwụ anwụ. (Eklisiastis 9:5) Mgbe mmadụ nwụsịrị, anụ ahụ ya na-alaghachi n’ala, ma ọ bụ site n’ire ure nkịtị ma ọ bụ n’ịbụ nke e suru ọkụ. Onye ahụ nwụrụ anwụ adịghịkwa ndụ ọzọ; ọ ga-adịghachi ndụ ọzọ nanị ma ọ bụrụ na Chineke akpọlite ya n’ọnwụ n’ọdịnihu,—Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15.
Ya mere, Ndịàmà Jehova adịghị agbaso omenala ili ozu ndị dabeere na nkwenkwe ahụ nke bụ na onye nwụrụ anwụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ, nke na-anọgide na-adị ndụ n’ebe ọzọ. Ha adịghị ekere òkè n’ịmụrụ ozu anya, na-agụ abụ, na-etikwa mkpu n’olu dara ụda iji menye “ndị mmụọ” egwu, ma ọ bụkwanụ ’n’ịmụ anya ogologo abalị nile ma ọ bụ n‵iru újú gabiga ókè, bụ nke e bụ n’uche iji mee onye ahụ nwụrụ anwụ obi ụtọ.
Otú ọ dị, nke a apụtaghị na ndị Chineke adịghị eru újú. Ọnwụ nke onye ikwu ma ọ bụ ezi enyi bụ ahụmahụ na-eweta mwute, ọbụna nye ndị na-efe ezi ofufe, bụ́ ndị nwere ezi ihe ọmụma banyere ndị nwụrụ anwụ. Dị ka ihe atụ, mgbe Jekọb chere na anụ ọhịa adọgbuwo Josef, nna ochie ahụ “ruuru nwa ya újú ọtụtụ ụbọchị.” Anyị na-agụ na “ụmụ ya ndị ikom nile na ụmụ ya ndị inyom nile wee bilie ịkasi ya obi.” (Jenesis 37:33-35) Mgbe Jekọb onye kwesịrị ntụkwasị obi nwụrụ, Josef “[nyere] ndị ohu ya, bụ ndị dibia, iwu ịgbasi ozu nna ya,” “ndị Ijipt wee kwaara ya ákwá [iri ụbọchị asaa].” Ọ bụ ezie na ezinụlọ Jekọb ekwereghị n’echiche ụgha nke ndị Ijipt banyere ndị nwụrụ anwụ, o doro anya na ọnwụ Jekọb metụrụ ha n’ahụ. “Ụlọ Josef nile, na ụmụnne ya” chọrọ ka e lie Jekọb olili dị mma, ọbụna ndị nọ n’èzí pụrụ ịhụta na ha na-eru újú.—Jenesis 50:1-11.
A pụrụ ihota ọtụtụ ihe nlereanya ndị ọzọ ebe ndị ohu Jehova nwere mmetụta site n’ọnwụ nke onye ha na ya na-efekọ ofufe ma ọ bụ onye ikwu ha, ha wee ruo újú n’ụzọ kwesịrị ekwesi.a Mgbe Jisọs na ndị ikwu Lazarọs ndị na-eru újú nọ, Jisọs anọghị dị ka onye ihe na-adịghị emetụ n’ahụ ma ọ bụ na-aṅụrị ọṅụ n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị. Ọ bụ ezie na o nwere obi ike n’ike nke mbilite n’ọnwụ, Jisọs kwara ákwá. (Jọn 11:33-35) Mgbe Jisọs n’onwe ya nwụsịrị, ndị na-eso ụzọ ya ruru újú, ọ bụ ezie na ọ gwara ha na a gaje igbu ya, na a ga-akpọlitekwa ya ọzọ bia ná ndụ.—-Matiu 16:28; Jọn 16:17-20; 20:11.
Ndị ohu Chineke taa pụrụ, ha na-enwekwa mwute nke ọnwụ na-eweta. Ma, nghọta Bible ha nwere na-enyere ha aka ibelata ma ọ bụ ịhazi iru újú ha n’ụzọ kwekọrọ ná 1 Ndị Tesalọnaịka 4:13, 14: “Ma anyị achọghị ka unu ghara ịmara ihe banyere ndị na-ada n’ụra ọnwụ, ụmụnna anyị; ka o wee ghara iwute unu, ọbụna dị ka ọ na-ewute ndị fọdụrụ, ndị na-enweghị olileanya. N’ihi na a sị na anyị kwere na Jisọs nwụrụ sikwa n’ọnwụ bilie, otu a ndị e mere ka ha daa n‵ụra ọnwụ [n‵ime, NW] Jisọs, ọ bụkwa ndị a ka Chineke ga-ekuru ka ha soo ya bia.”
Ya mere, gịnị banyere ije ememe ili ozu ndị Kraist (ma ọ bụ okwu ememe ncheta banyere onye kwere ekwe)? E nwere ihe ndị sitere na Bible mere Ndịàmà ji chee na ọ bara uru inwe na ije nnọkọ ndị dị otú ahụ.
Cheta na mgbe o yiri ka nwa Jekọb ọ nwụwo, “ụmụ ya ndị ikom na ụmụ ya ndị inyom nile [biliri] ịkasị ya obi.” (Jenesis 37:35) N’ọtụtụ ala, ọ bụ nnọọ dị ka omenala si dị na ndị ikwu nile ga-agbakọta maka ememe ili ozu. Nke a na-enye ndị ọzọ ohere, bụ́ ndị ọ pụrụ ịbụ na ha anọbughị nso, wee si otú a bụrụ ndị ọ na-emetụtachaghị nke ukwuu, ikwu okwu ọmịiko na okwu nkasị obi, Mgbe Lazarọs nwụsịrị, ‘ọtụtụ n’etiti ndị Juu bịakwutere Mata na Meri, ka ha wee kasie ha obi n’ihi nwanne ha.’ (Jọn 11:19) Nke a metụtakwara ndị Kraịst ndị chọrọ ‘inwe ike ịkasi ndị nọ ná mkpagbu ọ bụla obi.’—2 Ndị Kọrint 1:4.
Ndị nlekọta bụ ndị Kraịst, ọ bụ ezie na ha pụrụ iji ọrụ n’aka, kwesịrị ibute ụzọ n’inye ìgwè atụrụ ahụ nkasi obi. Ha na-eburu n’uche na onye ha na-agbaso ihe nlereanya ya, bụ Jisọs, bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ Ọma ahụ, bụ onye e nyere ọrụ nke ‘ikechi ọnyá ndị obi ha tiwara etiwa na ịkasi ndị nile na-eru újú obi.’ (Aịsaịa 61: 1,2; Jọn 10:14) Jisọs enyeghị nkasi obi dị otú ahụ nanị mgbe ọ dịịrị ya mma. Ọ dị njikere itinye mgbalị iga njem iji nọnyere ndị ikwu Lazarọs ahụ mmadụ nwụnahụrụ—iji soro ha kerịta iru újú ha.—Jọn 11:11, 17, 33.
Ọbụna ndị Kraịst ndị ọ pụrụ ịbụ na ha agaghị enwe ọtụtụ ihe ikwu gwa ndị mmadụ nwụnahụrụ n’oge ememe ili ozu pụrụ ime ihe dị mma nanị site ’n’ọnụnọ ha nọ n’ebe ahụ. Ndị ezinụlọ na-eru újú pụrụ inweta nkasi obi dị ukwuu nanị site n’ọnụnọ ọmịiko ọtụtụ ndị nọ n’ebe ahụ—ụmụntakịrị na ndị okenye—site n’ọgbakọ ndị Kraịst. Cheta mmeghachi omume nke ụfọdụ ndị Juu mgbe Jisọs bịakwutere ụmụnne Lazarọs ndị na-eru újú: “Lee otú ọ hụrụ ya n’anya!” (Jọn 11:36) Ndị na-ekweghị ekwe bụ ndị ikwu, ndị agbata obi, ma ọ bụ ndị ha na onye Kraịst ahụ nwụrụ anwụ na-arụkọ ọrụ, bụ ndị bịara ememe ili ozu enwetawo mmetụta dị mma site n’ọnụ ọgụgụ buru ibu nke Ndịàmà ndị bịaranụ, wee si otú a bụrụ ndị na-anabata ihe nke ọma karị mgbe e wetaara ha eziokwu Bible.
Àgwà Ndịàmà ndị bịaranụ aghaghị ịbụ nke kwesịrị ọnọdụ ahụ. Ọ bụ ezie na ha maara na onye ahụ nwụrụ anwụ anọghị na-ata ahụhụ, nweekwa obi ike na mbilite n’ọnwụ na-echere ndị nile na-eguzosi ike n’ihe, ha na-eburu n’obi ha ndụmọdụ ahụ bụ: ‘E nwere mgbe ikwa ákwá na mgbe ịchị ọchị; mgbe iru újú na mgbe ite egwú. (Eklisiastis 3:4) Ememe ili ozu ma ọ bụ nnọkọ ememe ncheta banyere onye nwụrụ anwụ abụghị oge kwesịrị ekwesị maka ikwu okwu egwuregwu n’olu dara ụda. Ọ bụ oge igosi ọmịiko, bụ́ nke kwekọrọ n’okwu ndụmọdụ ahụ bụ: “Na-esonụ ndị na-aṅụrị n’ịṅụrị ọṅụ; na-esonụ ndị na-akwa ákwá n’ịkwa ákwá.”—Ndị Rom 12:15.
E nwere ihe ọzọ mere Ndịàmà Jehova na-eji eje ememe ili ozu. Okwu Chineke na-asị: “Ọ dị mma ije n’ụlọ oruru újú, karịa ije n’ụlọ ọṅụṅụ mmanya vine: n’ihi na nke ahụ bụ nsọtụ mmadụ nile; onye dị ndụ ga-etinyekwa ya n’obi ya. . . . Obi ndị maara ihe dị n’ụlọ oruru újú; ma obi ndị nzuzu dị n’ụlọ ọṅụ.”—Eklisiastis 7:2-4.
Ọ bụ ezie na Ndịàmà Jehova nwere ihe mere ha ga-eji nwee olileanya, okwu ndị ahụ sitere n’ike mmụọ nsọ, e tinyekwara ha n’ime Bible maka abamuru anyị. A pụrụ iji ememe ili ozu tụnyere “ụlọ oruru újú.” Mgbe anyị na-eje, echiche anyị pụrụ ịhapụgodị nchegbu nkịtị ndị anyị nwere ma ọ bụ ihe nkịtị ndị anyị na-eme ma tụkwasị n’ịdị mkpirikpi nke ndụ. Ma ọ bụ site n’ọrịa ma ọ bụ “ihe ndapụta” ọzọ, ọnwụ pụrụ ịdabara onye ọ bụla n’ime anyị, wee weta anyị n’ihe efu na mberede, n’ihi na “ọbụna mmadụ adịghị ama mgbe ya.” (Eklisiastis 9:11, 12) Ndị mụrụ ụmụ ndị na-akpọ ụmụ ha eje ememe ili ozu ndị Kraịst pụrụ ịhụ na nke a pụrụ iduje ha n’ịkparịta otú o si bụrụ na ọnwụ bụ ihe dị adị n’ezie, mkpa anyị nwere maka àjà mgbapụta ahụ na amamihe nke dị n’ijere “Chineke onye na-eme ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie” ozi. —2 Ndị Kọrịnt 1:9; Eklisiastis 12:1, 13.
Ndịàmà Jehova adịghị ele ememe ili ozu anya dị ka sakramenti, kama ha na-aghọta na ihe omume ndị a na-eweta mwute na-enye ohere inye nkasi obi. Site n’ije ha, ndị Kraịst pụrụ inye ihe àmà nke ịhụnanya na nsọpụrụ ha nweburu maka onye Kraịst ibe ha. A pụkwara ịkpali ha ichemikwu echiche banyere ihe ndụ pụtara, banyere ụzọ ha kwesịrị isi na-eji ndụ nke ha na-eme ihe n’ihu Chineke.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a Jenesis 23:2, 19; Ọnụ Ọgụgụ 20:29; Deuterọnọmi 34:7, 8; 2 Samuel 1:11, 12; 3:31-34; 13:32-37; 18:33; 2 Ihe Emere 35:24, 25; Job 1:18-20; Abụ Ọma 35:14; Jeremaịa 9:1; Luk 7:12, 13; 8:49-52; Ọrụ 8:2; 9:39.