Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • km 4/08 p. 8
  • Kasie Ndị Na-eru Uju Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kasie Ndị Na-eru Uju Obi
  • Ozi Alaeze Anyi—2008
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ngụgụ Obi Site n’Aka “Chineke nke Nkasi Obi Nile”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Kasie Ndị Na-eru Újú Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • “Soronụ Ndị Na-akwa Ákwá Kwaa Ákwá”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2017
  • “Ịkasi Ndị Niile Na-eru Uju Obi”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2011
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ozi Alaeze Anyi—2008
km 4/08 p. 8

Kasie Ndị Na-eru Uju Obi

1. Olee ihe mere nkasi obi ji dị ndị na-eru uju mkpa?

1 Ọ bụ ihe na-agbawa obi ma onye mmadụ hụrụ n’anya nwụnahụ ya, karịsịa ma ọ bụrụ na onye ahụ enweghị olileanya Alaeze ahụ. (1 Tesa. 4:13) Ọtụtụ ndị na-echekarị, sị: ‘Olee ihe mere mmadụ ji anwụ anwụ? Olee ebe ha na-aga ma ha nwụọ? M̀ ga-ahụ onye m hụrụ n’anya nwụrụ anwụ ọzọ?’ N’okpuru ebe a, a tụrụ aro ụfọdụ banyere otú anyị ga-esi kasie ndị anyị zutere n’ozi ọma, bụ́ ndị na-eru uju maka ọnwụ nke onye ikwu ha ma ọ bụ enyi ha, obi.—Aịza. 61:2.

2. Ọ̀ bụ mgbe niile onye nwe ụlọ gwara anyị na ya na-eru uju ka anyị ga-ezitewe ya ozi ọma aka?

2 Site n’Ụlọ Ruo n’Ụlọ: Onye nwe ụlọ nwere ike ịgwa anyị na mmadụ nwụnahụrụ ya ọhụrụ. Ọ̀ na-ebe ákwá? È nwere ndị ikwu ndị na-eru uju ebe ahụ? Ya dị otú ahụ, ọ ga-akacha mma ka i gbuo okwu gị nkenke. (Ekli. 3:1, 7) Ikekwe, anyị nwere ike ịgwa onye ahụ na ihe merenụ wutere anyị, nye ya traktị, magazin, ma ọ bụ broshuọ kwekọrọ n’ọnọdụ ya, ma sị ya ka ọ dị mgbe ọzọ. Anyị nweziri ike ịgaghachi n’oge kwesịrị ekwesị ma jiri Baịbụl kasikwuo ya obi.

3. Ọ bụrụ na ọnọdụ anyị zutere onye nwe ụlọ nke na-eru uju nyere anyị ohere ịgụrụ ya Baịbụl, olee ebe ndị anyị nwere ike ịgụ?

3 N’ọnọdụ ndị ọzọ, anyị nwere ike ịchọpụta na anyị nwere ike ikwutetụ okwu aka na mgbe mbụ anyị bịara. Ọ bụ eziokwu na oge a abụghị oge anyị ga-abịa gbaghawa ihe na-abụghị eziokwu e kwuru, anyị nwere ike ịgụ nkwa ndị Baịbụl kwere banyere mbilite n’ọnwụ. (Jọn 5:28, 29) Ma ọ bụkwanụ anyị nwere ike ịgwa ya ihe Baịbụl kwuru banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ. (Ekli. 9:5, 10) Ịgụrụ ya ebe a kpọlitere mmadụ n’ọnwụ na Baịbụl nwekwara ike ịkasi ya obi. (Jọn 11:39-44) Ihe ọzọ anyị nwekwara ike ime bụ ịgụrụ ya okwu ndị na-eme ka mmadụ nwee olileanya n’ebe Jehova nọ, bụ́ ndị Job kwesịrị ntụkwasị obi kwuru. (Job 14:14, 15) Tupu anyị alawa, anyị nwere ike inyefe ya broshuọ bụ́ Gịnị Na-eme Anyị Mgbe Anyị Nwụrụ?, Mgbe Onye Ị Hụrụ n’Anya Nwụrụ ma ọ bụ broshuọ ọzọ, ma ọ bụkwanụ traktị kwesịrị ekwesị. Anyị nwekwara ike inye ya akwụkwọ Bible Na-akụzi, gosi ya ihe e kwuru n’isi nke 6, ma mee ndokwa ịtụle isiokwu ahụ mgbe ọzọ anyị ga-abịa.

4. Olee ohere ndị ọzọ anyị nwere iji kasie ndị mmadụ obi?

4 N’ọnọdụ Ndị Ọzọ: Ọ bụrụ na a ga-ekwu okwu olili ozu n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ndị na-abụghị Ndịàmà hà ga-abịa? E nwere ike inye ha akwụkwọ anyị ndị na-akasi onye mmadụ nwụnahụrụ obi. Ụfọdụ ndị na-arụ ebe a na-agbasi ozu nwere obi ụtọ mgbe e nyere ha akwụkwọ ụfọdụ kwesịrị ekwesị ha ga-enye ezinụlọ ndị mmadụ nwụnahụrụ. Mgbe ụfọdụ, olili ozu ndị a kpọsara n’akwụkwọ akụkọ emeela ka e nwee ohere idere ndị ezinụlọ mmadụ nwụnahụrụ akwụkwọ ozi na-etoghị ogologo iji kasie ha obi. N’otu oge, mgbe otu nwoke nwunye ya nwụrụ natachara akwụkwọ ozi e tinyere traktị ụfọdụ n’ime ya, ya na nwa ya nwaanyị so gaa n’ụlọ onye nkwusa degaara ya akwụkwọ ozi ahụ ma jụọ ya, sị: “Ọ̀ bụ unu ziteere m akwụkwọ ozi a? Aga m achọ ịmatakwu banyere Baịbụl!” Nwoke ahụ na nwa ya nwaanyị kwetara ka a mụwara ha Baịbụl, ha malitekwara ịbịa ọmụmụ ihe.

5. Olee ihe mere anyị kwesịrị iji mụrụ anya iji kasie ndị na-eru uju obi?

5 Ekliziastis 7:2 kwuru, sị: “Ọ dị mma ịga n’ụlọ iru uju karịa ịga n’ụlọ oriri.” Ọ na-adịkarịrị onye na-eru uju mfe ige ntị n’Okwu Chineke karịa onye na-eri oriri. Anyị niile kwesịrị ịmụrụ anya iji hụta ohere ndị anyị nwere ike iji kasie ndị na-eru uju n’ihi onye ha hụrụ n’anya nwụnahụrụ ha obi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya